Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Gbamiri Mkpọrọgwụ Na-akpata Ya, Mmetụta Dị Ukwuu Ndị Ọ Na-enwe

Ihe Ndị Gbamiri Mkpọrọgwụ Na-akpata Ya, Mmetụta Dị Ukwuu Ndị Ọ Na-enwe

Ihe Ndị Gbamiri Mkpọrọgwụ Na-akpata Ya, Mmetụta Dị Ukwuu Ndị Ọ Na-enwe

“Agụụ gụrụ m, unu hiwekwara otu kọmitii ileba anya n’agụụ m. Enweghị m ebe obibi, unu tinyekwara akwụkwọ maka ọnọdụ m. Ahụ́ esighị m ike, unu nwekwara nzukọ maka ọnọdụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ. Unu nyochara akụkụ nile nke ọnọdụ m, ma agụụ ka na-agụ m, m ka nọkwa n’enweghị ebe obibi, ahụ́ esibeghịkwa m ike.”—A maghị onye kwuru ya.

N’AGBANYEGHỊ na ụlọ ọrụ dị iche iche nke ụwa emewo mgbalị dị ukwuu iji kwụsị nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, ọ rụpụtabeghị nnọọ ihe a tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1996, Nnọkọ Ihe Oriri Ụwa nke Òtù Na-ahụ Maka Ihe Oriri na Ọrụ Ugbo nke Mba Ndị Dị n’Otu (FAO), setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke ibelata ọnụ ọgụgụ nke ndị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ n’ụwa ruo ọkara—ihe dị ka nde mmadụ 400—ka ọ na-erule n’afọ 2015. *

N’ụzọ kwesịrị ịja mma, e nwewo ọganihu ụfọdụ. Ma n’ụzọ dị mwute, akụkọ òtù FAO wepụtara n’oge na-adịbeghị anya, bụ́ The State of Food Insecurity in the World 2001, na-ekweta, sị: “N’ụzọ doro anya, ọ̀tụ̀tụ̀ e ji ebelata ọnụ ọgụgụ ndị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ n’ụwa dịzi ala.” Ya mere, ihe mgbaru ọsọ nke nnọkọ ahụ setịpụrụ ka yiri ihe a na-apụghị iru eru. N’eziokwu, akụkọ ahụ kwetara na “ọnụ ọgụgụ ndị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ amụbawo nnọọ n’ihe ka ọtụtụ ná mba ndị ka na-emepe emepe.”

Olee ihe mere onye iro a ji sie nnọọ ike mmeri? Iji chọta azịza ya, anyị pụrụ ibu ụzọ kọwaa ihe ọ pụtara bụ́ na mmadụ nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, e mesịzie, anyị enyochaa mmetụta dị ukwuu ọ na-enwe na ihe ndị gbamiri mkpọrọgwụ na-akpata ya.

Gịnị Bụ Nsogbu Na-esi n’Erighị Ihe Ndị Na-edozi Ahụ́?

Nsogbu a na-adị ma ọ bụrụ na mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ́ adịghịzi enweta ihe ndị na-edozi ahụ́, ọ bụkwa ụzọ ihe abụọ na-ejikọtakarị aka akpata ya: (1) erighị ihe na-enye protein, calorie, vitamin, na mineral nke ọma na (2) ibute ọrịa ugboro ugboro.

Nrịanrịa ndị dị ka afọ ọsịsa, arụbara, ịba, na ọrịa ndị na-emetụta iku ume, na-eme ka ahụ́ rụbiga ọrụ ókè ma wepụsịa ihe ndị na-edozi ahụ́. Ha na-ebelata inwe agụụ ma mee ka mmadụ gharazie iri nri nke ọma, wee si otú ahụ tinye aka n’ịkpata nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. N’aka nke ọzọ, nwatakịrị na-adịghị eri ihe ndị na-edozi ahụ́ nwekarịrị ohere ka ukwuu ibute ọrịa dị iche iche. Ọ na-esi otú ahụ amalite ajọ nsogbu na-ekota ọzọ bụ́ nke na-amụba ohere e nwere na onye nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-enye protein na ume ọrụ ga-anwụ.

N’ihi gịnị ka ụmụaka ji nwee ohere ka ukwuu nke inwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́? Ọ bụ n’ihi na ha nọ n’oge ha na-eto ngwa ngwa bụ́ nke na-eme ka ahụ́ ha chọkwuo calorie na protein. Ọ bụkwa ihe ndị yiri nke ahụ mere ndị inyom dị ime na ndị na-enye nwa ara ji enwe ohere dị ukwuu nke inwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́.

