Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na M Si n’Ezinụlọ Nwere Naanị Nne Ma Ọ Bụ Nna?

M̀ Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na M Si n’Ezinụlọ Nwere Naanị Nne Ma Ọ Bụ Nna?

 ISI NKE 25

M̀ Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na M Si n’Ezinụlọ Nwere Naanị Nne Ma Ọ Bụ Nna?

“Ụmụaka ndị nwere nne na nna nwere ike inwe ọnụ ụlọ nke ha, zụọkwa uwe ọhụrụ. Ma mụ na ndị ọzọ bi n’otu ọnụ ụlọ; ọ na-ara m ahụ́ ịzụ ụdị uwe m chọrọ ịzụ. Mama m sịrị na ego adịghị. Ya gaa ọrụ, ọ bụ m na-arụ ọrụ niile dị n’ụlọ, ya adịzie m ka m̀ bụ nwa bọị, ya bụ, na a naghị ekwe m mee ihe ụmụaka na-eme.”—Shalonda, dị afọ iri na atọ.

 O DORO anya na ọ na-atọ ụtọ ibi n’ezinụlọ nwere ezigbo papa na mama. Ọ bụrụ na papa na mama ebikọta ọnụ, ọ na-akara ha mfe iduzi ụmụ ha, ichebe ha, na inyere ha aka. Baịbụl kwuru, sị: “Abụọ dị mma karịa otu, n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha.”—Ekliziastis 4:9.

N’agbanyeghị nke ahụ, ihe na-eme eme ugbu a na-egosi na ezinụlọ nwere nne na nna adịwala ụkọ. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị ọkara ụmụaka nọ na United States na-ebitụ n’ezinụlọ nwere naanị papa ma ọ bụ mama tupu ha eruo afọ iri na asatọ.

Ma, ọnọdụ ndị na-eto eto ụfọdụ ndị si n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna na-eme ha ihere. Ndị ọzọ na-ahụsi anya n’ihi otú ihe isi ike si eme ka ụwa na-ara ha ahụ́. Ọ bụrụ na i bi n’ụdị ezinụlọ ahụ, olee nsogbu ndị ị na-enwe? N’okpuru ebe a, dee nsogbu na-akacha ewute gị.

․․․․․

Ọ bụrụ na ọ bụ naanị mama gị ma ọ bụ papa gị na-azụ gị ma na-elekọta gị, ọ̀ pụtara na o nweghị ihe ga-eme ka i nwee obi ụtọ? Mbanụ! Ọ dabeere n’otú i si ele ọnọdụ gị anya. Ilu 15:15 kwuru, sị: “Ụbọchị niile nke onye nọ n’ahụhụ jọrọ njọ; ma onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.” Ilu a na-ekwu na ọ bụchaghị ọnọdụ mmadụ na-ekpebi otú obi ga-adị ya, kama ọ bụ otú onye ahụ si ele ọnọdụ ya anya. Gịnị ka ị ga-eme ka ‘obi dị gị mma’ n’agbanyeghị otú ọnọdụ gị dị?

Ihe Ị Ga-eme Mgbe Obi Na-adịghị Gị Mma

Ihe mbụ ị ga-eme bụ, ekwela ka okwu ọjọọ ndị mmadụ gwara gị mee gị obi ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nkụzi na-ekwu okwu na-adịghị mma banyere ụmụ akwụkwọ ha ndị si n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwu na àgwà ọjọọ ọ bụla nwa akwụkwọ si n’ụdị ezinụlọ ahụ kpara, o si n’ebe a zụrụ ya. Ma, jụọ onwe gị, sị: ‘Ndị na-ekwu ụdị ihe ahụ hà ma mụ na ezinụlọ anyị n’ezie? Ka hà na-ekwu ya n’ihi ihe ha nụrụ ndị ọzọ kwuru banyere ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna?’

 Anyị kwesịrị icheta na Akwụkwọ Nsọ kwuru ọtụtụ ugboro banyere “nwa na-enweghị nna.” Ọ dịghị ebe o kwuru okwu ọjọọ banyere ya. N’ezie, n’ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru banyere “nwa na-enweghị nna,” Jehova gosiri ezigbo ịhụnanya ọ hụrụ ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna. *

N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi nwere ike ịkpachapụ ezigbo anya mgbe ha na-agwa gị okwu. Dị ka ihe atụ, mgbe ha na-agwa gị okwu, o nwere ike isiri ha ike ikwu ihe ndị dị ka “nna gị,” “alụmdi na nwunye,” “ịgba alụkwaghịm,” ma ọ bụ “ọnwụ,” n’ihi na ha achọghị ikwu ihe ga-ewe gị iwe ma ọ bụ menye gị ihere. Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-ewute gị? Ọ bụrụ na ọ na-ewute gị, jiri akọ gwa ha na ha ekwesịghị inye onwe ha nsogbu. Otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ aha ya bụ Tony amaghị nna mụrụ ya. O kwuru na ọ na-abụ, ụfọdụ ndị chọọ ịgwa ya okwu, ikwu ihe ụfọdụ esiere ha ike. Ma, Tony gwawa ha okwu, ọ na-ekwu ihe ndị ahụ ha na-achọghị ikwu. Ọ sịrị: “Achọrọ m ka ha mata na ọnọdụ m anaghị eme m ihere.”

