Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Eme Ka Mmekọahụ Pụọ M n’Obi?

Olee Otú M Ga-esi Eme Ka Mmekọahụ Pụọ M n’Obi?

 ISI NKE 29

Olee Otú M Ga-esi Eme Ka Mmekọahụ Pụọ M n’Obi?

 OTU nwa okorobịa aha ya bụ Michael kwuru, sị, “Ana m echekarị banyere ụmụ agbọghọ—ọbụna mgbe mụ na ha na-anọghị. Ọ bụ nzuzu. Mgbe ụfọdụ, ọ na-echu m ụra.”

Dị ka Michael, ị̀ na-echekarị banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịdị gị ka gị na uche gị ùnu na-alụ ọgụ. I nwere ike ịnọkata chesiwe echiche ike banyere mmekọahụ. Michael kwuru, sị: “Ụdị echiche ahụ nwere ike iri mmadụ isi mgbe ụfọdụ. O nwere ike ime ka o si ebe ọ na-achọghị isi, ka o nwee ike ịhụ otu nwa agbọghọ mara mma. O nwekwara ike ime ka o si ebe a na-ere ihe ọ na-achọghị ịzụ naanị ka o leruo otu nwa agbọghọ anya.”

Ma, cheta na inwe agụụ mmekọahụ abụghị ihe ọjọọ. A sị ka e kwuwe, Chineke kere nwoke na nwaanyị, mee ka ibe ha na-agụ ha agụụ. Ọ bụ naanị di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ. Mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, mmekọahụ nwere ike na-agụsi gị ike. Ọ bụrụ na ọ gụwa gị, echela na ị bụ onye ọjọọ ma ọ bụ na o nweghị ihe ga-eme ka i zere ịkwa iko. Ị ga-ezere ya ma ị chọọ! Ma ọ bụrụ na ị chọghị ime omume rụrụ arụ, ọ pụtara na ị gaghị na-eche banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị mgbe niile. Olee otú ị ga-esi eme ya?

Lezie anya ná ndị gị na ha na-akpa. Ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ ibe gị amalite ikwu okwu banyere mmekọahụ rụrụ arụ, i nwere ike ịchọ itinye ọnụ—ka ị ghara ịdị iche. Ma n’eziokwu, ọ ga-eme ka o sikwuoro gị ike ime ka echiche ọjọọ pụọ gị n’obi. Gịnị ka i kwesịrị ime—ọ̀ bụ ibili si ebe ahụ pụọ? Kpọmkwem! Ime otú ahụ ekwesịghị ime gị ihere! Ọtụtụ mgbe, ị ga-ama otú ị ga-esi apụ n’emeghị ka ị̀ bụ onye oké ezi omume ma ọ bụ mee ka ha chịwa gị ọchị.

 Zere ntụrụndụ rụrụ arụ. N’eziokwu, ọ bụghị fim niile ma ọ bụ egwú niile dị njọ. Ma, e ji ọtụtụ ntụrụndụ e nwere taa eme ka mmekọahụ na-ezighị ezi na-agụ ndị mmadụ agụụ. Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere? O kwuru, sị: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Zere ntụrụndụ ọ bụla nwere ike ime ka mmekọahụ rụrụ arụ gụwa gị. *

Nsogbu Mmadụ Igbo Onwe Ya Agụụ Mmekọahụ Na-akpata

Otú ụfọdụ ndị na-eto eto na-esi eme ka agụụ mmekọahụ na-agụ ha dajụọ bụ iji aka ha na-egbo onwe ha agụụ mmekọahụ. Ma o nwere ike ịkpata ezigbo nsogbu. Baịbụl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ abụghị ‘ime ka agụụ mmekọahụ nwụọ.’ N’ezie, ọ na-eme ka agụụ mmekọahụ na-ere ka ọkụ!

Iji aka gị egbo onwe gị agụụ mmekọahụ nwere ike ime ka ị ghọọrọ ọchịchọ gị ohu. (Taịtọs 3:3) Ị chọọ imeri ya, ihe mbụ  ị ga-eme bụ ịkọrọ ya onye ị tụkwasịrị obi. Otu Onye Kraịst ya na omume ahụ lụrụ ọgụ ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: “A sị nnọọ na m katara obi kọọrọ ya mmadụ mgbe m ka na-eto eto! Obi m pịara m ụtarị ruo ọtụtụ afọ, o mekwara ka mụ na ndị ọzọ ghara ịdị ná mma, nke ka nke, mụ na Jehova.”

Ònye ka i kwesịrị ịgwa? Ọ kacha mma ka ị gwa papa gị ma ọ bụ mama gị. Onye Kraịst ṅụjuru mmiri ara afọ nwekwara ike inyere gị aka. I nwere ike ịgwa onye ahụ, sị, “M chọrọ ịkọrọ gị otu nsogbu na-echu m ụra.”

