Ozi Ọma Jọn Dere 18:1-40
18 Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gafee Ndagwurugwu Kidrọn*+ ma gaa n’ebe e nwere ubi. Ya na ndị na-eso ụzọ ya wee banye n’ubi ahụ.+
2 Judas, onye ga-arara ya nye, makwa ebe ahụ n’ihi na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ezukọọla n’ebe ahụ ugboro ugboro.
3 Judas wee kpọrọ ìgwè ndị agha na ndị nche bịa n’ebe ahụ. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị Farisii zitere ndị nche a. Ha ji ọwa ọkụ na mpanaka* na ngwá ọgụ bịa.+
4 Ebe Jizọs ma ihe niile ga-eme ya, ọ gakwuuru ha, sị ha: “Ònye ka unu na-achọ?”
5 Ha sịrị ya: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.”+ O wee sị ha: “Ọ bụ m.” Judas, onye na-arara ya nye, so ha guzoro n’ebe ahụ.+
6 Ma mgbe Jizọs sịrị ha, “Ọ bụ m,” ha lara azụ daa n’ala.+
7 O wee jụọ ha ọzọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha sịrị: “Jizọs onye Nazaret.”
8 Jizọs wee sị: “Agwara m unu na ọ bụ m. N’ihi ya, ọ bụrụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.”
9 Ihe a mere ka ihe o kwuru mezuo, ya bụ: “N’ime ndị niile i nyere m, e nweghị otu onye funahụrụ m.”+
10 Saịmọn Pita ji mma agha. O wee mịrị ya gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà ma bepụ ya ntị aka nri.+ Aha ohu ahụ bụ Makọs.
11 Ma Jizọs sịrị Pita: “Mịghachi mma agha ahụ n’ọbọ ya.+ Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịṅụ ihe dị n’iko Nna m bunyere m?”+
12 Ndị agha ahụ na ọchịagha ha na ndị nche ndị Juu wee jide Jizọs kee ya agbụ n’aka.
13 Ha bu ụzọ kpụgara ya Anas n’ihi na ọ bụ nna nwunye Kayafas. Ọ bụ Kayafas+ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ.+
14 N’eziokwu, ọ bụ Kayafas bụ onye gwara ndị Juu na ọ kaara ha mma ka otu onye nwụchitere ha ọnwụ.+
15 Saịmọn Pita nọ na-eso Jizọs, ya na onye ọzọ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs.+ Nnukwu onye nchụàjà ma onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Onye ahụ sooro Jizọs banye na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà.
16 Ma Pita guzo n’èzí n’ọnụ ụzọ. Onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye nnukwu onye nchụàjà ma, gara gwa onye nche ọnụ ụzọ okwu wee kpọbata Pita.
17 Nwa agbọghọ na-eje ozi, onye na-eche ọnụ ụzọ ahụ nche, sịrị Pita: “Ọ̀ bụ na i soghị ná ndị na-eso ụzọ nwoke a?” O wee sị: “Esoghị m.”+
18 Ndị ohu na ndị nche guzocha gburugburu ọkụ ha kwanyere. Ha nọ na-anya ọkụ maka na oyi na-atụ. Pita sokwa ha guzoro na-anya ọkụ.
19 Onyeisi nchụàjà wee jụọ Jizọs ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya na ihe ọ na-akụzi.
20 Jizọs sịrị ya: “Agwara m ndị mmadụ okwu n’ihu ọha. M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ,+ bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọ. E nweghịkwa ihe m kwuru na nzuzo.
21 Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ? Jụọ ndị nụrụ ihe m gwara ha. Ha ma ihe m kwuru.”
22 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, otu n’ime ndị nche guzo nso n’ebe ahụ mara Jizọs ụra n’ihu+ ma sị ya: “Ọ̀ bụ otú a ka i si aza onyeisi nchụàjà ajụjụ?”
23 Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na m kwuru ihe ọjọọ, gbaa akaebe na m kwuru ihe ọjọọ. Ma ọ bụrụ na ihe m kwuru ziri ezi, gịnị mere i ji tie m ihe?”
24 Anas wee kwuo ka a kpụgara ya Kayafas, nnukwu onye nchụàjà. Jizọs ka bukwa agbụ e kere ya n’aka mgbe a kpụ ya gawa.+
25 Saịmọn Pita guzo na-anya ọkụ. Ha wee sị ya: “Ọ̀ bụ na i soghị ná ndị na-eso ụzọ ya?” Ọ gọrọ agọ, sị: “Esoghị m.”+
26 Otu n’ime ndị ohu nnukwu onye nchụàjà, bụ́ onye ikwu nwoke ahụ Pita bepụrụ ntị,+ sịrị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?”
27 Ma Pita gọrọ agọ ọzọ. Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara.+
28 Ha wee kpụrụ Jizọs si n’ụlọ Kayafas gaa n’ụlọ gọvanọ.+ Ọ bụzi isi ụtụtụ. Ma, ha abanyeghị n’ụlọ gọvanọ ka ha ghara imerụ onwe ha,+ ka ha nwee ike iri nri Ememme Ngabiga.
29 Paịlet wee bịakwute ha n’èzí, sị: “Olee ihe ọjọọ unu sị na nwoke a mere?”
30 Ha zara ya, sị: “A sị na nwoke a anaghị eme ihe ọjọọ, anyị agaraghị enyefe ya n’aka gị.”
31 Paịlet wee sị ha: “Kpọrọnụ ya, kpeenụ ya ikpe otú iwu unu kwuru.”+ Ndị Juu sịrị ya: “E nyeghị anyị ikike igbu onye ọ bụla.”+
32 Ihe a bụ ka e wee mezuo ihe Jizọs kwuru gbasara ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.+
33 Paịlet banyere ọzọ n’ụlọ ya* ma kpọọ Jizọs, sị ya: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?”+
34 Jizọs zara ya, sị: “Ọ̀ bụ gị chepụtara ajụjụ a ị jụrụ m, ka ọ̀ bụ ndị ọzọ gwara gị banyere m?”
35 Paịlet sịrị: “Àbụ m onye Juu? Ọ bụ ndị obodo unu na ndị isi nchụàjà nyefere gị n’aka m. Gịnị ka i mere?”
36 Jizọs zara,+ sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.+ A sị na Alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu.+ Ma, Alaeze m esighị n’ebe a.”
37 Paịlet wee sị ya: “Ma, ị̀ bụnụ eze?” Jizọs zara, sị: “Ọ bụ gị na-ekwu na m bụ eze.*+ Ọ bụ ihe a mere e ji mụọ m, ọ bụkwa ihe a mere m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.+ Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege m ntị.”
38 Paịlet sịrị ya: “Gịnị bụ eziokwu?”
Mgbe o kwuchara ihe a, ọ gakwuuru ndị Juu ọzọ, sị ha: “O nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.+
39 Omenala unu bụkwa na m ga-ahapụrụ unu otu onye n’oge Ememme Ngabiga.+ Ùnu chọrọnụ ka m hapụrụ unu Eze ndị Juu?”
40 Ha wee tie mkpu ọzọ, sị: “Ahapụla nwoke a, kama hapụrụ anyị Barabas!” Ma, Barabas bụ onye ohi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Mmiri na-adị na ndagwurugwu a naanị ma mmiri zosie ike n’oge udu mmiri.
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ma ọ bụ “n’ụlọ gọvanọ.”
^ Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.