Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Chọrọ Ka A Na-akwanyere Ụmụ Nwaanyị Ùgwù

Chineke Chọrọ Ka A Na-akwanyere Ụmụ Nwaanyị Ùgwù

Chineke Chọrọ Ka A Na-akwanyere Ụmụ Nwaanyị Ùgwù

MGBE Jizọs nọ n’ụwa, ihe ndị o mere gosiri nnọọ ụdị onye Nna ya nke eluigwe bụ. Jizọs kwuru, sị: “Adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m. . . . M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:28, 29; Ndị Kọlọsi 1:15) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị eleba anya n’otú Jizọs na ụmụ nwaanyị si kwurịta okwu na otú o si kpaso ha àgwà, anyị ga-aghọta otú Chineke si ele ụmụ nwaanyị anya na ihe ndị ọ chọrọ n’aka ha.

Ihe ndị e dere n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn emeela ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwuo na otú Jizọs si were ụmụ nwaanyị dị nnọọ iche n’otú e si were ụmụ nwaanyị n’oge ọ nọ n’ụwa. Olee otú o si dị iche? Ihe ọ kụziri ọ̀ ka na-eme ka a ghara ịkpọ ụmụ nwaanyị asị n’oge anyị a?

Otú Jizọs Si Kpaso Ụmụ Nwaanyị Àgwà

Jizọs echeghị na naanị uru ụmụ nwaanyị bara bụ ka ha na ụmụ nwoke na-enwe mmekọahụ. Ụfọdụ ndị isi okpukpe ndị Juu kwuru na agụụ inwe mmekọahụ ga na-agụ ụmụ nwoke ma ọ bụrụ na ụmụ nwaanyị ana-abịa ha nso. Ebe ọ bụ na e weere ụmụ nwaanyị ka ndị na-akpata ọnwụnwa, a naghị ekwe ka ha gwa ụmụ nwoke okwu n’ihu ọha ma ọ bụ ka ha pụta èzí ma ha ejighị ákwà kpuchie isi ha. Ma, Jizọs nyere ụmụ nwoke ndụmọdụ ka ha na-ejide onwe ha ka agụụ mmekọahụ ghara iduba ha n’ịkwa iko, ọ gwakwara ha ka ha na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù kama ize ha eze.—Matiu 5:28.

Jizọs kwukwara, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko ma na-emejọ ya.” (Mak 10:11, 12) Ihe a o kwuru gosiri na o kwetaghị ihe ndị nkụzi ndị Juu na-akụzi. Ha na-akụzi na nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm “n’ihi ụdị ihe ọ bụla.” (Matiu 19:3, 9) Ọtụtụ ndị Juu amaghị na ọ bụrụ na nwoke akwaa iko, na o mejọọla nwunye ya. Ndị nkụzi ndị Juu na-akụzi na ọ bụrụ na nwoke akwaa iko, o mejọghị nwunye ya, ma ọ bụrụ na nwaanyị akwaa iko, o mejọọla di ya. Otu akwụkwọ kwuru banyere ihe a Jizọs kwuru, sị, “Jizọs gosiri na ụmụ nwoke akaghị ụmụ nwaanyị mgbe o kwuru na ọ bụrụ na nwoke akwaa iko, na o mejọọla nwunye ya.”

Uru ihe Jizọs kụziri baara anyị n’oge a: N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-akpakọrịta. Ma, ụmụ nwaanyị anaghị atụ ụjọ na ụmụ nwoke ga-abịa ha nso otú na-adịghị mma n’ihi na ụmụ nwoke na-agbalị ka ha ‘na-emeso ụmụ nwaanyị mere okenye dị ka ndị nne, na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne ha ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.’1 Timoti 5:2.

Jizọs wepụtara oge kụziere ụmụ nwaanyị ihe. N’agbanyeghị na otú ndị nkụzi ndị Juu si emeso ụmụ nwaanyị mere ka ụmụ nwaanyị ghara ịma akwụkwọ, Jizọs kụziiri ụmụ nwaanyị ihe, hapụkwa ha ka kwuo ihe dị ha n’obi. Dị ka ihe atụ, ihe Jizọs kụziiri Meri gosiri na uru nwaanyị bara abụghị naanị isi nri n’usekwu. (Luk 10:38-42) Ihe Jizọs kụziiri Mata, bụ́ nwanne Meri, bakwaara Mata uru. Ihe gosiri na ọ baara ya uru bụ otú o si zata ajụjụ Jizọs jụrụ ya mgbe nwanne ya bụ́ Lazarọs nwụrụ.—Jọn 11:21-27.

Jizọs elegharaghị echiche ụmụ nwaanyị anya. N’oge ahụ, ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị Juu chere na ihe ga-eme ka ha nwee obi ụtọ bụ ma nwa ha bụrụ onye amụma ma ọ bụ onye e ji eme ọnụ n’obodo. Otu ụbọchị mgbe otu nwaanyị gwara Jizọs, sị: “Obi ụtọ na-adịrị afọ buru gị na ara ị ṅụrụ!” Jizọs gwara ya na e nwere ihe ka mkpa ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. (Luk 11:27, 28) Jizọs gwara ya na ihe ahụ bụ mmadụ irubere Chineke isi, ọ bụghị iso omenala.—Jọn 8:32.

