Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugbu A Amatala M Chineke M Na-efe

Ugbu A Amatala M Chineke M Na-efe

 Ugbu A Amatala M Chineke M Na-efe

AKỤKỌ MARIETA MANUEL BACUDIO KỌRỌ

Otu pastọ e kwuru na o nwere ikike e ji agwọ ọrịa bịara ememme e ji chie m pastọ. Ozugbo o bitụrụ m aka, adara m n’ala tụbọọ. Echere m na ọ bụ mmụọ nsọ kwadara m. Mgbe m ghọtara onwe m, ọ bịara dị m ka m̀ nwetala ihe m chọrọ, ya bụ, ikike e ji agwọ ọrịa. Gịnị kpatara ihe ahụ mere n’ụbọchị ahụ, gịnịkwa mechara mee? Tupu mụ azaa ajụjụ ndị ahụ, ka m kọgodị ihe ndị mere mgbe m na-etolite.

A MỤRỤ M n’obodo Ilokos Note, nke dị na Filipinz, n’abalị iri n’ọnwa Disemba, n’afọ 1968. Papa m na mama m mụrụ ụmụ iri, abụ m nwa nke asaa. Anyị bụ ndị Katọlik otú ọtụtụ ndị bi na Filipinz bụkwa. Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’afọ 1986, achọrọ m ịbụ nọọsụ. Ma, o nweghị isi n’ihi na m rịara nnukwu ọrịa mgbe ahụ. Echedịrị m na m ga-anwụ n’ọrịa ahụ. N’ihi ya, m rịọrọ Chineke ka o nyere m aka, gwakwa ya na ọ bụrụ na m gbakee, m ga-eji ndụ m niile jeere ya ozi.

Mgbe m gbakere, echetara m nkwa ahụ m kwere Chineke. Ọ bụ ya mere m ji banye n’ụlọ akwụkwọ ndị pastọ n’ọnwa Jun, n’afọ 1991. Otu n’ime ihe ndị a na-akụziri anyị n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ otú mmadụ ga-esi enweta “onyinye mmụọ nsọ.” M chọkwara inweta ikike e ji agwọ ọrịa. A kụziiri anyị na ikpe ekpere na ibu ọnụ ga-eme ka anyị nweta ikike ahụ. Otu ụbọchị, mgbe m chọrọ igosi ụmụ akwụkwọ ibe m na enwetala m “onyinye mmụọ nsọ” ahụ, m zooro ezoro gaa gee ntị n’ekpere otu nwa klas anyị na-ekpe n’oge ekpere. Mgbe ọ fọrọ obere ka o kpechaa, m mere ngwa ngwa gaghachi n’ebe m nọ na-ekpe ekpere nke m. Mgbe o kpechara, agwara m ya ihe niile o kpere n’ekpere ahụ, ya echee na enwetala m “onyinye mmụọ nsọ” ahụ.

N’oge ahụ m nọ n’ụlọ akwụkwọ, e nwere ọtụtụ ihe na-agbagwoju m anya. Dị ka ihe atụ, Matiu 6:9 kwuru banyere “Nna” anyị nke bi n’eluigwe na ido “aha” ya nsọ. M na-ajụ ndị nkụzi anyị ajụjụ ndị dị ka “Ònye bụ Nna ahụ Jizọs kpọrọ aha n’amaokwu a?” “Oleekwa onye a ga-edo aha ya nsọ?” Ọtụtụ mgbe, ihe ndị na-akụziri anyị ihe na-aza anaghị edo m anya. Ha na-akụziri anyị banyere Atọ n’Ime Otu, ha na-asịkwa na ọ bụ ihe omimi. Ọ naghị edo m anya. N’agbanyeghị nke ahụ, anọgidere m n’ụlọ akwụkwọ ahụ.

