Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Kọlọsi 1:1-29

  • Ekele (1, 2)

  • Pọl kelere Chineke maka na ndị Kọlọsi kweere na Jizọs (3-8)

  • Pọl kpere ekpere ka ndị Kọlọsi na-amụtakwu eziokwu gbasara Chineke (9-12)

  • Kraịst bụ ntọala okwukwe anyị (13-23)

  • Pọl gbasiri mbọ ike maka ọdịmma ọgbakọ (24-29)

1  Mụnwa bụ́ Pọl, onye ọ bụ uche Chineke ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, na Timoti+ nwanna anyị, 2  na-edetara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi a. Unu bụ ndị nsọ na ụmụnna a tụkwasịrị obi, ndị ha na Kraịst dị n’otu. Ka Chineke Nna anyị meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu. 3  Mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere maka unu, anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. 4  Ihe mere anyị ji ekele ya bụ na anyị nụrụ na unu kweere na Kraịst Jizọs, hụkwa ndị nsọ niile n’anya, 5  n’ihi na unu nwere olileanya inweta ihe e doweere unu n’eluigwe.+ Unu matara banyere olileanya a mgbe e ziri unu ozi ọma bụ́ eziokwu. 6  Ozi ọma a unu nụrụ na-amị mkpụrụ, na-agbasakwa n’ụwa niile,+ otú ahụ ọ na-amị mkpụrụ n’ime unu malite n’ụbọchị unu nụrụ nke bụ́ eziokwu gbasara amara Chineke, matakwa ya nke ọma. 7  Onye kụziiri unu eziokwu a bụ Epafras,+ ohu ibe anyị anyị hụrụ n’anya, onye ozi Kraịst a tụkwasịrị obi, onye na-anọchitekwa anya anyị. 8  Ọ gwakwara anyị na mmụọ nsọ na-enyere unu aka ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya. 9  Ọ bụ ya mere na malite n’ụbọchị anyị nụrụ ya, anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu,+ na-arịọ ka unu mara uche Chineke nke ọma,+ nweekwa amamihe, nakwa ka mmụọ nsọ na-eme ka unu na-aghọta ihe.+ 10  Anyị na-arịọkwa ka unu na-eme ihe otú ndị na-efe Jehova* kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ, ka unu na-eme ihe ọ bụla dị mma ma na-amụtakwu eziokwu gbasara Chineke.+ 11  Ihe ọzọ anyị na-arịọ bụ ka Chineke jiri ike ya dị ebube mee ka unu dị ike,+ ka unu wee na-atachi obi n’ihe niile, jirikwa ọṅụ na-edi ihe niile. 12  Ekpere anyị bụkwa ka unu na-ekele Nna anyị, onye mere ka unu ruo eruo inweta ihe o kwere ndị nsọ nọ n’ìhè ná nkwa.+ 13  Ọ kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị*+ ma kpọga anyị n’alaeze Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, 14  onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta gbapụta anyị, nke pụtara na a gbagharala anyị mmehie anyị.+ 15  Onye a yiri Chineke, onye a na-enweghị ike ịhụ anya.+ Ọ bụkwa onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.+ 16  N’ihi na e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa, ihe ndị e nwere ike ịhụ anya na ihe ndị a na-enweghị ike ịhụ anya,+ ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ndị isi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike. E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile,+ e kekwara ha maka ya. 17  O bu ihe ndị ọzọ niile ụzọ malite ịdị.+ E sikwa n’aka ya mee ka ihe ndị ọzọ niile dịrị. 18  Ọ bụkwa onyeisi nke ahụ́ ya, ya bụ, ọgbakọ ya.+ Ọ bụ ya ka e ji malite ihe niile. Ọ bụ onye mbụ e si n’ọnwụ kpọlite.+ N’ihi ya, ọ bụ onye mbụ n’ihe niile. 19  N’ihi na Chineke chọrọ ka Kraịst zuo ezuo n’ihe niile.+ 20  O sikwa n’aka Kraịst mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dị ná mma,+ ma ihe ndị dị n’ụwa ma ihe ndị dị n’eluigwe. Ọ bụkwa ọbara+ Kraịst wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ* ka Chineke ji mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dịrị n’udo. 21  N’eziokwu, e nwere oge unu bụ ndị iro Chineke, oge a na-enweghị ihe jikọrọ unu na ya n’ihi na uche unu dị naanị n’ihe ọjọọ. 22  Ma ugbu a, o ji maka ọnwụ onye ahụ ji anụ ahụ́ ya chụọ àjà mee ka unu na ya dị ná mma, ka unu wee dịrị nsọ n’anya ya, bụrụkwa ndị na-enweghị ntụpọ na ndị a na-anaghị ebo ebubo n’ihu ya.+ 23  Ma, unu ekwesịghị ịkwụsị inwe okwukwe na Chineke,+ kama, kwụsienụ ike na ntọala+ okwukwe unu, guzosiekwanụ ike,+ ka a ghara ime ka unu kwụsị inwe olileanya nke ozi ọma unu nụrụ mere ka unu nwee, nke e kwusakwara ebe niile n’ụwa.*+ Mụnwa bụ́ Pọl ghọkwara onyeozi maka izisa ozi ọma a.+ 24  Ana m aṅụrị ọṅụ ugbu a n’agbanyeghị na m na-ata ahụhụ maka unu.+ Echere m na m ga na-ata ya na-aga ebe m so n’ahụ́ Kraịst. Ahụhụ a m na-ata bụkwa maka ọdịmma nke ahụ́ Kraịst,+ ya bụ, ọgbakọ ya.+ 25  M na-ejere ndị Chineke ozi n’ihi na ọ họpụtara m maka ozi a.+ Ọ bụkwa maka ọdịmma unu. Ọ bụ ya mere m ji na-eji ike m niile ekwusa okwu Chineke. 26  Ozi a m na-ezisa bụ ihe nzuzo dị nsọ+ e zoro kemgbe ụwa,*+ e meghịkwa ka ọgbọ ndị gara aga mara gbasara ya. Ma ugbu a, e meela ka ndị nsọ mara ya.+ 27  Ọ masịrị Chineke ime ka ndị mba ọzọ bụ́ ndị nsọ mara ihe nzuzo a dị nsọ,+ nke bụ́ akụ̀ dị ebube. Unu nwere olileanya ịdị ebube ka Kraịst+ n’ihi na unu na ya dị n’otu. 28  Anyị na-ekwusa gbasara Kraịst, na-adụ mmadụ niile ọdụ, jirikwa amamihe niile na-akụziri mmadụ niile ihe, ka anyị wee mee ka mmadụ niile, ndị ha na Kraịst dị n’otu, bụrụ ndị tozuru okè n’anya Chineke.+ 29  Ọ bụ ya mere m ji na-arụsi ọrụ ike, jiri ike Chineke nyere m+ na-agbasi mbọ ike.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Na Grik, “Ọ napụtara anyị n’ikike nke ọchịchịrị.”
Na Grik, “nke e kwusakwaara ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”