Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Jiri Nnwere Onwe Ime Nhọrọ Anyị Na-eme Ihe?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Jiri Nnwere Onwe Ime Nhọrọ Anyị Na-eme Ihe?

Echiche nke Bible

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Jiri Nnwere Onwe Ime Nhọrọ Anyị Na-eme Ihe?

C HINEKE nyere mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, ikike ime nhọrọ n’onwe ha. O nyere Adam ọrụ ilekọta ogige Iden. Ọrụ Adam gụnyere ịgụ ụmụ anụmanụ aha. (Jenesis 2:15, 19) Nke ka mkpa, Adam na Iv pụrụ ikpebi ma hà ga-erubere Chineke isi ma ọ̀ bụ na ha agaghị erubere ya.—Jenesis 2:17, 18.

Kemgbe ahụ, ndị mmadụ emewo ọtụtụ ijeri mkpebi—ọtụtụ n’ime ha bụ mkpebi ndị dị mma, ụfọdụ bụ ndị na-adịghị mma, ndị ọzọ bụ nnọọ mkpebi ọjọọ. Ụfọdụ n’ime mkpebi ndị na-adịghị mma mmadụ mere arụpụtawo ọdachi. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịbeghị mgbe Chineke weghaara ikike anyị nwere ime nhọrọ. Dị ka Nna nke na-ahụ n’anya, Chineke na-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma site na Bible. Ọ na-adọkwa anyị aka ná ntị banyere ihe ndị na-esi n’ime nhọrọ na-ezighị ezi apụta. Bible na-ekwu na anyị ga-aghọrọ mkpụrụ anyị kụrụ.—Ndị Galeshia 6:7.

Ime Mkpebi n’Okwu Ndị Dịịrị Onwe Onye

N’okwu ụfọdụ, Chineke na-ekwupụta ihe bụ́ uche ya n’ụzọ doro anya, na-enye anyị ntụziaka a kapịrị ọnụ. Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọtụtụ okwu, Bible enyeghị iwu iji chịkwaa ihe nile anyị na-emere onwe anyị. Kama nke ahụ, ọ na-enye nduzi sara mbara ndị na-enye mmadụ ohere ime ihe ndị masịrị ya na ihe ndị ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe ọ na-ekwu banyere ntụrụndụ.

Akwụkwọ Nsọ kpọrọ Jehova “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Okwu ya na-ekwu banyere “mgbe ịchị ọchị” na “mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:1, 4) Bible na-agwa anyị na Eze Devid kpọrọ egwú maka ọdịmma ndị ọzọ. (1 Samuel 16:16-18, 23) Jizọs jere oriri agbamakwụkwọ, ọ tụnyekwara ụtụ n’ememe ahụ site n’ime ka mmiri ghọọ mmanya.—Jọn 2:1-10.

Otú ọ dị, Bible dọrọ aka ná ntị n’ụzọ dabara adaba, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) “Okwu njakịrị rụrụ arụ” na omume rụrụ arụ na-akpasu Chineke iwe, ha pụkwara imebi mmekọrịta anyị na ya. (Ndị Efesọs 5:3-5) Mgbe e nwere mmanya na-aba n’anya ná nnọkọ ntụrụndụ n’ụzọ a na-chịkwaghị achị, nnukwute nsogbu pụrụ isi na ya pụta. (Ilu 23:29-35; Aịsaịa 5:11, 12) Jehova Chineke kpọkwara ime ihe ike asị.—Abụ Ọma 11:5; Ilu 3:31.

Amaokwu Bible ndị a na-enyere anyị aka ile ntụrụndụ anya otú Chineke si ele ya anya. Mgbe ha na-eme nhọrọ, Ndị Kraịst na-eburu ihe Bible kwuru n’uche. N’ezie, anyị nile ga-eburu ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ si ná nhọrọ anyị mere pụta.—Ndị Galeshia 6:7-10.