Nsogbu nwa ọhụrụ na-amalitekarị ọbụna tupu a mụọ ya. Ọ bụrụ na nwanyị enwee nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ tupu ọ tụrụ ime nakwa n’oge ọ dị ime, ọ ga-amụ nwa na-adịghị arọ otú kwesịrịnụ. Mgbe ahụ, ịnapụ ya ara ngwa ngwa, enyeghị ya nri nke ọma, na edebeghị ya ọcha pụrụ ime ka o nwee nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́.

Ọ bụrụ na nwatakịrị enweghị ihe ndị na-edozi ahụ́ dị mkpa, ọ ga-eme ka ọ kwụsị ito nke ọma. Ọ ga na-ebe ákwá nke ukwuu, ọ pụkwara ibute ọrịa n’ụzọ dị mfe. Ka ọnọdụ ya na-akawanye njọ, ọ ga-atazi ahụ́ n’ụzọ pụtara ìhè, anya ya na opu isi ya (ebe na-esighị ike n’elu isi) na-aba ime, akpụkpọ ahụ́ na uru ahụ́ ya ekwedoo ekwedo, ikike o nwere ịnọgide na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị mma na-ebelata.

Nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ nwere ike ịpụta ìhè n’ụzọ ndị ọzọ. Nke a kwa pụrụ ime ka ụmụaka ghara ito nke ọma. Dị ka ihe atụ, erighị ihe ndị na-enye mineral—karịsịa iron, iodine, na zinc—nakwa vitamin—karịsịa vitamin A, nke ọma—pụrụ inwe mmetụta dị otú ahụ. Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) na-ekwu na ụkọ vitamin A, na-emetụta ihe dị ka 100 nde obere ụmụaka n’ụwa, ọ na-akpatakwa ìsì. Ọ na-ebelata ikike nke usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ na nke nwatakịrị nwere izere ibute ọrịa.

Mmetụta Dị Ukwuu Ndị Ọ Na-enwe

Nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ na-akpa ahụ́ aka ọjọọ, karịsịa nke nwatakịrị. Ọ pụrụ imetụta akụkụ ahụ́ ọ bụla—gụnyere obi, akụrụ, afọ, eriri afọ, akpa ume, na ụbụrụ.

Nnyocha dịgasị iche iche e mere egosiwo na ọ bụrụ na nwatakịrị etoghị nke ọma, ọ na-eme ka ọ ghara ịmacha ihe, meekwa ka ọ ghara inwecha ọgụgụ isi. Otu akụkọ Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara na-akpọ mmetụta ndị a ihe kasị njọ, nke kasị anọte aka, bụ́ ndị nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ na-akpata.

A bịa n’ụmụaka ndị na-anwụghị n’ihi nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, mmetụta ya pụrụ ịdịgide ha etoo. Ọ bụ ya mere UNICEF ji kwaa arịrị, sị: “Mbelata nke ọgụgụ isi mmadụ ruo n’ókè dị ukwuu otú ahụ—n’ihi ihe ndị a pụrụ nnọọ igbochi egbochi—bụ nnọọ mmefu ihe n’ụzọ na-enweghị isi, nke na-ezighịkwa ezi.” Ya mere, mmetụta ndị na-adịte aka nke nsogbu ndị na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ na-akpata oké nchegbu. Nnyocha ndị e mere na nso nso a na-egosi na nwa ọhụrụ inwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ga-eme ka o nwee ike ibute ọrịa ndị na-adịghị ala ala, bụ́ ndị dị ka ọrịa obi, ọrịa shuga, na ọbara mgbali elu, mgbe o mere okenye.

Otú ọ dị, nsogbu dị oké njọ si n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ abụghị nsogbu nke kasị enwe mmetụta dị njọ, dị ka UNICEF na-ekweta: “Ihe karịrị ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke ndị nile na-anwụ n’ihi ihe gụnyere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, adịghị anwụ n’ihi ụdị ya dị oké njọ kama ha na-anwụ n’ihi ụdị ya na-adịghị oké njọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ụmụaka ndị nwere nsogbu na-adịghị oké njọ na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ pụrụ inwe nsogbu ahụ́ ike ndị ọzọ na-adịte aka. Ya mere, ọ dị oké mkpa ka a mata mgbaàmà nke nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ n’ụmụaka, ka e wee nye ha ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị.—Lee igbe dị na peeji nke 7.

