Ọrụ Ndịozi 8:1-40

  • Sọl na-emesi ndị na-eso ụzọ Jizọs ike (1-3)

  • Ndị Sameria gere ntị n’ozi ọma Filip ziri ha (4-13)

  • E zigara Pita na Jọn Sameria (14-17)

  • Saịmọn nwara iji ego nweta mmụọ nsọ (18-25)

  • Otu nwoke Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ (26-40)

8  Sọl kwadoro ogbugbu e gburu Stivin.+ Si n’ụbọchị ahụ gawa, a malitere ịkpagbu ọgbakọ dị na Jeruselem. E wezụga ndịozi, a chụsasịrị ndị niile na-eso ụzọ Jizọs, ha agbaga n’ógbè ndị dị na Judia na Sameria.+  Ma ụmụ nwoke ndị na-atụ egwu Chineke buuru Stivin gaa lie. Ha bekwaara ya ezigbo ákwá.  Ma, Sọl malitere imesi ọgbakọ Chineke ike. Ọ na-aga n’ụlọ n’ụlọ, na-akpụrụ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, na-atụkwa ha mkpọrọ.+  Ma, ndị ahụ a chụsasịrị gara obodo dị iche iche na-ekwusa okwu Chineke.+  Otu n’ime ha bụ Filip. Ọ gara Sameria+ malite ikwusara ha gbasara Kraịst.  Ndị mmadụ ji otu obi na-aṅa ntị n’ihe Filip na-ekwu. Ha nọ na-ege ntị, na-elekwa anya ka ọ na-arụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ.  N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ* ji, mmụọ ọjọọ ndị ahụ na-etisikwa mkpu ike wee si n’ime ha pụta.+ A gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwọrọ.  Obi wee bụrụ ndị obodo ahụ sọ aṅụrị.  Ma, e nwere otu nwoke n’obodo ahụ aha ya bụ Saịmọn. Tupu oge a, ọ na-eme anwansi,* na-emekwa ihe tụrụ ndị Sameria n’anya. Ọ na-ekwukwa na ya bụ nnukwu mmadụ. 10  Ha niile, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, na-aṅa ya ntị ma na-ekwu, sị: “Chineke nyere nwoke a ike dị egwu.” 11  Otú anwansi* ọ na-eme kemgbe si atụ ha n’anya mere ka ha na-eso ya. 12  Ma mgbe Filip nọ na-ezisa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke+ nakwa gbasara aha Jizọs Kraịst, ha nabatara ihe ọ nọ na-ekwu, e mee ha baptizim, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+ 13  Saịmọn ghọkwara onye na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe o mechara baptizim, ya na Filip na-anọkarị.+ Mgbe ọ hụrụ ọrụ ebube Filip nọ na-arụ, ọ tụrụ ya n’anya. 14  Mgbe ndịozi nọ na Jeruselem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu Chineke,+ ha zigaara ha Pita na Jọn. 15  Mgbe ha ruru Sameria, ha kpeere ha ekpere ka mmụọ nsọ dakwasị ha.+ 16  N’ihi na ọ dakwasịbeghị onye ọ bụla n’ime ha, naanị na ha emeela baptizim n’aha Onyenwe anyị Jizọs.+ 17  Pita na Jọn wee bikwasị ha aka n’isi,+ mmụọ nsọ amalite ịdakwasị ha. 18  Ma mgbe Saịmọn hụrụ na mmụọ nsọ na-adakwasị onye ọ bụla ndịozi ahụ bikwasịrị aka n’isi, ya ewepụta ego nyewe ha, 19  sị: “Nyenụ m ikike a, ka ọ ga-abụ, onye ọ bụla m bikwasịrị aka n’isi, mmụọ nsọ adakwasị ya.” 20  Ma Pita sịrị ya: “Ka gị na ọlaọcha gị laa n’iyi, n’ihi na i chere na ị ga-ejili ego nweta onyinye Chineke na-enye n’efu.