Uru ihe ndị Jizọs kụziri baara anyị n’oge a: N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị na-aza ajụjụ mgbe a na-amụ ihe. Ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-akwanyere ụmụ nwaanyị katarala ahụ́ ùgwù n’ihi na ụmụ nwaanyị ndị ahụ na-eji àgwà ọma ha ‘akụziri ndị ọzọ ihe dị mma.’ Ha nwekwara ike ịgakwuru Ndịàmà Jehova ibe ha nyere ha aka. (Taịtọs 2:3) Ụmụ nwaanyị na-ekwusakwara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke.—Abụ Ọma 68:11; gụọ igbe bụ́ “Pọl Onyeozi Ò Kwuru na Ụmụ Nwaanyị Ekwesịghị Ikwu Okwu n’Ọgbakọ?” nke dị na peeji a.

Jizọs ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe. N’oge Baịbụl, ndị nne na nna na-eji ụmụ ha ndị nwoke akpọrọ ihe karịa ụmụ ha ndị nwaanyị. Akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ́ Talmud gosiri na nke a bụ eziokwu. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Onye mụtara ụmụ nwoke ụmụ nwoke alaferela. Ma onye mụtara ụmụ nwaanyị ụmụ nwaanyị ahụsiela anya.” Ụfọdụ ndị nne na nna weere ịzụ nwa nwaanyị ka nnukwu ibu ọrụ maka na ọ bụ ha ga-achọtara ya di ma kwụọ onye ga-alụ ya ụgwọ. Ha wekwaara na ọ dịghị ihe nwa ha nwaanyị ahụ ga-emere ha ma ha mee agadi.

Jizọs gosiri na o nweghị ihe nwa nwoke ji kara nwa nwaanyị n’ihi na ọ kpọlitere ada Jeirọs n’ọnwụ otú ọ kpọlitekwara nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ n’obodo Nen. (Mak 5:35, 41, 42; Luk 7:11-15) Mgbe Jizọs gwọchara otu nwaanyị nke “mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ịdị ike ji kemgbe afọ iri na asatọ,” Jizọs kpọrọ nwaanyị ahụ “nwa Ebreham.” O siri ike ịhụ ebe a kpọrọ nwaanyị ụdị aha a n’akwụkwọ niile ndị Juu dere. (Luk 13:10-16) Ihe a ọ kpọrọ nwaanyị ahụ gosiri na o weere nwaanyị ahụ ka nwa afọ obodo otú e si were ụmụ nwoke. O gosikwara na ọ ghọtara na nwaanyị ahụ nwere ezigbo okwukwe.—Luk 19:9; Ndị Galeshia 3:7.

Uru ihe ndị Jizọs kụziri baara anyị n’oge a: Otu ilu a na-atụ n’Eshia kwuru na “mmadụ ịzụ nwaanyị yiri ịgbara onye agbata obi ya mmiri n’ubi.” Ezigbo Ndị Kraịst bụ́ nna anaghị ewere ụmụ ha ndị nwaanyị otú ahụ, kama ha na-elekọta ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị nke ọma. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-azụ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị n’ụlọ akwụkwọ, na-agwọkwa ha mgbe ha na-arịa ọrịa.

Jizọs tụkwasịrị ụmụ nwaanyị obi. N’ụlọikpe ndị Juu, a na-ewere akaebe nwaanyị gbara ka akaebe ohu gbara. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs, onye dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, kwuru, sị: “Unu anabatala akaebe ọ bụla nwaanyị gbara n’ihi na ụmụ nwaanyị abụghị ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi.”

Ma Jizọs eleghị ụmụ nwaanyị anya otú ahụ. Ọ bụ ụmụ nwaanyị bụ ndị mbụ ọ gwara ka ha gaa kọọrọ ndị ọzọ na a kpọlitela ya n’ọnwụ. (Matiu 28:1, 8-10) N’agbanyeghị na ụmụ nwaanyị a hụrụ mgbe e gburu Jizọs na mgbe e liri ya, ma mgbe ha gwara ndịozi Jizọs na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, ndịozi ahụ ekwetaghị ihe ha kwuru. (Matiu 27:55, 56, 61; Luk 24:10, 11) Ma, ebe ọ bụ na ụmụ nwaanyị bụ ndị mbụ Kraịst pụtara n’ihu ha mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, Kraịst gosiri na ụmụ nwaanyị kwesịkwara ịgba akaebe otú ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị nwoke, na-agba.—Ọrụ Ndịozi 1:8, 14.

Uru ihe ndị Jizọs kụziri baara anyị n’oge a: Ụmụ nwoke ndị na-elekọta ọgbakọ Ndịàmà Jehova anaghị eleda ihe ụmụ nwaanyị kwuru anya. Ndị bụ́ di n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ‘na-enye ndị nwunye ha nsọpụrụ.’ Otu ụzọ ha si eme nke a bụ na ha na-ege ha ntị nke ọma mgbe ha na-ekwu okwu.—1 Pita 3:7; Jenesis 21:12.

