Ndị Eze nke Abụọ 17:1-41

  • Hoshia malitere ịchị Izrel (1-4)

  • E meriri ndị Izrel (5, 6)

  • A dọọrọ ndị Izrel n’agha maka na ha hapụrụ Chineke (7-23)

  • A kpọtara ndị obodo ọzọ ha ebichie n’obodo ndị dị na Sameria (24-26)

  • Ndị bi na Sameria na-atụ egwu Chineke, na-efekwa chi dị iche iche (27-41)

17  N’afọ nke iri na abụọ n’ọchịchị Ehaz eze Juda, Hoshia+ nwa Ịla malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ itoolu na Sameria.  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, naanị na o merughị ka ndị eze Izrel ndị bu ya ụzọ.  Shalmaniza eze Asiria bịakwara lụso Hoshia agha,+ ya aghọọ ohu ya, malitekwa ịtụrụ ya ụtụ.+  Ma, eze Asiria chọpụtara na Hoshia na-akpara ya nkata. Ọ nụrụ na Hoshia zigara ndị mmadụ na nke Soo eze Ijipt.+ O wetaghịkwaara yanwa bụ́ eze Asiria ụtụ otú ọ na-eweta n’afọ ndị gara aga. N’ihi ya, eze Asiria kere ya agbụ ma kpọchie ya n’ụlọ mkpọrọ.  Eze Asiria bịara lụso ndị Izrel agha, nọchibidokwa Sameria ruo afọ atọ.  N’afọ nke itoolu n’ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria,+ dọrọkwa ndị Izrel n’agha+ laa Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan,+ nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+  Ihe a mere ndị Izrel maka na ha mehiere Jehova bụ́ Chineke ha, onye napụtara ha n’aka Fero eze Ijipt+ mgbe o si Ijipt kpọpụta ha. Ha nọ na-efe* chi ọzọ dị iche iche.+  Ha nọ na-eme ihe otú mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihi ha na-eme. Ha nọkwa na-eme ihe otú ndị eze Izrel kwuru ka ha na-eme.  Ndị Izrel nọkwa na-eme ihe ndị na-adịghị mma n’anya Jehova bụ́ Chineke ha. Ha nọ na-arụ ebe ndị dị elu n’obodo ha niile,+ malite n’ụlọ nche ruo n’obodo a rụsiri ike.* 10  Ha nọkwa na-arụrụ onwe ha ogidi arụsị na ogwe osisi arụsị*+ n’ugwu ọ bụla nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+ 11  Ha na-anọkwa n’ebe niile dị elu na-esu àjà ọkụ otú mba ndị ọzọ na-eme, ndị Jehova ji maka ndị Izrel mee ka a dọrọ n’agha.+ Ha nọ na-eme ihe ọjọọ, na-akpasu Jehova iwe. 12  Ha nọkwa na-efe arụsị dị iche iche na-asọ oyi,*+ ndị Jehova gwara ha ka ha ghara ife.+ 13  Jehova sikwa n’aka ndị amụma ya niile na ndị ọhụụ niile+ na-adọ ndị Izrel na ndị Juda aka ná ntị, sị: “Hapụnụ ihe ọjọọ unu na-eme.+ Na-edebenụ iwu m, na-esonụ ntụziaka m, na-edebekwanụ iwu niile m nyere nna nna unu hà, ndị m gwara ndị amụma, bụ́ ndị ohu m, ka ha gwa unu.” 14  Ma ha egeghị ntị, kama ha nọ na-eme isi ike* ka ndị nna nna ha, ndị na-enweghị okwukwe na Jehova bụ́ Chineke ha.+ 15  Ha nọ na-ajụ idebe iwu ya na ime ihe ya na ndị nna nna ha kwekọrịtara mgbe ha na ya gbara ndụ.+ Ha egeghịkwa ntị n’ihe ndị o chetaara ha, ndị o ji dọọ ha aka ná ntị.+ Ha nọkwa na-efe arụsị ndị na-abaghị uru,+ ghọọkwa ndị na-abaghị uru n’onwe ha.+ Ha si otú a na-eme ka mba ndị gbara ha gburugburu, ndị Jehova gwara ha ka ha ghara ime ka ha.+ 16  Ha hapụrụ idebe iwu niile Jehova bụ́ Chineke ha nyere ha. Ha kpụrụ ụmụ ehi abụọ,+ rụọkwa ogwe osisi arụsị.*+ Ha nọkwa na-akpọrọ ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ na-efekwa Bel.+ 17  Ha na-akpọ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ iji chụọ àjà,+ na-agbakwa afa ka ha mata ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Ha na-akpachara anya* eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, na-akpasu ya iwe. 18  N’ihi ya, Jehova wesara ndị Izrel ezigbo iwe, nke mere na ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ O nweghị ebo ọ bụla ọ hapụrụ n’Izrel ma e wezụga ebo Juda. 19  Ndị Juda n’onwe ha edebeghịkwa iwu Jehova bụ́ Chineke ha,+ kama ha nọ na-eme ihe otú ndị Izrel na-eme.