Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ileta Obodo Ọlaedo Ojii

Ileta Obodo Ọlaedo Ojii

 Ileta Obodo Ọlaedo Ojii

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BRAZIL

Ọ PỤRỤ ịbụ na ị nụtụbeghị banyere obodo Ouro Prêto nke dị na Brazil, ma na narị afọ nke 18, ọnụ ọgụgụ ndị nọ na ya ji okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ ndị nọ na New York City, ọ dịkwa mgbe o nyere ego e ji rụgharịa Lisbon nke dị na Portugal bụ́ nke ala ọma jijiji bibiri. Na 1980, Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu debanyere Ouro Prêto n’Ihe Ndekọ nke Ógbè Ndị Nwere Akụ̀ Ndị Dị n’Ime Ala, bụ́ nke e debanyeworo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ógbè 700 kasị nwee ọdịbendị na akụ̀ ndị sitere n’okike na ya. N’ihi gịnị ka Ouro Prêto ji nọrọ n’ọkwá a? Tụlee akụkọ banyere obodo a pụrụ iche.

Ọṅụṅụ Mmiri E Ji Chọpụta Ọlaedo

N’ọkara mbụ nke narị afọ nke 17, ọtụtụ ndị Portugal na-eme nchọpụta, ndị a na-akpọ ndị bandeirante, nọ na-agagharị na Brazil na-achọ ala ọhụrụ, ndị ohu bụ́ ndị India, nakwa ọlaedo. Otu ìgwè ndị na-eme nchọpụta tinyere isi n’ime obodo ruo mgbe ha rutere Ugwu Itacolomi. N’ebe ahụ, Duarte Lopes gara n’otu obere iyi iji mejụọ akpịrị ịkpọ nkụ ya. O jiri ọba ya kuru mmiri ṅụọ. Ọ hụziri ụmụ obere okwute ojii n’ime ọba ahụ.

Lopes resịrị enyi ya okwute ndị ahụ, bụ́ onye chere na ha bara uru wee zigara ha gọvanọ Rio de Janeiro. Mgbe o nyochara okwute ndị ahụ, gọvanọ ahụ hụrụ na ha bụ ezigbo ọlaedo ndị iron na oxygen na-eji ojii kpuchiri. Ma olee ebe ọlaedo ndị ahụ sitere? Ozugbo Lopes mara atụ Itacolomi, a malitere ịchọ ya. N’afọ 1698, onye bandeirante bụ́ Antônio Dias de Oliveira chọtara ugwu ọlaedo ahụ sitere na ya. Ndị na-egwupụta ọlaedo ji oké ọsọ kwaga n’ogige dịdewere ebe a chọtara ọlaedo ahụ, bụ́ ebe e mesịrị kpọọ Vila Rica. N’oge na-adịghị anya, e nwere mmadụ 80,000 bi na Vila Rica. Ka oge na-aga, ọ ghọrọ isi obodo Minas Gerais, a kpọkwara ya Ouro Prêto, nke pụtara “Ọlaedo Ojii.”

Ọlaedo Ojii Akpata Oké Mwụfu Ọbara

N’agbata afọ 1700 na 1820, ndị na-achọ akụ̀ ndị dị n’ime ala gwupụtara ọlaedo dị tọn 1,200—pasent 80 nke ọlaedo nile e gwupụtara n’ụwa nile n’oge ahụ. Ma olee ebe e bugara ọlaedo nile ahụ? A gbazere ọlaedo ndị e gwupụtara ma wapụtagasịa ha n’ibé n’ibé n’ebe a na-akpọ Casa dos Contos, ma ọ bụ Ụlọ Mkpụrụ Ego. Mgbe e mesịrị nke ahụ, otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọlaedo ahụ, bụ́ ụtụ isi, na-abanyezi n’akpa ezinụlọ eze Portugal.

Ndị obodo ahụ a na-achị achị megidere ịkwụ ịtụ isi ahụ. Otu n’ime ha bụ Felipe dos Santos, bụ́ onye kpaliri ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala, ndị agha, na ndị òtù okpukpe imegide Eze Portugal. Ma ndị Portugal megwaara. N’afọ 1720, a kwụgburu dos Santos ma jiri ịnyịnya dọkpụrụ ozu ya gbagharịa n’okporo ámá nile. Ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala maliteghachiri ọrụ, ụtụ isi ahụ nọgidekwara na-arị elu.

Otú ọ dị, nke a kwụsịrị nnupụisi ruo nanị nwa oge. Ka e mesịrị na narị afọ ahụ, Joaquim da Silva Xavier, bụ́ onye a na-etu Tiradentes, nke pụtara “ofo ezé”—nke na-arụtụ aka n’otu n’ime ọrụ ya—bilitere. O so n’ìgwè ndị na-ede uri, ndị ọkàiwu, na ndị agha nke Ouro Prêto bụ́ ndị na-ezukọtakarị n’ụlọ Toledo, bụ́ ụkọchukwu. Ná mmalite, ihe ha kasị ekwurịta bụ ihe ndị metụtara nkà ihe ọmụma, ma ha maliteziri ikwurịta banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ahụ. Mkparịta ụka ha dugaziri ná nnupụisi mgbe ìgwè ahụ malitere iji ụda olu dị ala na-ekwurịta banyere ihe siri ike Eze Portugal na-achọ n’aka ha. Eze nwanyị Portugal, bụ́ Dona Maria nke Mbụ, adịla mbụ dọọ aka ná ntị na a ga-egbupụ ndị nnupụisi isi. Ka o sina dị, n’afọ 1788, Tiradentes, onye bụ́ ọchịagha mgbe ahụ, duziri Inconfidência  Mineira, ma ọ bụ Nnupụisi nke Steeti Minas Gerais.

