Ọrụ Ndịozi 23:1-35

  • Okwu Pọl kwuru n’ihu ndị Sanhedrin (1-10)

  • Onyenwe anyị gbara Pọl ume (11)

  • A kpara nkata igbu Pọl (12-22)

  • A kpụgara Pọl Sizaria (23-35)

23  Pọl legidere ndị Sanhedrin anya, sị: “Ụmụnna m, Chineke ma na akọnuche m na-agwa m na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere+ ruo taa.”  Ananayas bụ́ nnukwu onye nchụàjà wee gwa ndị guzo Pọl nso ka ha tie ya ihe n’ọnụ.  Pọl wee sị ya: “Mgbidi e tere nzu, Chineke ga-eti gị ihe. Ị nọ ọdụ ka i kpee m ikpe otú Iwu kwuru, ma ị na-emebi Iwu, ebe i kwuru ka e tie m ihe. Ihe a ị na-eme ọ̀ dị mma?”  Ndị guzo ya n’akụkụ wee sị: “Ị̀ na-akparị nnukwu onye nchụàjà Chineke?”  Pọl asị: “Ụmụnna m, amaghị m na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. N’ihi na e dere, sị, ‘Agwala onye na-achị ndị gị okwu ọjọọ.’”+  Ma mgbe Pọl matara na ụfọdụ n’ime ndị Sanhedrin ahụ bụ ndị Sadusii, ndị nke ọzọ abụrụ ndị Farisii, o tiri mkpu, sị ha: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii,+ nna nna m hà bụkwa ndị Farisii. Ihe mere e ji na-ekpe m ikpe bụ maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.”  N’ihi ihe a o kwuru, ndị Farisii na ndị Sadusii malitere ise okwu, ha kewakwara abụọ.  N’ihi na ndị Sadusii na-ekwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na e nweghị ndị mmụọ ozi ma ọ bụ mmụọ, ma ndị Farisii ekweghị n’ihe a niile ha na-ekwu.+  N’ihi ya, ebe ahụ niile malitere ịgba ghara ghara, ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị dụnyeere ndị Farisii úkwù malitere ịrụ ezigbo ụka, sị: “Anyị ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. O nwere ike ịbụ na mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi gwara ya okwu+—.” 10  Ma mgbe esemokwu ahụ karịwara, ọchịagha ahụ tụrụ egwu na ha ga-egbu* Pọl. O wee gwa ndị agha ya ka ha gaa napụta ya n’aka ha ma kpọta ya n’ogige ndị agha. 11  Ma n’abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị guzoro n’akụkụ ya, sị ya: “Obi sie gị ike.+ N’ihi na otú ahụ ị nọ na-agba àmà nke ọma banyere m na Jeruselem, ka ị ga-agbakwa àmà banyere m na Rom.”+ 12  Ma mgbe chi bọrọ, ndị Juu kpara nkata igbu Pọl, ṅụọkwa iyi, sị: “Anyị agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruo mgbe anyị gburu Pọl. Ọ bụrụkwa na anyị emeghị ihe a, ka a bụọ anyị ọnụ.” 13  E nwere ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ kpara nkata a, ṅụọkwa iyi a. 14  Ha gakwuuru ndị isi nchụàjà na ndị okenye, sị ha: “Anyị aṅụọla iyi na anyị agaghị emetụ nri ọ bụla ọnụ ruo mgbe anyị gburu Pọl. 15  N’ihi ya, unu na ndị Sanhedrin gaa gwa ọchịagha ahụ ka ọ kpọtara unu Pọl ka à ga-asị na unu chọrọ ilebakwu anya n’okwu ya. Ma, anyịnwa ga-adị njikere igbu ya tupu ya erute.” 