Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Otú M Dị Adịghị Mụ Mma?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Otú M Dị Adịghị Mụ Mma?

 ISI NKE 7

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Otú M Dị Adịghị Mụ Mma?

Iwe ọ̀ na-ewekarị gị n’ihi otú ị dị?

□ Ee □ Ee e

Ọ̀ dịtụla mgbe i chere echiche ịwa ahụ́ ma ọ bụ ịhọ nri iji mezie otú ị dị?

□ Ee □ Ee e

A sị na i nwere ike, olee ihe ị ga-achọ imezi n’ahụ́ gị? (Kaa ndị ọ bụ akara.)

Ogologo gị

Otú ahụ́ gị dị

Ụcha gị

Otú ị hà

Ntutu gị

Ụda olu gị

 Ọ BỤRỤ na ị zara ee n’ajụjụ abụọ ahụ e bu ụzọ jụọ, ọ bụrụkwa na ị kara atọ ma ọ bụ karịa n’ime ihe ndị ahụ e kwuru akara, si n’ụzọ ọzọ lee ya anya: O nwedịrị ike ịbụ na ndị ọzọ anaghị ele gị anya otú ahụ i si ele onwe gị. Ma ị́ kpacharaghị anya, otú ị dị nwere ike ime ka i mefee ihe ókè, ya echuwezie gị ụra. N’eziokwu, otu nchọpụta e mere gosiri na ụmụ agbọghọ na-atụkarị ibu ibu ụjọ karịa otú ha si atụ agha ọgwụrụ mba, ọrịa kansa, na ọnwụ nne na nna ha ụjọ!

O doro anya na otú ị dị ga-emetụta otú i si ele onwe gị anya nakwa otú ndị ọzọ ga-esi na-akpaso gị àgwà. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maritza kwuru, sị: “Mgbe anyị na-eto eto, ụmụnne m abụọ ndị tọrọ m mara mma dị egwu, ma ahà m ka awọ. A na-akọkarị m ọnụ n’ụlọ akwụkwọ. Ihe ọzọ bụ na anti m na-akpọ m Uduawo, nke bụ́ aha ọ na-akpọ obere nkịta ya buru oké ibu!” Ụdị ihe ahụ mere nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Julie. O kwuru, sị: “Otu nwa agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị kọrọ m ọnụ, sị na m bụ ‘ezé atako.’ Ọ bụ ezie na o nweghị ihe o wepụrụ m n’ahụ́, o wutere m, ọbụna ugbu a, ezé m na-eme m ihere!”

Ọ̀ Na-ewute Gị Ka Ọ̀ Na-echu Gị Ụra?

Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na otú ị dị na-ewute gị. N’eziokwu, Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ọtụtụ ụmụ nwoke na  ụmụ nwaanyị ndị mara mma, dị ka Sera, Rechel, Josef, Devid, na Abigel. Baịbụl kwuru na otu nwaanyị aha ya bụ Abishag “mara mma nke ukwuu.”—1 Ndị Eze 1:4.

Otú ọ dị, otú ọtụtụ ndị na-eto eto dị na-echu ha ụra. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụ agbọghọ chere na onye mara mma bụ onye dị gịrịgịrị. O yiri ka ọ̀ bụ ndị dị ka ogwu azụ̀ a na-ese n’akwụkwọ e ji akpọsà ngwá ahịa na-eme ka ha na-eche otú ahụ. Ha anaghị ama na e ji aka ma ọ bụ kọmputa chọọ foto ndị ahụ mma, nakwa na ndị ahụ e sere dị gịrịgịrị na-afọ nke nta ka ha na-ebu ọnụ iji mee ka ha ghara ibu ibu! N’agbanyeghị nke ahụ, iji onwe gị atụnyere ndị ahụ nwere ike ime ka iwe na-ewe gị. Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na otú ị dị na-eme gị obi ọjọọ n’ezie? Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ileru onwe gị anya nke ọma.

Ọ̀ Bụ Otú Ị Dị n’Eziokwu?

Ọ̀ dịtụla mgbe i lere onwe gị anya n’enyo nke na-akọ mmadụ ọnụ? O nwere ike ime ka i buo ibu ma ọ bụ dị ntakịrị karịa otú ị dị. Ihe ọ bụla ị hụrụ n’enyo ahụ abụghị otú ị dị.

N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị ahụ onwe ha otú ha dị. Chegodị echiche: N’otu nchọpụta e mere, ihe dị ka ụmụ agbọghọ isii n’ime ụmụ  agbọghọ iri kwuru na ha buru oké ibu, ebe ọ bụkwanụ naanị ihe dị ka mmadụ abụọ n’ime ha buru ibu n’eziokwu. Ná nchọpụta ọzọ e mere, ihe dị ka ụmụ nwaanyị ise n’ime ụmụ nwaanyị iri, bụ́ ndị a ma na ha dị gịrịgịrị, chere na ha buru oké ibu!

Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọtụtụ ụmụ agbọghọ ndị na-echegbu onwe ha na ha buru ibu ebudịghị ibu ọ bụla. N’ezie, o nwere ike ịbụ na ihe ahụ ha kwuru agaghị emecha ka obi ruo gị ala ma ọ bụrụ na i buru ibu. Ọ bụrụ na i buru ibu, gịnị nwere ike ịkpata ya?

O nwere ike ịbụ na o si gị n’ọbara. Ụfọdụ na-esi n’afọ nne ha dịrị gịrịgịrị ma kwụrụ chịm. Ma ọ bụrụ na ọbara nne gị ma ọ bụ nna gị mere ka ị dọrọ adọrọ n’ala ma buo ibu, ọ pụtara na ị gaghị adị gịrịgịrị. Ọ bụrụgodị na ị hà otú i kwesịrị ịha, o nwere ike ịdị gị ka ì buru ibu. Imega ahụ́ na iri obere nri nwere ike inyere gị aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ị gaghị agbanwecha otú ị dị ma ọ bụrụ na o si gị n’ọbara.

Ihe ọzọ nwere ike ịkpata ya bụ mgbanwe mmadụ na-enwe mgbe ọ na-eto. Ọ na-eme ka ahụ́ nwa agbọghọ buo ibu ihe karịrị okpukpu abụọ. Ụdị onye ahụ nwere ike ịgbanwe ka oge na-aga. Nwata nwaanyị buru ibu, nke dị afọ iri na otu ma ọ bụ iri na abụọ, nwekwara ike ịghọ nwa agbọghọ kwaziri ahụ́. N’aka nke ọzọ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe mere i ji há otú ị hà bụ na ị naghị eri ezi ihe ma ọ bụ na ị naghị emega ahụ́? Gịnịkwa ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na i kwesịrị ifelata n’ihi ọrịa?

 Ihe I Kwesịrị Ime

Baịbụl kwuru okwu ọma banyere mmadụ ‘ịbụ onye na-emeru ihe n’ókè.’ (1 Timoti 3:11) N’ihi ya, ebula ọnụ. Erikwala nri dị oké ntakịrị. Ma eleghị anya, ụzọ kacha mma ị ga-esi felata bụ iri ezi nri mgbe niile na ịna-emega ahụ́.

I kwesịghị iriwe ihe ndị a sị na ha ga-eme ka i felata. Dị ka ihe atụ, ọgwụ ndị na-eme ka mmadụ felata nwere ike ime ka agụụ ghara ịgụ gị ruo nwa oge; ma n’oge na-adịghị anya, ha ga-amara gị ahụ́, agụụ amalitekwa ịgụ gị. Ma ọ bụkwanụ, ahụ́ gị nwere ike ọ gaghị agbaricha nri i riri, ya emee ka i bukwuo ibu—ma ya fọkwa nsogbu ụfọdụ o nwere ike ịkpatara gị, dị ka iro ụra, ọbara mgbali elu, obi ezughị ike nakwa ma eleghị anya, mee ka ọgwụ ahụ rie gị ahụ́. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọgwụ ndị na-eme ka mmadụ na-anyụ mamịrị ma ọ bụkwanụ ndị na-eme ka nri na-agbari ngwa ngwa na-eme.

Ma, iri nri kwesịrị ekwesị mgbe niile na ịna-emega ahụ́ nke ọma ga-eme ka ị dị mma n’anya, meekwa ka ahụ́ dị gị mma. Ọ bụrụ na ị na-emega ahụ́ otú kwesịrị ekwesị ọtụtụ ugboro kwa izu, ị ga-ahụ ihe dị iche n’ahụ́ gị. Naanị ịgasi ije ike na ịrị ụlọ elu nwere ike inyere gị aka.

Kpachara Anya Banyere Ụjọ Nri!

Ụfọdụ ndị na-eto eto na-atụ ụjọ nri n’ihi na ha chọrọ ifelata. Ụjọ nri bụ ọrịa nwere ike igbu mmadụ n’ihi achọghị iri nri. E nyeere otu onye na-eto eto aha ya bụ Masami aka ka ọ kwụsị ịtụ ụjọ nri. Mgbe ihe dị ka ọnwa anọ gachara, ọ sịrị: “Mgbe ndị mmadụ gwara m, sị, ‘Ahụ́ dị gị mma,’ ana m ekwu n’obi m, sị, ‘Ọ ga-abụ na ebuwele m ibu.’ Ana m  amalite ịkwa arịrị, na-agwa onwe m, sị, ‘A sị nnọọ na m ga-adịghachili otú m dị ọnwa anọ gara aga!’”

