Ọrụ Ndịozi 20:1-38

  • Pọl gara Masedonia na Gris (1-6)

  • A kpọlitere Yutikọs n’ọnwụ na Troas (7-12)

  • Pọl si Troas gaa Maịlitọs (13-16)

  • Pọl na ndị okenye Efesọs zukọrọ (17-38)

    • Pọl ziri ndị mmadụ ihe n’ụlọ n’ụlọ (20)

    • “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe” (35)

20  Mgbe ndị mmadụ kwụsịrị ịkpa aghara, Pọl ziri ozi ka a kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ọ gbachara ha ume ma sị ha ka e mesịa, ọ gawara Masedonia.  Mgbe ọ gachara obodo ndị dị ebe ahụ ma gbaa ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ume, ọ gawara Gris.  Ọ nọrọ ọnwa atọ ebe ahụ. Ma, mgbe ọ na-achọ ịba ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Siria, ọ chọpụtara na ndị Juu akpaala nkata igbu ya.+ N’ihi ya, o kpebiziri isi Masedonia laghachi.  Ndị so ya bụ Sọpata nwa Pirọs onye Beria, Arịstakọs+ na Sekọndọs, bụ́ ndị Tesalonaịka, Gayọs onye Dabe, Timoti,+ nakwa Tikikọs+ na Trọfimọs,+ bụ́ ndị si ná mpaghara Eshia.  Ndị a bu anyị ụzọ gawa ma chere anyị na Troas.  Ma mgbe ụbọchị Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko gachara, anyị banyere ụgbọ mmiri na Filipaị wee gawa.+ Mgbe ụbọchị ise gachara, anyị ruru Troas ebe ha nọ. Anyị nọkwara ụbọchị asaa ebe ahụ.  N’ụbọchị mbụ n’izu,* mgbe anyị zukọtara iri nri, Pọl malitere ịgwa ndị gbakọtara ebe ahụ okwu, ebe ọ bụ na ọ ga-aga ebe ọzọ echi ya. O kwugidekwara okwu ruo etiti abalị.  E nwekwara ọtụtụ mpanaka* n’ọnụ ụlọ dị n’elu ebe anyị zukọrọ.  Ma mgbe Pọl nọ na-ekwu okwu, ezigbo ụra buuru otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs, onye nọ ọdụ na windo. Ọ nọ na-ehi ụra a si n’ụlọ elu ha nọ daa. O si n’okpukpu nke atọ* daa. Mgbe ndị mmadụ na-erula ebe ọ dara, ya abụrụ na ọ nwụọla. 10  Ma Pọl gbadara n’ala, hulata, makụọ ya+ wee sị: “Unu esogbuzila onwe unu, n’ihi na ọ dị ndụ.”*+ 11  Pọl gbagoziri n’elu were nri rie. Ya na ha nọkwa na-akparịta ụka chi abọọ, ya agawazie ebe ọzọ. 12  Ha wee kpọrọ nwatakịrị nwoke ahụ pụọ, na-enwe sọ aṅụrị na ọ dịzi ndụ. 13  Ma anyị banyere ụgbọ mmiri bugara anyị Asọs, Pọl ejiri ụkwụ na-abịa otú o kwuru na ọ ga-eme. Ọ gwakwara anyị na anyị ga-eburu ya n’obodo a. 14  N’ihi ya, mgbe o rutere Asọs ebe anyị nọ, anyị buuru ya gawa Mitilini. 15  N’ụbọchị sochiri ya, anyị si ebe ahụ banye ụgbọ mmiri ma kwụsị ebe dị nso na Kiọs. Ma n’echi ya, anyị kwụsịtụrụ na Semọs. Nwanne echi ya, anyị eruo Maịlitọs. 16  Pọl kpebiri ịbanye ụgbọ mmiri gafere Efesọs+ ka ọ ghara igbu oge ná mpaghara Eshia, n’ihi na ọ na-eme ngwa ngwa ka o nwee ike ịgaru Jeruselem+ n’ụbọchị Ememme Pentikọst. 17  Ma, ọ nọ na Maịlitọs zie ozi ka ndị okenye ọgbakọ Efesọs bịa hụ ya. 18  Mgbe ha bịara, ọ sịrị ha: “Unu ma nnọọ otú m si na-akpa àgwà mgbe mụ na unu nọ, malite n’ụbọchị mbụ ụkwụ m kpara ná mpaghara Eshia.+ 19  Eweturu m onwe m ala na-agbara Onyenwe anyị ohu.