Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àchọwala M Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

Àchọwala M Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

 ISI NKE 1

Àchọwala M Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

“Ọtụtụ ụmụ nwoke na-agwa m ka mụ na ha kpawa. E nwekwara ọtụtụ ụmụ nwoke mara mma mụ na ha nwere ike ịkpa.”—Whitney.

“Ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-arịọsi ụmụ okoro ike ka ha na ha kpawa. Ọ na-adị m ka m kweta. Ma, ọ bụrụ na mụ ajụọ ndị mụrụ m, ama m na ha agaghị ekwe.”—Phillip.

O NWERE ike na-agụsi gị agụụ ike ka gị na onye ị hụrụ n’anya—na onye hụrụ gị n’anya—na-akpa, ọbụna mgbe ị ka bụ nwata. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jenifer kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na otu, ọ malitere ịgụ m agụụ ka mụ na nwoke kpawa.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Brittany kwukwara, sị: “N’ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na i nweghị nwoke gị na ya na-akpa, ọ ga-adị gị ka ị bụghị nwaanyị!”

 Gịnwa kwanụ? Ị̀ chọwala ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ tụlee otu ajụjụ ka mkpa:

Gịnị Ka “Nwoke na Nwaanyị Ịkpa” Pụtara?

Kanye akara n’ihe ị chọrọ ịza n’ajụjụ ndị a:

Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpapụ mgbe niile. Gị na ya ùnu na-akpa?

□ Ee

□ Ee e

Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị hụrụ ibe unu n’anya. Ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, ị na-eji ekwe ntị gị ezigara ya ozi ma ọ bụ na-akpọ ya. Gị na ya ùnu na-akpa?

□ Ee

□ Ee e

Mgbe ọ bụla gị na ndị enyi gị zukọtara, gị na otu onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-anọkarị. Gị na ya ùnu na-akpa?

□ Ee

□ Ee e

Ikekwe, ịza ajụjụ nke mbụ ahụ esighịrị gị ike. Ma o nwere ike ịbụ na i bu ụzọ chee echiche tupu gị azaa ajụjụ nke abụọ na nke atọ. Gịnị kpọmkwem ka nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara? N’ezie, nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara na ha abụọ na-emekọ ihe ma nwee mmasị n’ebe ibe ha nọ. Ya mere, azịza nke ajụjụ atọ ahụ a jụrụ na mbụ bụ ee. Ma ọ̀ bụ n’ekwe ntị, ma ọ bụ n’ihu n’ihu, n’ebe ndị mmadụ nọ ma ọ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọghị, ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere mmasị n’ebe ibe unu nọ, na-eziritakwa ozi mgbe niile, unu na-akpa. Ị̀ dịla njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye? E nwere ajụjụ atọ ị ga-atụle ga-enyere gị aka ịchọpụta.

Gịnị Mere I Ji Chọọ Ka Unu Na-akpa?

N’ọtụtụ ebe, a na-ewere na nwoke na nwaanyị ịkpa bụ ụzọ kwesịrị ekwesị ha ga-esi amata ibe ha nke ọma. Ma e kwesịrị inwe ezigbo ihe mere nwoke na nwaanyị ga-eji na-akpa. Ọ bụ iji nyere nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa aka ịmata ma hà ga-alụ.

N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ndị ọgbọ gị na-ewere nwoke na nwaanyị ịkpa dị ka ihe egwuregwu. Ma eleghị anya, ọ na-atọ ha ụtọ ka ha na enyi ha nwoke ma ọ bụ enyi ha nwaanyị ihe ya kasị  amasị ha na-anọ, n’agbanyeghị na ha achọghị ịlụ onye ahụ. Ụfọdụ nwere ike iwere enyi ha nwoke ma ọ bụ enyi ha nwaanyị dị ka onye ha ga-eji na-akpa nganga n’ihu ọha. Ọ bụghị ihe ijuanya na mmekọrịta dị otú ahụ anaghị adịtekarị aka. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Heather kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị ntorobịa ndị nwere enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị na-etisa n’ime otu izu ma ọ bụ abụọ. Ha na-ele mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha anya dị ka ihe na-ekwesịghị ịdịte aka. E nwekwara ike ikwu na ọ na-eme ka ha mụta ịgba alụkwaghịm kama ịmụta ịnọgide n’alụmdi na nwunye.”

O doro anya na mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ị na-eri onye ahụ obi. Ya mere, jide n’aka na i bu ezi ihe n’obi. Chegodị echiche: Ị̀ chọrọ ka onye ọzọ were obi gị na-egwuri egwu dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe ụmụaka ji egwuri egwu, nke a ga-atụtụrụ, tụfuokwa n’egbughị oge? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chelsea sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-eche na nwoke na nwaanyị ịkpa kwesịrị ịbụ ihe egwuregwu, ma ọ bụghị ihe egwuregwu ma otu onye buru n’obi na ha ga-alụ, ma onye nke ọzọ ebughị ya n’obi otú ahụ.”

