Ozi Ọma Jọn Dere 21:1-25

  • Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya (1-14)

  • Pita kwuru na ya hụrụ Jizọs n’anya (15-19)

    • “Na-enye ụmụ atụrụ m nri” (17)

  • Ihe Jizọs kwuru gbasara onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ n’anya (20-23)

  • Okwu mmechi (24, 25)

21  Mgbe e mechara, Jizọs pụtara ọzọ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya n’Oké Osimiri Taịbirias. Ọ bụ otú a ka o si gosi ha onwe ya.  Saịmọn Pita, Tọmọs (onye a na-akpọ Ejima),+ Nataniel+ onye Kena nke dị na Galili, ụmụ Zebedi,+ na mmadụ abụọ ọzọ na-eso ụzọ Jizọs nọ.  Saịmọn Pita sịrị ha: “Ana m aga igbu azụ̀.” Ha wee sị ya: “Anyị ga-eso gị gaa.” Ha pụrụ gaa banye n’ụgbọ mmiri. Ma o nweghị ihe ha gbutere n’abalị ahụ.+  Mgbe chi na-abọ, Jizọs guzo n’ikpere osimiri ahụ. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ ya.+  Jizọs wee sị ha: “Ụmụntakịrị, ùnu nwere ihe ọ bụla* unu ga-eri?” Ha sịrị ya: “Mba.”  O wee sị ha: “Wụnyenụ ụgbụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ mmiri unu, unu ga-egbute azụ̀.” Ha wee wụnye ya, ma ha enweghịzi ike ịdọbata ya n’ụgbọ ha n’ihi ọtụtụ azụ̀ juru na ya.+  Onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya,+ sịrị Pita: “Ọ bụ Onyenwe anyị.” Mgbe Saịmọn Pita nụrụ na ọ bụ Onyenwe anyị, o yiiri uwe elu ya n’ihi na ọ gba ahụ́ ọtọ.* O wee maba n’oké osimiri ahụ.  Ma ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs, ndị nọ n’obere ụgbọ ahụ, kwọọrọ ụgbọ ahụ ma dọkpụrụ ụgbụ ahụ azụ̀ juru pụtawa n’ihi na ebe ha nọ adịghị anya n’ikpere osimiri ahụ. Ọ dị ihe dị ka mita iri itoolu.*  Mgbe ha pụtara n’elu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere nke azụ̀ dị n’elu ya nakwa achịcha. 10  Jizọs sịrị ha: “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ̀ ndị unu ka gbutere ugbu a.” 11  Saịmọn Pita wee banye n’ụgbọ mmiri dọpụta ụgbụ ahụ nnukwu azụ̀ juru n’elu ala. Azụ̀ ndị ahụ dị otu narị na iri ise na atọ (153). Ụgbụ ahụ adọkaghị n’agbanyeghị na azụ̀ ndị dị na ya dị ọtụtụ. 12  Jizọs sịrị ha: “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” E nweghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya obi kara ịjụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ?” n’ihi na ha ma na ọ bụ Onyenwe anyị. 13  Jizọs bịara were achịcha ahụ nye ha, nyekwa ha azụ̀ ndị ahụ. 14  Nke a bụ nke ugboro atọ+ Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. 15  Mgbe ha richara nri ụtụtụ, Jizọs jụrụ Saịmọn Pita, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?” O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị, ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Ọ sịrị ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.”*+ 16  Ọ jụrụ ya nke ugboro abụọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị, ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Ọ sịrị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”+ 17  O wee jụọ ya nke ugboro atọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O wee wute Pita na ọ jụrụ ya nke ugboro atọ, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya?” Pita wee sị ya: “Onyenwe anyị, ị ma ihe niile. Ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Jizọs sịziri ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.*+ 18  N’eziokwu, ana m asị gị na mgbe ị bụ nwata, ị na-eji aka gị eyiri ákwà ma na-ejegharị ebe ị chọrọ. Ma mgbe ị ga-eme agadi, ị ga-agbatị aka gị, onye ọzọ eyiwe gị ákwà, durukwa gị gaa n’ebe ị na-achọghị.” 19  O kwuru ihe a iji gosi ụdị ọnwụ Pita ga-anwụ, nke ga-ewetara Chineke otuto. Mgbe o kwuchara ihe a, ọ sịrị ya: “Na-eso m.”+ 20  Pita tụgharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya,+ ka ọ na-eso ha. Ọ bụ ya bụ onye ahụ dalara azụ ma dabere n’obi Jizọs n’oge ha na-eri nri anyasị, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ onye ga-arara gị nye?” 21  Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jizọs: “Onyenwe anyị, onye a kwanụ?” 22  Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na ọ bụ uche m ka ọ nọrọ ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ gbasara gị? Gịnwa, na-eso m.” 23  N’ihi ya, ụmụnna nụrụ na onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs agaghị anwụ. Ma, Jizọs agwaghị ya na ọ gaghị anwụ, kama ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na ọ bụ uche m ka ọ nọrọ ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ gbasara gị?” 24  Ọ bụ onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs+ na-agba àmà a banyere ihe ndị a, ọ bụkwa ya dere ihe ndị a. Anyị makwa na àmà ya bụ eziokwu. 25  N’eziokwu, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs mere. Ọ bụrụ na e dechaa ha niile, echeghị m na ụwa ga-aba akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “azụ̀ ọ bụla.”
Ma ọ bụ “e nweghị ezigbo ihe o yi.”
Na Grik, “ihe dị ka kubit 200.” Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”
Ma ọ bụ “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”