Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ò Ji Ụmụ Nwaanyị Kpọrọ Ihe?

Chineke Ò Ji Ụmụ Nwaanyị Kpọrọ Ihe?

 Chineke Ò Ji Ụmụ Nwaanyị Kpọrọ Ihe?

“Ọ bụ nwaanyị kpatara mmehie, ọ bụkwa nwaanyị mere anyị niile ji anwụ anwụ.”​—AKWỤKWỌ BỤ́ ECCLESIASTICUS, NKE E DERE N’IHE DỊ KA AFỌ 200 TUPU OGE NDỊ KRAỊST.

“Ị bụ ngwá ọrụ Ekwensu: ọ bụ gị bụ onye mbụ riri mkpụrụ osisi a sịrị erila: ọ bụ gị bụ onye mbụ dara iwu Chineke .  . . Ọ bụ gị duhiere nwoke, onye bụ́ onyinyo Chineke.”​—TETỌLIAN KWURU NKE A N’AKWỤKWỌ BỤ́ ON THE APPAREL OF WOMEN, NKE O DERE N’IHE DỊ KA AFỌ 200 OGE NDỊ KRAỊST.

IHE ndị a e dere n’akwụkwọ ndị ahụ esighị na Baịbụl. Kemgbe ọtụtụ narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị ekwuola na imegbu ụmụ nwaanyị dị mma n’ihi ihe e dere n’akwụkwọ ndị ahụ. Ụfọdụ ndị okpukpe ha na-agba ara n’oge a ka na-ekwu na otú ahụ e si emegbu ụmụ nwaanyị kwesịrị ekwesị n’ihi ihe ndị ha gụtara n’akwụkwọ okpukpe ha. Ha na-ekwu na ọ bụ ụmụ nwaanyị kpatara ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata n’ụwa a. Ma, ọ̀ bụ eziokwu na Chineke chọrọ ka ụmụ nwoke na-emegbu ụmụ nwaanyị? Gịnị ka Baịbụl kwuru? Ka anyị hụ.

Chineke ọ̀ bụrụ ụmụ nwaanyị ọnụ?

Mba. Kama nke ahụ, ọ bụ “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu,” ka Chineke “bụrụ ọnụ.” (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:14) Mgbe Chineke kwuru na Adam ‘ga-achị’ nwunye ya, ihe ọ na-ekwu abụghị na ya chọrọ ka ụmụ nwoke na-achị ụmụ nwaanyị ọchịchị nchigbu. (Jenesis 3:16) Kama, ihe ọ na-ekwu bụ nsogbu mmehie Adam na Iv mere ga-akpatara ha.

N’ihi ya, ọ bụghị uche Chineke ka a na-emegbu ụmụ nwaanyị, kama ọ bụ mmehie ụmụ mmadụ kpatara ya. Baịbụl ekwughị na ụmụ nwoke kwesịrị ịna-achị ụmụ nwaanyị ọchịchị nchigbu ka Chineke nwee ike ịgbaghara anyị mmehie ahụ Adam na Iv mere.—Ndị Rom 5:12.

Chineke ò kere ụmụ nwaanyị ka ha dị ala karịa ụmụ nwoke?

Mbanụ. Jenesis 1:27 kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.” Nke a pụtara na malite mgbe ahụ Chineke kere ụmụ mmadụ, ma nwoke ma nwaanyị, o kere ha ka ha na-akpa àgwà ka ya. Ọ bụ eziokwu na ahụ́ Adam dị iche na nke Iv, otú o si eche echiche adịtụkwa iche na nke Iv, Chineke nyere ha abụọ otu ọrụ, ha abụọ hàkwa n’anya ya.—Jenesis 1:28-31.

Tupu Chineke ekee Iv, Chineke kwuru, sị: “M gaje imere [Adam] onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” (Jenesis 2:18) Ma okwu ahụ bụ́ ‘onye ga-eme ka Adam zuo ezu’ ọ̀ pụtara na nwaanyị ahụ ga-adị ala karịa nwoke? Mba. Chegodị echiche otú onye nọ n’ụgbọ mmiri na-akụ azụ̀ na onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ si arụkọ ọrụ? Otu onye ọ̀ ga na-egbu azụ̀ ma na-akwọ  ụgbọ mmiri n’otu mgbe? Mba. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ onye ahụ na-akụ azụ̀ na-egbute azụ̀, ma nke a ọ̀ pụtara na ọrụ ya dị mkpa karịa nke onye ahụ na-akwọ ụgbọ ahụ? Ọ pụtaghị otú ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa nwoke na nwaanyị. Chineke kere ha ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ, ọ bụghị ka ha na-amarịta aka.—Jenesis 2:24.