Onye nledo kpughere aha ndị gbara izu mmegide ahụ. E jidere ha n’otu n’otu ma chụga ha Africa ka ha nwụọ. Tiradentes hụjuru anya n’ụlọ ngá dere mmiri nke dị na Rio de Janeiro ruo mgbe a kwụgburu ya ma gbupụ ya isi n’April 21, 1792. A rụnyere isi Tiradentes n’osisi e gwunyere na mbara ámá obodo Ouro Prêto, e kewakwara ahụ́ ya ụzọ anọ ma kedo ha n’osisi ndị e gwunyere n’akụkụ okporo ụzọ dị iche iche. Ruo oge ụfọdụ, nke ahụ mere ka a ghara inwe ndị nnupụisi. Ma afọ iri atọ mgbe nke ahụ gasịrị, n’afọ 1822, Brazil nweere onwe ya pụọ n’aka Portugal.

Ọrụ Nkà Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa, Akụkọ Ihe Mere Eme, na Okpukpe

Ka oge na-aga, ọlaedo dị na Ouro Prêto gwụrụ, mgbe ahụ ịdị mkpa ya belatakwara. Ma obodo ahụ ka nwere ụfọdụ ọrụ nkà na ihe ndị ọzọ na-eme ka e cheta ihe ndị mere na ya n’oge gara aga. A na-ahụ ụfọdụ n’ime ha n’ụzọ dị mfe n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Inconfidência, bụ́ nke dị na Praça Tiradentes. Ebe ọ bụ na a na-ejibu ya eme ihe dị ka ụlọ nzukọ obodo na ụlọ mkpọrọ, ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ na-eme ka ọrụ nkà, akụkọ ihe mere eme, na ọdachi dakwasịrị obodo ahụ dị ọhụrụ n’uche.

Ihe ndị a na-egosi gụnyere akwụkwọ Dona Maria nke Mbụ ji nye ikike ka e gbuo Tiradentes, na ibé osisi ndị e ji kwụgbuo ya. E ji mbadamba okwute, bụ́ ndị a haziri n’ahịrị dị ka àkwà ndị dị n’ụlọ obibi, dogide ọkpụkpụ nke ụfọdụ n’ime ndị ha na Tiradentes so kpaa nkata ahụ. N’ime ụlọ ọzọ, e nwere ngwá ụlọ ochie, ndị e ji mee ihe n’oge mba ọzọ na-achị obodo ahụ nakwa mgbe eze na-achị ha.

Ihe Ndọrọ Nye Ndị Nkume Dị Oké Ọnụ Ahịa Na-amasị

N’ebe mgbago nke Praça Tiradentes, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa—Obí Gọvanọ, bụ́ ebe ndị gọvanọ na president mba ahụ na-ebi. Ka ọ dị ugbu a, ọ bụzi ụlọ akwụkwọ Escola de Minas, bụ́ ụlọ akwụkwọ dị elu ebe a na-amụ banyere nkà igwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala, nkà mmụta ihe banyere ala, na nkà mmụta banyere ígwè. Ebe ngosi ihe mgbe ochie nke ụlọ akwụkwọ ahụ na-egosi n’ụzọ dị ịrịba ama 20,000 nke ụdị ihe ndị e  gwupụtara n’ala, nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, nkume kristal nakwa ouro prêto, bụ́ ọlaedo ojii 3,000.

A dịghịzi enweta ọlaedo n’ụba taa n’ebe ahụ. Ka o sina dị, a nọgidewo na-enweta nkume aquamarine na nkume emerad beril nakwa nkume topaz na-acha odo odo n’ógbè ahụ. Ihe dị ka afọ 50 gara aga, ọ bụ nanị ndị ọkachamara ole na ole nwere nkà nke igbuwapụta nkume dị oké ọnụ ahịa. Ma taa, e nwere ọtụtụ ndị nọọrọ onwe ha na-achọ nkume ndị dị oké ọnụ ahịa na ụlọ ahịa ndị na-ere ọla na Praça Tiradentes. Ọ bụghị nanị na ndị na-elekọta ụlọ ahịa ndị ahụ ga-akụziri gị otú e si amata nkume ndị dị oké ọnụ ahịa kamakwa ha ga-akpọgara gị ndị na-egbuwapụta nkume ndị dị oké ọnụ ahịa na ndị na-eme ka ha dị mụrụmụrụ bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ime ụlọ ndị dị n’azụ ụlọ. Ha onwe ha, n’aka nke ha, ga-enwe obi ụtọ igosi gị otú e si egbuwapụta ya. Ngosipụta a nke ile ọbịa na-egosi mmetụta ndị obodo ahụ na-enwe n’ihi ịbụ ndị nwere ihe ùgwù nke ibi n’obodo ihe ndị na-adọrọ mmasị mere na ya.

Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịga Brazil, jide n’aka na ị gbakwụnyere ijeru n’Ouro Prêto nke mara mma n’atụmatụ njem gị.

[Map dị na peeji 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ouro Prêto

[Ebe E Si Nweta Foto]

Map: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Mgbe a kpụchapụrụ “iron” na “oxide,” nkume ojii ndị ahụ na-aghọ ọkpụrụkpụ ọlaedo

[Foto dị na peeji nke 17]

Ouro Prêto na Ugwu Itacolomi bụ́ nke dị n’ime ime

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Inconfidência, bụ́ nke dị na Praça Tiradentes

[Foto dị na peeji nke 18]

Nkume “aquamarine,” nkume topaz nke na-acha odo odo, na nkume emerad

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nkume ndị dị oké ọnụ ahịa: Brasil Gemas, Ouro Preto, MG