Ọrụ Ndịozi 7:1-60

  • Ihe Stivin kwuru n’ihu ndị Sanhedrin (1-53)

    • Ihe mere n’oge ndị nna nna ndị Juu (2-16)

    • Otú Mosis si duo ndị Izrel na otú ha si kpeere arụsị (17-43)

    • Chineke anaghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka rụọ (44-50)

  • E ji nkume tụgbuo Stivin (54-60)

7  Ma nnukwu onye nchụàjà sịrị: “Ihe a ndị a kwuru ọ̀ bụ eziokwu?”  Stivin wee sị: “Ụmụnna m na ndị nna m, geenụ ntị. Chineke onye dị ebube pụtara n’ihu nna nna anyị Ebreham mgbe ọ nọ na Mesopotemia, tupu ya agaa biri na Heran.+  O wee sị ya: ‘Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.’+  O wee si n’ala ndị Kaldia kwapụ, gaa biri na Heran. Mgbe nna ya nwụrụ,+ Chineke gwara ya ka o si ebe ahụ kwata n’ala a unu bi ugbu a.+  Ma, o nyeghị ya ala ọ bụla n’ala a, ọbụnadị otu amaụkwụ. Kama o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya ala a nakwa na ọ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke nwa* ya ga-anọchi ya.+ O kwere ya nkwa a n’agbanyeghị na ọ mụtabeghị nwa.  Chineke kwukwara na ụmụ* ya ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha. Ndị ala ahụ ga-eji ha mere ndị ohu ma mesie ha ike ruo narị afọ anọ (400).+  Chineke kwukwara, sị: ‘M ga-ekpe mba ahụ ha ga-agbara ohu ikpe,+ ha ga-apụtakwa mgbe ihe ndị a mechara, nọrọkwa ebe a na-efe m.’+  “Chineke na Ebreham gbara ndụ na a ga-ebi Ebreham na ụmụ ya ndị nwoke niile úgwù.+ N’ihi ya, mgbe Ebreham mụrụ Aịzik,+ o biri ya úgwù n’ụbọchị nke asatọ.+ Aịzik mụkwara Jekọb, Jekọb amụọ ụmụ nwoke iri na abụọ bụ́ ndị nna nna anyị.  Ndị nna nna anyị a nweere Josef nwanne ha anyaụfụ+ ma resị ya ndị Ijipt.+ Ma Chineke nọnyeere ya.+ 10  Ọ napụtara ya n’oge niile a na-akpagbu ya, nye ya amamihe ma mee ka ihe ya masị Fero bụ́ eze Ijipt. Fero mere ya onye na-achị Ijipt nakwa ezinụlọ ya niile.+ 11  Ma ụnwụ dara ebe niile n’Ijipt nakwa na Kenan, nke mere ndị mmadụ ji taa ezigbo ahụhụ, ndị nna nna anyị ahụghịkwa nri ọ bụla.+ 12  Ma Jekọb nụrụ na nri* dị n’Ijipt. O wee zipụ nna nna anyị hà ka ha gaa ebe ahụ.+ 13  Mgbe ha gara nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata onye ọ bụ. Fero matakwara ezinụlọ Josef si.+ 14  Josef wee zie ozi ka Jekọb nna ya na ndị ikwu ya niile si Kenan kwata Ijipt.+ Ha niile dị mmadụ* iri asaa na ise.+ 15  Jekọb wee gaa Ijipt,+ nwụọkwa ebe ahụ.+ Ndị nna nna anyị nwụkwara ebe ahụ.+ 16  E bugara ha Shikem ma lie ha n’ili Ebreham ji ego ọlaọcha zụọ na Shikem n’aka ụmụ Hemọ.+ 17  “Mgbe oge nọ na-eru ka nkwa ahụ Chineke kwere Ebreham mezuo, ndị Izrel bịara dị ọtụtụ, na-amụbakwa n’Ijipt, 18  ruo mgbe eze dị iche na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt.+ 19  Onye a ghọrọ agbụrụ anyị aghụghọ ma mesie ndị nna nna anyị ike, manyekwa ha ịhapụ ụmụ ọhụrụ ha ka ha nwụọ.+ 20  Ọ bụ n’oge ahụ ka a mụrụ Mosis. Ọ makwara mma na-enweghị atụ.* E lekọtakwara ya ruo ọnwa atọ n’ụlọ nna ya.