Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ememe Ọha Bịa Lere nke Nwere Mmetụta n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ

Ememe Ọha Bịa Lere nke Nwere Mmetụta n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ

Ememe Ọha Bịa Lere nke Nwere Mmetụta n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GERMANY

“Ọ MAKA! Ọ bụ nnọọ ịgba!” “Unu emeela maka ọbịa unu lere anyị nakwa maka ọmarịcha ihe ndị unu gosiri anyị. Anyị nwere nnọọ ahụ́ iru ala.” Gịnị kpaliri ọtụtụ ndị nleta ikwupụta ekele dị otú ahụ? Ọ bụ ememe ọha bịa lere nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Germany mere ná ngwụsị izu. Ruo ụbọchị atọ, site na Friday, May 24 ruo Sunday, May 26, 2002, e meghepụụrụ ndị ọbịa ọnụ ụzọ nke ihe owuwu ahụ dị na Selters-Taunus, ịbịa sonyere ihe karịrị 1,000 ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ọrụ n’alaka ahụ n’ememe mgbaafọ otu narị nke alaka ụlọ ọrụ Germany.

Ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị gburugburu alaka ụlọ ọrụ ahụ jiri ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ọkpụkpọ òkù ahụ pụrụ iche. Izu abụọ tupu ememe a dị ịrịba ama amalite, e nyefere ndị mmadụ, ma ọ bụ debe n’ụlọ ndị mmadụ, ihe karịrị 100,000 akwụkwọ ịkpọ òkù. A kwadokwara ọkpụkpọ òkù ahụ site n’ịkpọsa na ide isiokwu ndị dị ogologo banyere ya n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche nakwa site ná mkpọsa ndị e mere na redio. A kpọrọ ndị achụmnta ego na-eresị alaka ahụ ihe na ndị ọchịchị òkù. Ihe karịrị nnọọ mmadụ 7,000 nabatara ya—ndị ọtụtụ n’ime ha na-abụghị Ndịàmà.

Ndị ọbịa gagharịrị n’ebe obibi akwụkwọ, n’ebe mpịakọta akwụkwọ, ná ngalaba mbupụ akwụkwọ, n’ebe ọrụ nkà dị iche iche, n’ebe ịsa ákwà, nakwa n’akụkụ ụfọdụ nke ngalaba nlekọta ọrụ. Ihe osise ndị e gosiri mere ka ndị mmadụ mata banyere nkwụsi ike nke Ndịàmà Jehova nọ na Germany n’ihe banyere ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’oge ọchịchị ndị Nazi na ndị Kọmunist. Ebe e gosiri Bible dị iche iche, bụ́ ndị dị 700, dọọrọ uche gaa n’ojiji e ji aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe. Ọ gaghị ekwe mee ikwughachicha okwu ekele nile a nụrụ, ma ndị a bụ ihe ụfọdụ ndị kwuru.

“Mmadụ nile nọ n’ebe a nwere omume enyi. Ihe nile dị nnọọ ọcha, dịkwa mma n’anya. Ihe nile na-aga nnọọ n’usoro—gburugburu ebe a nakwa ndị bi na ya. Anyị chọrọ ịmụtatụ omume enyi unu.”—Otu di na nwunye meworo agadi.

“Unu emeela maka ezigbo nri unu nakwa maka iji obiọma lekọta anyị n’ụzọ magburu onwe ya nakwa n’ụzọ na-egosi omume enyi. Ọ tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu, ọ ga-amasịkwa anyị ịbịa ọzọ. Ndị bi n’ebe a bụ nnọọ ndị ezigbo mmadụ!”—Ihe otu ìgwè sitere n’ụlọ ọrụ na-emepụta enyo denyere n’akwụkwọ ndị ọbịa.

“Unu emeela nnọọ maka nnabata unu nabatara anyị n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ụlọ ọrụ unu. Nleta ahụ kpaliri mmasị [anyị] nke ukwuu. Anyị na-ekele ndị na-elekọta ngalaba ịsa ákwà, n’ihi na anyị agatụbeghị ebe ịsa ákwà dị ọcha, dịkwa mma n’anya otú ahụ.”—Ozi e-mail sitere n’aka onye nnọchiteanya nke ụlọ ọrụ na-emepụta ncha na ígwè ọrụ ndị na-asa ákwà.