Olee ihe na-egosi na Chineke ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe?

Ebe ọ bụ na Chineke maara ihe ụmụ nwoke na-ezughị okè nwere ike ime, o nyere iwu ndị ga-eme ka a ghara imegbu ụmụ nwaanyị. Otu nwaanyị aha ya bụ Laure Aynard dere banyere iwu ahụ Chineke nyere ndị Izrel n’otu akwụkwọ o dere. Nwaanyị a dere, sị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mgbe ọ bụla Iwu Mozis kwuru banyere ụmụ nwaanyị, ihe ọ na-ekwu bụ ihe ga-eme ka a ghara imegbu ụmụ nwaanyị.”

Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ kwuru ka mmadụ na-asọpụrụ ma nna ya ma nne ya. (Ọpụpụ 20:12; 21:15, 17) Iwu ahụ kwukwara ka a ghara imeso nwaanyị dị ime ihe ike. (Ọpụpụ 21:22) O doro anya na ihe e kwuru n’iwu ndị ahụ Chineke nyere dịkwa iche ma e were ya tụnyere otú e si anapụ ụmụ nwaanyị ihe ndị ruuru ha n’ọtụtụ ebe n’oge anyị a. Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ na-egosi na Chineke ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe.

Iwu Chineke Gosiri Otú O Si Ele Ụmụ Nwaanyị Anya

Iwu Jehova Chineke nyere mba Izrel baara ha uru n’ụzọ dị iche iche n’ihi na o mere ka ha ghara ịkpa àgwà ọjọọ, meekwa ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụrụhaala na ha egee Jehova ntị ma debe iwu ya, ha ‘ga-adị elu karịa mba niile ọzọ dị n’ụwa.’ (Diuterọnọmi 28:1, 2) Olee ihe Iwu ahụ kwuru banyere ihe ndị ruuru ụmụ nwaanyị? Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha.

1. Nwaanyị ọ bụla nweere onwe ya ime ihe ndị ọ chọrọ ime. Otu ihe mere mba Izrel ji dị iche n’ọtụtụ mba ndị ọzọ n’oge ochie bụ na e nwere ọtụtụ ihe ụmụ nwaanyị Izrel nweere onwe ha ime. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ nwoke bụ onyeisi ezinụlọ, nwaanyị nwere ike ịga ‘leruo ala anya ma zụta ya,’ ‘kụọkwa ubi vaịn’ n’onwe ya n’ihi na di ya tụkwasịrị ya obi. Ọ bụrụ na ọ ma otú e si ekwe ákwà,  o nwedịrị ike imepe ebe ọ ga na-ekwe ákwà ma na-ere ha. (Ilu 31:11, 16-19) Iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel gosiri na ụmụ nwaanyị nweere onwe ha ime ihe ndị ha chọrọ ime otú ahụ ụmụ nwoke nwekwaara onwe ha ime ihe ndị ha chọrọ.

N’Izrel oge ochie, ụmụ nwaanyị nweere onwe ha ife Chineke. Baịbụl kọrọ banyere Hana. O kwuru na Hana kpegaara Chineke ekpere ma kọọrọ ya ihe dị ya n’obi ma kwe Chineke nkwa. (1 Samuel 1:11, 24-28) Baịbụl kwukwara na otu nwaanyị nke bi n’obodo Shunem na-agakwuru Ịlaịsha onye amụma n’ụbọchị izu ike. (2 Ndị Eze 4:22-25) Chineke ji ụmụ nwaanyị ndị dị ka Debora na Họlda mere ndị nnọchianya ya. Ụfọdụ ụmụ nwoke a ma ama n’Izrel nakwa ndị nchụàjà gakwuuru ha ka ha gwa ha ihe ha ga-eme.—Ndị Ikpe 4:4-8; 2 Ndị Eze 22:14-16, 20.

2. Ha ma akwụkwọ. Ebe ọ bụ na ụmụ nwaanyị so ná ndị ha na Chineke gbara ndụ nakwa ndị Chineke nyere iwu ya, ha so ná ndị na-abịa ege ntị mgbe a na-agụpụta Iwu ahụ. Nke a mere ka ha nwee ohere ịmụ ihe. (Diuterọnọmi 31:12; Nehemaya 8:2, 8) Ha sokwa ná ndị a kụziiri ihe ka ha nwee ike iso rụọ ọrụ ụfọdụ mgbe ndị Izrel zukọtara ife Chineke. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-eso eje “ozi a haziri ahazi” n’ụlọikwuu, ebe ndị ọzọ na-eso ụmụ nwoke abụ abụ n’ụlọ Jehova.—Ọpụpụ 38:8; 1 Ihe E Mere 25:5, 6.