Mmadụ nwere ike nọkata tụwa ụjọ nri. Nwata nwaanyị nwere ike nọkata họwa nri, nke nwere ike iyi ka o nweghị ihe o mere, ma eleghị anya, n’ihi na ọ chọrọ ifelatatụ. Otú ọ dị, mgbe o felatatụrụ, obi anaghị adị ya mma. Ya lee onwe ya anya ọjọọ n’enyo, ya asị, “M ka buru oké ibu!” Ya emee ka o kpebie ifelatatụkwu. Ya emechaa felatatụ. O nwere ike meekwa ya ọzọ. Otú ahụ ka ụjọ nri si amalite.

Ọ bụrụ na i nwere ihe na-egosi na ị na-atụ ụjọ nri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-eme ka ị ghara iri nri nke ọma, i kwesịrị ịchọ enyemaka. Gwa ya papa gị ma ọ bụ mama gị, ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto ị tụkwasịrị obi. Otu ilu a tụrụ na Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.

Ihe Ezigbo Mma Pụtara

N’ihe niile Baịbụl kwuru, o kwusighị okwu ike banyere otú mmadụ dị ma ọ bụ otú ahụ́ ya dị. Kama nke ahụ, ọ bụ  ihe mmadụ bụ n’ime na-eme ka mmadụ maa mma n’anya Chineke ma ọ bụkwanụ jọọ njọ n’anya ya.—Ilu 11:20, 22.

Chegodị echiche banyere nwa Eze Devid bụ́ Absalọm. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị nwoke mara mma n’Izrel dum dị ka Absalọm, nke a ga-eto otú e si eto ya. Malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya, ntụpọ adịghị ya n’ahụ́.” (2 Samuel 14:25) N’agbanyeghị nke ahụ, nwa okorobịa a bụ onye aghụghọ. Mpako na oké ọchịchọ mere ka ọ gbalịa ịnapụ eze Jehova họpụtara ocheeze ya. Ya mere, Baịbụl ekwughị okwu ọma banyere Absalọm, kama nke ahụ, o kwuru na ọ bụ onye ihere na-adịghị n’anya, onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, na onye ụfụ obi.

Ihe dị mkpa bụ na “Jehova na-enyocha obi”—ọ bụghị otú úkwù nwa agbọghọ hà ma ọ bụkwanụ otú nwa okorobịa nweruru akpụ obi. (Ilu 21:2) N’ihi ya, ọ bụ ezie na ọ dịghị njọ ma ị chọọ ịdị mma n’anya, ihe ka mkpa bụ àgwà gị. Mee elu mee ala, ihe ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ị nọ bụ inwe àgwà e ji mara onye na-efe Chineke, ọ bụghị inwe akpụ obi ma ọ bụ ịdị gịrịgịrị!

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 10

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala ma ọ bụ nwee nkwarụ. Ọ bụrụ na ị na-arịa ụdị ọrịa ahụ, olee otú ị ga-esi na-edi ya?

AMAOKWU BAỊBỤL

Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.1 Samuel 16:7.

NDỤMỌDỤ

Mgbe ị chọrọ ifelata . . .

● Ahapụla iri nri ụtụtụ. Ọ bụrụ na i righị nri ụtụtụ, ụdị agụụ ga-agụ gị mgbe e mechara nwere ike ime ka i rie nri karịa otú ị na-eribu.

● Mgbe ọ bụla ị chọrọ iri nri, buru ụzọ ṅụọ otu iko mmiri buru ibu. Ọ ga-eme ka agụụ ghara ịgụcha gị, meekwa ka ị ghara iri oké nri.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ụfọdụ ndị ọkachamara dọrọ aka ná ntị na ọ bụrụ na i buo ọnụ n’ihi na ị chọrọ ifelata, ahụ́ gị nwere ike ime ka ị “dị ka onye na-aga ịnwụ anwụ,” mee ka nri i riri ghara ịgbari ngwa ngwa, meekwa ka i bughachi ibu!

IHE M GA-EME!

Otú m ga-esi elekọta onwe m bụ ․․․․․

Ụdị mmega ahụ́ kwesịrị ekwesị nke ga-adị mụ mma n’ahụ́ bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee otú obi na-adị gị ma i lee onwe gị anya?

Olee ihe ụfọdụ kwesịrị ekwesị ị ga-eme iji mee ka ị dịkwuo mma n’anya?

Gịnị ka ị ga-agwa enyi gị na-anaghị ekwe eri nri?

Olee otú ị ga-esi nyere nwanne gị ị tọrọ aka ka ọ na-ele otú ọ dị anya otú kwesịrị ekwesị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 69]

“Ruo ogologo oge, a na-akọ m ọnụ na anya m buru ibu. Ana m achịfu ya n’ọchị ma nwee obi ike n’ụdị onye m bụ nakwa àgwà ọma ndị ọzọ m na-akpa. Otú m dị amarala m ahụ́. Ana m ewere onwe m otú m dị.”—Amber

[Foto dị na peeji nke 68]

Otú i si ele onwe gị anya nwere ike ịdị ka ile onwe gị anya n’enyo na-akọ mmadụ ọnụ