Ozi Ọma Matiu Dere 27:1-66

  • E nyefere Jizọs n’aka Paịlet (1, 2)

  • Judas kwụgburu onwe ya (3-10)

  • Mgbe Jizọs guzo n’ihu Paịlet (11-26)

  • A kwara Jizọs emo n’ihu ọha (27-31)

  • A kpọgidere Jizọs n’osisi na Gọlgọta (32-44)

  • Mgbe Jizọs nwụrụ (45-56)

  • Mgbe e liri Jizọs (57-61)

  • E chesiri ili Jizọs nche ike (62-66)

27  Mgbe o ruru n’ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye niile nke ndị Juu gbara izu ka e gbuo Jizọs.+  Mgbe ha kechara ya agbụ, ha kpụụrụ ya pụọ, nyefee ya n’aka Paịlet, bụ́ gọvanọ.+  Mgbe Judas, onye raara ya nye, hụrụ na a maala Jizọs ikpe ọnwụ, ọ kwara mmakwaara ma chịghachiri ndị isi nchụàjà na ndị okenye mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ,+  sị: “Emehiere m mgbe m nyefere unu onye aka ya dị ọcha ka unu gbuo.” Ha wee sị: “Nke ahụ gbasara gị. Ọ gbasaghị anyị.”  O wee wụsa mkpụrụ ego ọlaọcha ndị ahụ n’ụlọ nsọ, pụọ gaa kwụgbuo onwe ya.+  Ma ndị isi nchụàjà chịịrị mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ, sị: “Ọ dịghị mma ịwụnye ha n’ebe dị nsọ a na-edebe ego, n’ihi na ọ bụ ego ọbara.”  Mgbe ha gbachara izu, ha ji ego ahụ zụọ ala onye ọkpụite, ebe ha ga na-eli ndị bịara abịa.  Ọ bụ ya mere e ji akpọ ala ahụ Ala Ọbara+ ruo taa.  Mgbe ahụ, ihe e si n’ọnụ Jeremaya* onye amụma kwuo mezuru. Ọ sịrị: “Ha wee chịrị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ, bụ́ ego ole a kwụrụ n’isi onye e rere ere, onye ụfọdụ ndị Izrel kwuru ego ole a ga-ere ya. 10  Ha ji ya zụta ala onye ọkpụite, dị ka Jehova* nyere m n’iwu.”+ 11  Mgbe Jizọs guzo n’ihu gọvanọ, gọvanọ jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?” Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*+ 12  Ma mgbe ndị isi nchụàjà na ndị okenye na-ebo ya ebubo, o kwughị ihe ọ bụla.+ 13  Paịlet wee sị ya: “Ị́ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?” 14  Ma ọ tụpụrụghị ya ọnụ, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu. 15  Mgbe ọ bụla a na-eme Ememme Ngabiga, gọvanọ ahụ na-ahapụrụ ìgwè mmadụ ahụ otu onye mkpọrọ ha chọrọ.+ 16  N’oge ahụ, e nwere otu onye omekome a tụrụ mkpọrọ. Aha ya bụ Barabas. 17  N’ihi ya, mgbe ha zukọtara, Paịlet sịrị ha: “Olee onye nke unu chọrọ ka m hapụrụ unu? Ọ̀ bụ Barabas ka ọ̀ bụ Jizọs, onye a sị na ọ bụ Kraịst?” 18  N’ihi na Paịlet ma na ọ bụ anyaụfụ mere ha ji nyefee ya n’aka ya. 19  Mgbe ọ nọkwa ọdụ n’oche ikpe, nwunye ya ziteere ya ozi, sị: “Ya enwekwala ihe ị ga-eme onye ezi omume ahụ, maka na ahụsiri m anya taa ná nrọ n’ihi ya.” 20  Ma, ndị isi nchụàjà na ndị okenye gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha kwuo ka e gbuo Jizọs,+ hapụrụ ha Barabas.+ 21  Gọvanọ ahụ jụrụ ha, sị: “Ònye n’ime ha abụọ ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha asị: “Barabas.” 