Otú Mụ na Ndịàmà Jehova Si Mata

N’ụlọ akwụkwọ ahụ, a kụziiri anyị na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ okpukpe ụgha kacha njọ e nwere. A gwakwara anyị na ha bụ ndị na-emegide Kraịst. Nke a mere ka m kpọọ ha asị.

Mgbe m nọ n’afọ nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, m lara ịga hụ ndị mụrụ m mgbe anyị nọ ezumike. Nwanne m nwaanyị aha ya bụ Carmen nụrụ na m lọtara, ya alọtakwa. N’oge ahụ, Carmen aghọọlarị Onyeàmà Jehova e mere baptizim, na-ekwusakwa ozi ọma oge niile. Mgbe ọ gbalịrị ka ọ kụziere m banyere Chineke, iwe were m, mụ agwa ya, sị:  “Amarala m Chineke m na-efe!” M gwakasịrị ya okwu ahụ́ ma kwapụ ya n’ụzọ, enyeghịkwa m ya ohere ọzọ ịgwa m okwu.

Mgbe m laghachiri n’ụlọ akwụkwọ, Carmen ziteere m otu akwụkwọ aha ya bụ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? * M fụkọtara ya ozugbo tụba ya n’ọkụ. M ka na-ewere Carmen iwe.

Otú M Si Ghọọ Pastọ

Mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, e nwere ndị m kpọbatara na chọọchị anyị. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe mama m na otu nwanne m nwoke batakwara na chọọchị ahụ.

N’ọnwa Mach n’afọ 1994, m gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị pastọ ahụ. Dị ka m kwuru ná mmalite, otu pastọ a ma ama bịara ememme e ji chie anyị pastọ. Anyị niile ndị gụchara akwụkwọ chọrọ ịnọ ya nso n’ihi na anyị kweere na o nwere onyinye ịgwọ ọrịa. Anyị gakwuuru ya n’elu ọlta, soro ya na-awụgharị ma na-akụ aka mgbe a na-akụ egwú. Onye ọ bụla o bitụrụ aka, ya adaa, anyị chekwara na ọ bụ “mmụọ nsọ na-akwada anyị.” Mgbe o bitụrụ m aka, adara m n’ala tụbọọ. Mgbe m ghọtara onwe m, ezigbo ụjọ tụrụ m, ma ọ bịara dị m ka m̀ nwetala ikike ahụ e ji agwọ ọrịa. N’ihi ya, obi tọrọ m ụtọ.

Obere oge ihe a mechara, m ji ikike ahụ gwọọ otu nwatakịrị oké ahụ́ ọkụ ji. Mgbe m kpeere ya ekpere, ọsụsọ malitere ịgba ya, oké ahụ́ ọkụ ahụ ji ya akwụsịkwa. Ọ bụ mgbe ahụ ka m bịara chee na o ruola mgbe m ga-emezu nkwa ahụ m kwere Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-adị m ka ò nwere ihe kọrọ m. N’ime obi m, ekweere m na e nwere naanị otu Chineke, ma amachaghị m onye ọ bụ. Ọ na-adịkwa m ka ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị anyị abụghị eziokwu.

Ihe Ndị Mere Ka M Gbanwee Echiche M

N’oge ahụ, m bịara kpọkwuo Ndịàmà Jehova asị. Mgbe ọ bụla m hụrụ akwụkwọ ha, m na-akpọ ya ọkụ. Ma otu ihe m na-atụghị anya ya mere. O juru m anya mgbe m chọpụtara na mama m akwụsịla ịga chọọchị anyị. Carmen amalitela ịkụziri ya Baịbụl! Ihe a nwanne m mere were m ezigbo iwe.