Akwala Ụwa

N’eziokwu, ọ bụrụ na mama gị na papa gị gbara alụkwaghịm, ma ọ bụkwanụ na otu n’ime ha nwụrụ, ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na ọ na-ewute gị, na-agbawa gị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị iwere ọnọdụ gị otú ị hụrụ ya. Baịbụl dụrụ ọdụ, sị, “Asịla: ‘Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?’” (Ekliziastis 7:10) N’ụdị ihe a, e nwere otu nwata nwaanyị dị afọ iri na atọ aha ya bụ Sarah. Papa ya na mama ya gbara alụkwaghịm mgbe ọ dị afọ iri na atọ. O kwuru, sị: “Ekwela ka ọnọdụ gị na-echu gị ụra, gị ana-akwa ụwa, ma ọ bụ na-eche na ihe mere i ji na-enwe nsogbu bụ  na i bi n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụkwanụ na ụmụaka ndị bi n’ezinụlọ nwere nne na nna bụ ndị ụwa ọma.” Ihe a bụ ezigbo ndụmọdụ. A sị ka e kwuwe, ezinụlọ ndị nwere nne na nna na-enwekwa nsogbu nke ha.

Were ya na ndị ezinụlọ unu yiri ndị na-akwọ ụgbọ epeepe. Ndị na-akwọ ụgbọ epeepe kwesịrị izu ezu. N’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna, ọ pụtara na otu onye anọghị ya. N’ihi ya, ndị fọrọ afọ kwesịrị ịrụsikwu ọrụ ike. Ọ̀ pụtara na ihe agaghị adịrị ụdị ezinụlọ ahụ mma? Mbanụ! Ọ bụrụhaala na ndị ọzọ ejiri otu obi na-agbalị, ha ga-akwọrọ ezinụlọ ha dị ka ụgbọ ruo ebe ha na-aga.

Ị̀ Na-eme Ihe I Kwesịrị Ime?

Gịnị ga-enyere gị aka ime ihe i kwesịrị ime dị ka ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ unu na-eme? Leba anya n’aro atọ ndị a:

Kpachara anya n’otú i si emefu ego. Ihe na-enye ọtụtụ ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna ezigbo nsogbu bụ ego.  Olee ihe ị ga-eme iji nye aka? Tony e kwuru okwu ya ná mmalite kwuru, sị: “Ụmụ akwụkwọ ibe m na-esi ọnwụ ka a zụọrọ ha uwe na akpụkpọ ụkwụ dara oké ọnụ. Ma á zụghị ya, ha asị na ha agaghị aga ụlọ akwụkwọ. Enweghị m uwe dara oké ọnụ, ma uwe m na-adị ọcha, na-adịkwa mma n’anya. M na-ejizi nke m nwere ejizi. Mama m na-agbalị; achọghị m ime ka ihe sikwuoro ya ike.” Ọ bụrụ na ị gbalịtụ, i nwere ike ime ihe Pọl onyeozi mere. O kwuru, sị: “Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya. . . . N’ihe niile nakwa n’ọnọdụ niile, amụtawo m ma otú e si eriju afọ ma otú e si anọ agụụ.”—Ndị Filipaị 4:11, 12.

Otú ọzọ ị ga-esi akpachara anya n’imefu ego bụ ịghara ịla ihe n’iyi. (Jọn 6:12) Otu nwa okorobịa aha ya bụ Young Rodney kwuru, sị: “N’ụlọ anyị, m na-akpachara anya ka m ghara imebi ihe ma ọ bụ ịtụfu ihe, ebe ọ bụ na ọ bụ ego ka a ga-eji arụzi ya ma ọ bụ zụchie ya. M na-agbanyụ ọkụ ma ọ bụ ihe ndị dị ka TV ma ọ bụrụ na o nweghị onye ji ya eme ihe ọ bụla. Ọ na-eme ka ụgwọ ọkụ anyị dịrị ntakịrị.”

Na-eme ihe i kwesịrị ime. Ọtụtụ nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ anaghị achọ imesi ụmụ ha ike ma ha daa iwu ma ọ bụkwanụ ịgwa ụmụ ha ka ha rụọ ọrụ a na-arụ n’ụlọ. N’ihi gịnị? Ụfọdụ n’ime ha achọghị inye ụmụ ha nsogbu, ka ha ghara ịna-echeta nne ha ma ọ bụ nna ha na-anọghị ya. Ha nwere ike iche, sị, ‘Achọrọ m ịhapụ ụmụ m ka ha gwurie egwu.’

