Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Dị Njọ n’Ịgba Asịrị?

Gịnị Dị Njọ n’Ịgba Asịrị?

 ISI NKE 12

Gịnị Dị Njọ n’Ịgba Asịrị?

“Ọ dị otu mgbe m gara oriri. N’echi ya, ndị mmadụ malitere ikwu na mụ na otu n’ime ụmụ okorobịa ndị bịara oriri ahụ nwere mmekọahụ. Ọ bụtụdịghị eziokwu!”—Linda.

“Mgbe ụfọdụ, ana m anụ asịrị e ji m na-agba na m nwere enyi nwaanyị. Ma n’eziokwu, ahụtụbeghị m onye ọ bụ! Ọtụtụ ndị asịrị anadịghị achọ ịma ma ihe ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu.”—Mike.

 Ọ BỤRỤ na e jiri gị gbaa asịrị, a ga na-akọ banyere gị karịa otú e si akọ banyere ndị na-eme fim. Ụdị ihe ahụ mere otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Amber. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ ejirila m gbaa asịrị ọtụtụ ugboro. Ha sịrị na m dị ime, na mụ eteela ime ọtụtụ ugboro, na m na-ere ọgwụ ike, na m na-azụ ọgwụ ike, na-aṅụkwa ọgwụ ike. Gịnị mere ndị mmadụ ji agba m ụdị asịrị a? N’eziokwu, amaghị m!”

Ebe ọ bụ na e nwere ike iji kọmputa na ekwe ntị zie ozi n’egbughị oge, nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ nke bu ihe ọjọọ n’obi nwere ike imebi aha gị n’ekwughị okwu ọ bụla. Naanị ihe ọ ga-eme bụ iji ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa dee mkpụrụ okwu ole na ole jọgburu onwe ha, zigara ya ọtụtụ ndị chọrọ ịnụ! E nweela ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma n’Ịntanet, bụ́ ndị a na-eji emebi aha ndị mmadụ. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-enwe ebe ha na-ede ihe. N’ebe ahụ, a na-agụtakarị ụdị asịrị ndị mmadụ na-agaghị ejili ọnụ ha kọọ.

Ma, ọ̀ bụ mgbe niile ka ikwu banyere ndị ọzọ dị njọ? Ọzọkwa, . . .

Ò Nwere Mgbe Ịkọ Banyere Ndị Ọzọ Dị Mma?

Kanye akara n’eziokwu ma ọ bụ n’ụgha n’ahịrịokwu na-esonụ.

Ọ dị njọ mgbe niile ịkọ banyere onye ọzọ. □ Eziokwu □ Ụgha

Olee nke bụ́ azịza ya? N’ezie, ọ dabeere n’ihe a na-akọ banyere onye ahụ. Ọ bụrụ na ihe a na-akọ banyere onye ahụ agaghị emebi aha ya, o nwere ike ịbụ na ọ dịghị njọ. A sị ka e kwuwe, Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-eleba anya n’ihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme.” (Ndị Filipaị 2:4, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ pụtaghị na anyị kwesịrị inyonye anya n’ihe na-agbasaghị anyị. (1 Pita 4:15) Ma  a na-esikarị ná mkparịta ụka nkịtị anụ akụkọ bara uru, dị ka ihe atụ, onye na-aga ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụkwanụ onye mụrụ nwa. N’eziokwu, anyị enweghị ike ikwu na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi ma ọ bụrụ na anyị anaghị ekwu banyere ha!

Ma, e nwere ike isi ná mkparịta ụka nkịtị banye n’ịgba asịrị. Dị ka ihe atụ, onye na-ebughị ihe ọjọọ n’obi nwere ike ịsị, “Ihe ga-adabara Emeka na Nkechi ma ha lụọ.” Mgbe onye nụrụ ya chọrọ ịkọrọ ya onye ọzọ, o nwere ike ịsị, “Emeka na Nkechi achọwala ịgba akwụkwọ”—n’agbanyeghị na ụdị ihe ahụ abatatụbeghị Emeka na Nkechi n’obi. I nwere ike ikwu na o nweghị ihe o mere. Ma ọ bụrụ na ị bụ Emeka ma ọ bụ Nkechi, ị ga-ama na ọ dị ihe o mere!