Ma otu ụbọchị, m hụrụ otu Teta! n’ụlọ mama m. Ọ bụrụ mgbe mbụ, m gaara agba ya ọkụ. Ma ebe ọ bụ na m chọrọ ịmata ihe mama m na-agụta n’akwụkwọ ahụ, m sapewere ya. Ka m na-asape ya, ahụrụ m otu isiokwu nke kọrọ banyere otu onye nke na-ejighị chọọchị ya egwuri egwu, ma mgbe ọ malitere ịgụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova nakwa Baịbụl, ọ bịara doo ya anya na nkụzi Atọ n’Ime Otu na ọkụ mmụọ esighị na Baịbụl. Ọ ghọtakwara na ọ bụghị eziokwu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ihe a m gụrụ ruru m n’obi. M nọ kemgbe na-achọ otú m ga-esi aghọta ihe ndị ahụ. Malite mgbe ahụ gawa, m chọwara otú m ga-esi aghọta ihe Baịbụl na-akụzi.

M gụkwara otu Teta! ọzọ nke kọrọ otú otu onye aṅụrụma nke na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ si kwụsị ịṅụ oké mmanya na ọgwụ ọjọọ mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl. Nke a mere ka m malite ịgụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ.  Ahụrụ m otu akwụkwọ aha ya bụ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi. * Mgbe m gụrụ akwụkwọ ahụ, m mụtara na aha Chineke bụ Jehova. Obi tọrọ m ụtọ na m matala onye ezi Chineke bụ!—Diuterọnọmi 4:39; Jeremaya 10:10.

M nọgidere na-agụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova na nzuzo, na-amụtakwa ọtụtụ ihe na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ ndị pastọ, a kụziiri anyị na Jizọs bụ Chineke, ma m si na Baịbụl mụta na Jizọs bụ “Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:15, 16.

Agbanwere M Obi M

N’oge ọzọ m hụrụ Carmen, o juru ya anya mgbe m gwara ya ka o nye m akwụkwọ ahụ a na-akpọ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi na akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara. N’agbanyeghị na m gụrụ akwụkwọ ọtụtụ afọ n’ụlọ akwụkwọ ndị pastọ, a kụzighịrị m eziokwu n’ebe ahụ. Adị m ka onye ìsì. Obi na-atọzi m ụtọ ugbu a n’ihi ihe ndị m na-amụta na Baịbụl. M bịara ghọta na ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Eziokwu ahụ m na-amụta malitere ịgbanwe ndụ m.

N’oge ahụ, m chere na m nwere ike izoro ezoro na-efe Jehova Chineke ma bụrụkwa pastọ. Ma n’oge na-adịghị anya, m chọpụtara na ọ na-esiri m ike ịkụzi ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe ndị nọ na-enye m nsogbu n’obi. M nọ na-eche otú m ga-esi na-akpata ego ma m kwụsị ịbụ pastọ. Ọ bụrụkwa na m ghọọ Onyeàmà Jehova, ihere ga-emekwa ndị chọọchị anyị na otu pastọ ha aghọọla Onyeàmà Jehova! N’ihi ya, m nọgidere na chọọchị ahụ, ma akwụsịrị m ịkụzi nkụzi ụgha ndị a na-akụzi na chọọchị anyị.

Mgbe ọzọ m hụrụ Carmen, ọ gwara m ka m gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ebe ọ bụ na m na-agakarị ahụ ndị isi chọọchị anyị n’obodo a na-akpọ Lawag, otu ụbọchị, m zooro ezoro gaa chọta otu Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ. Mgbe m ruru, e gosiri m otu Onyeàmà Jehova. Aha ya bụ Alma Preciosa Villarin, ma ọtụtụ ndị na-akpọ ya “Precious.” Ọ na-ekwusa ozi ọma oge niile. Ọ bụ eziokwu na obi akachabeghị m ịbụ Onyeàmà Jehova, m kwetara ka ọ malite ịkụziri m Baịbụl.