+ 21  O nweghị ihe ọ bụla gbasara gị n’ihe a, n’ihi na obi gị adịghị ọcha n’anya Chineke. 22  N’ihi ya, chegharịa, hapụ ihe ọjọọ a ị na-eche. Rịọsiekwa Jehova* arịrịọ ike ma gbanwee echiche ọjọọ gị, ka ọ gbaghara gị. 23  N’ihi na ahụrụ m na ị bụ onye anyaụfụ, ihe na-agụkwa gị mgbe niile bụ ime ihe ọjọọ.” 24  Saịmọn wee sị ha: “Rịọsierenụ m Jehova* arịrịọ ike ka nke ọ bụla n’ime ihe unu kwuru ghara ime m.” 25  Mgbe ha gwachara ndị mmadụ okwu Jehova* nke ọma, ha malitere ịlaghachi Jeruselem. Ka ha na-ala, ha nọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ọtụtụ obodo nta ndị dị na Sameria.+ 26  Ma, mmụọ ozi Jehova*+ sịrị Filip: “Gaa n’ebe ndịda, n’ụzọ si Jeruselem gaa Gaza.” (Ụzọ a dị n’ọzara.) 27  Filip wee gawa ma hụ otu nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ* n’obí eze nwaanyị ndị Etiopia. Aha eze nwaanyị a bụ Kandesi. Ọ bụ nwoke ahụ na-elekọta akụ̀ niile eze nwaanyị a nwere. Nwoke a gara Jeruselem ife Chineke.+ 28  Ka ọ na-alọta, ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ya na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma. 29  Chineke wee jiri mmụọ nsọ ya gwa Filip, sị: “Garuo ụgbọ ịnyịnya a nso.” 30  Filip wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụgbọ ahụ ma nụ ka nwoke ahụ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Filip asị ya: “Ị̀ na-aghọta ihe ị na-agụ?” 31  Ya asị: “Olee otú m ga-esi ghọta ihe m na-agụ ma ọ bụrụ na o nweghị onye kọwaara m ya?” O wee gwa Filip ka ọ rịgota soro ya nọdụ ala. 32  Ma, ebe ọ nọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ bụ ebe sịrị: “A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu. Ọ dị ka nwa atụrụ gbara nkịtị ka a na-akpacha ya ajị. O kwughịkwa ihe ọ bụla.+ 33  N’oge ha mere ya ihe ihere, e kpere ya ikpe mkpegbu.+ Ebe ọ bụ na e gbuola ya, ònye ga-akọ ihe niile gbasara ezinụlọ o si?”+ 34  Nwoke ahụ wee sị Filip: “Biko, ònye ka onye amụma a na-ekwu banyere ya? Ọ̀ bụ banyere onwe ya, ka ọ̀ bụ banyere onye ọzọ?” 35  Filip malitere ịkọwara ya ebe ahụ ọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ, ziekwa ya ozi ọma banyere Jizọs. 36  Ma ka ha nọ na-aga n’okporo ụzọ ahụ, ha bịarutere n’otu mmiri, nwoke ahụ wee sị: “Lee mmiri, gịnị ga-egbochi ime m baptizim?” 37 * —— 38  N’ihi ya, nwoke ahụ kwuru ka a kwụsị ụgbọ ịnyịnya ahụ. Mgbe ọ kwụsịrị, ya na Filip arịtuo banye na mmiri ahụ, Filip emee ya baptizim. 39  Mgbe ha si na mmiri ahụ pụta, mmụọ Jehova* duuru Filip pụọ ngwa ngwa, nwoke ahụ ahụghịkwa ya ọzọ, kama ọ nọ na-aga ebe ọ na-aga na-aṅụrị ọṅụ. 40  Ma Filip gara Ashdọd. Ọ nọkwa na-ezisa ozi ọma n’obodo dị iche iche ruo mgbe ọ garuru Sizaria.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “majik.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “ọnaozi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
Gụọ A5.