Ọrụ Ndịozi 3:1-26

  • Pita gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ (1-10)

  • Okwu Pita nọ na Varanda Solomọn kwuo (11-26)

    • ‘Chineke ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’ (21)

    • Onye amụma dị ka Mosis (22)

3  Otu ụbọchị, ka Pita na Jọn nọ na-agbago n’ụlọ nsọ n’oge e ji ekpe ekpere, ya bụ, n’awa nke itoolu,*  e nwere otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya, onye e bu na-abịa ka e busa ya n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Mara Mma. A na-ebusa ya ebe ahụ kwa ụbọchị ka o wee na-arịọ ndị na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ arịrịọ.  Mgbe ọ hụrụ ka Pita na Jọn na-achọ ịbanye n’ụlọ nsọ, ọ malitere ịrịọ ha arịrịọ.  Ma Pita na Jọn legidere ya anya wee sị ya: “Lee anyị anya.”  O wee legide ha anya, na-atụ anya ka ha nye ya ihe.  Ma, Pita sịrị: “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo. Ihe m nwere ka m ga-enye gị. N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, jewe ije!”+  O wee jide ya n’aka nri selite ya.+ Ozugbo ahụ, ụkwụ ya na nkwonkwo ụkwụ ya agbasie ike,+  ya amalie elu,+ malite ije ije, sorokwa ha banye n’ụlọ nsọ, na-eje ije, na-amali elu, na-etokwa Chineke.  Mmadụ niile hụkwara ya ka ọ nọ na-aga na-eto Chineke. 10  Ha matakwara onye ọ bụ, na ọ bụ ya bụ nwoke ahụ na-anọbu n’Ọnụ Ụzọ Mara Mma n’ụlọ nsọ na-arịọ arịrịọ.+ O juru ha nnọọ anya na ọ na-ejezi ije. 11  Ka nwoke ahụ ka ji Pita na Jọn aka, mmadụ niile kwooro gaa n’ebe ha nọ, n’ebe a na-akpọ Varanda Solomọn.+ Ọ tụkwara ha nnọọ n’anya. 12  Mgbe Pita hụrụ ihe a, ọ gwara ndị ahụ, sị: “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a merenụ ji na-eju unu anya? Gịnịkwa mere unu ji na-ele anyị ka à ga-asị na ọ bụ ike anyị ma ọ bụ maka na anyị na-efesi Chineke ike mere anyị ji mee ka nwoke a jewe ije? 13  Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emeela ka Jizọs,+ bụ́ Ohu ya, dị ebube,+ onye unu nyefere+ Paịlet, gọnahụkwa ya n’ihu ya, mgbe ọ chọrọ ịhapụ ya. 14  Unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume. Unu kwukwara ka a hapụrụ unu otu nwoke, bụ́ ogbu mmadụ.+ 15  Ma, unu gburu Nnukwu Onye Ndú a họpụtara ka o nye ndị mmadụ ndụ.+ Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, anyị jikwa anya anyị hụ ya.+ 16  Ọ bụ aha Jizọs ka anyị ji mee ka ụkwụ nwoke a unu na-ahụ, onye unu makwaara, gbasie ike. Ọ bụkwa maka na anyị kweere na aha ya na-akpa ike. Ihe mere ahụ́ ji dị nwoke a mma n’ihu unu niile bụ n’ihi na anyị kweere na Jizọs. 17  Ugbu a, ụmụnna m, ama m na unu mere ihe unu mere n’amaghị ụma,+ otú ndị na-achị unu mere.+ 18  Ma, Chineke hapụrụ ka ihe ndị a mee iji mezuo ihe ndị o si n’ọnụ ndị amụma niile kwuo na ha ga-eme, ya bụ, na Kraịst ga-ata ahụhụ.+ 19  “N’ihi ya, chegharịanụ,+ lọghachikwutekwanụ Jehova*+ ka o wee hichapụ mmehie unu,+ meekwa ka obi ruo unu ala. 20  Ọ ga-ezitekwa Kraịst ọ họpụtaara unu, ya bụ, Jizọs. 21  N’oge ochie, Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ kwe nkwa na ya ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ. Ma tupu oge ahụ eruo, Jizọs ga-anọgide n’eluigwe. 22  N’eziokwu, Mosis sịrị: ‘Jehova* bụ́ Chineke unu ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m.+ Geenụ ntị n’ihe ọ bụla ọ ga-agwa unu.+ 23  A ga-ebibi onye ọ bụla* na-egeghị Onye Amụma ahụ ntị.’+ 24  Ndị amụma niile, ma Samuel ma ndị sochiri ya, kwuchara gbasara oge a.+ 25  Ndị amụma ahụ kwuru gbasara ọgbụgba ndụ Chineke na nna nna unu hà gbara. Unu sokwa n’ọgbụgba ndụ a,+ n’ihi na Chineke kwere Ebreham nkwa, sị: ‘M ga-esi n’aka nwa* gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.’+ 26  Mgbe Chineke họpụtachara Ohu ya, o bu ụzọ zitere unu ya+ ka o mee ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ àgwà ọjọọ ya, si otú a gọzie unu.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ọ bụla.”
Na Grik, “mkpụrụ.”