Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Meela Ka Ndị Mmadụ Mata Aha Chineke N’asụsụ Swahili

E Meela Ka Ndị Mmadụ Mata Aha Chineke N’asụsụ Swahili

 E Meela Ka Ndị Mmadụ Mata Aha Chineke N’asụsụ Swahili

Ọ na-abụ ọtụtụ ndị nụ okwu ahụ bụ́ “Swahili,” ihe na-agbata ha n’obi bụ Afrịka na ọtụtụ ụmụ anụmanụ ndị na-akpagharị n’ogige ụmụ anụmanụ nke dị n’ebe a na-akpọ Serengeti. Ma, e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmata banyere asụsụ Swahili na ndị na-asụ ya.

SWAHILI bụ asụsụ ihe dị ka narị nde mmadụ na-asụ ná mba iri na abụọ ma ọ dịkarịa ala. Mba ndị ahụ dị n’ebe etiti Afrịka nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ Afrịka. * Ọ bụ asụsụ a kacha asụ ná mba ndị dị ka Kenya, Tanzania, nakwa Yuganda. A na-asụkwa ya n’obodo ndị gbara mba atọ a gburugburu. Asụsụ a na-eme ka ọ dịrị ndị bi n’ebe ndị ahụ mfe ịzụkọrịta ahịa na ikwurịta okwu.

Asụsụ Swahili so n’ihe mere ka mba ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Afrịka dịrị n’otu. Dị ka ihe atụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, a na-asụ otu narị asụsụ na iri na anọ n’ime obodo ndị dị na Tanzania. N’ebe ndị ahụ, ọ bụrụ na i si n’ebe i bi gbaa naanị kilomita iri anọ ruo iri asatọ, ị ga-ahụ ndị na-asụ asụsụ dị nnọọ iche n’asụsụ gị. Ị gaa n’ebe ụfọdụ, obere obodo ole na ole na-enwe asụsụ nke ha. Olee otú gị na ndị bi n’ebe ndị ahụ ga-esi ekwurịta okwu? Ị̀ hụla ihe mere inwe otu asụsụ nke ọtụtụ ndị na-asụ ji dị mma?

Mgbe Asụsụ Swahili Bidoro

Ọtụtụ ndị chere na ọ ga-abụ n’ihe dị ka otu puku afọ gara aga ka a malitere ịsụ asụsụ Swahili. A malitere ide ya ede n’ihe dị ka narị afọ isii gara aga. Ndị na-amụ asụsụ Swahili na-achọpụta ngwa ngwa na ọtụtụ okwu Swahili na nke Arabik yiri. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kee okwu niile e nwere n’asụsụ Swahili ụzọ ise, otu ụzọ si  n’asụsụ Arabik, ebe ụzọ anọ si n’asụsụ ndị a na-asụ n’Afrịka. Ka a sịkwa ihe mere o ji bụrụ mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Arabik ka e ji na-ede asụsụ Swahili ruo ọtụtụ narị afọ.

Taa, a na-ede Swahili ná mkpụrụ akwụkwọ yiri nke Bekee. Gịnị kpatara ya? Gịnị mere e ji kwụsị iji mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Arabik ede ya? Tupu anyị azaa ajụjụ ndị a, ka anyị burugodị ụzọ mata ihe mere mgbe ndị ọcha mbụ si Yurop bịara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka n’ihe dị ka otu narị afọ na iri ise gara aga. Ndị ọcha ahụ bịara ịkụziri ndị Afrịka ahụ Baịbụl.

Oge Mbụ Okwu Chineke Rutere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka

N’afọ 1499, bụ́ mgbe Vasko da Gama ji ụgbọ mmiri rute na ndịda Afrịka, ndị ọcha na-ekwusa ozi ọma, bụ́ ndị si Pọchụgal, wuru chọọchị Katọlik ha n’obodo a na-akpọ Zanziba ma malite ịkụziri ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka okpukpe ha. Ma, mgbe narị afọ abụọ na-agafela, ndị obodo ahụ chụpụrụ ndị ọcha ahụ, nke mere ka a kwụsị ikpe chọọchị Katọlik n’obodo ahụ.

