Ozi Ọma Luk Dere 11:1-54

  • Otú e si ekpe ekpere (1-13)

    • Ekpere Nna anyị nke bi n’eluigwe (2-4)

  • Jizọs ji ike Chineke chụpụ ndị mmụọ ọjọọ (14-23)

  • Mgbe mmụọ ọjọọ lọghachiri ebe o si pụọ (24-26)

  • Ihe na-eme ka e nwee ezigbo obi ụtọ (27, 28)

  • Ọrụ ebube a rụụrụ Jona (29-32)

  • Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè (33-36)

  • Ndị okpukpe, bụ́ ndị ihu abụọ, ga-ata ahụhụ (37-54)

11  Otu ụbọchị, mgbe o kpechara ekpere, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere, dị ka Jọn kụziiri ndị na-eso ụzọ ya.”  O wee sị ha: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ: ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ.+ Ka Alaeze gị bịa.+  Nye anyị nri ga-ezuru anyị n’ụbọchị ọ bụla.+  Gbaghara anyị mmehie anyị,+ n’ihi na anyịnwa na-agbagharakwa onye ọ bụla mehiere anyị.*+ Ekwekwala ka a nwata anyị.”*+  Ọ sịkwara ha: “Ka e were ya na otu n’ime unu nwere enyi, ya agakwuru ya n’etiti abalị wee sị ya, ‘Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ,  n’ihi na otu enyi m si ebe dị anya bịa n’ụlọ m, enweghịkwa m ihe m ga-enye ya.’  Onye ahụ esi n’ime ụlọ sị ya: ‘Enyezila m nsogbu. Akpọchiela m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinarakwala n’àkwà.* Enwekwaghị m ike ibili nye gị ihe ọ bụla.’  Ana m asị unu, ọ bụrụgodị na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla maka na ọ bụ enyi ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọ chọrọ maka na ọ nọgidesiri ike na-arịọ ya.+  N’ihi ya, ana m asị unu, na-arịọnụ,+ a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya.+ 10  N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta,+ onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa aka n’ụzọ ka a ga-emeghere ụzọ. 11  N’eziokwu, ònye n’ime unu bụ́ nna ka nwa ya ga-arịọ azụ̀, ya enye ya agwọ kama inye ya azụ̀,+ 12  ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá, ya enye ya akpị? 13  N’ihi ya, ọ bụrụ na unu ma otú e si enye ụmụ unu ezigbo onyinye, ọ bụ eziokwu na unu bụ ndị ajọ omume, ọ̀ bụ na Nna unu nke nọ n’eluigwe agaghị enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ ha na-arịọ ya?”+ 14  E mechaa, ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ mere ka otu nwoke daa ogbi.+ Mgbe ọ chụpụchara mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ ekwuwe okwu. Ọ tụkwara ìgwè mmadụ ahụ n’anya.+ 15  Ma ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Ọ bụ ike Bielzebọb,* onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ, ka o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 16  Ma, ndị ọzọ gwara ya ka ọ rụọ ọrụ ebube+ n’aha Chineke iji nwaa ya. 17  Ebe ọ ma ihe ha na-eche,+ ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada. Ezinụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị adịgide. 18  Ọ bụrụkwa na Setan ekewaa na-emegide onwe ya, olee otú alaeze ya ga-esi kwụrụ? N’ihi na unu na-ekwu na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. 19  Ọ bụrụ na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ọ bụ ya mere ha ga-eji bụrụ ndị ga-ekpe unu ikpe. 20  Ma ọ bụrụ na ọ bụ ike Chineke*+ ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’eziokwu, Alaeze Chineke akwaala unu.+ 21  Ọ bụrụ na onye siri ike achịrị ngwá agha na-eche obí ya nche, o nweghị ihe na-eme ihe ndị o nwere. 22  Ma ọ bụrụ na onye ka ya ike alụso ya ọgụ wee merie ya, ọ ga-eburu ngwá agha ya niile ọ tụkwasịrị obi pụọ, kesaakwa ihe ndị ọ naara ya. 23  Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m. Onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.+ 24  “Mgbe mmụọ ọjọọ* si n’ime mmadụ pụọ, ọ na-aga ebe mmiri na-adịghị ka ọ chọta ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụọ.’+ 25  Mgbe o rukwara, ọ na-ahụ na a zachaala ụlọ ahụ nke ọma, chọọkwa ya mma. 26  Ọ na-agazi kpọrọ mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya. Mgbe ha banyere, ha na-ebiri ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-akazi nke mbụ njọ.” 27  Ma ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, otu nwaanyị nke so n’ìgwè mmadụ ahụ sịrị ya: “Nwaanyị mụrụ gị ma nye gị ara na-enwe obi ụtọ.”+ 28  Ma ọ sịrị: “Mba, kama ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”+ 29  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nọ na-ezukọta, ọ malitere ịsị: “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe àmà. Ma o nweghị ihe àmà a ga-egosi ya ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona.+ 30  N’ihi na otú ahụ ihe mere Jona+ si bụụrụ ndị Ninive ihe àmà, ka Nwa nke mmadụ ga-esi abụrụ ọgbọ a. 31  A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda+ na ọgbọ a n’Ụbọchị Ikpe, ọ ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ okwu onye amamihe Solomọn na-ekwu. Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.+ 32  Ndị Ninive na ọgbọ a ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe. Ndị Ninive ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ ihe Jona kwusara.+ Ma, onye ka Jona nọ ebe a. 33  Mmadụ mụnye ọkụ,* ọ naghị adọsa ya n’ebe zoro ezo ma ọ bụ n’okpuru nkata, kama, ọ na-adọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ+ ka ọ na-enwuru ndị na-abata n’ụlọ. 34  Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè. Ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe,* ahụ́ gị niile ga-abụ ìhè ìhè. Ma ọ bụrụ na ihe anya gị na-ahụ na-eme ka ị bụrụ onye anyaụfụ,* ahụ́ gị niile ga-agba ọchịchịrị.+ 35  N”ihi ya, kpachara anya ka ìhè dị n’ime gị ghara ịbụ ọchịchịrị. 36  Ọ bụrụ na ahụ́ gị niile bụ ìhè ìhè n’enweghị ebe gbara ọchịchịrị, ọ ga na-enwu gbaa ka ebe ọkụ* na-enye gị ìhè.” 37  Mgbe o kwuchara ihe a, otu onye Farisii gwara ya ka o soro ya rie nri. O wee gaa n’ụlọ ya ma nọdụ ala na-eri ihe na tebụl. 38  Ma, o juru onye Farisii ahụ anya mgbe ọ hụrụ na o bughị ụzọ kwọọ aka* tupu ya eriwe nri.+ 39  Ma Onyenwe anyị sịrị ya: “Unu ndị Farisii, unu na-eme ka azụ iko na azụ efere dị ọcha, ma ihe juru n’obi unu bụ anyaukwu na ime ihe ọjọọ.+ 40  Ndị na-enweghị uche, ọ́ bụghị onye kere elu ahụ́ anyị kekwara ime ahụ́ anyị? 41  Ma, werenụ ihe dị n’ime nye onyinye ebere,* ihe niile gbasara unu ga-adịkwa ọcha. 42  Ma unu ndị Farisii ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint na mkpá akwụkwọ ruu na nke akwụkwọ ọ bụla ọzọ,+ ma unu na-eleghara ịhụ Chineke n’anya na ikpe ikpe ziri ezi anya. Unu kwesịrị ịna-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị ahụ, ma unu ekwesịghị ileghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu anya.+ 43  Unu ndị Farisii ga-ata ahụhụ, n’ihi na ọ na-atọ unu ụtọ ịnọ n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ, nakwa ka a na-ekele unu n’ọma ahịa.+ 44  Unu ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu yiri ili*+ ndị na-apụtaghị ìhè,* nke ndị mmadụ na-eje ije n’elu ha n’amaghị ihe ha bụ.” 45  Otu n’ime ndị ma Iwu wee sị ya: “Onye Ozizi, ị na-akparịkwa anyị n’ihe ndị a ị na-ekwu.” 46  O wee sị ya: “Unu ndị ma Iwu ga-atakwa ahụhụ, n’ihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu siri ike obubu, ma ununwa anaghị arụtụ ibu ndị ahụ otu mkpịsị aka unu.+ 47  “Unu ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu na-arụ ili* ndị amụma, ma, ọ bụ nna nna unu hà gburu ha.+ 48  N’eziokwu, unu ma ihe nna nna unu hà mere. Ma, unu nabatara ihe ha mere, n’ihi na ha gburu ndị amụma,+ ma unu na-arụ ili ha. 49  Ọ bụ ya mere amamihe Chineke ji sịkwa: ‘M ga-ezigara ha ndị amụma na ndịozi. Ha ga-egbu ụfọdụ n’ime ha, kpagbuokwa ụfọdụ, 50  ka ọbara ndị amụma niile e gburu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa wee dị n’isi ọgbọ a,+ 51  malite n’ọbara Ebel+ ruo n’ọbara Zekaraya, onye e gburu n’agbata ebe ịchụàjà na ụlọ nsọ.’+ N’eziokwu, ana m asị unu, ọbara ha ga-adị n’isi ọgbọ a. 52  “Unu ndị ma Iwu ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu ekweghị ka ndị mmadụ mara Chineke. Ununwa abanyeghị n’Alaeze Chineke, unu na-egbochikwa ndị chọrọ ịbanye.”*+ 53  Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii malitere inye ya ezigbo nsogbu, na-ajụkwa ya ọtụtụ ajụjụ, 54  chebiri ya, ka ha jiri okwu ọnụ ya nweta ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.”
Na Grik, “Ewebala anyị n’ọnwụnwa.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan.
Na Grik, “mkpịsị aka Chineke.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ma ọ bụ “anya doro gị.”
Na Grik, “anya gị dị njọ.”
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ya bụ, ịkwọ aka otú ọdịnala ndị Juu si kwuo.
Ma ọ bụ “nye ndị ogbenye onyinye.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “n’ebe kacha mma.”
Na Grik, “ili ncheta.”
Ma ọ bụ “ili ndị a na-ahụwaghị ama.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Na Grik, “unu wepụrụ mkpịsị ugodi e ji amata Chineke. Unu abanyeghị, unu na-egbochikwa ndị chọrọ ịbanye.”