Ozi Ọma Jọn Dere 7:1-52
7 Mgbe e mechara, Jizọs nọ na Galili na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ọ chọghị ịga Judia maka na ndị Juu nọ na-achọ igbu ya.+
2 Ma, ememme ndị Juu a na-akpọ Ememme Ụlọikwuu*+ na-eru nso.
3 N’ihi ya, ụmụnne ya ndị nwoke+ sịrị ya: “Hapụ ebe a gawa Judia, ka ndị na-eso ụzọ gị hụkwa ọrụ ndị ị na-arụ.
4 N’ihi na e nweghị onye na-eme ihe ọ bụla na nzuzo ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka mmadụ niile mara ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
5 N’eziokwu, ụmụnne ya ndị nwoke enweghị okwukwe na ya.+
6 N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “Oge m erubeghị,+ ma oge ọ bụla dịịrị unu mma.
7 E nweghị ihe mere ụwa ga-eji kpọọ unu asị. Ma ọ kpọrọ m asị n’ihi na m na-agba àmà na ọrụ ya dị njọ.+
8 Gawanụ ememme a. Agawabeghị m, n’ihi na oge m eruchabeghị.”+
9 Mgbe ọ gwachara ha ihe ndị a, ọ nọdụrụ na Galili.
10 Ma mgbe ụmụnne ya ndị nwoke gawarala ememme ahụ, ọ gawakwara. Ma ọ gara na nzuzo, ka ndị mmadụ ghara ịmata.
11 N’ihi ya, ndị Juu malitere ịchọ ya n’ememme ahụ, na-asị: “Olee nwoke ahụ?”
12 Ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ebe ahụ weturu olu ala na-ekwu okwu banyere Jizọs. Ụfọdụ nọ na-asị: “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị: “Ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ọ na-eduhie ìgwè mmadụ a.”+
13 Ma, e nweghị onye na-ekwu banyere ya n’ihu ọha n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu.+
14 Mgbe ememme ahụ gara ọkara, Jizọs gbagooro n’ụlọ nsọ ma malite izi ihe.
15 O juru ndị Juu anya, ha ana-asị: “Olee otú nwoke a si mara Akwụkwọ Nsọ,*+ ebe ọ bụ na ọ gụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ?”*+
16 Ma Jizọs sịrị ha: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.+
17 Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ime uche Chineke, ọ ga-ama ma ihe m na-ezi ò si n’aka Chineke+ ka m̀ na-ekwu echiche m.
18 Onye na-ekwu echiche nke ya na-achọ otuto nke ya. Ma onye na-achọ otuto nke onye zitere ya+ bụ onye eziokwu, ajọ omume adịghịkwa n’ime ya.
19 Ọ̀ bụ na Mosis enyeghị unu Iwu?+ Ma e nweghị onye n’ime unu na-erube isi n’Iwu ahụ. Gịnị mere unu ji na-achọ igbu m?”+
20 Ìgwè mmadụ ahụ zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ji gị. Ònye na-achọ igbu gị?”
21 Jizọs wee sị ha: “Otu ihe ka m mere, ya eju unu niile anya.
22 Ọ bụ ya mere Mosis ji nye unu iwu ibi úgwù.+ Ọ bụghị na o si n’aka Mosis, kama o si n’aka nna nna unu hà.+ Unu na-ebikwa mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike.
23 Ebe ọ bụ na a na-ebi mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike ka a ghara ịda Iwu Mosis, gịnị mere unu ji na-ewesa m iwe ọkụ maka na m gwọrọ mmadụ n’ụbọchị izu ike?+
24 Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”+
25 Ụfọdụ ndị bi na Jeruselem malitere ịsị: “Ọ́ bụghị nwoke a ka a na-achọ igbu?+
26 Ma lee, ọ na-ekwu okwu n’ihu ọha, e nweghịkwa ihe ha na-agwa ya. Ọ̀ ga-abụ na ndị isi amatala n’eziokwu na ọ bụ ya bụ Kraịst?