E ji otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Julie gbaa ụdị asịrị ahụ, ya agbawaa ya obi. O kwuru, sị: “Ọ kpasuru m iwe, meekwa ka m ghara ịma onye m ga-atụkwasị obi.” Ụdị ihe ahụ mere nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Jane. O kwuru, sị, “Emechara m gbawara nwa okorobịa ahụ a sịrị na mụ na ya chọrọ ịlụ ọsọ. Ama m na ọsọ m na-agbara ya adịghị mma n’ihi na mụ na ya dị ná mma. Echekwara m na anyị kwesịrị ịna-ekwurịta okwu n’enweghị ndị ga-eji anyị na-agba asịrị!”

Lezie Anya Ka Mkparịta Ụka Unu Ghara Ịghọ Asịrị

Olee otú ị ga-esi jide ire gị aka ma a kpawara gị asịrị? Ihe ga-enyere gị aka n’ịza ajụjụ a bụ iche echiche banyere nkà a na-eji akwọ ụgbọala n’okporo ụzọ awara awara ebe ụgbọala karịrị akarị. Ọ bụrụ na ị bụ ọkwọ ụgbọala, otu ihe nwere ike ime na mberede, gị akwọrọ ụgbọala gị gafee  n’akụkụ nke ọzọ ma ọ bụ kwụsịtụ ka ụgbọala ọzọ gafere, ma ọ bụkwanụ gị akwụsịchaa kpamkpam. Ọ bụrụ na anya ruru gị ala, ị ga-ahụ ihe dị n’ihu ma mee ihe i kwesịrị ime.

Otú ahụ ka mkparịta ụka dị. I nwere ike ịmata mgbe mkparịta ụka unu ghọwara asịrị. Ọ bụrụ na o mee, ị̀ ga-eji nkà mee ka mkparịta ụka ahụ ghara ịghọ asịrị? Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, marakwa na asịrị na-emebi ihe. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Mike kwuru, sị: “Ekwuru m ihe na-adịghị mma banyere otu nwa agbọghọ—na ụmụ nwoke na-agba ya ara—ya emechaa nụ ya. Agaghị m echefu olu o ji gwa m okwu mgbe ọ bịakwutere m, nakwa otú okwu m kwuru n’echeghị echiche si wute ya. Anyị mechara kpezie. Ma obi adịghị mụ mma na m kwuru okwu wutere mmadụ!”

O doro anya na okwu a gwara mmadụ nwere ike iwute ya. Baịbụl kwukwara na “e nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.” (Ilu 12:18) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka i chee echiche tupu gị ekwuo okwu! N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ na-akọ ihe na-atọ gị ụtọ banyere onye ọzọ, ọ gaghị adị mfe ịsị ya kwụsị. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị ime ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri  na asaa aha ya bụ Carolyn kwuru. Ọ sịrị: “I kwesịrị ịkpachara anya n’ihe ị na-ekwu. Ọ bụrụ na onye kọọrọ gị ihe ahụ anaghị ekwu eziokwu, ihe ị na-akọsa nwere ike ịbụ ụgha.” N’ihi ya, ọ bụrụ na ị nụ ihe nwere ike ịbụ asịrị, mee ihe Pọl onyeozi dụrụ ọdụ ka i mee, ya bụ, ‘ikpebi ibi ndụ n’ụzọ dị nwayọọ na ilekwasị anya n’ihe ị na-eme.’—1 Ndị Tesalonaịka 4:11.

