Zefanaya 3:1-20

  • Jeruselem bụ obodo na-enupụ isi na nke rụrụ arụ (1-7)

  • Ihe Jehova kpebiri ime na oge ọ ga-akpọlata ndị ya (8-20)

    • A ga-agbanwe asụsụ ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha (9)

    • A ga-azọpụta ndị dị umeala n’obi na ndị dị nwayọọ (12)

    • Jehova ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Zayọn (17)

3  Obodo a nke na-enupụ isi, nke rụkwara arụ ma na-emegbu ụmụ amaala ya, ga-ata ahụhụ.+   Ọ naghị ege ntị.+ Ọ naghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya.+ Ọ tụkwasịghị Jehova obi.+ Ọ naghịkwa abịa Chineke ya nso.+   Ndị isi ya bụ ọdụm na-agbọ ụja.+ Ndị na-ekpe ikpe na ya bụ anụ ọhịa wolf ndị na-achụ nta anụ ná mgbede. Tupu ụtụtụ eruo, ha na-atachapụ ọkpụkpụ niile.   Ndị amụma ya na-akparị mmadụ, na-aghọkwa aghụghọ.+ Ndị nchụàjà ya na-emerụ ihe dị nsọ.+ Ha na-emebi iwu.+   Jehova bụ onye ezi omume, nọrọkwa n’obodo ahụ.+ Ọ naghị eme ihe ọjọọ ọ bụla. N’ụtụtụ ọ bụla, ọ na-eme ka a mara ikpe ziri ezi ọ na-ekpe.+ Ọ naghị ahapụ ime ya otú ahụ chi na-anaghị ahapụ ịbọ. Ma ihere anaghị eme onye ajọ omume.+   “M bibiri mba dị iche iche. M mekwara ka ụlọ nche ndị dị n’isi isi mgbidi ha tọgbọrọ nkịtị. M lara okporo ámá ha n’iyi, nke mere na o nweghị onye na-esi na ya agafe. Obodo ha dị iche iche bụzi ikpo nkume, nke mere na mmadụ afọdụghị na ha, o nweghịkwa onye bi na ha.+   M sịrị, ‘Tụọ egwu m, nabatakwa aka ná ntị m na-adọ gị,’*+Ka a ghara ibibi ebe i bi,+N’ihi na m ga-eme ka ị zaa ajụjụ* maka ihe ndị a niile. Ma, ime ihe ọjọọ na-agụsi ha agụụ ike.+   Jehova kwuru, sị, ‘N’ihi ya, cherenụ m*+Ruo ụbọchị m ga-ebili ịkwakọrọ ihe.* N’ihi na m kpebiri ịchịkọta mba dị iche iche na ịchịkọta alaeze dị iche iche,Iji wesa ha iwe m, wesakwa ha iwe m dị ọkụ.+ N’ihi na iwe m dị ka ọkụ, ọ ga-erepịakwa ụwa niile.+   N’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-agbanwe asụsụ ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha,Ka ha niile wee na-akpọ aha m bụ́ JehovaMa jiri otu obi na-efe m ofufe.’+ 10  Ndị na-arịọsi m arịrịọ ike, ya bụ, ndị m a chụsara achụsa,Ga-esi n’ógbè* osimiri Etiopia wetara m onyinye.+ 11  N’ụbọchị ahụ, a gaghị emenye gị ihereN’ihi isi niile i nupụụrụ m,+Maka na ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-esi n’ime gị wepụ ndị gị dị mpako. Ị gaghịzi adị mpako n’ugwu m dị nsọ.+ 12  M ga-ahapụ ndị dị umeala n’obi na ndị dị nwayọọ ka ha dịrị ndụ.+ Ha ga-agbakwutekwa mụnwa bụ́ Jehova ka m chebe ha.* 13  Ndị fọdụrụ n’Izrel+ agaghị eme ihe ọjọọ.+ Ha agaghị agha ụgha. Ha agaghịkwa eji ọnụ ha ghọgbuo mmadụ. Ha ga-eriju afọ ma dinara ala. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”+ 14  Ndị bi na Zayọn,* tienụ mkpu ọṅụ. Ndị Izrel, tienụ mkpu aṅụrị.+ Ndị bi na Jeruselem,* jirinụ obi unu niile ṅụrịa ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ.+ 15  Jehova akagbuola ikpe a mara unu.+ Ọ chụpụla ndị iro unu.+ Eze Izrel, bụ́ Jehova, nọnyeere unu.+ Unu agaghịzi atụ egwu ọdachi.+ 16  N’ụbọchị ahụ, a ga-asị Jeruselem: “Zayọn, unu atụla egwu.+ Unu adakwala mbà.* 17  Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu.+ Ọ bụ Dike, ọ ga-azọpụtakwa unu. Ọ ga-aṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi unu.+ Afọ ga-eju ya maka na ọ hụrụ unu n’anya. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ n’ihi unu. 18  M ga-akpọkọta ndị na-eru uju maka na ha anọghị n’oge ememme unu.+ Ha anọghị ebe unu nọ n’ihi na ha nọ n’ala ọzọ na-edi nkọcha a na-akọcha ha.+ 19  N’oge ahụ, m ga-emesi ndị niile na-emegbu unu ike.+ M ga-azọpụtakwa onye na-ete ụkwụ.+ M ga-akpọkọtakwa ndị a chụsara achụsa.+ M ga-eme ka a na-eto ha, aha ha ana-edekwa udeN’ala niile e menyere ha ihere. 20  N’oge ahụ, m ga-akpọlata unu. N’oge ahụ, m ga-akpọkọta unu. Mgbe m ga-eme ka ndị unu a dọọrọ n’agha lọta,M ga-eme ka aha unu na-ede ude, meekwa ka a na-eto unu+ n’ihu ndị niile nọ n’ụwa. Unu ga-ahụ ka ihe a na-eme.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ị taa ahụhụ.”
Ma ọ bụ “ọdụ m na-adụ gị.”
Ma ọ bụ “nweenụ ndidi, chere m.”
O nwere ike ịbụ, “m ga-ebili ka onye akaebe.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Na Hibru, “Ha ga-agbabakwa n’aha Jehova.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
Na Hibru, “Ekwela ka aka gị kụda.”