Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Timoti 1:1-18

  • Ekele (1, 2)

  • Pọl kelere Chineke maka otú Timoti si nwee okwukwe (3-5)

  • Jiri onyinye Chineke nyere gị kpọrọ ihe (6-11)

  • Jidesie eziokwu m kụziiri gị aka ike (12-14)

  • Ndị iro Pọl na ndị enyi ya (15-18)

1  Abụ m Pọl. Ọ bụkwa uche Chineke ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, ka m nwee ike ịgwa ndị ọzọ gbasara nkwa Chineke kwere inye ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs ndụ.+  M na-edetara gịnwa bụ́ Timoti, nwa m hụrụ n’anya,+ akwụkwọ ozi a: Ka Chineke bụ́ Nna nakwa Kraịst Jizọs Onyenwe anyị meere gị amara na ebere, meekwa ka udo dịrị gị.  Ana m ekele Chineke, onye m na-efe* otú nna nna m hà fere. Akọnuche m anaghịkwa ama m ikpe ka m na-efe ya. Ọ bụ ya mere m ji echeta gị, ehihie na abalị, mgbe ọ bụla m na-arịọsi Chineke arịrịọ ike.  M cheta anya mmiri gị, ịhụ gị agụsiwe m ike, ka obi wee bụrụ m sọ aṅụrị.  N’ihi na m na-echeta otú i si nwee ezigbo okwukwe.+ Nne nne gị bụ́ Lọịs na nne gị bụ́ Yunis bu ụzọ nwee ụdị okwukwe a. Obi sikwara m ike na ị ka nwere ya.  Ọ bụ ya mere m ji na-echetara gị ka i jiri onyinye Chineke nyere gị mgbe m bikwasịrị gị aka n’isi kpọrọ ihe mgbe niile.+  N’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyere anyị anaghị eme ka anyị tụwa ụjọ,+ kama, ọ na-enye anyị ike,+ na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwa ka anyị na-ele ihe anya otú dị mma.  N’ihi ya, ka ihere ịgba àmà banyere Onyenwe anyị ghara ime gị,+ ka ihere gharakwa ime gị maka na a tụrụ m mkpọrọ n’ihi Onyenwe anyị. Kama, ka obi sie gị ike na Chineke ga-enye gị ike+ idi ahụhụ a ga-ata gị+ n’ihi ozi ọma ị na-ezisa.  Ọ zọpụtara anyị ma kpọọ anyị ka anyị dịrị nsọ,+ ọ bụghị n’ihi àgwà anyị, kama n’ihi nzube ya na amara ya.+ Ọ dịla ezigbo anya o si n’aka Kraịst Jizọs meere anyị amara a. 10  Ma, ọ bụ ugbu a Kraịst Jizọs, Onye Nzọpụta anyị, pụtara ìhè ka e mere ka amara a e meere anyị doo anya.+ Ọ bụ Jizọs wepụrụ ọnwụ+ ma jiri ozi ọma o zisara+ mee ka anyị mara otú anyị ga-esi dịrị ndụ+ ma ghara ire ure.+ 11  Ọ bụ maka ozi ọma a ka e ji họpụta m ka m na-ekwusa ya, na-akụzi ya, bụrụkwa onyeozi.+ 12  Ọ bụkwa n’ihi ozi ọma a ka m ji na-ata ahụhụ ndị a,+ ma ọ naghị eme m ihere.+ N’ihi na ama m onye m kweere na ya, obi sikwara m ike na ọ ga-echebeli ihe m nyefere n’aka ya ruo ụbọchị ikpe.+ 13  Jidesie ụdị eziokwu m kụziiri gị aka ike.+ Na-egosi na i nwere okwukwe, nakwa na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 14  Ka mmụọ nsọ nyere gị aka ka i jiri ezigbo ihe a e nyefere n’aka gị kpọrọ ihe.+ 15  Ị ma na ndị niile nọ ná mpaghara Eshia+ agbakụtala m azụ. Faịjelọs na Hemọjinis so na ha. 16  Ka Onyenwe anyị* meere Onesịfọrọs na ezinụlọ ya+ ebere, n’ihi na ọ gbara m ume ugboro ugboro. Agbụ ígwè e kere m emeghịkwa ya ihere. 17  Ọ bụ ya mere na mgbe ọ bịara Rom, ọ chọsiri m ike wee chọta m. 18  Ka Onyenwe anyị Jehova* meere ya ebere n’ụbọchị ikpe. Ị makwa nke ọma gbasara ihe niile o meere m n’Efesọs.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “m na-ejere ozi dị nsọ.”
Ya bụ, Jehova.
Gụọ A5.