O were otu narị afọ na iri ise ọzọ tupu Okwu Chineke abata ọzọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka. Onye ji ya bịa na nke ugbu a bụ Johann Ludwig Krapf, bụ́ onye Jamanị na-ekwusa ozi ọma. O rutere n’obodo Mombasa, nke dị na Kenya, n’afọ 1844. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka aghọọla ndị Alakụba, ebe ndị ọzọ bụ ndị ọgọ mmụọ. Krapf chere na ọ dị mkpa ka mmadụ niile nweta Baịbụl ha ga na-agụ.

Krapf malitere ịmụ asụsụ Swahili ozugbo o rutere. Obere oge o rutere, ọ malitere ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ a n’ọnwa Jun afọ 1844. Ma ọdachi dakwasịrị ya n’ọnwa Julaị. Nwunye ya, bụ́ onye ya na ya lụrụla naanị afọ abụọ, nwụrụ. Abalị ole na ole nwunye ya nwụchara, obere nwa ha nwaanyị nwụkwara. Ọ bụ eziokwu na ọnwụ ha wutere ya, nke ahụ emeghị ka ọ kwụsị ịsụgharị Baịbụl ahụ. N’afọ 1847, e bipụtara Jenesis isi nke mbụ ruo isi nke atọ n’asụsụ Swahili. Ọ bụ ya sụgharịrị ha. Nke a bụ nke mbụ a na-ebipụta akwụkwọ n’asụsụ Swahili.

Krapf bụ onye mbụ ji mkpụrụ akwụkwọ yiri nke Bekee dee ihe n’asụsụ Swahili. Tupu mgbe ahụ, a na-eji mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Arabik ede ihe n’asụsụ Swahili. O nwere ọtụtụ ihe mere o ji jiri mkpụrụ akwụkwọ yiri nke Bekee dee ihe n’asụsụ Swahili. O kwuru na otu n’ime ha bụ na ‘iji mkpụrụ akwụkwọ Arabik ede ihe n’asụsụ Swahili ga-eme ka o siere ndị si Yurop, bụ́ ndị ga-achọ ịmụta asụsụ Swahili, ike ịmụta ya.’ Ọ sịkwara na ‘iji mkpụrụ akwụkwọ yiri nke Bekee ede ihe n’asụsụ Swahili ga-eme ka ọ dịrị ndị na-asụ Swahili mfe ịmụta asụsụ ndị a na-asụ na Yurop.’ E nwekwara ndị ji mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Arabik dee ihe n’asụsụ Swahili ruo ọtụtụ afọ. E jidị mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Arabik dee ụfọdụ akwụkwọ ndị dị na Baịbụl ma bipụta ha. Ma, mkpụrụ akwụkwọ ahụ Krapf ji dee ihe n’asụsụ Swahili  mere ka ọ dịrị ọtụtụ ndị mfe ịmụta Swahili. O doro anya na obi tọrọ ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma na ndị ọzọ na-amụ asụsụ Swahili ụtọ na a malitere iji mkpụrụ akwụkwọ yiri nke Bekee na-ede ihe n’asụsụ Swahili.

Krapf bụ onye mbụ sụgharịrị Okwu Chineke n’asụsụ Swahili, o mekwara ka ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Swahili dịrị ndị ọzọ ga-emecha malite ịsụgharị ha mfe. Ọ bụ ya bipụtara akwụkwọ mbụ e ji amụ asụsụ Swahili, bipụtakwa akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ ahụ.