Ị̀ Dị Afọ Ole?

Afọ ole ka i chere onye na-eto eto kwesịrị ịdị tupu ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya akpawa? ․․․․․

Ugbu a, jụọ papa gị ma ọ bụ mama gị ajụjụ ahụ, ma ọ bụkwanụ jụọ ha abụọ, ma dee ihe ha zara. ․․․․․

Afọ ole papa gị na mama gị gwara gị i dere nwere ike ịkarị afọ ole i chere onye na-eto eto kwesịrị ịdị. O nwere ike ọ gaghị  akarị ya! I nwere ike ịbụ otu n’ime ndị ntorobịa maara ihe, ndị kpebiri na ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha agaghị akpa ruo mgbe ha toruru ịmata onwe ha nke ọma. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Danielle kpebiri ime otú ahụ. Ọ sịrị: “Ụdị onye m gaara achọ ịlụ n’afọ abụọ gara aga dị nnọọ iche n’ụdị onye m ga-achọ ịlụ ugbu a. Ọbụna ugbu a, echeghị m na m ga-ekpebili ụdị onye m ga-alụ. Mgbe m chere na amatala m ihe m chọrọ, afọ ole na ole agafeekwa, mgbe ahụ ka m ga-echewe echiche ka mụ na nwoke kpawa.”

E nwere ihe ọzọ mere o ji dị mma ka mmadụ cheretụ. Baịbụl ji okwu bụ́ “ntoju ntorobịa” kọwaa oge agụụ mmekọahụ na-esi ike ná ndụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:36) Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị ka nọ n’oge ntoju ntorobịa, o nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụsiwe gị ike, meekwa ka i mee omume ọjọọ. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ọ bụghị ihe ọjọọ n’anya ndị ọgbọ gị. Ọ na-anụ ọtụtụ n’ime ha ọkụ n’obi inwe mmekọahụ. Ma i nwere ike izere ụdị echiche ahụ! (Ndị Rom 12:2) A sị ka e kwuwe, Baịbụl dụrụ gị ọdụ ka ‘ị gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ bụrụ na i chere ruo mgbe ị gafere oge ntoju ntorobịa, ‘ị gaghị ekwe ka ọdachi dakwasị gị.’—Ekliziastis 11:10.

Ị̀ Chọwala Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

Iji nyere gị aka ịza ajụjụ a, leruo onwe gị anya. Chee echiche banyere ihe ndị a:

Mmekọrịta gị na ndị mmadụ. Olee otú i si akpaso ndị mụrụ gị na ụmụnne gị àgwà? Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe niile ijide onwe  gị mgbe gị na ha na-emekọ ihe, ikekwe, gị ejiri olu ike ma ọ bụ njakịrị na-agwa ha okwu? Ọ bụrụ na a jụọ ha, gịnị ka ha ga-ekwu banyere gị? Otú i si akpaso ndị ezinụlọ gị àgwà na-egosi otú ị ga-esi na-akpaso di gị ma ọ bụ nwunye gị àgwà.—Gụọ Ndị Efesọs 4:31.

Otú i si ele ihe anya. Ì nwere olileanya na ihe ga-aka mma, ka ị̀ na-eche na ọ ga-aka njọ? Ì nwere ezi uche, ka ị̀ na-esi ọnwụ mgbe niile ka e mee ihe otú ị chọrọ? Ì nwere ike ijide onwe gị mgbe ihe siri ike? Ị̀ na-enwe ndidi? Ịmụta àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ugbu a ga-enyere gị aka ịbụ di ma ọ bụ nwunye n’ọdịnihu.—Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.

Otú gị na ego si aga. Olee otú gị na ego si aga? Ị̀ na-ejikarị ụgwọ? Ị̀ na-anọgideli n’ọrụ i nwetara? Ọ bụrụ na ị naghị anọgideli na ya, gịnị mere? Ọ̀ bụ n’ihi otú ọrụ ahụ dị, ka ọ̀ bụ n’ihi onye ị na-arụrụ ọrụ, ka ọ̀ bụkwanụ n’ihi àgwà na-adịghị mma ị na-akpa? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike iji ego gị eme ihe bara uru, olee otú ị ga-esi elekọta ezinụlọ gị?—Gụọ 1 Timoti 5:8.

Mmekọrịta gị na Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, gịnị ka ị na-eme ka ị ghara imebi mmekọrịta gị na Chineke? Ị̀ na-ewepụta oge iji gụọ Baịbụl, iji gaa ozi ọma, na iji gaa ọmụmụ ihe? Onye ị ga-alụ kwesịrị ịlụ onye okwukwe ya siri ike.—Gụọ Ekliziastis 4:9, 10.