Ihe Ndị Gbamiri Mkpọrọgwụ Na-akpata Ya

Ihe ndị bụ́ isi na-akpata nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ bụ ọnọdụ ndị e nwere n’etiti ọha na eze, ọnọdụ akụ̀ na ụba, ọdịbendị, na ihe ndị na-eme gburugburu ebe obibi. Nke kasịnụ n’ime ha bụ ịda ogbenye, bụ́ nke na-emetụta ọtụtụ nde mmadụ, karịsịa ná mba ndị ka na-emepe emepe. Otú ọ dị, ịda ogbenye bụ ma ihe so akpata nsogbu na-esi n’erighị ihe na-edozi ahụ́ ma ihe na-esi na ya apụta, ebe ọ bụ na nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ na-eme ka ndị mmadụ gharazie ịdị na-arụpụta ihe nke ọma, wee si otú ahụ na-eme ka ịda ogbenye dị njọ karị.

E nwere ihe ndị ọzọ so akpata ya. Enweghị ihe ọmụma na-akpata àgwà nke erighị ihe nke ọma. Dị ka anyị hụworo, ọrịa ndị e butere ebute na-ekerekwa òkè. E nwekwara ihe ndị ọzọ metụtara ọha na eze na ọdịbendị bụ́ ndị so akpata ya, dị ka ekeghị ihe oriri n’ụzọ ha nhata na ịkpa ókè megide ndị inyom. Ndị inyom na-erikarị nri ma ndị ikom richaa, ha na-erikwa obere nri karị. A dịghị enyekwa ndị inyom ohere ịga akwụkwọ bụ́ nke ga-enyere ha aka ilekọta ụmụ ha n’ụzọ ka mma.

Tụkwasị na nke a, ihe ndị na-eme gburugburu ebe obibi na-akpata mbelata nke mmepụta ihe oriri. Ọdachi na agha so n’ime ha. Dị ka akwụkwọ bụ́ The State of Food Insecurity in the World 2001 si kwuo, site n’October 1999 ruo June 2001 nanị, ụkọ mmiri ozuzo metụtara mba 22, ajọ ifufe ma ọ bụ idei mmiri kpakwara mba 17 aka ọjọọ, a lụrụ agha obodo ma ọ bụ nwee esemokwu obodo ná mba 14, oké oyi kpara mba 3 aka ọjọọ, ala ọma jijiji mekwara ná mba 2.

Ọgwụgwọ na Mgbochi Ya

Olee otú a pụrụ isi gwọọ nwatakịrị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́? Ọ bụrụ na nwatakịrị ahụ nwere nsogbu dị oké njọ n’ihi erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, ọ pụrụ ịkasị mma ịkpọga ya ụlọ ọgwụ maka ọgwụgwọ mbụ. Dị ka otu akwụkwọ maka ndị dọkịta nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa wepụtara si kwuo, ndị dọkịta ga-enyocha ọnọdụ nwatakịrị ahụ ma gwọọ ọrịa ọ bụla o butere ma ọ bụkwanụ mmiri gwụrụ ya n’ahụ́. A pụrụ iji nke nta nke nta na-enye ya nri, a na-ejikarị tuubu amalite. Agba nke mbụ a pụrụ iwe ihe ruru otu izu.

Agba nke ime ka ahụ́ dịghachi ya mma na-esochizi. Nne nwatakịrị ahụ na-amaliteghachi inye ya ara, na-agbakwa ya ume iri ihe nke ọma ruo n’ókè o kwere mee. Ịkpali ya n’ụzọ mmetụta uche nakwa n’ụzọ anụ ahụ́ dị mkpa n’akụkụ a. Nlekọta anya na mmetụta ịhụnanya pụrụ ịrụpụta ihe ọma dị ịtụnanya maka uto nwatakịrị ahụ. Ọ bụ n’oge a ka a pụrụ ịkụziri nne ya ụzọ ọ ga-esi jiri nri ndị kwesịrị ekwesị na-elekọta nwa ya, na-edebekwa nwa ya ọcha, iji zere ndaghachi azụ. E mesịa, nwatakịrị ahụ na-ahapụ ụlọ ọgwụ. Ọ dị mkpa ka a na-akpọga nwatakịrị ahụ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ụlọ ahụ́ ike iji nọgide na-ahụ maka ahụ́ ike ya.