Aha Chineke n’Asụsụ Swahili

Mgbe e bipụtara Jenesis isi nke mbụ ruo isi nke atọ, ihe a sụgharịrị aha Chineke bụ “Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” Ma, n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, e nwere ọtụtụ ndị bịara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka ma malite ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Swahili. Ụfọdụ n’ime ha bụ Johann Rebmann, William Taylor, Harry Binns, Edward Steere, Francis Hodgson, na Arthur Madans.

Otu ihe dị ezigbo mma na Baịbụl ndị a sụgharịrị n’oge ndị ahụ bụ na e dere aha Chineke n’ebe niile ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ bụghị naanị n’ebe ole na ole. Ndị nọ n’obodo Zanziba na-asụgharị Baịbụl sụgharịrị aha Chineke “Yahuwa,” ebe ndị nke nọ n’obodo Mombasa sụgharịrị ya “Jehova.”

Mgbe ọ na-erule afọ 1895, e bipụtala Baịbụl zuru ezu n’asụsụ Swahili. Mgbe ọtụtụ afọ gafere, e nwere Baịbụl ndị ọzọ a sụgharịrị n’asụsụ Swahili, ma e bipụtaghị ha nnukwu. N’ihe dị ka iri afọ asatọ gara aga, e mere ka otú e si ede asụsụ Swahili n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka bụrụ otu. Ọ bụ ya mere e ji bipụta Baịbụl a kpọrọ Swahili Union Version n’afọ 1952. Baịbụl a bụ Baịbụl ndị na-asụ asụsụ Swahili kacha agụ. Ebe ọ bụ na e dere aha Chineke “Yehova” na Baịbụl a, ọtụtụ ndị bịaziri mara na aha Chineke bụ “Yehova” n’asụsụ Swahili.

Ọ dị mwute na mgbe a kwụsịrị ibipụta Baịbụl ndị ahụ a sụgharịrị n’oge gboo, a kwụsịkwara ide aha Chineke n’ebe niile e kwesịrị ide ha na Baịbụl. E wepụrụ aha Chineke kpamkpam n’ụfọdụ Baịbụl ndị a sụgharịrị na nso nso a. Na Baịbụl ndị nke e dere ya, ọ bụ naanị n’ebe ole na ole ka e dere ya. Dị ka ihe atụ, na Baịbụl ahụ a na-akpọ Swahili Union Version, e dere aha Chineke naanị ugboro iri na ise. Ma mgbe e dezigharịrị Baịbụl a n’afọ 2006, ọ bụ naanị ugboro iri na otu ka e dere aha ahụ. *

Ọ bụ eziokwu na e deghị aha Chineke na Baịbụl a n’ebe niile e kwesịrị ide ya, e nwere otu ihe dị mma ndị sụgharịrị Baịbụl a dere na ya. Ha dere na aha Chineke bụ Jehova n’otu n’ime peeji ndị bidoro Baịbụl a. Nke a na-enyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka ịmata aha Nna anyị nke eluigwe ma ha gụọ Baịbụl ha.

Ma ọ bụghị ebe a ka okwu gbasara ide aha Chineke na Baịbụl kwụsịrị. N’afọ 1996, e bipụtara Baịbụl bụ́ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Swahili. Ihe a bụ Baịbụl mbụ a sụgharịrị n’asụsụ Swahili nke e dere aha Jehova n’ebe niile e kwesịrị ide ya. E dere aha Jehova narị ugboro abụọ na iri atọ na asaa na ya, ya bụ, malite na Matiu ruo ná Mkpughe.  N’afọ 2003, e bipụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a nke zuru ezu n’asụsụ Swahili. Aha ya bụ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. Malite n’afọ ahụ ruo ugbu a, e bipụtala Baịbụl a ihe dị ka narị puku itoolu.

E zoghị aha Chineke ezo na Baịbụl a, e jighịkwa utu aha nkịtị dochie ya ma ọ bụkwanụ dee ya naanị n’otu n’ime peeji ndị bidoro Baịbụl a. Kama nke ahụ, e dere aha Chineke ihe karịrị ugboro puku asaa na ya. Mgbe ọ bụla ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke gụrụ Baịbụl a ma hụ aha Chineke na ya, ọ na-eme ka ha na Chineke na-adịkwu ná mma.