+ Ebere m ákwá, taakwa ahụhụ mgbe ndị Juu kpara nkata igbu m. 20  Unu makwa na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile ga-abara unu uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha+ nakwa n’ụlọ n’ụlọ.+ 21  Kama, eziri m ma ndị Juu ma ndị Grik ozi ọma nke ọma ka ha chegharịa,+ fewe Chineke ma nwee okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.+ 22  Ma ugbu a, mmụọ nsọ du m na-aga Jeruselem, n’agbanyeghị na amaghị m ihe ga-eme m ebe ahụ, 23  naanị na si n’obodo ruo n’obodo, mmụọ nsọ na-agbara m àmà ugboro ugboro na a ga-atụ m mkpọrọ, kpagbuokwa m.+ 24  Ka o sina dị, o nweghị ihe m ji ndụ m* kpọrọ. Ihe bụ́ mkpa m bụ ime ihe niile m kwesịrị ime+ na ịrụcha ọrụ Onyenwe anyị Jizọs nyere m. Ọrụ ahụ bụ izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma gbasara amara Chineke meere anyị. 25  “Ugbu a, ama m na unu niile m kwusaara ozi ọma gbasara Alaeze Chineke agaghị ahụ ihu m ọzọ. 26  Ma, ihe mere m ji kpọọ unu bụ ka unu mara na ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi,+ 27  n’ihi na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile Chineke zubere ime.+ 28  Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ Chineke niile anya,+ nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya,+ ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke,+ nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.+ 29  Ama m na mgbe m na-anọghịzi ya, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata ebe unu nọ.+ Ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ Chineke ebere. 30  Ụfọdụ ndị n’ime unu ga-ebidokwa ịna-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.+ 31  “N’ihi ya, mụrụnụ anya, chetakwanụ na kemgbe afọ atọ,+ akwụsịghị m iji anya mmiri na-adụ onye ọ bụla n’ime unu ọdụ, ehihie na abalị. 32  Ana m enyefe unu n’aka Chineke, na-asịkwa ka okwu gbasara amara ya chebe unu. Okwu ahụ ga-agba unu ume, meekwa ka unu nweta ihe Chineke na-enye ndị nsọ niile.+ 33  O nweghị onye ọlaọcha ya ma ọ bụ ọlaedo ya ma ọ bụ uwe ya gụrụ m agụụ.+ 34  O doro unu anya na ọ bụ aka m ka m ji akpata ihe m ji egbo mkpa m+ nakwa nke ndị mụ na ha nọ. 35  Eji m ihe ndị m na-eme gosi unu na n’ihe niile,+ unu kwesịrị inyere ndị na-adịghị ike aka. Unu kwesịkwara ịna-echeta ihe Onyenwe anyị Jizọs kwuru. Ọ sịrị: ‘A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe+ karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.’” 36  Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ya na ndị niile nọ ebe ahụ gburu ikpere n’ala, ya ekpee ekpere. 37  N’eziokwu, ha niile malitere ibe ezigbo ákwá, ha makụkwara Pọl* ma susuo ya ọnụ,* 38  n’ihi na ihe kacha wute ha bụ na ọ sịrị na ha agaghị ahụ ihu ya ọzọ.+ Ha wee duruo ya ebe ọ bara ụgbọ mmiri.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụrụ na a gụnye nke ala ala ya.
Na Grik, “mkpụrụ obi ya dị n’ime ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Grik, “ha dakwasịkwara Pọl n’olu.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.