Ime Ihe Ndị E Kwuru na Baịbụl Na-eme Ka Ụmụ Nwaanyị Nwee Obi Ụtọ

Ọ bụrụ na ụmụ nwoke ana-akpa àgwà ka Kraịst, ọ ga-eme ka a na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù otú Chineke bu n’obi mgbe o kere mmadụ, meekwa ka ụmụ nwaanyị ghara ịdị ka hà bụ́ ohu. (Jenesis 1:27, 28) Ndị Kraịst bụ́ di anaghị eleda ndị nwunye ha anya. Ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, nke a na-emekwa ka ndị nwunye ha na-enwe obi ụtọ.—Ndị Efesọs 5:28, 29.

Dị ka ihe atụ, mgbe Yelena malitere ịmụ Baịbụl, di ya nọ na-emegbu ya. Otu ihe kpatara nke a bụ na n’ebe di ya nọ too, ụmụ nwoke na-eti ụmụ nwaanyị ihe. N’ebe ahụ, nwoke nwere ike ịga tọrọ nwaanyị ọ bụla ọ chọrọ ịlụ. Yelena kwuru, sị: “Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka obi sie m ike. M mụtara na e nwere onye hụrụ m n’anya nke ukwuu ma jiri m kpọrọ ihe. M ghọtakwara na ọ bụrụ na di m amalite ịmụ Baịbụl, o nwere ike ịkwụsị ihe ọjọọ niile ọ na-eme m.” Di ya mechara malite ịmụ Baịbụl, e mechakwara mee ya baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Yelena kwuziri, sị: “Di m mechara mụta ijide onwe ya ma kwụsị ihe ọjọọ niile ọ na-eme m. Anyị amụtakwala ịna-agbaghara ibe anyị.” Olee ihe Yelena mechara kwuo? O kwuru, sị: “Ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka di m jiri m kpọrọ ihe, o meekwala ka mụ na di m dịrị ná mma.”—Ndị Kọlọsi 3:13, 18, 19.

Ọ bụghị naanị Yelena ka ụdị ihe a metụrụla. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ ugbu a n’ihi na ha na ndị di ha na-agbalịsi ike ime ihe Baịbụl kwuru banyere alụmdi na nwunye. Ahụ́ na-eru ha ala ma ha na Ndị Kraịst ibe ha nọrọ, Ndị Kraịst ibe ha na-akwanyekwara ha ùgwù.—Jọn 13:34, 35.

Ndị Kraịst niile maara na “e doro ihe e kere eke,” ya bụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, “ịbụ ihe efu.” N’ihi ya, ha niile ka bụ ndị mmehie na ndị na-ezughị okè. Ma, ha na-atụ anya na a ga-eme ka ha ‘nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke’ ma ọ bụrụ na ha na Jehova, bụ́ Nna nke hụrụ anyị n’anya, adịrị ná mma. O doro anya na ihe ga-adịrị ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị mma n’oge ahụ n’ihi na Chineke ji mmadụ niile kpọrọ ihe.—Ndị Rom 8:20, 21.

[Igbe dị na peeji nke 9]

Pọl Onyeozi Ò Kwuru na Ụmụ Nwaanyị Ekwesịghị Ikwu Okwu n’Ọgbakọ?

Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka ụmụ nwaanyị na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ.” (1 Ndị Kọrịnt 14:34) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ọ̀ na-ekwu na ụmụ nwaanyị amaghị ihe? Mba. N’eziokwu, o kwudịrị ọtụtụ ugboro banyere otú ụfọdụ ụmụ nwaanyị si kụziere ndị ọzọ ihe. (2 Timoti 1:5; Taịtọs 2:3-5) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ gwara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị nwere onyinye ibu amụma na ịsụ asụsụ dị iche iche n’ọgbakọ ka ha “gbachie nkịtị” mgbe Onye Kraịst ibe ha na-ekwu okwu. * (1 Ndị Kọrịnt 14:26-30, 33) Ọ ga-abụ na ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst anaghị ejideli onwe ha nke na ha na-anapụ onye na-ekwu okwu okwu n’ọnụ mgbe ha chọrọ ịjụ ajụjụ, dị ka ndị Gris na-eme n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na Pọl achọghị ka ụdị ihe ahụ na-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ gwara ụmụ nwaanyị ka ha ‘na-ajụ di ha n’ụlọ.’—1 Ndị Kọrịnt 14:35.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ọrụ ụmụ nwaanyị kwesịrị ịna-arụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, gụọ isiokwu bụ́ “Ụmụ Nwaanyị Bụ́ Ndịàmà Jehova Hà Na-akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl?” Ọ dị na peeji nke 23.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ bụ Meri Magdalin ka Jizọs gwara ka ọ gaa kọọrọ ndịozi ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 11]

Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù