Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụ Nwaanyị Bụ́ Ndịàmà Jehova Hà Na-akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl?

Ụmụ Nwaanyị Bụ́ Ndịàmà Jehova Hà Na-akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl?

 Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ụmụ Nwaanyị Bụ́ Ndịàmà Jehova Hà Na-akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl?

▪ Ee. N’ụwa niile, ọtụtụ nde ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ha na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Abụ Ọma 68:11 kwuru banyere ha, sị: “Ọ bụ Jehova kwuru okwu; ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.”

Ma ọrụ a ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-arụ na nke ụmụ nwaanyị bụ́ ndị pastọ ma ọ bụ ndị ụkọchukwu na chọọchị ndị ọzọ na-arụ abụghị otu. E nwere ezigbo ihe dị iche na ha. Olee otú ha si dị iche?

Otu ihe mere ha ji dị iche bụ na ndị ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-akụziri ihe dị iche ná ndị ụmụ nwaanyị ndị bụ́ pastọ ma ọ bụ ụkọchukwu na-akụziri ihe. Ụmụ nwaanyị ndị bụ́ pastọ ma ọ bụ ụkọchukwu na-abụ ndị isi n’ime chọọchị ha, ndị ha na-akụzikwara ihe bụ ndị chọọchị ha. Ma ụmụ nwaanyị ndị bụ́ Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ihe, ya bụ, ndị ha na-ahụ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ.

Ihe ọzọ mere ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova ji dị iche n’ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ahụ bụ ọrụ ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ọgbakọ. Ụmụ nwaanyị ndị bụ́ pastọ ma ọ bụ ụkọchukwu na-anọ n’isi na chọọchị ha na-akụziri ndị chọọchị ha ihe. Ma, ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova anaghị akụzi ihe n’ọgbakọ, ọ gwụla ma ụmụ nwoke e merela baptizim anọghị. Ọ bụ naanị ndị nwoke a họpụtara ahọpụta na-akụzi ihe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova.—1 Timoti 3:2; Jems 3:1.

Ihe ndị e kwuru na Baịbụl gosiri na ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka a chọrọ ka ha na-elekọta ọgbakọ. Legodị ihe Pọl onyeozi gwara onye nlekọta ibe ya bụ́ Taịtọs n’akwụkwọ ozi o degaara ya. Ọ gwara ya sị: “Ihe mere m ji hapụ gị na Krit bụ ka i nwee ike . . . ịhọpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche.” Pọl kwukwara na nwoke ọ bụla a ga-ahọpụta ga-abụ onye “a na-adịghị ebo ebubo, di nke otu nwunye.” (Taịtọs 1:5, 6) Pọl gwakwara Timoti ihe yiri nke ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara ya. Ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya. Ya mere, onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ, di nke otu nwunye, . . . onye ruru eru izi ihe.”—1 Timoti 3:1, 2.

Gịnị mere o ji bụrụ naanị ụmụ nwoke ga na-elekọta ọgbakọ? Pọl kwuru, sị: “Enyeghị m nwaanyị ikike izi ihe, ma ọ bụ inwe ikike n’ebe nwoke nọ, kama ka ọ na-agbachi nkịtị. N’ihi na ọ bụ Adam ka e bu ụzọ kpụọ, e mesịa kpụọ Iv.” (1 Timoti 2:12, 13) Ebe ọ bụ na Chineke bu ụzọ kee Adam tupu ya ekee Iv, o doro anya na ọ chọrọ ka ọ bụrụ ụmụ nwoke ga na-akụzi ihe ma na-elekọta ọgbakọ.

Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma otú Onye ndú ha bụ́ Jizọs Kraịst kwusara. Luk, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, dere banyere otú Jizọs si kwusaa ozi ọma, sị: “Ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” Jizọs mechakwara zipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Luk dekwara, sị: “Ha wee gawa, gazuo ókèala ahụ malite n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ezisa ozi ọma.”—Luk 8:1; 9:2-6.

Taa Ndịàmà Jehova, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, na-agbasi mbọ ike na-ekwusa ozi ọma ahụ Jizọs kwuru na a ga-ekwusa. Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.