+ 21  Ma mgbe a hapụrụ ya,+ ada Fero kutere ya ma zụọ ya, ya abụrụ nwa ya nwoke.+ 22  N’ihi ya, a kụziiri Mosis ihe otú kacha mma e si akụzi ihe n’Ijipt. N’eziokwu, ọ na-ekwu okwu ka dike, na-emekwa ọtụtụ nnukwu ihe.+ 23  “Ma mgbe ọ gbara afọ iri anọ, ọ batara ya n’obi* ịga hụ ụmụnne ya* bụ́ ndị Izrel.+ 24  Mgbe ọ hụrụ ka onye Ijipt na-emesi otu n’ime ụmụnne ya ike, ọ bịara gbachitere nwanne ya ahụ, napụta ya n’aka onye Ijipt ahụ ma gbuo onye Ijipt ahụ. 25  O chere na ụmụnne ya ga-aghọta na Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta ha, ma ha aghọtaghị. 26  N’echi ya, ọ bịara hụ ụmụnne ya abụọ ka ha na-ese okwu. O wee gbalịa ikpeziri ha, sị ha: ‘Unu bụ ụmụnne. Gịnị mere unu ji na-ese okwu?’ 27  Ma, onye nke chọrọ ibe ya okwu kwapụrụ ya, wee sị ya: ‘Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị? 28  Ị̀ chọrọ igbu m otú i gburu onye Ijipt ụnyaahụ?’ 29  Mgbe o kwuru ihe a, Mosis gbara ọsọ gbaga Midian, birizie ebe ahụ, lụọ nwaanyị, mụta ụmụ nwoke abụọ.+ 30  “Mgbe afọ iri anọ gachara, otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ya n’ọkụ na-enwu n’otu osisi ogwu, n’ala ịkpa dị n’Ugwu Saịnaị.+ 31  Mgbe Mosis hụrụ ihe a, ọ tụrụ ya n’anya. Ma ka ọ na-eru nso ka ọ chọpụta ihe na-eme, ọ nụrụ olu Jehova* ka ọ sịrị: 32  ‘Abụ m Chineke nna nna gị hà, Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb.’+ Mosis wee bido ịma jijiji. Ụjọ ekweghịzi ya ile osisi ahụ anya. 33  Jehova* wee sị ya: ‘Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ. 34  Ahụla m ahụhụ a na-ata ndị m nọ n’Ijipt, anụkwala m ude ha na-asụ.+ Agbadatala m ka m napụta ha. Ugbu a, bịa ka m ziga gị Ijipt.’ 35  Mosis ahụ, onye ha jụrụ ajụ na onye ha gwara, sị: ‘Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị?’+ ọ bụ ya ka Chineke si n’aka mmụọ ozi ahụ pụtara n’ihu Mosis n’osisi ogwu ahụ ziga+ ka ọ bụrụ onye na-achị ha na onye ga-anapụta ha. 36  Ọ bụ nwoke a si n’Ijipt dupụta+ ndị nna nna anyị. Ka ọ na-edupụta ha, ọ rụrụ ọrụ ebube n’Ijipt+ na n’Oké Osimiri Uhie+ nakwa n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ.+ 37  “Ọ bụ Mosis a gwara ndị Izrel, sị: ‘Chineke ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m.’+ 38  Mosis a na ndị Izrel ibe ya nọrọ n’ala ịkpa. Ọ na-abụ mmụọ ozi+ gwa ya okwu+ n’Ugwu Saịnaị, yanwa agwa ndị nna nna anyị. Ọ nụkwara okwu Chineke, nke na-enye ndụ, ma gwa anyị ya.+ 39  Nna nna anyị hà jụrụ irubere ya isi, jụkwa iso ya.+ Obi ha niile dị n’ịlaghachi Ijipt.+ 40  Ha sịrị Erọn: ‘Meere anyị chi ga na-edu anyị, n’ihi na anyị amaghị ihe mere Mosis a, onye si n’Ijipt dupụta anyị.’+ 41  N’oge ahụ, ha kpụrụ arụsị yiri nwa ehi ma chụọrọ ya àjà, na-eri, na-aṅụ ma na-enwe obi ụtọ maka ihe ha ji aka ha kpụọ.+ 42  N’ihi ya, Chineke gbakụtara ha azụ ma hapụ ha ka ha na-efe ihe ndị dị n’eluigwe,+ otú ahụ e dere n’Akwụkwọ Ndị Amụma, sị: ‘Unu ndị Izrel, ọ bụghị m ka unu nyere onyinye, ọ bụghịkwa m ka unu chụụrụ àjà dị iche iche n’afọ iri anọ unu nọrọ n’ala ịkpa. 43  Kama ọ bụ ụlọikwuu Molọk+ na kpakpando chi Rifan ka unu na-ebu aga ebe dị iche iche, ya bụ, arụsị ndị unu mere ka unu na-efe ha. N’ihi ya, m ga-eme ka a dọrọ unu n’agha gaa n’ebe dị anya karịa Babịlọn.’+ 44  “Nna nna anyị hà nwere ụlọikwuu* n’ala ịkpa. Ọ bụ Chineke gwara Mosis ka a rụọ ụlọikwuu ahụ. Ha rụkwara ya otú Chineke kwuru ka e si rụọ ya.+ 45  E mechaa, ụmụ ndị nna nna anyị hà butere ụlọikwuu a mgbe Joshụa du ha bata n’ala a bụ́ nke ndị mba ọzọ,+ ndị Chineke chụpụrụ n’ihu nna nna anyị hà.+ Ụlọikwuu ahụ dịgidere ebe a ruo n’oge Devid. 46  Ihe Devid masịrị Chineke. O kwukwara na ya ga-achọ ịrụrụ Chineke nke Jekọb ụlọ.+ 47  Ma, ọ bụ Solomọn rụụrụ ya ụlọ.+ 48  Ma, Onye Kacha Elu anaghị ebi n’ụlọ e ji aka rụọ,+ dị ka otu onye amụma sịrị: 49  ‘Jehova* kwuru, sị, “Eluigwe bụ ocheeze m,+ ụwa bụkwa ihe m ji gbakwasị ụkwụ m.+ Olee ụdị ụlọ unu ga-arụrụ m? Ma ọ bụ, olee ebe unu ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi? 50  Ọ̀ bụ na ọ bụghị m ji aka m mee ihe a niile?”’+ 51  “Unu ndị isi ike, ndị kpọchiri obi ha na ntị ha, unu na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ mgbe niile. Otú nna nna unu hà mere ka unu na-eme.+ 52  Ò nwere onye amụma nna nna unu hà na-akpagbughị?+ Ha gburu ndị mara ọkwa na e nwere onye ezi omume na-abịa.+ Ọ bụ onye ahụ ka unu raara nye ma gbuo n’oge na-adịbeghị anya.+ 53  Chineke si n’aka ndị mmụọ ozi nye unu Iwu,+ ma unu edebeghị ya.” 54  Ma, ihe a o kwuru were ha ezigbo iwe,* ha ana-ele ya na-ata ikikere ezé. 55  Ma ebe o jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere anya n’eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa ka Jizọs guzo n’aka nri Chineke.+ 56  O wee, sị: “Ana m ahụ ka eluigwe meghere, na-ahụkwa ka Nwa nke mmadụ+ guzo n’aka nri Chineke.”+ 57  Mgbe o kwuru ihe a, ha tiri ezigbo mkpu, kpuchie aka ná ntị, nukọrọkwa n’ike bịa ebe ọ nọ. 58  Mgbe ha kpụụrụ ya gaa n’azụ obodo, ha malitere ịtụ ya nkume.+ Ndị akaebe ahụ+ wụsakwaara otu nwa okorobịa a na-akpọ Sọl uwe elu ha.+ 59  Ka ha na-atụ Stivin nkume, ọ sịrị: “Onyenwe m Jizọs, ndụ* m dị gị n’aka.”* 60  O wee gbuo ikpere n’ala, tie ezigbo mkpu, sị: “Jehova,* ka mmehie a ghara ịdị ha n’isi.”+ Mgbe o kwuchara ihe a, ọ nwụrụ.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “mkpụrụ.”
Na Grik, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ọka.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Ọ makwara mma n’anya Chineke.”
Ma ọ bụ “o kpebiri.”
Ma ọ bụ “ịga lee otú ụmụnne ya mere.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ụlọikwuu nke na-egosi na Chineke nọnyeere ha.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “dụrụ ha adụ n’obi.”
Ma ọ bụ “ume.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mmụọ.”
Na Grik, “nabata mmụọ m.”
Gụọ A5.
Na Grik, “o hiri ụra.”