Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti 1:1-20

  • Ekele (1, 2)

  • Ihe Pọl kwuru gbasara ndị na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu (3-11)

  • E meere Pọl amara (12-16)

  • Eze mgbe ebighị ebi (17)

  • ‘Na-alụ agha dị mma anyị na-alụ’ (18-20)

1  Chineke bụ́ Onye Nzọpụta anyị nakwa Kraịst Jizọs, onye mere ka anyị nwee olileanya,+ nyere mụnwa bụ́ Pọl ikike ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs.  M na-edetara gịnwa bụ́ Timoti*+ akwụkwọ ozi a. Ị bụ ezigbo nwa m+ nke mụ na ya kweere n’Onyenwe anyị. Ka Chineke bụ́ Nna nakwa Kraịst Jizọs Onyenwe anyị meere gị amara na ebere, meekwa ka udo dịrị gị.  Otú ahụ m gwara gị ka ị nọrọ n’Efesọs mgbe m chọrọ ịgawa Masedonia, ka m na-agwakwa gị ugbu a ka ị ka nọrọ ebe ahụ iji gwasie ụfọdụ ndị ike ka ha ghara izi ozizi dị iche,  ka ha gharakwa ịṅa ntị n’akụkọ ụgha+ nakwa n’okwu gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche. O nweghị uru ọ bụla ihe ndị a bara,+ kama, ihe ha na-akpata bụ ịrụ ụka na-enweghị isi. Ha esoghịkwa n’ihe Chineke ji eme ka okwukwe anyị sie ike.  N’eziokwu, ihe mere m ji kwuo ihe ndị a bụ ka anyị jiri obi dị ọcha hụ ndị ọzọ n’anya,+ ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma, ka anyị nwee okwukwe,+ gharakwa ịbụ ndị ihu abụọ.  Ụfọdụ ndị ajụla ịna-eme ihe ndị a, malitezie ịna-ekwu okwu na-enweghị isi na ọdụ.+  Ha na-achọ ka ha bụrụ ndị na-akụzi+ iwu Chineke,* ma, ihe ndị ha na-ekwu na ihe ndị ọnụ na-aka ha ịkụzi edoghị ha anya.  Anyị ma na Iwu Chineke dị mma ma ọ bụrụ na mmadụ ana-edebe ya otú kwesịrị ekwesị.  Ihe ọzọ bụkwa na ọ bụghị n’ihi onye ezi omume ka Chineke ji nye iwu ndị o nyere, kama, ọ bụ n’ihi ndị na-emebi iwu+ na ndị isi ike, ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na ndị mmehie, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ* na ndị na-emerụ ihe dị nsọ, ndị na-egbu nne ha, nna ha, ma ọ bụ ndị ọzọ, 10  ndị na-akwa iko,* ụmụ nwoke ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha,* ndị na-atọrọ mmadụ, ndị ụgha, ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ihe ọ bụla ọzọ dị iche n’eziokwu a na-akụziri anyị,+ 11  nke bụ́ ozi ọma dị ebube a họpụtara m ka m na-ezisa.+ Ozi ọma a si n’aka Chineke, onye obi ụtọ. 12  Ana m ekele Kraịst Jizọs Onyenwe anyị, onye nyere m ike, gwakwa m ka m na-ejere ya ozi, n’ihi na ọ gụrụ m n’onye a tụkwasịrị obi,+ 13  ọ bụ eziokwu na n’oge gara aga, ana m ekwulu Chineke, na-akpagbu ndị mmadụ, na-akparịkwa ndị mmadụ.+ Ma, e meere m ebere, n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ, emekwara m ihe ndị ahụ n’ihi na enweghị m okwukwe. 14  Ma, Onyenwe anyị meere m amara na-enweghị atụ. Enwekwara m okwukwe, hụkwa ndị ọzọ n’anya n’ihi na m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 15  Kraịst Jizọs bịara n’ụwa a ka ọ zọpụta ndị mmehie.+ Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, anyị kwesịkwara iji obi anyị niile nabata ya. N’ime ndị mmehie a niile, ọ bụ m kacha bụrụ onye mmehie.+ 16  Ma, ihe mere e ji meere m ebere bụ ka Kraịst Jizọs si n’aka mụnwa kacha bụrụ onye mmehie gosi ndị ga-enwe okwukwe na ya otú o nweruru ndidi, ka ha wee nweta ndụ ebighị ebi.+ 17  Ka Eze mgbe ebighị ebi,+ onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,+ onye a na-enweghị ike ịhụ anya,+ onye naanị ya bụ Chineke,+ bụrụ onye a na-asọpụrụ na onye a na-eto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 18  Timoti nwa m, ihe ndị a m na-agwa gị dabara n’ihe ndị amụma kwuru banyere gị. Ana m agwa gị ha ka i nwee ike na-alụ agha a dị mma anyị na-alụ.+ 19  Akwụsịla inwe okwukwe na akọnuche na-arụ ọrụ nke ọma,+ nke ụfọdụ na-enweghịzi, okwukwe ha ekpuo ka ụgbọ. 20  Haịmeniọs+ na Alegzanda so ná ndị a. Enyefeekwala m ha n’aka Setan+ ka ha jiri maka aka ná ntị a dọrọ ha kwụsị ịna-ekwulu Chineke.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Timoti pụtara “Onye Na-asọpụrụ Chineke.”
Na Grik, “ndị na-akụzi iwu.”
Ma ọ bụ “ndị na-anaghị egosi ịhụnanya pụrụ iche.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “ụmụ nwoke ndị ha na ụmụ nwoke na-enwe mmekọahụ.”