Eva, bụ́ onye dugharịrị ndị nleta, kọrọ, sị: “N’ìgwè nke ọ bụla m dugharịrị, a ga-enwerịrị onye ga-ekwu okwu banyere ime ụlọ obibi, sị: ‘Lewe anya, anyị ga-ebute igbe ákwà anyị. Anyị ga-akwabata n’ime ụlọ a!’”

Ka otu nwanyị nke nọ n’oche nkwagharị nke na-eji ike eletrik arụ ọrụ na-ekiri nnọọ ihe osise nke alaka ahụ, otu onye ọrụ afọ ofufo jụrụ ya ma ya ga-enyere ya aka. “Ee e!” ka nwanyị ahụ zaghachiri. O kwuru na ya anọworị n’ogige ahụ ruo awa ise nke mere na ya apụghịzi ịnọlite anọlite. Ọ dịghị esi n’àkwà ebili, ọ na-enwekwa nnọọ ihe mgbu ka ọ dị ugbu a. Otú ọ dị, ọ kọwara, sị: “Apụrụ m idina ala n’ụlọ, ma ememe ọha bịa lere a na-ewere ọnọdụ nanị otu ugboro!” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe nile na-adọrọ nnọọ mmasị nke na m chọrọ ijide n’aka na m hụrụ ihe nile!”

A jụrụ obere Georg, bụ́ onye dị ihe dị ka afọ ise, ihe kasị masị ya. N’ịbụ onye ígwè obibi akwụkwọ rotary ndị ahụ kpaliri mmasị ya, ọ zara, sị: “Ọ bụ ùkwù akwụkwọ ndị ahụ! E tinye ha n’isi ebe a, ha esi n’isi ya nke ọzọ pụta dị ka akwụkwọ akụkọ. Nke ahụ amaka!”

Otu Onyeàmà nwere ihe ijuanya tọrọ ya ụtọ. Di ya, bụ́ onye na-abụghị Onyeàmà, nke gaworo nzukọ Ndị Kraịst nanị otu ugboro, kwetara isoro ya gaa ememe ọha bịa lere ahụ na Saturday. Na Sunday, mgbe nwunye ya si nzukọ ọgbakọ lọta, o jikerela nnọọ ma chọwa ịpụ. “Gịnị ka ị na-eme?” ka nwunye ya jụrụ. “Ahụzughị m ihe nile ụnyaahụ,” ka ọ zaghachiri. “N’ihi ya, anyị ga-aga Selters ma i jikerechaa. Achọrọ m ịga lerukwuo ya anya.”

N’ebe e gosiri Bible dị iche iche, otu agadi nwanyị, nke jiri ejiji nke ọma, jiri ihere jụọ ebe ọ pụrụ ịkpọ fon, n’ihi na ọ ghaghị ịkpọ fon ozugbo. O mesịrị bụrụ na di ya bụ onye na-adụkọta akwụkwọ, onye bụ́ ọkachamara n’imezi akwụkwọ ochie. Ya na di ya na-esokarị ndị ọzọ akwụkwọ na-amasị, bụ́ ndị otu n’ime ha bụ pastọ ndị Protestant, bụ́ onye na-eji ịdị uchu edokọba ụdị Bible dị iche iche, ezukọ. Ọ bụ ya ka nwanyị ahụ chọrọ nnọọ ịkpọ na fon. Ebe ọ bụ na ọ nọghị n’ụlọ, o zinyere ozi ahụ n’ígwè na-azara ya òkù fon, sị: “Hụ na ị bịara ebe a taa ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Eji m n’aka na ị hụtụbeghị ihe yiri nke a. O kwesịghị ịkwa gị!”