Otú ọ dị, o doro anya na mgbochi bụ ụzọ kasị mma. Ọ bụ ya mere n’ọtụtụ mba, gọọmenti na òtù ndị nkịtị dị iche iche eguzobewo usoro ihe omume nke itinye ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ́ n’ihe oriri ọha na eze. Obodo dị iche iche na-enyekwa aka n’ọtụtụ ụzọ n’igbochi nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, dị ka site n’ime ka e nwee usoro ihe ọmụmụ banyere ihe oriri, ichebe ebe e si enweta mmiri ọṅụṅụ, igwu mposi, idebe obodo ọcha, na ịkwado atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa, na ilekọta uto ụmụaka.

Ma gịnị ka ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ime iji gbochie nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́? Igbe dị na peeji nke 8 nwere aro ụfọdụ na-enye aka. Tụkwasị n’ihe ndị ahụ, ọkachamara n’ọrịa ụmụaka na ihe oriri, bụ́ Georgina Toussaint, na-atụ aro ka nwanyị mụrụ nwa gakwuru ọkà n’ọrịa ụmụaka ma ọ bụ gaa ụlọ ahụ́ ike ụbọchị asaa mgbe ọ mụsịrị nwa, mgbe nwa ọhụrụ ahụ dị otu ọnwa, na-agakwa kwa ọnwa mgbe nke ahụ gasịrị. Nne ahụ kwesịkwara ịgakwuru ọkachamara ná nlekọta ahụ́ ike ma ọ bụrụ na a hụ mgbaàmà ndị na-egosi na mmiri agwụla nwa ọhụrụ ahụ n’ahụ́, ndị na-egosi na afọ na-asasi ya ike, ma ọ bụkwanụ ndị na-egosi na o nwere ahụ́ ọkụ.

Ọ bụ ezie na aro ndị a na-enye aka n’ime ka nri ụmụaka ka mma, a ghaghị ikweta na nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ abụghị obere ihe—ọ dị nnọọ njọ nke na ụmụ mmadụ apụghị ịgwọta ya. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekweta, sị: “Otú ọ dị, ime ka mmadụ nile nwee ihe oriri nakwa ịkụziri ha banyere nri n’ụzọ zuru ezu, ka bụ ihe ịma aka gbara ọkpụrụkpụ.” Ya mere, è nwere olileanya ọ bụla na ọ dị mgbe a ga-eweta ‘ọnọdụ a chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke na-esi ike nchọpụta’ ná njedebe?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere Nnọkọ Ihe Oriri Ụwa ahụ, lee mbipụta Teta! nke August 8, 1997, peeji nke 20-22.

[Igbe dị na peeji nke 7]

NWA GỊ Ò NWERE NSOGBU NA-ESI N’ERIGHỊ IHE NDỊ NA-EDOZI AHỤ́?

Olee otú ndị ọkachamara ahụ́ ike na-esi achọpụta ókè nwatakịrị nweruru ihe ndị na-edozi ahụ́? Ha pụrụ ịtụle mgbaàmà dị iche iche, jụọ ajụjụ banyere otú nwatakịrị ahụ si eri ihe, ma kwuo ka e mee nnyocha ndị ọzọ. Otú ọ dị, ha na-adaberekarị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a na-aghọta n’ụzọ dị mfe. Ha na-atụ ahụ́ nwatakịrị ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma jiri ihe ha nwetara tụnyere ụkpụrụ ndị e setịpụrụ maka onye hà otú ahụ. Nke ahụ na-enyere ha aka ịchọpụta ụdị nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ nwatakịrị ahụ nwere nakwa otú ọ dịruru ná njọ.

Ihe ndị kasị mkpa ha na-atụ bụ ịdị arọ, ogo ya, na gburugburu ogwe aka ya. Iji ịdị arọ nwatakịrị ahụ tụnyere afọ ndụ ya ga-eme ka a mata ókè nsogbu ahụ na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ dịruru ná njọ; ọ bụrụ na ọ dị oké njọ, nwatakịrị ahụ na-ata ahụ́ ma dị nnọọ tịga tịga. A na-ele nrịanrịa ahụ anya dị ka nke dị oké njọ ma ọ bụrụ na ịdị arọ nwatakịrị ahụ ejiri ihe karịrị pasent 40 dị ala karịa otú o kwesịrị, na-elekwa ya anya dị ka nke na-adịchaghị oké njọ ma ọ bụrụ na o ji pasent 10 ruo 25 dị ala karịa otú o kwesịrị. Ọ bụrụ na ogo ya adị nnọọ nta ma e were ya tụnyere afọ ndụ ya, ọ pụrụ igosi na nwatakịrị ahụ nwere nsogbu na-adịghị ala ala n’ihi erighị ihe ndị na-edozi ahụ́—nwatakịrị ahụ adịghị eto nke ọma.