22  Paịlet wee sị ha: “Gịnịzi ka m ga-eme Jizọs, onye a sị na ọ bụ Kraịst?” Ha niile asị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 23  O wee sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọ na-etikwu mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”+ 24  Mgbe Paịlet hụrụ na mbọ niile ọ na-agba enweghị isi, kama nke ahụ, ụzụ na-arị ibe ya elu, o ji mmiri kwọọ aka n’ihu ìgwè mmadụ ahụ ma sị ha: “Aka m adịghịkwa n’ọbara nwoke a. Ihe gbasara ya dịzi unu n’aka.” 25  Ìgwè mmadụ ahụ niile asị ya: “Ka ọbara ya dị n’isi anyị, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”+ 26  O wee hapụrụ ha Barabas, ma nyefee Jizọs n’aka ndị agha ka ha pịa ya ụtarị,+ gbuokwa ya n’elu osisi.+ 27  Mgbe ahụ, ndị agha gọvanọ kpọọrọ Jizọs banye n’ụlọ gọvanọ ma mee ka ndị agha gbaa ya gburugburu.+ 28  Ha yipụrụ ya ákwà, gbokwasị ya ákwà na-acha uhie uhie.*+ 29  Ha ji ogwu kpaa okpueze, kpuwe ya n’isi, nyekwa ya okporo ahịhịa amị n’aka nri ya. Ha gbuuru ya ikpere n’ala, na-akwa ya emo, sị: “Eze ndị Juu, ndeewo.” 30  Ha gbụrụ ya asọ mmiri,+ werekwa okporo ahịhịa amị ahụ na-eti ya n’isi. 31  N’ikpeazụ, mgbe ha kwachara ya emo, ha yipụrụ ya ákwà mgbokwasị ahụ ma yiwe ya uwe elu ya, kpụrụkwa ya pụọ ịga kpọgide ya n’osisi.+ 32  Mgbe ha na-apụ, ha hụrụ otu nwoke onye Saịrini aha ya bụ Saịmọn. Ha manyere ya ka o buru osisi ịta ahụhụ* Jizọs.+ 33  Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ Gọlgọta, ya bụ, Ebe Okpokoro Isi,+ 34  ha nyere Jizọs mmanya a gwara ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ.+ Ma, mgbe o detụrụ ya ọnụ, o kweghị aṅụ ya. 35  Mgbe ha kpọgidere ya n’osisi, ha fere nza kee uwe elu ya.+ 36  Ha nọdụrụ ala ebe ahụ na-eche ya nche. 37  Ha debekwara ihe e dere ebubo e boro ya n’elu osisi a kpọgidere ya. Ihe e dere na ya bụ: “Onye a bụ Jizọs, Eze ndị Juu.”+ 38  N’ụbọchị ahụ, e nwere ndị ohi abụọ a kpọgidekwara n’osisi n’akụkụ ya, otu n’aka nri ya, otu n’aka ekpe ya.+ 39  Ndị na-agafe agafe nọ na-akparị ya,+ na-efufe isi ha,+ 40  na-asị: “Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ ma rụghachi ya n’ụbọchị atọ,+ zọpụtanụ onwe gị. Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ* ahụ rịdata.”+ 41  Otú ahụkwa ka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye si na-akwa ya emo, na-asị:+ 42  “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ Eze Izrel.+ Ya si n’osisi ịta ahụhụ* rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43  Ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ya napụta ya ugbu a ma ọ bụrụ na ihe ya masịrị ya,+ n’ihi na ọ sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’”+ 44  Otú ahụkwa ka ndị ohi ahụ a kpọgidere n’osisi n’akụkụ ya si na-akparị ya.+ 45  Ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile malite n’awa nke isii* ruo n’awa nke itoolu.*+ 46  N’ihe dị ka n’awa nke itoolu, Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: “Eli, Eli, lama sabaktani?” ya bụ, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?”