Ozi Ọma Mak Dere 5:1-43

  • Jizọs chụbara ndị mmụọ ọjọọ n’ime ìgwè ézì (1-20)

  • Ada Jaịrọs; otu nwaanyị bitụrụ uwe Jizọs aka (21-43)

5  Ha wee rute n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ n’obodo ndị Gerasa.+  Ozugbo Jizọs pụtara n’ụgbọ mmiri ahụ, otu nwoke mmụọ ọjọọ* ji si n’ebe a na-eli ozu* bịakwute ya.  O bi n’ebe ahụ a na-eli ozu. Tupu mgbe ahụ, e nwetụbeghị onye nwere ike ike ya agbụ ya aghara ịdọbi ya, ọ sọgodị ya bụrụ agbụ ígwè.  A tụọkwala ya ịga n’ụkwụ nakwa n’aka ọtụtụ ugboro, ma ọ kụjiri ịga ndị ahụ. E nweghịkwa onye nwere ike ijide ya.  Ọ na-eti mkpu mgbe niile, ma n’ehihie ma n’abalị, n’ebe a na-eli ozu nakwa n’ugwu, jirikwa nkume na-ebekasị onwe ya ahụ́.  Ma mgbe ọ nọ n’ebe dị anya hụ Jizọs, ọ gbaara ọsọ gaa kpọọrọ ya isiala.+  O wee tie mkpu n’oké olu, sị: “Jizọs, Ọkpara Chineke Onye Kacha Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị? Jiri Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị emekpa m ahụ́.”+  Ọ bụ n’ihi na Jizọs nọ na-asị ya: “Gị mmụọ ọjọọ,* si n’ime nwoke a pụta.”+  Ma, Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ aha gị?” Ọ sịrị ya: “Aha m bụ Ìgwè, n’ihi na anyị dị ọtụtụ.” 10  O wee na-arịọ Jizọs ka ọ ghara ịchụpụ ha n’obodo ahụ.+ 11  E nwekwara ìgwè ézì+ nọ n’ugwu dị n’ebe ahụ na-ata ahịhịa.+ 12  Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee rịọ ya, sị: “Chụba anyị n’ime ìgwè ézì ndị a, ka anyị banye n’ime ha.” 13  O wee kwe ka ha banye. Ndị mmụọ ọjọọ* ahụ pụtara banye n’ime ézì ndị ahụ. Ézì ndị ahụ nuuru daba n’oké osimiri. Ha dị ihe dị ka puku ézì abụọ (2,000). Oké osimiri wee rie ha. 14  Ma ndị na-azụ ézì ndị ahụ gbara ọsọ. Ha gara n’obodo ha nakwa gburugburu ya kọọ ihe merenụ. Ndị mmadụ wee bịa ka ha hụ ihe merenụ.+ 15  Ha bịakwutere Jizọs ma hụ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji, onye ìgwè ndị mmụọ ọjọọ nọbu n’ime ya. Nwoke ahụ yi uwe, nọrọ ọdụ, isi kpakọkwara ya ọnụ. Egwu wee tụọ ha. 16  Ndị hụrụ ihe merenụ kọkwaara ha ihe mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu nakwa ihe mere ézì ndị ahụ. 17  Ha wee malite ịrịọ Jizọs ka ọ pụọ n’ógbè ha.+ 18  Ka Jizọs na-abanye n’ụgbọ mmiri, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu rịọrọ ya ka ya soro ya.+ 19  Ma o kweghị, kama ọ sịrị ya: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe niile Jehova* meere gị nakwa ebere o meere gị.” 20  Nwoke a gawara ma malite ịkọsa n’ime Dikapọlis* ihe niile Jizọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya. 21  Mgbe Jizọs ji ụgbọ gaghachi n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, ìgwè mmadụ gbakọtara n’ebe ọ nọ mgbe ọ ka nọ n’akụkụ oké osimiri ahụ.+ 22  Otu n’ime ndị isi ụlọ nzukọ ndị Juu, onye aha ya bụ Jaịrọs, bịara. Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o gburu ikpere n’ala n’ihu ya.+ 23  Ọ rịọrọ ya arịrịọ ọtụtụ ugboro, sị: “Ọrịa ji obere nwa m nwaanyị aka ọjọọ.* Biko, bịa bikwasị ya aka+ ka ọ gbakee dị ndụ.” 24  Jizọs wee soro ya gawa. Ìgwè mmadụ sokwa ya ma na-adagide ya. 25  E nwere otu nwaanyị nke rịarala ọrịa oruru ọbara+ afọ iri na abụọ.+ 26  Ọ taala nnukwu ahụhụ* n’aka ọtụtụ ndị na-agwọ ọrịa, mefuokwa ihe niile o nwere. Ma ọ gbakebeghị, kama ọrịa ya akala njọ. 27  Mgbe ọ nụrụ banyere Jizọs, o si n’etiti ìgwè mmadụ ahụ bịa n’azụ ya bitụ uwe elu ya aka,+ 28  n’ihi na ọ nọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.”+ 29  Ọrịa oruru ọbara ya lara ozugbo. O wee mata na a gwọọla ya ọrịa ọjọọ ahụ. 30  Jizọs matara ozugbo na ike+ apụọla ya n’ahụ́. O wee tụgharịa n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, jụọ, sị: “Ònye bitụrụ uwe elu m aka?”+ 31  Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Ị hụrụ ka ìgwè mmadụ na-adagide gị, gị ana-ajụ, ‘Ònye bitụrụ m aka?’” 32  Ma, ọ nọ na-elegharị anya ka ọ hụ onye bitụrụ ya aka. 33  Ebe nwaanyị ahụ ma ihe mere ya, ọ tụrụ ụjọ, marakwa jijiji bịa sekpuru ala n’ihu ya wee gwa ya eziokwu niile. 34  Jizọs sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma. Lawa n’udo,+ gbakeekwa n’ọrịa ọjọọ na-arịa gị.”+ 35  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ụfọdụ ụmụ nwoke ndị si n’ụlọ Jaịrọs bịara kwuo, sị: “Nwa gị nwaanyị anwụọla. Ọ baghịzi uru inyewe Onye Ozizi nsogbu.”+ 36  Ma Jizọs nụpeere ihe ha na-ekwu wee sị Jaịrọs: “Atụla egwu,* naanị nwee okwukwe.”+ 37  O kweghị ka onye ọ bụla soro ya ma e wepụ Pita, Jems, na Jọn nwanne Jems.+ 38  Ha wee bịa n’ụlọ Jaịrọs. Jizọs wee hụ otú ebe niile si na-agba ghara ghara, hụkwa ndị na-ebe ákwá ma na-eti mkpu arịrị.+ 39  Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-ebe ákwá ma na-eme ka ebe niile na-agba ghara ghara? Nwatakịrị ahụ anwụbeghị, kama ọ na-ehi ụra.”+ 40  Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo. Ma, ọ chụpụrụ ha niile n’èzí, kpọrọ nne na nna nwatakịrị ahụ na ndị ha na ya so banye n’ebe nwatakịrị ahụ tọgbọ. 41  O wee sere nwatakịrị ahụ n’aka, sị ya: “Talita kumi,” nke pụtara: “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, bilie.”+ 42  Nwata nwaanyị ahụ biliri ozugbo malite ije ije. (Ọ dị afọ iri na abụọ.) Ozugbo ahụ, ha nwere nnukwu obi ụtọ. 43  Ma ọ gwara ha ugboro ugboro* ka ha ghara ime ka onye ọ bụla nụ ihe a.+ O kwukwara ka e nye nwata nwaanyị ahụ ihe ka o rie.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “Obodo Nwere Obodo Nta Iri.”
Ma ọ bụ “Obere nwa m nwaanyị nọ n’ọnụ ọnwụ.”
Ma ọ bụ “O nweela ọtụtụ ihe mgbu.”
Ma ọ bụ “Kwụsị ịtụ ụjọ.”
Ma ọ bụ “o nyesiri ha iwu ike.”