Ụdị nsogbu kasị njọ na-esi n’erighị ihe ndị na-enye protein na ume ọrụ bụ marasmus, kwashịọkọ, nakwa mgbe ha abụọ jikọtara aka ọnụ. Marasmus (ịta ahụ́ n’akwụsịghị akwụsị) na-emetụta ụmụaka ka na-aṅụ ara bụ́ ndị dị n’agbata ọnwa 6 na 18. Ọ na-eji nke nta nke nta ewere ọnọdụ dị ka oké ụkọ nke calorie na ihe ndị na-edozi ahụ́, ọ na-amalitekwa n’ihi enyeghị nwatakịrị ara nke ọma ma ọ bụ iji ihe ndị ọzọ a gwagburu nnọọ agwagbu dochie anya mmiri ara. Nwa ọhụrụ ahụ na-efelata nnọọ, uru ahụ́ ya na-adị nnọọ peke peke nke na akpụkpọ ahụ́ ya na-arapagidesị n’ọkpụkpụ ya, ọ dịghịkwa eto nke ọma. Nwatakịrị ahụ na-enwekwa “ihu okongwu,” ahụ́ adịghị eru ya ala, ọ na-ebekwa ákwá nke ukwuu.

Aha ahụ bụ́ kwashịọkọ, bụ́ nke e nwetara n’olumba e nwere n’Africa, pụtara “nwatakịrị a chụturu achụtu.” Ọ na-ezo aka n’ebe nwatakịrị nne ya mụrụ nwa ọhụrụ mgbe ọ ka na-aṅụ ara nọ. Ọnọdụ a na-amalite mgbe a napụsịrị nwatakịrị ara, ọ bụkwa ezie na ọ gụnyere ụkọ calorie, ọ na-amalite site n’oké ụkọ nke protein n’ahụ́. Ọ na-eme ka mmiri na-adọrọ n’ime ahụ́, bụ́ nke na-eme ka aka, ụkwụ, na afọ nwatakịrị ahụ zachaa aza. Mgbe ụfọdụ, ọ na-emetụtakwa ihu ya, na-eme ka o yie ọnwa gbazuru agbazu. Ọnyà na-apụtagasị ya n’ihu, ntutu isi ya na-achanwụkwa ma dị nwịrị nwịrị. Imeju nke ụmụaka nọ n’ọnọdụ a na-aza aza, ọ dịghịkwa ihe na-amasị ha, obi adịghịkwa adị ha mma. Ọ bụ ọnọdụ a ka Erik, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, nọ na ya, bụ́ onye nne ya nyere ara ruo nanị otu ọnwa nke ndụ ya; mgbe ahụ, o nyewara ya mmiri ara ehi a gwagburu nnọọ agwagbu. Mgbe ọ dị ọnwa atọ, e nyewara ya ofe ụgụ na mmiri e tinyere shuga ma hapụrụ ya onye agbata obi ha ka ọ na-elekọta.

Ụdị nke atọ nke nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-enye protein na ume ọrụ na-agụnye ọrịa jikọtara ma marasmus ma kwashịọkọ. Ọnọdụ ndị a nile pụrụ igbu egbu ma ọ bụrụ na a gwọghị ha n’oge.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

CHEBE NWA GỊ PỤỌ NÁ NSOGBU NA-ESI N’ERIGHỊ IHE NDỊ NA-EDOZI AHỤ́!

▪ Ọ dị oké mkpa ka e mee ka nri nwanyị mụrụ nwa dịwanye mma. Ọ dị mkpa ka ụmụ nwanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara na-eri ihe ndị na-enye calorie na protein karị. Karịsịa, protein na-enye aka n’imepụta mmiri ara nne. Ya mere, mgbe e nwere obere nri, buru ụzọ nye ndị inyom toruworo ịmụ nwa na ụmụaka.

▪ N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile, ihe oriri kasị mma maka nwa ọhụrụ bụ ara nne ya. Ọ dị otú a karịsịa n’ụbọchị ndị mbụ mgbe a mụsịrị nwa n’ihi na ara nne nwere ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ bụ́ ndị na-echebe nwa ọhụrụ ahụ pụọ n’ibute ọrịa. N’ime ọnwa anọ ndị mbụ ma ọ bụ karịa, mmiri ara na-enye nwa ọhụrụ ihe nile na-edozi ahụ́ dị ya mkpa iji na-eto nke ọma.

