Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obiọma Bụ Àgwà Dị Mkpa n’Anya Chineke

Obiọma Bụ Àgwà Dị Mkpa n’Anya Chineke

 Obiọma Bụ Àgwà Dị Mkpa n’Anya Chineke

IHE ọma otu agadi nwoke obi ruru ala na-emere otu nwa okorobịa onye Japan ruru nwa okorobịa ahụ n’obi. Ọ dịchabeghị anya agadi nwoke ahụ bịara na Japan ikwusa ozi ọma, ọ mụtachabeghịkwa otú e si asụ asụsụ ndị Japan. N’agbanyeghị ihe ndị a, kwa izu, ọ na-abịa n’ụlọ nwa okorobịa ahụ na-akụziri ya Baịbụl. Nwa okorobịa ahụ na-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ na-eji ndidi aza ya ihe ọ bụla ọ jụrụ ya. Ihu na-abụkwa agadi nwoke ahụ ọchị ọchị mgbe niile.

Nwa okorobịa ahụ agaghị echefu otú agadi nwoke ahụ si jiri obiọma nyere ya aka. Nwa okorobịa ahụ kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na Baịbụl nwere ike ime ka mmadụ dị obiọma otú a ma hụ ndị ọzọ n’anya, ọ dịghị ihe ga-eme ka m ghara ịmụ Baịbụl.’ Ọ bụ nke a mere o ji nwee mmasị ịmụ Baịbụl n’agbanyeghị na ọ gụbeghị Baịbụl mbụ. N’eziokwu, àgwà ọma anyị na ihe ọma anyị na-emere ndị mmadụ na-aka eru ha n’obi karịa okwu anyị na-agwa ha.

Obiọma Bụ Àgwà Si n’Aka Chineke

Anyị na-ejikarị obiọma emeso ndị ikwu anyị ihe. Ma n’eziokwu, obiọma bụ àgwà si n’aka Chineke. Jizọs kwuru na Nna ya nke eluigwe na-emere ma ndị hụrụ Ya n’anya ma “ndị na-enweghị ekele” ihe ọma. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-emere ndị ọzọ ihe ọma otú Chineke si eme. O kwuru, sị: “Unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.”—Luk 6:35; Matiu 5:48; Ọpụpụ 34:6.

Ebe ọ bụ na Chineke kere ụmụ mmadụ n’onyinyo ya, ụmụ mmadụ nwere ike ịdị obiọma ka Chineke. (Jenesis 1:27) N’eziokwu, anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ka Chineke ma na-emere ma ndị ikwu anyị ma ndị ọzọ ihe ọma. Baịbụl kwuru na obiọma so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ike Chineke nke na-arụ ọrụ mgbe niile. (Ndị Galeshia 5:22) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ amụtakwuo banyere Chineke, bụ́ Onye kere anyị, ya na Chineke adịrịkwuo ná mma, onye ahụ ga-adị obiọma.

E nwere ezigbo ihe mere Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-enwe obiọma n’ebe ibe anyị nọ.’ (Ndị Efesọs 4:32) Nke mbụ bụ na ọ na-amasị ụmụ mmadụ imere ndị ọzọ ihe ọma. Nke abụọ abụrụ na Chineke chọrọ ka anyị na-eme otú ahụ. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Unu echefula ile ọbịa,” ma ọ bụ ‘unu echefula imere ndị unu na-amaghị ihe ọma.’—Ndị Hibru 13:2.

Ọ̀ dị mma ka anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ma ndị anyị na-amaghị, n’agbanyeghị na obi tara ọtụtụ ndị mmiri n’oge a? Olee ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ? Gịnị mere imere ndị ọzọ ihe ọma ji gbasa anyị?

Chineke Chọrọ Ka Anyị Dị Obiọma

Mgbe Pọl onyeozi gwachara anyị ka anyị na-emere ndị anyị na-amaghị ihe ọma, o kwukwara, sị: “Ụfọdụ lere ndị mmụọ ozi ọbịa n’amaghị ama.” Olee otú obi ga-adị gị ma i lee ndị mmụọ ozi ọbịa? Ma ihe Pọl na-ekwu bụ na ndị ahụ lere ndị mmụọ ozi ọbịa “n’amaghị ama.” Nke a pụtara na ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ma ndị anyị na-amaghị, Chineke nwere ike ịgọzi anyị n’ụzọ ndị anyị na-atụghị anya ha.

Ọtụtụ Baịbụl nwere ihe e dere n’etiti peeji ha nke ọ bụla. Ihe ndị ahụ na-egosi ebe ndị ọzọ mmadụ nwere ike ịgụ na Baịbụl ka ọ ghọtakwuo ihe ọ na-agụ. Ọtụtụ Baịbụl ndị dị otú ahụ gosiri na mgbe Pọl gwara anyị ka anyị na-ele ọbịa, o bu ihe e dere na Jenesis isi nke 18 na nke 19 n’obi. Ebe ndị ahụ kọrọ banyere Ebreham na Lọt ma kwuo na ndị mmụọ ozi bịara zie ha ozi dị mkpa. Ma n’oge ahụ, ha amaghị na ndị ahụ bụ ndị mmụọ ozi. Mgbe ha bịakwutere  Ebreham, ha gwara ya na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-emezu nkwa o kwere ya nke bụ́ na ọ ga-amụta nwa nwoke. Ndị mmụọ ozi ahụ gwakwara Lọt na ha bịara ịkpọpụta ya na ezinụlọ ya ka a ghara ibibi ha mgbe ha na-ebibi Sọdọm na Gọmọra.—Jenesis 18:1-10; 19:1-3, 15-17.

Ọ bụrụ na ị gụọ ebe ndị ahụ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na ma Ebreham ma Lọt lere ndị na-agafe agafe ha na-amaghị ọbịa. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-ele ndị njem na ndị na-agafe agafe ọbịa, ma ndị ahụ hà bụ ndị ikwu ha na ndị enyi ha ma ọ bụ na ha abụghị. Chineke gwadịrị ndị Izrel n’iwu o nyere ha ka ha na-enyere ndị ọbịa bi n’ala ha aka. (Diuterọnọmi 10:17-19) Ma ihe Ebreham na Lọt meere ndị ahụ ha na-amaghị karịrị ihe e mechara gwa ụmụ Izrel ka ha na-eme. Ebreham na Lọt gbara ezigbo mbọ lee ndị ahụ ọbịa pụrụ iche, Chineke gọzikwara ha maka ya.

Ihe ọma ahụ Ebreham mere mere ka a gọzie ya, ya amụta nwa nwoke. Nke ahụ mekwara ka a gọzie anyị. Olee otú nke ahụ si mee ka a gọzie anyị? Chineke ji Ebreham na nwa ya Aịzik mezuo uche ya. E si n’ezinụlọ ha mụta Mesaya ahụ, bụ́ Jizọs. Ihe Ebreham na Aịzik mere gosiri ihe Chineke mechara mee iji zọpụta ụmụ mmadụ. Chineke mere ihe ahụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, bụrụkwa Chineke obiọma.—Jenesis 22:1-18; Matiu 1:1, 2; Jọn 3:16.

Ihe ndị ahụ a kọrọ na Baịbụl gosiri ihe Chineke chọrọ ka ndị ọ hụrụ n’anya na-eme, gosikwa na obiọma bụ àgwà dị mkpa n’anya Chineke. Ọ chọkwara ka anyị dị obiọma.

Imere Ndị Ọzọ Ihe Ọma Ga-eme Ka Anyị Matakwuo Chineke

Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị n’oge anyị a ga-abụ “ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ.” (2 Timoti 3:1-3) O doro anya na ị na-ahụ ụdị ndị ahụ kwa ụbọchị. Ma ọ bụghị nke ahụ ga-eme ka anyị ghara ịna-emere ndị mmadụ ihe ọma. A gwara Ndị Kraịst, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. Na-emenụ ihe dị mma n’anya mmadụ niile.”—Ndị Rom 12:17.

Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ịhụnanya . . . nwekwara ihe ọmụma banyere Chineke.” Otu ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ịna-emere ha ihe ọma. (1 Jọn 4:7; 1 Ndị Kọrịnt 13:4) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, anyị na-amatakwu onye Chineke bụ, nke a na-emekwa ka anyị nwekwuo obi ụtọ. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’Ugwu Oliv, o kwuru, sị: “Na-emekwanụ ihe ọma . . . ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kasị Elu.”—Luk 6:35.

Ka anyị hụ ihe mere otu nwaanyị onye Japan nke aha ya bụ Aki. Aki mụrụ ụmụ nwoke abụọ. Mgbe mama ya nwụrụ na  mberede, obi gbawara ya. Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ ya oké njọ nke na a na-akpọga ya na nke dọkịta. Otu ụbọchị, otu ezinụlọ kwabatara n’ebe dị nso n’ụlọ ha. Nna nwe ezinụlọ ahụ nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ, ya afọzie nwunye ya na obere ụmụ ha ise. Aki meteere ezinụlọ a ebere ma gbalịa ka ya na nwaanyị ahụ na ụmụ ya dịrị ná mma. Aki na-eme ihe niile o nwere ike ime iji nyere ha aka, dị ka inye ha ihe oriri, uwe, na ihe ndị ọzọ. Mgbe ọ na-eme ihe ndị a, ọ chọpụtara na ahụ́ bịara dị ya mma. Ọ hụrụ na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) N’eziokwu, imere ndị ọzọ ihe ọma bụ ihe kacha mma i nwere ike imere onwe gị mgbe ị nọ ná mwute.

‘Ịgbazinye Jehova Ihe’

Imere ndị mmadụ ihe ọma enweghị oké ihe ọ ga-efu anyị. Ọ bụkwanụghị inwe ọkpụkpụ aka ma ọ bụ inwe ọgụgụ isi ga-eme ka ịna-emere ndị mmadụ ihe ọma. Ihe ụfọdụ anyị nwere ike imere ndị ọzọ bụ ịmụmụrụ ha ọnụ ọchị, ịgwa ha okwu ọma, inyere ha aka n’ihe ha na-eme, inye ha obere onyinye, na ịhapụ ha ka ha buru anyị ụzọ nweta ihe mgbe anyị na ha kwụ n’ahịrị. Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme n’oge ụfọdụ, ihe i kwesịrị ikwu ma ọ bụ mee bụ ihe ị maara bụ́ ihe ọma. Otú agadi nwoke ahụ anyị kọrọ akụkọ ya ná mmalite isiokwu a si jiri obiọma na-enyere nwa okorobịa ahụ ọ na-akụziri Baịbụl aka ruru nwa okorobịa ahụ n’obi karịa ihe agadi nwoke ahụ na-agwa ya. Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji chọọ ka ndị na-efe ya ‘hụ obiọma n’anya.’—Maịka 6:8.

E nwere otu ilu a na-atụ n’Eshia. Ilu ahụ kwuru na “otu ihe ọma i meere mmadụ ga-abara ya uru ruo ogologo oge.” Ọ bụrụ na i ji obi gị niile meere mmadụ ihe ọma, nke ka nke, ma ọ bụrụ na i mere ya n’ihi na ị hụrụ Chineke n’anya, obi ga-atọ ma gị ma onye ahụ i meere ya ụtọ. Ọ bụrụgodị na onye i meere ihe ọma ekeleghị gị, nke ahụ apụtaghị na ihe ahụ i meere ya abaghị uru. Ihe ahụ i mere dị mma n’anya Chineke. Baịbụl kwuru na mgbe anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, anyị “na-agbazinye Jehova ihe.” (Ilu 19:17) N’ihi ya, gbalịa ka ị na-emere ndị ọzọ ihe ọma.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme n’oge ụfọdụ, ihe i kwesịrị ikwu ma ọ bụ mee bụ ihe ị maara bụ́ ihe ọma

[Foto dị na peeji nke 19]

A gọziri Ebreham maka na o meere ndị ọzọ ihe ọma

[Foto dị na peeji nke 20]

Mgbe anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, anyị “na-agbazinye Jehova ihe”