27 Anyị ma ebe nwoke a si.+ Ma mgbe Kraịst ga-abịa, e nweghị onye ga-ama ebe o si.”
28 Mgbe Jizọs na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, o ji oké olu kwuo, sị: “Unu ma m, marakwa ebe m si. Ọ bụghị m zitere onwe m,+ kama Onye zitere m dị adị, unu amaghịkwa ya.+
29 Ama m ya+ n’ihi na abụ m onye nnọchiteanya ya. Ọ bụ ya zitere m.”
30 N’ihi ya, ha malitere ịchọ otú ha ga-esi jide ya.+ Ma e nweghị onye bitụrụ ya aka n’ihi na oge ya erubeghị.+
31 Ma ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ nwere okwukwe na ya.+ Ha nọkwa na-asị: “Mgbe Kraịst ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube karịrị nke nwoke a na-arụ?”*
32 Ndị Farisii nụrụ ka ìgwè mmadụ ahụ na-atakwu ihe ndị a banyere Jizọs, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii wee dunye ndị nche ka ha gaa jide ya.
33 Jizọs wee sị: “Mụ na unu ka ga-anọtụkwu tupu mụ alakwuru Onye zitere m.+
34 Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu enweghịkwa ike ịbịa n’ebe m nọ.”+
35 N’ihi ya, ndị Juu kwurịtara, sị: “Ebee ka nwoke a bu n’uche ịga ka anyị ghara ịhụ ya? Ò bu n’uche ịgakwuru ndị Juu bi n’obodo ndị Grik ka ọ kụziere ndị Grik ihe?
36 Gịnị ka o bu n’obi mgbe ọ sịrị, ‘Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu enweghịkwa ike ịbịa n’ebe m nọ’?”
37 N’ụbọchị ikpeazụ, nke bụ́ nnukwu ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ ma jiri oké olu kwuo, sị: “Ọ bụrụ na mmiri na-agụ onye ọ bụla, ya bịakwute m ṅụọ mmiri.+
38 Onye ọ bụla nwere okwukwe na m, ‘Mmiri nke na-enye ndụ ga-esi n’ime ya na-asọpụta,’+ otú e kwuru ya n’Akwụkwọ Nsọ.”
39 Ma, ọ na-ekwu banyere mmụọ nsọ nke ndị nwere okwukwe na ya na-aga ịnata, n’ihi na ha anatabeghị mmụọ nsọ+ ebe ọ bụ na e mebeghị ka Jizọs dị ebube.+
40 Ụfọdụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ ndị nụrụ ihe a o kwuru malitere ịsị: “N’eziokwu, ọ bụ ya bụ Onye Amụma ahụ.”+
41 Ndị ọzọ nọ na-asị: “Onye a bụ Kraịst.”+ Ma ụfọdụ nọ na-asị: “Kraịst ọ̀ ga-esi na Galili bịa?+
42 Ọ̀ bụ na e kwughị n’Akwụkwọ Nsọ na Kraịst ga-esi n’agbụrụ Devid,+ nakwa na ọ ga-esi na Betlehem,+ bụ́ obodo Devid?”+
43 Ìgwè mmadụ ahụ kewaziri n’ihi ya.
44 Ụfọdụ n’ime ha chọrọ ijide ya, ma e nweghị onye bitụrụ ya aka.
45 Ndị nche ahụ wee laghachikwuru ndị isi nchụàjà na ndị Farisii. Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụrụ ha, sị: “Gịnị mere na unu akpụtaghị ya?”
46 Ndị nche ahụ zara, sị: “E nwetụbeghị onye ọzọ kwuru okwu otú a.”+
47 Ma, ndị Farisii kwuru, sị: “È duhiekwala ununwa?
48 È nwere otu n’ime ndị isi ma ọ bụ ndị Farisii nwere okwukwe na ya?+
49 Ma ìgwè mmadụ a na-amaghị Iwu* bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50 Nikọdimọs, onye bịakwuteburu Jizọs, onye bụ́kwa otu n’ime ndị Farisii, sịrị ha:
51 “Iwu anyị ekwughị na a ga-ama mmadụ ikpe ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nụ n’ọnụ onye ahụ ma mara ihe ọ na-eme, ka ò kwuru otú ahụ?”+
52 Ha zara ya, sị: “Gịnwa ì sikwu na Galili? Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na e nweghị onye amụma ga-esi na Galili.”*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Ụlọ Ndò.”
^ Ya bụ, ụlọ akwụkwọ ndị Rabaị.
^ Na Grik, “ihe e dere ede.”
^ Na Grik, “ọ̀ ga-eme ihe àmà karịrị nke nwoke a na-eme?”
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ Ọtụtụ Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie, bụ́ ndị kwuru ihe e ji n’aka, edenyeghị amaokwu nke 53 ruo isi 8, amaokwu nke 11.