+ 47  Mgbe ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe ahụ nụrụ ihe a, ha malitere ịsị: “Nwoke a na-akpọ Ịlaịja.”+ 48  Ozugbo ahụ, otu onye n’ime ha gbaara ọsọ were ogbo,* mikpuo ya n’ime mmanya gbara ụka, dokwasị ya n’okporo amị, nyekwa ya ka ọ ṅụọ.+ 49  Ma ndị ọzọ sịrị: “Hapụnụ ya. Ka anyị hụ ma Ịlaịja ọ̀ ga-abịa zọpụta ya.” 50  Jizọs tiri mkpu ọzọ n’oké olu, wee kubie ume.+ 51  Ma, ákwà mgbochi nke dị n’ụlọ nsọ+ dọwara ụzọ abụọ+ si n’elu ruo n’ala.+ Ala wee maa jijiji, oké nkume agbawasịakwa. 52  Ili* dị iche iche meghere, ọtụtụ ozu ndị nsọ nwụrụ anwụ adapụta, 53  ọtụtụ ndị hụkwara ha. (Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ụfọdụ ndị gara ebe ahụ a na-eli ozu pụtara banye n’obodo nsọ.) 54  Ma mgbe onyeisi ndị agha na ndị ha na ya na-eche Jizọs nche hụrụ ala ọma jijiji ahụ na ihe ndị ọzọ na-emenụ, ezigbo ụjọ tụrụ ha, ha asị: “N’eziokwu, onye a bụ Ọkpara Chineke.”+ 55  Ọtụtụ ụmụ nwaanyị nọkwa ebe dị anya na-ele anya. Ha so Jizọs mgbe o si na Galili pụta ka ha wee na-ejere ya ozi.+ 56  Ụfọdụ n’ime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jems na Josis, na nne ụmụ Zebedi.+ 57  Ma mgbe o ruru mgbede, otu nwoke bara ọgaranya bịara. Ọ bụ onye Arimatia. Aha ya bụ Josef, ọ bụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs.+ 58  Nwoke a gakwuuru Paịlet rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.+ Paịlet wee gwa ndị agha ahụ ka ha bunye ya ozu ahụ.+ 59  Josef buuru ozu ahụ, fụchie ya ezigbo ákwà linin dị ọcha,+ 60  liekwa ya n’ili* ọhụrụ+ o gwuru n’oké nkume. Ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ụzọ ili* ahụ lawa. 61  Ma Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọgidere ebe ahụ, nọdụ ala n’ihu ili ahụ.+ 62  Ihe ndị a mere n’ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike.+ N’echi ya, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii gakwuuru Paịlet, 63  sị ya: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye nduhie ahụ kwuru mgbe ọ ka nọ ndụ, sị, ‘Mgbe ụbọchị atọ gachara, a ga-akpọlite m.’+ 64  N’ihi ya, kwuo ka a na-eche ili ahụ nche ruo n’ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru ya+ ma gwa ndị mmadụ, sị, ‘A kpọlitela ya n’ọnwụ.’ Nduhie nke ikpeazụ a ga-akakwa nke mbụ njọ.” 65  Paịlet asị ha: “Unu nwere ndị nche. Gaanụ chee ya nche otú ọ bụla unu ma unu ga-esi chee ya.” 66  Ha wee gaa jiri nkume mechisie ili ahụ ike, dowekwa ndị nche na ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Amụma a dị na Zekaraya 11:12, 13. N’oge Matiu, Jeremaya bụ akwụkwọ mbụ n’akwụkwọ ndị amụma niile. Ọ ga-abụkwa na ọ bụ “Jeremaya” ka a na-akpọ ha niile, tinyere Zekaraya. Gụọ Luk 24:44.
Gụọ A5.
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi!”
Ma ọ bụ “na-acha ọbara ọbara.”
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ma ọ bụ “sapo.”
Ma ọ bụ “Ili ncheta.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”