Ilu 23:1-35

  • Kpachara anya ma a kpọọ gị oriri (2)

  • Achụla akụnụba (4)

  • Akụ̀ ị kpatara nwere ike ipu nku fepụ (5)

  • Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya (20)

  • Mmanya na-ata ka agwọ (32)

23  Ị nọdụ ala ka gị na eze rie ihe,Chebara ihe ị ga-eme echiche nke ọma.   Ọ bụrụ na ị na-eri oké nri,Jide akpịrị gị aka.*   Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,Ka o wee ghara ịbụrụ gị ọnyà.   Adọgbula onwe gị n’ọrụ ka ị kpata akụ̀.+ Kwụsị ime otú ahụ, kama gosi na ị na-aghọta ihe.*   I lee ya anya, ị ga-ahụ na ọ dịghịzi+N’ihi na ọ ga-epu nku ka ugo fega na mbara igwe.+   Erila nri onye aka ntagide. Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,   N’ihi na ọ na-agbakọ ihe niile ị na-eri. Ọ na-asị gị, “Rie nri, ṅụọkwa mmanya,” ma o sighị ya n’obi.   Ị ga-agbọ nri i riri,Ekele niile i kelere ya ga-alakwa n’iyi.   Agwala onye nzuzu okwu,+N’ihi na ọ gaghị eji okwu bara uru ị gwara ya kpọrọ ihe.+ 10  Ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala unu n’oge ochie azụ,+Abanyekwala n’ubi ụmụ na-enweghị nna. 11  N’ihi na Onye na-agbachitere* ha siri ike. Ọ ga-ekpechite ọnụ ha ma mesie gị ike.+ 12  Jiri obi gị nabata aka ná ntị m na-adọ gị,Geekwa ntị n’okwu onye ma ihe na-ekwu. 13  Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+ Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ. 14  I kwesịrị ịpịa ya ụtarịKa ị zọọ ya ndụ.* 15  Nwa m, ọ bụrụ na ị mara ihe,Obi ga-adị m ụtọ.+ 16  M ga-aṅụrị ọṅụ n’ime ime obi m*Mgbe i ji ọnụ gị na-ekwu ihe dị mma. 17  Enwerela ndị mmehie anyaụfụ n’ime obi gị.+ Kama, na-atụ egwu Jehova mgbe niile.+ 18  I mee otú ahụ, ihe ga-adịrị gị mma n’ọdịnihu,+Ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-emekwara gị. 19  Nwa m, gee ntị ka i wee mara ihe,Duziekwa obi gị ka i wee na-eme ihe dị mma. 20  Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya,+Esokwala ná ndị na-atafe anụ ókè,+ 21  N’ihi na onye aṅụrụma na onye na-eri oké nri ga-ada ogbenye,+Ụra ha na-ehi ga-eyiwekwa ha nkịrịka ákwà. 22  Gee nna mụrụ gị ntị,Eledakwala nne gị anya maka na o meela agadi.+ 23  Zụta eziokwu, erekwala ya,+Zụtakwa amamihe na ndụmọdụ* na nghọta.+ 24  Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Onye ọ bụla bụ́ nna onye ma ihe ga-enwekwa obi ụtọ n’ihi nwa ya. 25  Nne gị na nna gị ga-aṅụrị ọṅụ,Nwaanyị mụrụ gị ga-enwekwa obi ụtọ. 26  Nwa m, mee ka obi gị dịrị n’ebe m nọ,Ka ime ihe ndị m kwuru na-atọkwa gị ụtọ.+ 27  N’ihi na nwaanyị akwụna dị ka olulu miri emi,Nwaanyị na-akwa iko* dịkwa ka olulu mmiri dị warara.+ 28  Ọ na-echechi mmadụ n’ụzọ ka onye ohi.+ Ọ na-eme ka ụmụ nwoke ndị na-eme ihe ọjọọ na-adịkwu ọtụtụ. 29  Ònye na-ata ahụhụ? Ònye ka ahụ́ na-anaghị eru ala? Ònye na-ese okwu? Ònye na-ekpesa mkpesa? Ònye ka ọnyá juru ahụ́ mgbe a na-etighị ya ihe? Ònye ka anya ya na-ahụ inyoghi inyoghi? 30  Ọ bụ ndị na-aṅụte mmanya aka.+ Ndị na-achọ ebe mmanya a gwara agwa dị. 31  Ekwela ka otú mmanya si acha ọbara ọbara masị gị,Ekwekwala ka otú o si egbuke egbuke n’iko na otú o si eji nwayọọ agbada n’akpịrị masị gị. 32  N’ihi na n’ikpeazụ, ọ na-ata ka agwọ,Ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala. 33  Anya gị ga na-ahụ ihe na-enweghị isi na ọdụ,Obi gị ga-emekwa ka ị na-ekwu okwu rụrụ arụ.+ 34  Ọ ga-adị gị ka ì dina ala n’etiti oké osimiri,Ka à ga-asị na i dina ala n’elu osisi e ji ejide ákwà ụgbọ mmiri. 35  Ị ga-asị: “Ha etiela m ihe, ma o rughị m n’ahụ́.* Ha kụrụ m ihe, ma amaghị m na ha kụrụ m ihe. Olee mgbe m ga-eteta?+M ka chọrọ ịṅụ ọzọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Tinye mma n’akpịrị gị.”
O nwere ike ịbụ, “Kwụsị iso nghọta gị.”
Na Hibru, “Onye na-agbapụta.”
Na Hibru, “Ka ị napụta ya na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Akụrụ m ga-aṅụrị ọṅụ.”
Na Hibru, “ịdọ aka ná ntị.”
Na Hibru, “Nwaanyị mba ọzọ.” Gụọ Ilu 2:16.
Ma ọ bụ “ọ fụghị m ụfụ.”