+ 20  Jehova jụrụ ndị Izrel niile,* menye ha ihere, nyefeekwa ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe ndị mmadụ, ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya. 21  O mere ka a gharazie inwe ihe jikọrọ ndị Izrel na ezinụlọ Devid. Ndị Izrel chikwara Jeroboam nwa Nibat eze.+ Ma, Jeroboam mere ka ndị Izrel kwụsị iso Jehova, meekwa ka ha mee nnukwu mmehie. 22  Ndị Izrel nọkwa na-eme ụdị mmehie niile Jeroboam mere.+ Ha akwụsịghị ịna-eme ha, 23  ruo mgbe Jehova chụpụrụ ndị Izrel n’ihu ya, otú o si n’ọnụ ndị amụma, bụ́ ndị ohu ya, kwuo.+ E sikwa n’Izrel dọrọ ha n’agha laa Asiria,+ ebe ha nọ ruo taa. 24  Eze Asiria sikwa Babịlọn, Kuta, Ava, Hemat, na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, ka ha bichie n’obodo ndị dị na Sameria ndị Izrel bibu. Ha bịakwara weghara Sameria, birikwa n’obodo ndị dị na ya. 25  Mgbe ha malitere ibi ebe ahụ, ha atụghị egwu* Jehova. N’ihi ya, Jehova mere ka ọdụm gaa dọgbuo ụfọdụ n’ime ha.+ 26  A kọọrọ eze Asiria, sị: “Mba ndị ahụ ị dọọrọ n’agha ma mee ka ha biri n’obodo ndị dị na Sameria amaghị Chi ndị obodo ahụ na okpukpe* ha. Ebe ọ bụkwa na e nweghị onye n’ime ha ma Chi ndị obodo ahụ na okpukpe ha, Chi ndị obodo ahụ mere ka ọdụm na-abịa adọgbu ha.” 27  Eze Asiria kwuziri, sị: “Gwanụ otu n’ime ndị nchụàjà so ná ndị unu si ebe ahụ dọrọ n’agha ka ọ gaa biri ebe ahụ na-akụziri ha otú e si ekpere Chi obodo ahụ.” 28  N’ihi ya, otu n’ime ndị nchụàjà, onye ha si na Sameria dọrọ n’agha, lọtara bịa biri na Betel.+ O bidokwara ịkụziri ha otú ha kwesịrị isi na-atụ egwu* Jehova.+ 29  Ma, mba nke ọ bụla mere chi nke ya, dowe ya n’ụlọ arụsị ndị dị n’ebe ndị dị elu ndị Sameria rụrụ. Mba nke ọ bụla mere otú ahụ n’obodo ha bi. 30  Arụsị ndị Babịlọn mere bụ Sọkọt-binọt, ndị Kọt emee Negal, ndị Hemat+ emee Ashaịma, 31  ndị Ava emee Nibhaz na Tatak. Ndị Sefaveyim+ na-akpọ ụmụ ha ọkụ iji chụọrọ Adramelek na Anamelek, bụ́ chi ha, àjà. 32  N’agbanyeghị na ha na-atụ egwu Jehova, ha si ná ndị nkịtị họrọ ndị ga-abụ ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu. Ndị a ha họọrọ na-arụkwara ha ọrụ n’ụlọ arụsị ndị dị n’ebe ndị dị elu.+ 33  Otú a ka ha si bụrụ ndị na-atụ egwu Jehova. Ma, ha na-efe chi ha dị iche iche otú ndị obodo ha si efe ha.+ 34  Ruo taa, ha na-efe chi ha otú ha na-emebu. O nweghị onye n’ime ha na-efe* Jehova. O nweghịkwa onye na-eso ntụziaka ya, ihe niile o kpebiri, na Iwu ya. O nweghịkwa onye n’ime ha debere iwu Jehova nyere ụmụ Jekọb, onye ọ gbanwere aha ya ka ọ bụrụ Izrel.+ 35  Mgbe ha na Jehova gbara ndụ,+ o nyere ha iwu, sị: “Unu atụla egwu chi ọ bụla ọzọ. Unu akpọrọla ya isiala, unu efela ya ofufe, unu achụkwarala ya àjà.+ 36  Kama ọ bụ Jehova, onye ji ike ya dị ukwuu na aka ya siri ike+ si n’Ijipt kpọpụta unu, ka unu ga na-atụ egwu,+ na-akpọrọ isiala, na-achụkwara àjà. 37  Unu ga na-elezi anya mgbe niile na-eso ntụziaka ya, ihe ndị o kpebiri, na iwu ya ndị o deere unu.+ Unu atụkwala egwu chi ọzọ. 38  Unu echefula ndụ mụ na unu gbara.+ Unu atụkwala egwu chi ọzọ. 39  Kama ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu ka unu ga-atụ egwu, n’ihi na ọ bụ ya ga-anapụta unu n’aka ndị iro unu niile.” 40  Ma mba ndị a erubeghị isi, kama ha na-efe chi ha otú ha na-emebu.+ 41  Ha na-atụ egwu Jehova,+ ma, ọ bụ arụsị ha a pịrị apị ka ha na-efe. Ruo taa, ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha na-akpa àgwà otú ndị nna nna ha kpara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-atụ egwu.”
Ya bụ, n’ebe niile, ma ebe ndị mmadụ na-ebichaghị ma ebe ndị mmadụ bijuru.
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “na-ekwesi olu ike.”
Gụọ Nkọwa Okwu..
Na Hibru, “na-ere onwe ha.”
Ma ọ bụ “ndị niile si n’ezinụlọ Izrel.”
Ma ọ bụ “ha efeghị.”
Ma ọ bụ “otú ha si ekpe okpukpe.”
Ma ọ bụ “na-efe.”
Na Hibru, “na-atụ egwu.”