Obi gị nwere ike ịgwa gị ka i mewe otú masịrị gị, ebe ọ bụ na mama gị ma ọ bụ papa gị achọghị inye gị nsogbu. Ma, i mee otú ahụ, ihe ga-esikwuru ya ike, kama ịkara ya mma.  Kama ime otú ahụ, ọ́ kaghị mma ka ị rụọ ihe i kwesịrị ịrụ n’echeghị ka a gwa gị agwa? Chee echiche banyere ihe Tony mere. O kwuru, sị: “Mama m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ, e kwesịrị ide uwe ọ na-eyi aga ọrụ ayọn. N’ihi ya, ọ bụ m na-ede ya ayọn.” Ihe ahụ ọ́ bụghị ọrụ ụmụ nwaanyị? Tony zara, sị: “Ụfọdụ chere otú ahụ. Ma, m na-eji ya enyere mama m aka. Ọ bụ ya mere m ji eme ya.”

Na-egosi ya na ihe ọ na-eme dị gị mma. E wezụga inyere mama gị ma ọ bụ papa gị aka, i nwere ike ime ka obi dị ya mma ma ọ bụrụ na ị na-egosi ya na ihe ọ na-eme dị gị mma. Otu nne naanị ya na-azụ ụmụ ya dere, sị: “M na-achọpụtakarị na mgbe obi na-adịghị mụ mma ma ọ bụ mgbe nsogbu m nwere n’ụlọ ọrụ kpasuru m iwe, m lọta, ọ bụ ụbọchị ahụ ka nwa m  nwaanyị na-edozi tebụl ma malite isi nri abalị. Nwa m nwoke na-ejide m aka, makụọkwa m.” Olee otú ụdị àgwà ọma ahụ mere ka obi dị ya? O dekwara, sị: “Ọ na-eme ka obi dị mụ mma.”

N’ime aro atọ ndị ahụ a tụrụ, dee nke i kwesịrị ịrụ ọrụ na ya karịchaa. ․․․․․

Ibi n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna ga-eme ka i nwee ike ịmụta àgwà ndị dị ka ọmịiko, achọghị ọdịmma onwe gị naanị, na ịbụ onye a tụkwasịrị obi. Jizọs kwukwara, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Obi ga na-atọ gị ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ị na-enyere mama gị ma ọ bụ papa gị naanị ya na-azụ ụmụ aka.

N’ezie, o nwere ike iwute gị mgbe ụfọdụ ma i cheta na mama gị ma ọ bụ papa gị anọkwaghị. Ma, i nwere ike ime ihe ga-akacha baara gị uru n’agbanyeghị ọnọdụ gị. Otu nwata nwaanyị aha ya bụ Nia chọpụtara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Mgbe papa m nwụrụ, otu onye gwara m na ‘ọ bụ omume m ga-eme ka ihe dịrị mụ mma ma ọ bụ dịrị mụ njọ. Anaghị m echefu ihe ahụ o kwuru echefu. Ọ na-echetara m na ekwesịghị m ikwe ka ọnọdụ m na-eme m obi ọjọọ mgbe niile.” I nwere ike ịmụta isi otú ahụ ele ihe anya. Cheta na ọ bụghị ọnọdụ gị ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ma ọ bụ mwute. Ọ bụ otú i si ele ya anya—nakwa ihe ị na-eme banyere ya.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 4

[Ihe odide ala ala peeji]

AMAOKWU BAỊBỤL

Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.Ndị Filipaị 2:4.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka è nyere gị ọrụ karịrị akarị, jiri akọ gwa papa gị ma ọ bụ mama gị ka o mee ihe a tụrụ aro ya n’ebe a:

Ka o dee ọrụ niile onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu ga na-arụ.

Mgbe ọ dị mkpa, ka o kegharịa ọrụ ndị ahụ, kenye ha ndị nwere ike ịrụ ha n’ezinụlọ unu.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ịrụ ọrụ e nyere gị n’ezinụlọ nwere ike ime ka i mewe ka dimkpa ngwa ngwa karịa ụmụaka ibe gị ndị nọ n’ezinụlọ nwere nne na nna, bụ́ ndị a na-anaghị enyecha ọrụ.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme ka obi dị mụ mma bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-akpachapụ ezigbo anya mgbe ha na-agwa m okwu, ihe m ga-agwa ha bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere ụfọdụ ndị ji eleda ụmụaka si n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna anya?

Gịnị nwere ike ime ka papa gị ma ọ bụ mama gị ghara ịgwa gị ka ị rụọ ọrụ dị n’ụlọ?

Olee otú i nwere ike isi gosi papa gị ma ọ bụ mama gị na ihe ọ na-eme dị gị mma?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 211]

“Kemgbe papa m na mama m gbara alụkwaghịm, mụ na mama m na-ekwurịta okwu; o meela ka anyị na-akpachi anya.”—Melanie

[Foto dị na peeji nke 210 na 211]

Ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna yiri ụgbọ epeepe nke otu n’ime ndị na-akwọ ya na-anọghị ya—ndị fọrọ afọ kwesịrị ịgbalịsikwu ike, ma ihe ga-adịrị ha mma ma obi ha bụrụ otu