Nwanne m nwaanyị ji ndidi na-akụziri m Baịbụl kemgbe. Abịakwara m hụ na Precious na-emekwa ka nwanne m, o ji ndidi na-eso m. O nyeere m aka ịghọta Baịbụl nke ọma n’agbanyeghị na iwe na-ejide m mgbe ụfọdụ, mụ arụwa ya ụka ma ọ bụkwanụ bawa mba ma na-esi ọnwụ na ihe ụfọdụ a kụzibuuru m bụ eziokwu. Àgwà ọma Precious na Ndịàmà  Jehova ndị ọzọ na-akpaso m na otú ha si jiri obiọma na-enyere m aka ruru m n’obi. Nke a mere ka m kpebie ife Jehova.

N’ọnwa Julaị n’afọ 1995, m bịara ghọta na ọ bụrụ na m chọrọ ife Jehova, m ga-akwụsịrịrị ịbụ pastọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Mkpughe 18:4 kwuru banyere okpukpe ụgha, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, ma ọ bụrụkwa na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.” Oleekwanụ otú m ga-esi na-akpata ego? Amụtara m ná Ndị Hibru 13:5 na ọ bụrụ na anyị emee uche Chineke, Chineke ga-emezu nkwa o kwere anyị nke bụ́: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”

Ọ bụ eziokwu na papa m na nwanne m nwoke achọtụdịghị ka m kwụsị ịbụ pastọ, ma m katara obi gaa kpọọ ihe niile m ji arụ ọrụ pastọ ọkụ mgbe ọ fọrọ izu abụọ ka e mee m baptizim. Mgbe m kpọchara ihe ndị ahụ ọkụ, achọpụtara m na ike ahụ e nyere m adịkwaghị. Tupu mgbe ahụ, ọ na-abụ m hiwe ụra, ya adị m ka è nwere ihe na-anyịgide m. Ma ihe ahụ kwụsịkwara ime m. O nwekwara ihe dị inyoghị inyoghị m na-ahụbu na windo ụlọ m, ma anaghịzi m ahụ ya. Ịmụ Baịbụl emeela ka m mata na onyinye mmụọ nsọ ndị mmadụ na-ekwu na ha nwere taa, dị ka ikike e ji agwọ ọrịa, esighị n’aka Chineke, kama o si n’aka ndị mmụọ ọjọọ. Obi dị m ụtọ na enwerela m onwe m n’aka ndị mmụọ ọjọọ otú ahụ otu nwa agbọghọ na-eje ozi si nwere onwe ya n’aka “mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase” mgbe Pọl chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ.—Ọrụ Ndịozi 16:16-18.

Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na e mere mụ na mama m baptizim n’otu ụbọchị na Septemba n’afọ 1996, anyị aghọọ Ndịàmà Jehova. Mgbe e mechara m baptizm, m malitere ikwusa ozi ọma oge niile. M kwusakwara ozi ọma oge niile ruo ọtụtụ afọ.

Ugbu a m lụọla di. Aha di m bụ Silver. Anyị abụọ na-agbalịsi ike ka anyị kụziere nwa anyị eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ụfọdụ ụmụnne m aghọọkwala Ndịàmà Jehova. Ọ bụ eziokwu na ọ na-ewute m na amaghị m Chineke kemgbe ọtụtụ afọ, obi dị m ezigbo ụtọ na ugbu a amatala m Chineke m na-efe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a naghịzi ebipụta ya.

^ par. 18 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

M ji ikike ahụ gwọọ otu nwatakịrị oké ahụ́ ọkụ ji

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Eziokwu m na-amụta malitere ịgbanwe ndụ m

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Obi tọrọ m ụtọ na m matala onye ezi Chineke bụ!

[Foto dị na peeji nke 13]

Mgbe m gụchara akwụkwọ ghọọ pastọ

[Foto dị na peeji nke 14, 15]

Ọ bụ Precious kụziiri m Baịbụl

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe e mere mụ na mama m baptizim

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe m na-ekwusa ozi ọma oge niile

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na di m na nwa anyị nwaanyị na ọtụtụ ndị ikwu m ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova