Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mba Niile Ga-amarakwa na Mụ Onwe M Bụ Jehova”

“Mba Niile Ga-amarakwa na Mụ Onwe M Bụ Jehova”

 Bịaruo Chineke Nso

“Mba Niile Ga-amarakwa na Mụ Onwe M Bụ Jehova”

OLEE otú obi ga-adị gị ma mmadụ bo gị ebubo na i mere ihe ọjọọ ị na-emeghị? Ya bụrụkwanụ na ihe o boro gị na i mere kpataara ndị mmadụ nsogbu, kpatakwara ọtụtụ ndị ọ na-enweghị ihe ha mere ahụhụ? O doro anya na ị ga-achọ igosi na aka gị dị ọcha! Ị̀ ma na a na-ebo Jehova ụdị ebubo a? Ọtụtụ ndị taa na-ekwu na ọ bụ Chineke na-akpata mmegbu na ahụhụ ndị juru n’ụwa. Jehova ọ̀ chọrọ ka a kwụsị imebi aha ya otú a e si emebi ya n’ihi ebubo ndị ahụ a na-ebo ya? N’eziokwu, ọ chọrọ! Ka anyị hụ ihe e kwuru n’akwụkwọ Ezikiel.—Gụọ Ezikiel 39:7.

Jehova kwuru, sị: “M gakwaghị ekwe ka e metọọ aha nsọ m.” Mgbe ọ bụla ụmụ mmadụ boro Chineke ebubo na ọ bụ ya na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata, ihe ha na-eme bụ imebi aha ya. Olee otú o si bụrụ imebi aha ya? Na Baịbụl, “aha” mmadụ na-egosikarị ụdị onye mmadụ bụ. Otu akwụkwọ kwuru na aha Chineke na-anọchi anya “ihe ndị ọzọ maara banyere ya, ya bụ, ihe o mere ka ndị ọzọ mara banyere ya. Ọ na-anọchikwa anya ùgwù a na-akwanyere ya.” Nke a bụ eziokwu n’ihi na aha Jehova na-anọchikwa anya ụdị onye ọ bụ. Ma ajụjụ bụ, Olee otú Jehova si ele ahụhụ ndị mmadụ na-ata anya? Ọ kpọrọ ya asị! Ọ na-emetekwara ndị na-ata ahụhụ ebere. * (Ọpụpụ 22:22-24) Mgbe ọ bụla ụmụ mmadụ kwuru na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ, nke bụ́kwanụ ihe ọ kpọrọ asị, ihe ha na-eme bụ imebi aha ya. E nwere ike ikwu na ihe ahụ ha na-eme bụ ‘ilelị aha ya.’—Abụ Ọma 74:10.

Ị̀ hụrụ na n’Ezikiel 39:7, Jehova kwuru “aha nsọ m” ugboro abụọ. N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuwe banyere aha Jehova, a na-ekwu na ọ ‘dị nsọ.’ Ọ bụrụ na e kwuo na ihe ‘dị nsọ,’ ihe ọ pụtara bụ na ihe ahụ dị iche, nakwa na ihe ahụ dị ọcha. Aha Jehova dị nsọ n’ihi na Chineke, bụ́ onye na-aza aha ahụ, dị nsọ, o nweghịkwa ihe jikọrọ ya na mmehie ma ọ bụ adịghị ọcha. Ị̀ hụla otú o si bụrụ na ndị na-ekwu na ọ bụ Jehova na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa na-ete “aha nsọ” ya unyi?

Isi ihe e kwuru na Baịbụl bụ na Jehova ga-eji Alaeze ya mee ka a kwụsị ite aha ya unyi. Akwụkwọ Ezikiel gosiri na nke a bụ eziokwu n’ihi na o kwuru ugboro ugboro na “mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 36:23; 37:28; 38:23; 39:7) Ị̀ hụrụ na ọ bụghị mba ndị ahụ ga-eji aka ha họrọ ma hà ga-amara na ọ bụ ya bụ Jehova? Kama nke ahụ, ha ‘ga-amara,’ ma hà chọrọ ma hà achọghị. Ihe a na-ekwu bụ na Jehova ga-amanye mba niile dị n’ụwa ịmata na ọ bụ ya bụ Jehova, bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị, onye aha ya dị nsọ, dịkwa ọcha.

Ihe ahụ Jehova kwuru ọtụtụ ugboro, nke bụ́ na “mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,” kwesịrị ime ndị chọrọ ka ahụhụ na mmegbu kwụsị obi ụtọ. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-emezu ihe a o kwuru ma gosi na ebubo niile ahụ a na-ebo ya abụghị eziokwu. Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị, bibiekwa ndị na-eme ihe ọjọọ. Ma, ọ ga-eme ka ndị na-akwanyere aha ya na ihe aha ya nọchiri anya ya ùgwù dịrị ndụ. (Ilu 18:10) Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịmụta ihe ị ga-eme ka gị na Jehova, bụ́ Chineke dị nsọ, onye ‘hụkwara ikpe ziri ezi n’anya,’ dịrị ná mma?—Abụ Ọma 37:9-11, 28.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Septemba:

Ezikiel 39Daniel 3

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Bịaruo Chineke Nso—Onye Hụrụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya,” nke gbara n’Ụlọ Nche November 1, 2008.