▪ Ọ bụ ezie na mmiri ara nne ya ga-anọgide na-abụ ihe oriri ya bụ́ isi, n’agbata ọnwa nke anọ na nke isii, nwa ọhụrụ ahụ na-adị njikere iri nri ndị ọzọ. Jiri nke nta nke nta nyewe ya mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị e gwere egwe. Ka nwa ọhụrụ ahụ na-eri otu nri ọhụrụ n’otu oge. Ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ mgbe e mesịrị, mgbe nri ahụ maratụworo ya ahụ́, nye ya ụdị ọzọ. N’ezie, ọ na-adịkarị mkpa inwe ndidi na ime mgbalị ọtụtụ ugboro tupu nwa ọhụrụ anarawa nri ọhụrụ. Mgbe ị na-akwadebe nri dị otú ahụ, cheta na ihe nile kwesịrị ịdị ezigbo ọcha! Saa ihe oriri na arịa nri nke ọma!

▪ N’agbata ọnwa nke ise na nke itoolu nke ndụ ha, ahụ́ ụmụ ọhụrụ na-amalitekarị ịchọ calorie na protein karịa ara. Nọgide na-ewebata nri ndị ọzọ. Mkpụrụ akụ́kụ́ na nri ụmụaka ndị e ji akwụkwọ nri mee pụrụ ibute ụzọ, a pụrụ iwebata anụ na ihe ndị e ji mmiri ara ehi mepụta mgbe e mesịrị. Ọ bụ eziokwu na nri ndị mbụ a na-enye nwa ọhụrụ na-abụ ihe oriri a zaara mmiri ya, site n’oge ọ dị ọnwa isii gaa n’ihu, a pụrụ nanị ịgbari nri nke ọma. Ọ dịghị mkpa itinye nnu ma ọ bụ shuga, a tụghịkwa aro ka e mee otú ahụ.

▪ Mgbe ọnwa nke asatọ gasịrị, mmiri ara abụghịzi ihe bụ́ isi nwa ọhụrụ ahụ na-eri, kama nke ahụ, ọ bụzi ihe ntụkwasị. Nwa ọhụrụ ahụ na-amalite iri nri ndị ezinụlọ ya na-eri. E kwesịrị idebe nri ahụ ezigbo ọcha, e kwesịkwara ịgbari ya nke ọma ka o wee dị mfe ọtịta. Nri ndị dị nnọọ mma na-agụnye mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri, mkpụrụ akụ́kụ́ na ihe oriri ndị na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa, na anụ na ihe ndị e ji mmiri ara ehi mepụta. * Karịsịa, ọ dị mkpa ka ụmụaka na-eri nri ndị na-enye vitamin A n’ụba. Ụfọdụ n’ime ihe ndị na-enye ya bụ mmiri ara, akwụkwọ nri ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị na-acha edo edo ma ọ bụ odo odo bụ́ ndị dị ka mango, karọt, na pọpọ. Ọ dị mkpa ka ụmụaka na-erubeghị afọ atọ na-eri ihe ugboro ise ma ọ bụ isii kwa ụbọchị.

▪ Ngwakọta kasịnụ nke nri ndị dị iche iche ruo n’ókè o kwere mee na-enye ihe ndị na-edozi ahụ́ bụ́ ndị na-echebe nwa gị. Nwanyị mụrụ nwa kwesịrị ilekwasị anya n’inye nwa ya ezigbo nri, o kwesịghị ịmanye nwatakịrị ahụ irikwu nri mgbe afọ juworo ya ma ọ bụkwanụ ịjụ inye ya nri mgbe o yiri ka ọ chọrọ irikwu nri.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 43 Ị ga-enwetakwu ihe ọmụma n’isiokwu bụ́ “Ihe Oriri Ndị Na-enye Ihe n’Ahụ́ Dị n’Ebe Aka Gị Ga-eru,” nke dị ná mbipụta Teta! nke May 8, 2002.

[Foto]

Ndị ọkachamara kwenyere na ọ fọrọ nke nta ka mmiri ara nne bụrụ mgbe nile nri kasị mma maka nwa ọhụrụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Caroline Penn/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụmụaka na-eri ọka wit kpọrọ nkụ nke a kwọrọ akwọ na akwụkwọ nri na Bhutan

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto FAO/Foto WFP: F. Mattioli

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị pụrụ ime ihe iji mee ka nri nwa gị ka mma

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto FAO