 Ihe I Nwere Ike Ime

Ọ bụrụ na mmadụ enyewe gị nsogbu ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị na-achọbeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o yiri mmadụ ịmanye gị ile ule ikpeazụ n’ihe ị ka malitere ịmụ amụ. O doro anya na ọ gaghị adị mma otú ahụ! I kwesịrị ịmụ ihe ahụ ruo ogologo oge ka i nwee ike ịmata ụdị ajụjụ a ga-ajụ gị n’ule ahụ.

O yiri nwoke na nwaanyị ịkpa. Dị ka anyị hụrụ, nwoke na nwaanyị ịkpa abụghị ntakịrị ihe. Ya mere, tupu gị enwee mmasị n’otu onye, i kwesịrị iwepụta oge mụọ “ihe” dị oké mkpa, ya bụ, otú ị ga-esi bụrụ ezigbo enyi ndị mmadụ. Mgbe ị ga-emecha hụ onye ị ga-alụ, ọ ga-adịrị gị mfe ime ka mmekọrịta gị na ya sie ike. A sị ka e kwuwe, ezigbo alụmdi na nwunye bụ mmekọrịta nke ezigbo enyi abụọ.

Icheretụ tupu gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị  ibe gị amalite ịkpa agaghị eme ka ị ghara inwere onwe gị. Kama nke ahụ, ọ ga-eme ka i nwekwuo ike ‘ịṅụrị ọṅụ mgbe ị bụ onye ntorobịa.’ (Ekliziastis 11:9) Ọ ga-eme ka i nwee oge ị ga-eji kwadebe onwe gị, ya bụ, imezikwu àgwà gị, nke ka nke, imezikwu mmekọrịta gị na Chineke.—Abụ Ákwá 3:27.

Ka ọ dị ugbu a, gị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere ike ịna-akpakọrịta. Olee ụzọ kacha mma ị ga-esi na-eme otú ahụ? Unu kwesịrị ịna-akpakọrịta n’ìgwè ebe ụmụ okoro, ụmụ agbọghọ na ndị mere okenye nọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tammy sịrị: “Echere m na ọ ka ụtọ otú ahụ. Ọ ka mma inwe ọtụtụ ndị enyi.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Monica kwetara ihe Tammy kwuru ma sị: “Ọ bara nnọọ uru ka ndị na-eto eto na-akpakọrịta n’ìgwè, n’ihi na ị ga-ahụ ndị nwere àgwà dị iche iche.”

Ma, ọ bụrụ na i nwee mmasị n’ebe otu onye nọ, n’oge na-adịghị anya, i nwere ike iji aka gị kpatara onwe gị obi mgbawa. Ya mere, ya adịla gị oké ngwa ngwa. Jiri oge a i nwere ugbu a mụta otú e si emeta enyi, nakwa otú enyi na enyi si adị ná mma. Ọ bụrụ na i mechaa kpebie ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa, ị ga-amatakwu onwe gị, matakwa ụdị àgwà ị chọrọ ka onye ị ga-alụ nwee.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 29 NA NKE 30

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ̀ na-adị gị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa n’emeghị ka ndị mụrụ gị mara? E nwere ọtụtụ nsogbu dị n’ime otú ahụ karịa otú i chere.

AMAOKWU BAỊBỤL

Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.Ilu 14:15.

NDỤMỌDỤ

Gụọ 2 Pita 1:5-7 ma họrọ otu àgwà i kwesịrị ịmụtakwu nke ga-enyere gị aka mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ga-akpawa maka ọlụlụ. Mgbe otu ọnwa gachara, chọpụta otú ị mụtaruru àgwà ahụ—na otú i si na-akpa ya ugbu a n’ụzọ ka mma.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọtụtụ nchọpụta e mere gosiri na ndị lụrụ di na nwunye mgbe ha na-erubeghị iri afọ abụọ na-agbakarị alụkwaghịm n’ime afọ ise ha lụchara.

IHE M GA-EME!

Iji kwadebe maka alụmdi na nwunye, m kwesịrị ịmụtakwu àgwà ndị a: ․․․․․

Otú m ga-esi amụtakwu àgwà ndị a bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee ebe ụfọdụ gị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kwesịrị ịna-akpakọrịta?

Gịnị ka ị ga-agwa nwanne gị nke chọrọ ka ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa mgbe ọ na-etorubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye?

Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ma i bughị n’obi ịlụ ya, olee otú obi nwere ike ịdị onye ahụ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 18]

“Echere m na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya kwesịrị ịna-akpa bụ onye ị hụrụ n’anya n’ezie, onye gị na ya nwere ike ibi. Ihe i kwo na-abịa onye ahụ nso bụ na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị naanị ka gị na ya na-akpa.”—Amber

[Foto dị na peeji nke 16 na 17]

Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ma i bughị n’obi ịlụ ya, ị na-eme ka nwatakịrị nke ji ihe o ji egwuri egwu a zụtaara ya ọhụrụ gwutụ egwu ma tụfuo ya