16  Ma, nwa nwanne Pọl* nụrụ nkata ahụ ha kpara ichechi Pọl n’ụzọ, ya abanye n’ogige ndị agha kọọrọ ya Pọl. 17  Pọl kpọziri otu n’ime ndị isi ndị agha wee sị ya: “Duru nwa okorobịa a gakwuru ọchịagha, n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa ya.” 18  Onyeisi ndị agha ahụ wee kpọrọ ya gakwuru ọchịagha, sị: “Pọl, onye nọ n’ụlọ mkpọrọ, kpọrọ m ma gwa m ka m kpọtara gị nwa okorobịa a, n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.” 19  Ọchịagha ahụ wee sere ya n’aka gaa ebe ndị mmadụ na-anọghị ma jụọ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ ịgwa m?” 20  Ya asị: “Ndị Juu ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọtara ndị Sanhedrin Pọl echi, ka à ga-asị na ha chọrọ ilebakwu anya n’okwu ya.+ 21  Ma egela ha ntị, n’ihi na ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ n’ime ha bu n’obi ichechi ya n’ụzọ. Ha aṅụọkwala iyi na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruo mgbe ha gburu ya.+ Ha dịkwa njikere ugbu a, na-eche ka i meere ha ihe ha chọrọ.” 22  N’ihi ya, ọchịagha ahụ hapụrụ nwa okorobịa ahụ ka ọ gawa. Ma, o bu ụzọ sị ya: “Agwakwala onye ọ bụla na ị gwara m ihe a.” 23  O wee kpọọ mmadụ abụọ n’ime ndị isi ndị agha ahụ wee sị ha: “Kwadebenụ narị ndị agha abụọ (200) nakwa iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya na narị ndị agha abụọ (200) ji ube, ka ha gaa Sizaria, n’awa nke atọ n’abalị.* 24  Kpụtakwanụ ịnyịnya ndị ga-eburu Pọl bugara Gọvanọ Feliks n’enweghị ihe ọ bụla ga-eme ya.” 25  O wee dee akwụkwọ ozi, sị: 26  “Klọdiọs Laịsias na-edetara Onye Ukwu, bụ́ Gọvanọ Feliks, akwụkwọ: Ana m ekele gị. 27  Ndị Juu jidere nwoke a. Ọ fọkwara obere ka ha gbuo ya. Ma, akpọ m ndị agha m bịa ngwa ngwa napụta ya,+ n’ihi na m nụrụ na ọ bụ onye Rom.+ 28  Ebe ọ bụ na m chọrọ ịchọpụta ihe ha sị na o mere, akpọtaara m ya ndị Sanhedrin ha.+ 29  Achọpụtara m na ihe ndị ha sị na o mere bụ ihe gbasara Iwu ha,+ ma, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e kwesịrị iji maka ya gbuo ya ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ. 30  Ma, a gwara m nkata a kpara igbu nwoke a.+ N’ihi ya, m na-akpọtara gị ya ozugbo, m na-agwakwa ndị ahụ boro ya ebubo ka ha bịa n’ihu gị kwuo ihe ha sị na o mere.” 31  N’ihi ya, ndị agha a kpọọrọ Pọl+ otú ahụ a gwara ha kpọta ya Antipatris n’abalị. 32  N’echi ya, ndị na-agba ịnyịnya sooro ya gawa, ndị agha ndị ọzọ alaghachizie n’ogige ndị agha. 33  Ndị ahụ na-agba ịnyịnya banyere na Sizaria ma nye gọvanọ akwụkwọ ozi ahụ, kpọrọkwa Pọl kpọnye ya. 34  O wee gụọ akwụkwọ ozi ahụ ma jụọ Pọl onye ebe ọ bụ, ya asị ya na ya bụ onye Silishia.+ 35  Ya asị Pọl: “Ndị boro gị ebubo bịarute, m ga-enye gị ohere ka i kwuo ihe niile ị chọrọ ikwu.”+ O wee kwuo ka a na-eche ya nche n’obí Herọd.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ga-adọrisị.”
Ya bụ, nwa nwanne ya nwaanyị.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke abalị.