Ọrụ Ndịozi 1:1-26

  • Akwụkwọ ozi e degaara Tiofilọs (1-5)

  • Ndị ga-agba àmà banyere Jizọs ruo ebe kacha anya n’ụwa (6-8)

  • Mgbe Jizọs rịgooro eluigwe (9-11)

  • Ndị na-eso ụzọ Jizọs ji otu obi zukọọ (12-14)

  • A họpụtara Matayas ka ọ nọchie Judas (15-26)

1  Tiofilọs, n’akwụkwọ mbụ m detaara gị, m dere banyere ihe niile Jizọs mere na ihe ọ kụziiri ndị mmadụ,+ si ná mbido  ruo mgbe a kpọgoro ya eluigwe.+ A kpọgoro ya mgbe mmụọ nsọ nyere ya ike, ya agwa ndịozi ọ họọrọ ihe ha ga-eme.+  Mgbe ọ tachara ahụhụ, ọ pụtara n’ihu ha ọtụtụ ugboro ka o doo ha anya na ya dị ndụ.+ Ha hụkwara ya ruo ụbọchị iri anọ, ọ nọkwa na-ekwu gbasara Alaeze Chineke.+  Mgbe ya na ha hụrụ, ọ gwara ha, sị: “Unu apụla na Jeruselem,+ kama cherenụ ka Nna m mezuo ihe o kwere ná nkwa,+ nke m gwara unu gbasara ya.  Jọn ji mmiri mee ndị mmadụ baptizim, ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim+ n’oge na-adịghị anya.”  Mgbe ha zukọrọ, ha jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ ga-eme ka Izrel nwetaghachi alaeze ha n’oge a?”+  Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ naanị Nna m nwere ikike ikpebi oge na mgbe ihe ga-emenụ ga-eme. Unu ekwesịghị ịma oge ọ ga-abụ.+  Ma unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.+ Unu ga-abụkwa ndị àmà m+ ma na Jeruselem+ ma na Judia na Sameria,+ ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.”*+  Mgbe o kwuchara ihe ndị a, e buliri ya elu ka ha nọ na-ele anya, ígwé ojii kpuchikwara ya, nke mere na ha enweghịzi ike ịhụ ya anya.+ 10  Mgbe ha nọkwa na-ele anya na mbara igwe ka ọ na-agbago, n’otu ntabi anya, ụmụ nwoke abụọ ndị yi uwe ọcha+ bịara guzoro ha n’akụkụ 11  wee sị ha: “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya na mbara igwe? Jizọs a, onye si ebe unu nọ gbagoo na mbara igwe, ga-esi otú a bịa, ya bụ, otú a unu hụrụ ya ka ọ na-abanye na mbara igwe.” 12  Ha wee si n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv, nke dị nso na Jeruselem,+ laghachi Jeruselem. Isi n’ugwu ahụ ruo Jeruselem dị ihe dị ka otu kilomita.* 13  Mgbe ha rutere, ha gbagoro n’ọnụ ụlọ dị n’elu, ebe ha na-anọ. Ha bụ Pita na Jọn na Jems na Andru, Filip na Tọmọs, Batolomiu na Matiu, Jems nwa Alfiọs na Saịmọn onye na-anụ ọkụ n’obi, na Judas nwa Jems.+ 14  Ha niile ji otu obi na-ekpe ekpere mgbe niile, ha na ụmụ nwaanyị+ ụfọdụ na ụmụnne Jizọs ndị nwoke+ na Meri nne ya. 15  Otu ụbọchị ha gbakọrọ ka ha kpee ekpere, ụmụnna gbakọrọ ebe ahụ dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ (120). Pita biliri, sị: 16  “Ụmụnna m, Devid si n’ike mmụọ nsọ buo amụma gbasara Judas,+ onye dutere ndị jidere Jizọs.+ Amụma a nke dị n’Akwụkwọ Nsọ kwesịkwara imezu. 17  Ọ bụbu onye òtù anyị,+ anyị na ya jekọkwara ozi. 18  (Nwoke a natakwara ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ o mere,+ jiri ya zụta otu ala. O bukwa ụzọ sụọ isi n’ala, afọ ya wee gbawaa, eriri afọ ya niile awụpụtakwa.+ 19  Ndị niile bi na Jeruselem mechara mara ihe a, nke mere na a kpọrọ ala ahụ Akeldama n’asụsụ ha, ya bụ, “Ala Ọbara.”) 20  N’ihi na e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, ‘Ka ebe o bi tọgbọrọ chakoo, ka a gharakwa inwe onye ga-ebi na ya.’+ E dekwara, sị, ‘Ka onye ọzọ rụwa ọrụ* ọ na-arụbu.’+ 21  N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhọpụta otu nwoke. Ma, ọ ga-abụrịrị onye na-eso anyị n’oge niile anyị na Onyenwe anyị Jizọs nọ, ya ana-eje ozi ya, 22  malite n’oge Jọn mere Jizọs baptizim+ ruo n’ụbọchị Jizọs gbagoro eluigwe.+ Nwoke ahụ ga-abụkwa onye ji anya ya soro anyị hụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ.”+ 23  N’ihi ya, ha kpọpụtara mmadụ abụọ, Matayas na Josef onye a na-akpọ Basabas, onye a na-akpọkwa Jọstọs. 24  Ha kpekwara ekpere, sị: “Jehova,* onye ma obi mmadụ niile,+ biko, gosi anyị onye ị họọrọ n’ime ụmụ nwoke abụọ a 25  ka ọ nọchie Judas bụrụ onyeozi ma na-ejere gị ozi Judas hapụrụ gawara onwe ya.”+ 26  Ha feere ha nza,+ nza ama Matayas, ya esoro ná ndịozi iri na abụọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ruokwa n’ebe ụwa sọtụrụ.”
Ma ọ bụ “Isi n’ugwu ahụ ruo Jeruselem na-ewe otu ụbọchị izu ike.” Naanị ihe dị ka otu kilomita ka onye Juu nwere ike ịga n’ụbọchị izu ike.
Ya bụ, ọrụ ilekọta ọgbakọ.
Gụọ A5.