A sụgharịrị Baịbụl a otú onye ọ bụla na-asụ Swahili n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka ga-aghọta ya n’ihi na ọ bụ Swahili a na-asụ n’oge a ka e dere na ya. Ihe ọzọkwa mere Baịbụl a ji dị mma bụ na mgbe a na-asụgharị ya, e denyeghị ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị e dere na Baịbụl ndị ọzọ. N’ihi nke a, obi nwere ike isi onye ọ bụla nke na-agụ Baịbụl a ike na ihe ọ na-agụ bụ ‘okwu ziri ezi nke bụ́ eziokwu,’ nke Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, ji ike mmụọ nsọ ya mee ka e dee.—Ekliziastis 12:10.

Ọtụtụ ndị ekwuola na obi dị ha ụtọ na e bipụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a n’asụsụ Swahili. Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Vicent, onye dị afọ iri abụọ na otu, onye na-ekwusakwa ozi ọma oge niile, kwuru, sị, “Obi tọrọ m ezigbo ụtọ n’ihi na Swahili e dere na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a esighị ike ọgụgụ. Ihe ọzọkwa bụ na e dere aha Jehova n’ebe niile e kwesịrị ide ya, ma ọ dịghị otú ahụ na Baịbụl ndị ọzọ.” Otu nwaanyị aha ya bụ Frieda, bụ́ onye mụrụ ụmụ atọ, kwuru na Baịbụl a emeela ka ọ dịrị ya mfe ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl.

Malite mgbe Karpf bidoro ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Swahili ruo ugbu a e bipụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ Swahili, ihe karịrị otu narị afọ na iri afọ ise agafeela. Jizọs kwuru na ya ‘mere ka aha Nna ya pụta ìhè.’ (Jọn 17:6) N’oge a kwa, ihe karịrị puku Ndịàmà Jehova iri asaa na puku isii, bụ́ ndị bi n’ebe etiti Afrịka nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ Afrịka, jikwa Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a na-eme ka mmadụ niile mara aha Chineke, bụ́ Jehova. Obi na-atọ ha ezigbo ụtọ na ha na-eme nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Otú e si asụ Swahili n’otu mba dịtụ iche n’otú e si asụ ya ná mba ọzọ.

[Map dị na peeji nke 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Mba Ebe Ndị A Na-asụ Asụsụ Swahili n’Afrịka

Sudan

Itiopia

Somalịa

Kenya

Yuganda

Kongo Kinshasa

Ruwanda

Buruundi

Tanzania

Zanziba

Zambia

Malawi

Mozambik

[Foto dị na peeji nke 27]

Akwụkwọ Jenesis 1:1-3 nke Johann Krapf sụgharịrị n’asụsụ Swahili n’afọ 1847

[Ebe E Si Nweta Foto]

Published in the Journal of the American Oriental Society, Vol. 1, No. 3, 1847

[Foto dị na peeji nke 28]

Akwụkwọ Matiu isi nke 1, nke e dere n’asụsụ Swahili ná mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Arabik n’afọ 1891

[Foto dị na peeji nke 28]

Paragraf ebe e dere aha Chineke, bụ́ Jehova, n’otu n’ime peeji ndị dị ná mmalite Baịbụl bụ́ “Swahili Union Version”

[Foto dị na peeji nke 28]

Baịbụl ndị mbụ a sụgharịrị n’asụsụ Swahili. A sụgharịrị aha Chineke “Yahuwa” nakwa “Jehova” na ha

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ịgụ “Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ” n’asụsụ Swahili

[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 28]

Ebe e si nweta foto ndị a: Bible Society of Tanzania and Bible Society of Kenya; nke dị n’aka ekpe n’elu: Image courtesy of the National Library of Scotland