Otu nwa okorobịa aha ya bụ André kọọrọ ya otu okenye ọgbakọ ma nwee obi ụtọ na o mere otú ahụ. André kwuru, sị, “Ka okenye ahụ na-ege ihe m na-akọrọ ya, anya mmiri juru ya n’anya. Mgbe m kwuchara, o mere ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya. Ọ gwara m na ọ bụghị naanị m nwere ụdị nsogbu ahụ. O kwere m nkwa na ya ga na-achọ ịma ma m̀ na-agbalịkwa, na ya ga-ewetakwara m ihe ndị ọzọ e kwuru banyere nsogbu ahụ n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Mgbe mụ na ya kwuchara, ekpebiri m na m ga na-agbalịsi ike—ọ bụrụgodị na mụ emee ya mgbe ụfọdụ.”

Nwa okorobịa ọzọ aha ya bụ Mário kpebiri ịkọrọ ya papa  ya. Papa ya ghọtara nsogbu ya ma nweekwa ọmịiko. Ọ gwadịrị Mário na mgbe ya ka na-eto eto, o siiri ya ike ịkwụsị omume ahụ. Mário kwuru, sị, “Eziokwu papa m kwuru gbara m ezigbo ume. Agwara m onwe m na ebe yanwa kwụsịrị ya, m ga-akwụsịkwa ya. Ihe papa m mere metụrụ m n’ahụ́, mee ka m bee ákwá.”

Dị ka André na Mário, i nwere ike inweta ihe ga-enyere gị aka ná mgbalị ị na-eme ịkwụsị iji aka gị egbo onwe gị agụụ mmekọahụ. Ọ bụrụgodị na i mee ya mgbe ụfọdụ, adala mbà! Ka obi sie gị ike na i nwere ike imeri n’ọgụ ahụ. *

Na-achị Echiche Gị

Pọl onyeozi kwuru, sị: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá, na-achị ya dị ka ohu.” (1 Ndị Kọrịnt 9:27) O nwere ike ịdị mkpa ka ị rụọ ahụ́ gị ụka otú ahụ mgbe ị malitere iche  echiche ọjọọ banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị. Ọ bụrụ na echiche ahụ ekweghị apụ gị n’obi, gaa megaa ahụ́. Baịbụl kwuru, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru.” (1 Timoti 4:8) Ịgasi ije ike ma ọ bụ imega ahụ́ nkeji ole na ole nwere ike inyere gị aka ịkwụsị iche ihe ahụ na-ezighị ezi.

Nke ka nke, echefula na Nna gị nke eluigwe ga-enyere gị aka. Otu Onye Kraịst kwuru, sị, “Mmekọahụ gụwa m, m na-ekpesi ekpere ike.” Cheta na Chineke agaghị eme ka ị kpọ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị asị. Ma ọ ga-enyere gị aka ịchọpụta na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ i kwesịrị ichebara echiche.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 7 A kọwara ntụrụndụ nke ọma ná Nkebi nke 8 n’akwụkwọ a.

^ par. 14 Ị chọọ ịgụkwu ihe ndị ọzọ banyere isiokwu a, gụọ nwanne akwụkwọ a e bu ụzọ bipụta, isi nke 25 na nke 26.

AMAOKWU BAỊBỤL

Omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.Ndị Filipaị 4:8.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ị na-agbalị ịkwụsị iji aka gị egbo onwe gị agụụ mmekọahụ, ma gị emechaa mee ya ọzọ, adala mbà! Chọpụta ihe mere i ji mee ya ọzọ, gbalịa ka ị ghara ime ihe ahụ ọzọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ihe ị na-eche echiche ya nwere ike imetụta ụdị onye ị bụ nakwa omume gị.—Jems 1:14, 15.

IHE M GA-EME!

M chọọ ịkwụsị iche banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m, ihe m ga-eme bụ

Ọ bụrụ na mụ na ụmụ klas anyị na-akparịta ụka, ha ekwuwe banyere omume rụrụ arụ, ihe m ga-eme bụ

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere e kwesịghị iwere agụụ mmekọahụ dị ka ihe ọjọọ mgbe niile?

● Gịnị mere i ji kwesị ijide onwe gị mgbe agụụ mmekọahụ gụwara gị?

● Olee ụdị ntụrụndụ nwere ike ime ka ị na-eche banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị?

● Ọ bụrụ na mkparịta ụka aghọwa okwu rụrụ arụ, gịnị mere o ji dị mkpa ka i si ebe ahụ pụọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 240]

“Ihe na-enyere m aka bụ ịmalite iche banyere ihe ọzọ, ya bụ, ịkwụsị iche banyere ihe na-eme ka mmekọahụ gụwa m. Ana m agwa onwe m na agụụ dị otú ahụ ga-emecha pụọ m n’obi.”—Scott

[Foto dị na peeji nke 239]

Ị̀ ga-ekwe ka e tinye nsí ná nri ị na-eri? Ọ bụrụ na ị gaghị ekwe, olee uru ọ bara ikponye ihe rụrụ arụ n’uche gị?