Ịzụ ahịa dokwara ọtụtụ ụmụ nwaanyị anya. (Ilu 31:24) Ụmụ nwaanyị ndị Izrel na-eso di ha akụziri ụmụ ha ndị nwoke ihe ruo mgbe ụmụ ahụ toro, ma a naghị eme otú ahụ ná mba ndị ọzọ n’oge ahụ. (Ilu 31:1) O doro anya na ụmụ nwaanyị ndị Izrel oge ochie abụghị itibọrịbọ.

3. A na-akwanyere ha ùgwù. Iwu Iri e nyere ụmụ Izrel kwuru hoo haa, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ọpụpụ 20:12) Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe, kwuru n’ilu ya, sị: “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.”—Ilu 1:8.

Iwu ahụ e nyere ụmụ Izrel kwukwara ọtụtụ ihe banyere otú ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị isi na-akpaso ibe ha àgwà. Iwu ahụ kwuru na e kwesịrị ịkwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù. (Levitikọs 18:6, 9; Diuterọnọmi 22:25, 26) N’ihi ihe  Iwu ahụ kwuru banyere ụmụ nwaanyị, onye bụ́ ezigbo di na-akwanyere nwunye ya ùgwù mgbe nwunye ya nọ ná nsọ ma ọ bụ mgbe ahụ́ na-adịchaghị ya.—Levitikọs 18:19.

4. A napụghị ha ihe ruuru ha. Na Baịbụl, Jehova kwuru na ya bụ “nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.” Nke a pụtara na Jehova na-agbachitere ụmụ na-enweghị nna na ụmụ nwaanyị na-enweghị di n’ihi na ha enweghị onye ga-agbachitere ha. (Abụ Ọma 68:5; Diuterọnọmi 10:17, 18) Dị ka ihe atụ, mgbe nwunye otu onye amụma nwụrụ anwụ nọ ná nsogbu maka na onye o ji ụgwọ chọrọ imesi ya na ụmụ ya ike, Jehova rụụrụ nwaanyị ahụ ọrụ ebube nke mere ka nwaanyị ahụ pụta ná nsogbu ahụ, a gharakwa imechu ya ihu.—2 Ndị Eze 4:1-7.

Tupu ụmụ Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, otu nwoke aha ya bụ Zelofehad nwụrụ n’amụtaghị nwa nwoke. N’ihi ya, ụmụ nwaanyị ise ọ mụtara gara rịọ Mozis ka o nye ha “ala” n’Ala Nkwa ahụ. Jehova gwara Mozis ka o meere ụmụ nwaanyị a otú e meere ezinụlọ ndị ọzọ. Ọ gwara Mozis, sị: “Hụ na i nyere ha ala dị ka ihe nketa n’etiti ụmụnne nna ha, ị ga-emekwa ka ihe nketa nna ha laara ha.” Malite n’oge ahụ gawa, ụmụ nwaanyị ndị Izrel nwere ike iketa ala nna ha, ala ha ketara na-aghọkwa nke ụmụ ha ma ha nwụọ.—Ọnụ Ọgụgụ 27:1-8.

Otú E Si Kwụsị Iwere Ụmụ Nwaanyị Otú Chineke Si Were Ha

Iwu Chineke nyere ndị Izrel mere ka ha na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù ma na-enye ha ihe ndị ruuru ha. Ma, malite n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ atọ gara aga, omenala ndị Gris malitere imebi okpukpe ndị Juu. Ndị Gris weere ụmụ nwaanyị ka ndị dị ala karịa ụmụ nwoke.—Gụọ igbe bụ́ “Ihe Ndị E Dere n’Akwụkwọ n’Oge Ochie So Mee Ka A Kpọọ Ụmụ Nwaanyị Asị.”