Olee otú ị ga-esi egosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ ma lekwasị anya n’ihe ị na-eme? Tupu gị ekwuwe banyere onye ọzọ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a m chọrọ ikwu ọ̀ bụ eziokwu? Gịnị mere m ji chọọ ịkọrọ ya mmadụ? Olee otú a ga-esi na-ele m anya ma m gbaa asịrị?’ Ajụjụ ikpeazụ a dị mkpa n’ihi na ọ bụrụ na e jiri ịgba asịrị mara gị, ọ ga-eme ka a mata àgwà gị karịa nke onye ahụ i ji na-agba asịrị.

Ọ Bụrụ na E Ji Gị Gbaa Asịrị

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e ji gị gbaa asịrị? Ekliziastis 7:9 dọrọ aka ná ntị, sị: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe.” Kama nke ahụ, gbalịa ka i lee ya anya otú kwesịrị ekwesị. Baịbụl sịrị: “Etinyekwala obi gị n’okwu niile ndị mmadụ  pụrụ ikwu, . . . n’ihi na obi gị maara nke ọma na ọbụna gị onwe gị akọchawo ndị ọzọ ọtụtụ ugboro.”—Ekliziastis 7:21, 22.

N’eziokwu, o nweghị ihe ga-eme ka ịgba asịrị bụrụ ihe ọma. Ma, ọ bụrụ na i kwe ka asịrị e ji gị gbaa gbawa gị ara, o nwere ike ime ka e lewe gị anya ọjọọ karịa asịrị ahụ! Ọ ga-adị mma ma i mee ihe nyeere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Renee aka. O kwuru, sị: “Mmadụ kwuo ihe ọjọọ banyere m, ọ na-ewe m iwe. Ma, m na-agbalị ile ya anya otú kwesịrị ekwesị. Ya bụ, n’ụbọchị ọzọ, ọ ka nwere ike ikwu banyere onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọzọ.” *

N’ihi ya, mara ihe, gbalịsie ike ka mkparịta ụka unu ghara ịghọ asịrị. E kwuo ihe na-adịghị mma banyere gị, mee ka dimkpa, ekwela ka ọ gbaa gị ara. Mee ka ọrụ ọma gị na-ekwuchite ọnụ gị. (1 Pita 2:12) I mee otú ahụ, ị ga-eme ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma, meekwa ka gị na Chineke dịrị ná mma.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 21 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịba uru ka ị mata ụzọ akọ ị ga-esi agakwuru onye asịrị ahụ. Ma, ọtụtụ mgbe, ọ gaghị aba uru ime otú ahụ, ebe ọ bụ na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

AMAOKWU BAỊBỤL

Onye na-eche ọnụ ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya. Onye na-agbape ọnụ ekwu okwu—mbibi ga-abụ nke ya.Ilu 13:3.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na a kọwara gị asịrị, i nwere ike ikwu, sị: “Anaghị m achọ ịkọ ụdị ihe a. A sị ka e kwuwe, onye ahụ anọghị ebe a ikwu otú ihe si mee.”

Ị̀ MA NA . . . ?

Naanị ige asịrị nwere ike ime ka i soro na ya. Ọ bụrụ na i kwe ka mmadụ kọwara gị asịrị, ị na-eme ka akụkọ ahụ na-agbasa ngwa ngwa!

IHE M GA-EME!

Mgbe ọ bụla ọ dị m ka m̀ kọsawa ihe m nụrụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo ihe na-adịghị mma banyere m, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee mgbe e kwesịrị ikwu ihe gbasara ndị ọzọ?

● È jitụla gị gbaa asịrị, ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị mụtara na ya?

● Olee otú iji ndị ọzọ agba asịrị ga-esi mebie aha gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 107]

“Amụtara m ihe mgbe onye m ji gbaa asịrị matara, bịa jụọ m banyere ya. O nweghị otú m ga-esi agọ agọ! N’eziokwu, amụtara m na ọ ka mma ịgwa mmadụ okwu ihu na ihu karịa ikwu ya okwu azụ!”—Paula

[Foto dị na peeji nke 108]

Asịrị dị ka ngwá agha jọgburu onwe ya nke nwere ike imebi aha onye ọzọ