N’otu aka ahụ, a na-agba Ndị Kraịst ume ime mkpebi ndị amamihe dị na ha n’ikwekọ n’ụkpụrụ Bible n’okwu metụtara ihe ndị dị ka uwe, alụmdi na nwunye, ịbụ nne ma ọ bụ nna, na mmekọrịta achụmnta ego. Ndị a na-agụnye okwu ndị a na-ekwughị maka ha kpọmkwem n’ime Akwụkwọ Nsọ, ma ụkpụrụ ndị dị n’ime ya na-enyere ha aka ime mkpebi dabere n’akọ na uche ha. (Ndị Rom 2:14, 15) Ụkpụrụ na-esonụ kwesịrị imetụta mkpebi onwe onye nile Ndị Kraịst na-eme: “Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31.

N’okwu a, ọ ga-adịkwa mma ka anyị tụlee ụkpụrụ ahụ nke bụ́ ‘ilekwasị anya n’ihe anyị na-eme.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:11) Ọtụtụ nhọrọ ndị na-emegideghị uche Chineke na-echekarị Ndị Kraịst ihu. N’ihi ya, ihe masịrị otu Onye Kraịst pụrụ ịdị iche n’ihe masịrị ndị ọzọ. Chineke agaghị enwe obi ụtọ ịhụ ka ndị ohu ya na-ekpe ibe ha ikpe. (Jems 4:11, 12) Bible na-adụ ọdụ n’ụzọ amamihe dị na ya, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ . . . dị ka onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ.”—1 Pita 4:15.

Mkpebi Ife Chineke Ofufe

Bible na-eme ka uru ndị dị n’irubere Chineke isi pụta ìhè. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke adịghị amanye ndị mmadụ amanye ife ya ofufe. Kama nke ahụ, ọ na-akpọ ụmụ mmadụ o kere eke òkù ka ha ghọọ ndị na-efe ya ofufe. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu, sị: “Batanụ, ka anyị kpọọ isiala huruokwa ala; ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova Onye meworo anyị.”—Abụ Ọma 95:6.

A kpọrọ ndị Izrel oge ochie òkù dị otú ahụ. Ihe karịrị afọ 3,500 gara aga, mba Izrel guzo n’ihu Ugwu Saịnaị, Chineke mere ka ọtụtụ nde mmadụ ahụ mata usoro ezi okpukpe nke Iwu Mozis gụnyere. Ugbu a, ha nwere nhọrọ ha na-aghaghị ime: Hà ga-efe Chineke ka ọ̀ bụ na ha agaghị efe ya? Gịnị ka ha zaghachiri? Ha ji otu obi kwuo, sị: “Ihe nile Jehova kwuworo, anyị [dị njikere ime ha, NW], nụkwa.” (Ọpụpụ 24:7) Ọ bụ ha ka ọ dịịrị ime mkpebi ife Jehova ofufe.

Na narị afọ mbụ, Jizọs malitere ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 4:17; 24:14) Ọ dịghị mgbe ọ rụgidere onye ọ bụla isonyere ya n’ọrụ a. Kama nke ahụ, o ji obiọma kpọọ ndị ọzọ òkù, na-asị: ‘Bịanụ bụrụ ndị na-eso ụzọ m.’ (Mak 2:14; 10:21) Ọtụtụ ndị nakweere òkù ọ kpọrọ wee malite iso ya na-eme nkwusa. (Luk 10:1-9) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ụfọdụ kpebiri ịhapụ Jizọs. Judas kpebiri ịrara ya nye. (Jọn 6:66; Ọrụ 1:25) Ka oge na-aga, ná nduzi nke ndịozi, ọtụtụ ndị ọzọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ, ọ bụghị ná mmanye kama site n’iji nnwere onwe ha nwere mee ihe. Ha “nwere ezi ọchịchọ obi” ma “ghọọ ndị kwere ekwe.” (Ọrụ 13:48; 17:34) Taakwa, ezi Ndị Kraịst ji ọchịchọ obi ha na-erubere Okwu Chineke isi ma na-agbaso ozizi Jizọs.

N’ụzọ doro anya, Chineke na-achọ ka anyị jiri ikike anyị nwere ime nhọrọ na-eme ihe. Ọ na-enyekwa nduzi ndị na-enye aka ime mkpebi amamihe dị na ha n’ime Bible. (Abụ Ọma 25:12) A bịa n’ime mkpebi onwe onye, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iji nlezianya tụlee ụkpụrụ ndị Chineke nyere. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú ahụ ka anyị pụrụ ijere Chineke ‘ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche anyị.’—Ndị Rom 12:1.