Dị ka ihe atụ, otu onye Gris na-ede uri, nke aha ya bụ Hesiod, kwuru na ọ bụ ụmụ nwaanyị kpatara ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata. Hesiod dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga. N’otu akwụkwọ ya, o kwuru na ụmụ nwaanyị bụ “agbụrụ ọjọọ nke bi n’etiti ụmụ nwoke, nke na-akpatakwara ụmụ nwoke nsogbu.” N’ihe dị ka puku afọ abụọ na otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu bịaziri lewe ụmụ nwaanyị anya otú ahụ. Akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ́ Talmud, nke e dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, dọrọ ụmụ nwoke aka ná ntị, sị: “Unu na ụmụ nwaanyị ekwula ọtụtụ okwu n’ihi na nke a ga-eme ka unu mee omume rụrụ arụ.”

Otú ahụ e sizi na-ele ụmụ nwaanyị anya n’oge ochie meziri ka ndị Juu ghara ikwe ka ụmụ nwaanyị na-eme ọtụtụ ihe ụmụ nwoke na-eme. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, a nazighị ekwe ka ụmụ nwaanyị bata n’ime ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Naanị ebe a na-ekwe ka ha rute bụ ebe a na-akpọ Ogige Ụmụ Nwaanyị. Ọ bụzi naanị ụmụ nwoke ka ndị Juu na-akụziri banyere okpukpe ha. Ọ ga-abụkwa na ụmụ nwoke na-anọ iche, ụmụ nwaanyị anọrọ iche n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Akwụkwọ okpukpe ndị Juu ahụ kwuru na otu onye nkụzi ndị Juu sịrị na “onye ọ bụla nke kụziiri nwa ya nwaanyị [iwu  Chineke nyere ụmụ Izrel] na-akụziri ya ihe ọjọọ.” Ndị isi okpukpe ndị Juu hapụziri ihe Chineke kwuru banyere ụmụ nwaanyị kụziwe ihe dị iche. N’ihi ya, ọtụtụ ụmụ nwoke bịaziri kpọwa ụmụ nwaanyị asị.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ hụrụ na ndị Juu kpọrọ ụmụ nwaanyị asị n’ihi omenala ha. (Matiu 15:6, 9; 26:7-11) Jizọs ò kwere ka ihe ndị Juu na-akụzi mee ka o mesowe ụmụ nwaanyị otú na-adịghị mma? Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Jizọs si kpaso ha àgwà? Otú ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst si emeso ụmụ nwaanyị ọ̀ na-eme ka ahụ́ ruo ụmụ nwaanyị ala? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ihe Ndị E Dere n’Akwụkwọ n’Oge Ochie So Mee Ka A Kpọọ Ụmụ Nwaanyị Asị

Malite n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga bịawazie, ndị na-ede akwụkwọ n’oge ochie, dị ka Filo onye Alegzandria, bidoro iji ihe ndị ha mụtara n’aka ndị Gris na-akọwara ndị mmadụ ihe ndị e dere n’akwụkwọ Jenesis. Filo kụziri na mmehie Adam na Iv mere bụ na ha nwere mmekọahụ, nakwa na ọ bụ Iv kpatara ya. Ụfọdụ ndị kweere na mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ha erila bụ mmekọahụ. Nkụzi ụgha a mere ka a gharazie iji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe. Ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu bịaziri kpọwa ụmụ nwaanyị asị. Ihe ndị nna chọọchị n’oge ochie dere n’akwụkwọ ha gosiri na ha kpọkwara ụmụ nwaanyị asị.

N’otu akwụkwọ ndị Juu e dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, nke aha ya bụ Midrash Rabba, otu onye nkụzi ndị Juu kwuru ihe mere ụmụ nwaanyị ji kwesị ịna-ekpuchi ákwà n’ihu. O kwuru, sị: “Nwaanyị dị ka onye mere mmehie nke ihere na-eme mgbe ọ hụrụ ndị mmadụ.” Otu onye na-ede akwụkwọ n’oge ochie nke aha ya bụ Tetọlian, bụ́ onye akwụkwọ ya maliterela iwu ewu n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, kụziri na nwaanyị ọ bụla kwesịrị iwere onwe ya ka Iv bụ́ onye mmehie. O kwesịrị ‘ịna-eru uju iji gosi na mmehie ya na-ewute ya.’ Ụdị nkụzi a, bụ́ nke ọtụtụ ndị chere na o si na Baịbụl, so mee ka a kpọọ ụmụ nwaanyị asị.

[Foto dị na peeji nke 5]

E kere Iv ka ọ bụrụ onye inyeaka Adam na onye ga-eme ka Adam zuo ezu

[Foto dị na peeji nke 6]

N’Izrel oge ochie, ụmụ nwaanyị na-eso ụmụ nwoke azụ ahịa