Ozi Ọma Jọn Dere 9:1-41

  • Jizọs mere ka nwoke kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya hụwa ụzọ (1-12)

  • Ndị Farisii gbara nwoke kpuburu ìsì ajụjụ (13-34)

  • Ndị Farisii kpuru ìsì (35-41)

9  Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya.  Ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya, sị: “Onye Ozizi,*+ ònye mehiere? Ọ̀ bụ nwoke a, ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ya, nke mere o ji kpuo ìsì mgbe a mụrụ ya?”  Jizọs zara, sị: “Ma nwoke a ma ndị mụrụ ya emehieghị, kama ọ bụ ka e si n’ihe mere ya mee ka ọrụ Chineke pụta ìhè.+  Anyị ga-arụ ọrụ Onye zitere m mgbe ìhè ka dị.+ Abalị na-abịa, mgbe mmadụ ọ bụla na-agaghị arụli ọrụ.  N’oge niile m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.”+  Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ gbụsara asọ mmiri n’ala, gwakọta ya na ájá wee tee ájá ahụ n’anya nwoke ahụ,+  sị ya: “Gaa saa anya gị n’ọdọ mmiri Siloam” (nke pụtara “Ihe Na-asọpụta Asọpụta”). O wee gaa saa anya ya. Mgbe ọ lọghachiri, ọ hụwala ụzọ.+  Ndị agbata obi ya na ndị na-ahụbu na ọ bụ onye arịrịọ malitere ịsị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala arịọ arịrịọ?”  Ụfọdụ ndị nọ na-asị: “Ọ bụ ya.” Ndị ọzọ nọ na-asị: “Ọ bụghị ya, kama o yiri ya.” Ma nwoke ahụ nọ na-asị: “Ọ bụ m.” 10  Ha wee jụọ ya, sị: “Oleezi otú e si meghee anya gị?” 11  Ọ zara, sị: “Nwoke ahụ a na-akpọ Jizọs gwọkọtara ájá tee m n’anya ma sị m, ‘Gaa na Siloam saa anya gị.’+ M wee gaa saa anya m, hụwa ụzọ.” 12  Ha wee sị ya: “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị ha: “Amaghị m.” 13  Ha duuru nwoke ahụ kpuburu ìsì gakwuru ndị Farisii. 14  Ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike+ ka Jizọs gwọkọtara ájá ma jiri ya meghee anya nwoke ahụ.+ 15  Ndị Farisii jụwaziri ya otú o si hụwa ụzọ. O wee sị ha: “O tere m ájá n’anya. M wee saa anya m, hụwa ụzọ.” 16  Ụfọdụ ndị Farisii malitere ịsị: “Ọ bụghị Chineke zitere nwoke a n’ihi na ọ naghị edebe Ụbọchị Izu Ike.”+ Ndị ọzọ sịrị: “Olee otú onye mmehie ga-esi na-arụ ụdị ọrụ ebube* ndị ahụ?”+ N’ihi ya, ha kewara.+ 17  Ha sịrị onye ìsì ahụ ọzọ: “Olee ihe ị ga-ekwu banyere ya ebe ọ bụ na o meghere anya gị?” Nwoke ahụ sịrị: “Ọ bụ onye amụma.” 18  Ma, ndị isi ndị Juu ekwetaghị na nwoke ahụ kpuburu ìsì ma mechaa hụwa ụzọ. N’ihi ya, ha kpọrọ ndị mụrụ ya. 19  Ha wee jụọ ha, sị: “Onye a ọ̀ bụ nwa unu, onye unu sịrị na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya? Oleezi otú o si na-ahụ ụzọ ugbu a?” 20  Ndị mụrụ ya zara, sị: “Anyị ma na ọ bụ nwa anyị, marakwa na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 21  Ma anyị amaghị otú o si hụwa ụzọ ugbu a, anyị amaghịkwa onye meghere anya ya. Jụọnụ ya. Ọ bụrụla dimkpa. Ya zara ọnụ ya.” 22  Ndị mụrụ ya kwuru ihe ndị a maka na ha na-atụ ndị isi ndị Juu egwu,+ n’ihi na ha kwekọrịtara na onye ọ bụla kwuru na Jizọs bụ Kraịst, a ga-achụpụ ya n’ụlọ nzukọ ha.+ 23  Ọ bụ ya mere ndị mụrụ ya ji sị: “Ọ bụrụla dimkpa. Jụọnụ ya.” 24  Ha wee kpọọ nwoke ahụ kpuburu ìsì nke ugboro abụọ, sị ya: “Nye Chineke otuto.* Anyị ma na nwoke ahụ bụ onye mmehie.” 25  Ọ gwara ha, sị: “Amaghị m ma ọ̀ bụ onye mmehie. Otu ihe m ma bụ na m kpuburu ìsì, ma ana m ahụ ụzọ ugbu a.” 26  Ha wee sị ya: “Gịnị ka o mere gị? Olee otú o si meghee anya gị?” 27  Ọ zara ha, sị: “M kọọrọla ya unu, ma unu egeghị ntị. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Ùnu chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?” 28  Ha wee kparịa ya, sị: “Ị bụ onye na-eso ụzọ nwoke ahụ, ma anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis. 29  Anyị ma na Chineke gwara Mosis okwu. Ma anyị amaghị ebe nwoke a si.” 30  Nwoke ahụ gwara ha, sị: “O juru m anya na unu sịrị na unu amaghị ebe o si ma ya emeghee anya m. 31  Anyị ma na Chineke anaghị ege ndị mmehie ntị.+ Ma ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Chineke, na-emekwa uche ya, ọ na-ege ya ntị.+ 32  Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 33  Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke zitere nwoke a, o nweghị ihe ọ bụla ọ ga-emeli.”+ 34  Ha gwara ya, sị: “Ị̀ na-ezi anyị ihe n’agbanyeghị na a mụrụ gị ná mmehie?” Ha wee chụpụ ya.+ 35  Jizọs nụrụ na ha achụpụla nwoke ahụ. Mgbe Jizọs hụrụ ya, ọ sịrị ya: “Ì nwere okwukwe na Nwa nke mmadụ?” 36  Nwoke ahụ zara, sị: “Nna anyị ukwu, ònyekwanụ ka ọ bụ ka m wee nwee okwukwe na ya?” 37  Jizọs sịrị ya: “Ị hụla ya. Ọ bụ onye a gị na ya na-ekwu okwu.” 38  O wee sị: “Onyenwe anyị, enwere m okwukwe na ya.” Nwoke ahụ wee kpọọrọ ya isiala. 39  Jizọs kwuziri, sị: “Abịara m n’ụwa a ka e kpee ụwa ikpe, ka ndị na-anaghị ahụ ụzọ wee hụwa ụzọ,+ ka ndị na-ahụ ụzọ kpuokwa ìsì.”+ 40  Ndị Farisii nọ n’ebe ahụ nụrụ ihe a o kwuru. Ha wee sị ya: “Ànyị kpukwuru ìsì?” 41  Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, unu agaraghị abụ ndị mmehie. Ma ugbu a, unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ A gaghị agbaghara unu mmehie unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “na-eme ụdị ihe àmà.”
Ihe ọ pụtara bụ “Kwuo eziokwu n’ihu Chineke.”