Ekliziastis 3:1-22

  • E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla (1-8)

  • Inwe obi ụtọ bụ onyinye si n’aka Chineke (9-15)

    • Ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ (11)

  • Chineke na-ekpe mmadụ niile ikpe ziri ezi (16, 17)

  • Ma mmadụ ma anụmanụ na-emecha nwụọ (18-22)

    • Ha niile ga-alaghachi n’ájá (20)

3  E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla,Ihe ọ bụla a na-eme n’ụwa* nwere oge:   Oge a ga-amụ mmadụ na oge mmadụ ga-anwụ;Oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ;   Oge igbu egbu na oge ịgwọ agwọ;Oge ịkwatu akwatu na oge ịrụ arụ;   Oge ibe ákwá na oge ịchị ọchị;Oge ibe ákwá arịrị na oge ịgba egwú;*   Oge ịtụfusị nkume na oge ịtụtụkọta nkume;Oge ịmakụ mmadụ na oge a na-agaghị amakụ mmadụ;   Oge ịchọ ihe na oge iwere na ihe efuola;Oge idowe ihe na oge ịtụfu ihe;   Oge ịdọka ihe+ na oge ịdụkọta ihe;Oge ịgbachi nkịtị+ na oge ikwu okwu;+   Oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị;+Oge agha na oge udo.  Olee uru onye ọrụ na-erite ná mbọ niile ọ na-agba?+ 10  Ahụla m ọrụ Chineke nyere ndị mmadụ ka ha na-arụ. 11  O mere ka ihe ọ bụla maa mma n’oge kwesịrị ekwesị.+ O medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.* Ma ha emekataghị chọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ malite n’isi ruo ná ngwụcha. 12  Aghọtala m na e nweghị ihe dị mma ha ga-eme karịa ịna-enwe obi ụtọ na ịna-eme ihe ọma n’oge ha dị ndụ+ 13  nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ mmanya ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ọrụ niile ọ na-arụsi ike. Ọ bụ onyinye Chineke.+ 14  Amatala m na ihe niile ezi Chineke na-eme ga-adịru mgbe ebighị ebi. E nweghị ihe mmadụ ga-etinye ma ọ bụ wepụ na ya. Ezi Chineke emeela ka ihe niile dịrị otú a, ka ndị mmadụ wee na-atụ egwu ya.+ 15  Ihe ọ bụla merenụ emebuola, ihe ka ga-adị adịbuokwala.+ Ma ezi Chineke ga-eme ihe ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ka ha mee.* 16  Ahụkwala m ihe a n’ụwa:* Ajọ omume anọchiela ikpe ziri ezi, ajọ omume anọchiekwala ezi omume.+ 17  M wee kwuo n’obi m, sị: “Ezi Chineke ga-ekpe ma onye ezi omume ma onye ajọ omume ikpe,+ n’ihi na ihe ọ bụla a na-eme eme na ọrụ ọ bụla a na-arụ arụ nwere oge.” 18  M kwukwara n’obi m banyere ụmụ mmadụ, sị: Ezi Chineke ga-anwale ha, gosikwa ha na ha dị ka anụmanụ. 19  N’ihi na ọ bụ ihe na-eme* mmadụ na-emekwa anụmanụ. Otu ihe ahụ na-eme ha niile.+ Otú anụmanụ si anwụ ka mmadụ si anwụ. Ọ bụ otu ume ndụ ka ha niile na-eku.+ N’ihi ya, e nweghị ihe mmadụ ji kara anụmanụ, n’ihi na ihe niile bụ ihe efu. 20  Ha niile na-aga n’otu ebe.+ Ha niile si n’ájá,+ ha niile na-alaghachikwa n’ájá.+ 21  Ònye ma ma ume ndụ mmadụ ọ̀ na-agbago elu? Ònyekwa ma ma ume ndụ anụmanụ ọ̀ na-agbada n’ala?+ 22  M wee hụ na e nweghị ihe dị mma mmadụ ga-eme karịa inwe obi ụtọ+ n’ihi ọrụ ọ na-arụ maka na ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ ya;* n’ihi na e nweghị onye nwere ike ime ka ọ hụ ihe ga-eme mgbe ọ na-anọghịzi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Na Hibru, “ịwụli elu.”
Na Hibru, “O tinyedịrị mgbe ebighị ebi n’obi ha.”
Ma ọ bụ “ezi Chineke ga-achọ ihe a nọ na-achụ.” O nwere ike ịbụ, “ezi Chineke ga-achọ ihe ndị gaferela agafe.”
Na Hibru, “n’okpuru anyanwu.”
Ma ọ bụ “na-adabara.”
Ma ọ bụ “òkè ya.”