Otu di na nwunye na nwa ha si n’otu obodo dị nso, bụ́ Limburg, bịa. Ha anụtụbeghị banyere Ndịàmà Jehova ruo mgbe ha natara akwụkwọ ọkpụkpọ òkù n’ebe obibi ha. Di na nwunye ahụ kpebiri ịbịa ma kirie nnukwu ụlọ ọrụ a dị na Selters. Marlon na Leila, bụ́ ndị ọrụ afọ ofufo n’alaka Germany, zutere ha ma kọwakwuoro ha banyere Ndịàmà Jehova na ndụ a na-ebi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. A kpaliri nnọọ mmasị nke ezinụlọ ahụ nke na nne na nna ahụ kwuru ka a kpọtụrụ ha maka iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi chiri anya.

“Ebe a dị nnọọ mma, ọ masịkwara m nke ukwuu. Nanị ígwè obibi akwụkwọ ka m hụrụ, ma ọ magburu onwe ya. Unu bụ ndị ezigbo mmadụ nwere omume enyi, ọ bụkwa ya bụ ihe na-amasị m.”—Stefanie (onye dị afọ 12), ihe e denyere n’akwụkwọ ndị ọbịa.

Otu nwanyị nke si n’obodo nta dị nso kwuru, sị: “Ọ dị ihe m na-aghaghị ịgwa unu. Abụ m onye Alakụba, anọwo m na-achọ ịhụ otú ebe a dị. Unu nile nwechara omume enyi, unu enweghịkwa nchekasị. Unu na-eme ka ahụ́ ruo anyị bụ́ [ndị ala ọzọ] ala na Germany. Unu na-egosi mmasị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Nke ahụ dịkwa nnọọ mma! Echi mụ na di m ga-eso bịa ọzọ.” O dere n’akwụkwọ ndị ọbịa, sị: “Ọ dị ịtụnanya! Ọ dị m ka m nọ na Paradaịs.”

Onye na-anya otu n’ime bọs ndị na-ebu ndị mmadụ site n’ebe a na-adọsa ụgbọala ruo n’ọnụ ụzọ mbata nụrụ ka otu onye o bu n’ụgbọala na-agwa onye ọzọ, sị: “Ndị a nwere nnọọ omume enyi! Amabughịdị m banyere ihe a na-emepụta n’ebe a. Ọ bụ ugbu a ka m matara ihe ndị a na-eme ebe a. Legodị otú ha si akpa àgwà. Ọ ghaghị nnọọ ịbụ nzụlite okpukpe ha na mmụta ha nwere mere ha ji eme otú ahụ.”

Awa abụọ tupu e mechie, otu nwoke nọ na-agagharị n’ihu ụlọ nlekọta ọrụ. Ọ nọ nnọọ na-eche echiche ma nọgide na-efufe isi, ya nọtụkwa ya elee ụlọ ahụ anya ọzọ. Ọ bịakwuteziri otu onye ọrụ afọ ofufo nọ n’alaka ahụ, na-ekwu, sị: “O doro anya na e ji ịhụnanya mee ihe nile. Abụghị m otu n’ime Ndịàmà Jehova, ma ọ ga-amasị m ka ngọzi Jehova dịnyere unu.”

Otu Onyeàmà dekwara, sị: “Ọ ga-amasị m iji akwụkwọ ozi a dị nkenke zitere unu ekele m sitere n’obi. Unu tinyere mgbalị dị ukwuu ịhụ na ememe ọha bịa lere a tọrọ ụtọ ruo n’ókè o kwere mee. . . . N’ozuzu ya, ọ bụ ngosipụta nke otú ọ ga-adị n’oge ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-ebikọta n’udo! . . . Ụbọchị ndị a e mere ememe ọha bịa lere wetaara Chineke anyị, bụ́ Jehova, otuto.”—Sandra.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ígwè ọrụ na-ebugharị ndị meworo agadi, ndị nwere nkwarụ, ma ọ bụ ndị ike gwụrụ

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe e gosiri ụzọ dị iche iche e si mee nkwusa n’oge gara aga

[Foto dị na peeji nke 29]

Anyị na-anabata gị n’ememe anyị nke ọha bịa lere

[Foto dị na peeji nke 30]

Ebe e gosiri Bible dị iche iche

[Foto dị na peeji nke 30]

Onye ọrụ afọ ofufo ka ọ na-akọwa nkà na ụzụ n’ụzọ dị mfe