Ilu 13:1-25

  • Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe (10)

  • Ike na-agwụ mmadụ ma ihe ọ na-atụ anya ya emezubeghị (12)

  • Onye ozi a tụkwasịrị obi na-eweta ozi bara uru (17)

  • Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe (20)

  • Onye hụrụ nwa ya n’anya na-adọ ya aka ná ntị (24)

13  Nwa ma ihe na-anabata aka ná ntị nna ya na-adọ ya,+Ma onye na-akwa mmadụ emo anaghị anabata mba a na-abara ya.+   Ihe dị mma mmadụ na-ekwu ga-eme ka ihe ọma bịara ya,+Ma ihe na-agụ ndị na-aghọ aghụghọ agụụ bụ tigbuo zọgbuo.   Onye na-eche ọnụ ya* nche na-echebe ndụ* ya,+Ma onye na-anaghị ejide ọnụ ya aka ga-ala n’iyi.+   Ọtụtụ ihe na-agụ onye umengwụ agụụ, ma e nweghị ihe ọ bụla o nwere.+ Ma afọ ga-eju onye na-arụsi ọrụ ike.+   Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,+Ma ihe ndị ajọ omume na-eme na-emechu ha ihu, na-emenyekwa ha ihere.   Ezi omume na-echebe onye aka ya dị ọcha,+Ma ajọ omume na-ala onye mmehie n’iyi.   E nwere onye na-eme ka à ga-asị na ọ bara ọgaranya, ma o nweghị ihe ọ bụla.+ E nwekwara onye na-eme ka à ga-asị na ọ dara ogbenye, ma o nwejuru akụ̀ enweju.   Mmadụ na-eji akụnụba ya agbapụta onwe ya,+Ma e nweghịdị ihe na-eyi ogbenye egwu.+   Ìhè ndị ezi omume na-enwusi ike,*+Ma a ga-emenyụ ọkụ* ndị ajọ omume.+ 10  Naanị ihe mpako na-akpata bụ ọgụ,+Ma ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ* ma ihe.+ 11  Akụ̀ a kpatara ngwa ngwa ga na-agbada agbada,+Ma akụ̀ mmadụ na-akpata obere obere ga na-amụba amụba. 12  Ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya.+ Ma ọ na-aṅụrị ọṅụ, nwetakwa ume ma ihe ọ na-atụ anya ya mezuo.*+ 13  Onye na-anaghị eji ntụziaka akpọrọ ihe ga-ata ahụhụ ya,+Ma onye na-eji iwu e nyere ya akpọrọ ihe ga-enweta ụgwọ ọrụ.+ 14  Ihe onye ma ihe na-akụzi* na-eme ka mmadụ dị ndụ.+ Ọ na-eme ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu ga-ata isi ya. 15  A na-ele onye na-aghọta ihe nke ọma anya ọma,Ma ndụ ndị aghụghọ na-abụ nsogbu nsogbu. 16  Onye ma ihe na-akpa àgwà otú na-egosi na ọ ma ihe,+Ma onye nzuzu na-egosi na ya dị iberiibe.+ 17  Onye ozi nke bụ́ onye ajọ omume ga-aba ná nsogbu,+Ma onye ozi a tụkwasịrị obi na-eme ka ihe dị mma.+ 18  Onye ọ bụla nke na-eleghara aka ná ntị a na-adọ ya anya ga-ada ogbenye, a ga-emechukwa ya ihu. Ma a ga-akwanyere onye na-anabata mba a na-abara ya ùgwù.+ 19  Obi na-adị mmadụ ụtọ mgbe o nwetara ihe na-agụ ya,+Ma ndị nzuzu anaghị achọ ịhapụ ihe ọjọọ.+ 20  Onye ya na ndị ma ihe na-akpa* ga-ama ihe,+Ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.+ 21  Ọdachi na-achụgharị ndị mmehie,+Ma ihe na-agaziri ndị ezi omume.+ 22  Ezigbo mmadụ na-ahapụrụ ụmụ ụmụ ya ihe ha ga-eketa. Ma, ọ bụ akụ̀ onye mmehie kpatara ka a ga-edowere onye ezi omume.+ 23  Ala ebe ndị ogbenye na-akọ ihe na-eme nri nke ọma,Ma ikpe na-ezighị ezi nwere ike ime ka ọ* laa n’iyi. 24  Onye na-anaghị apịa nwa ya ụtarị* kpọrọ ya asị,+Ma onye hụrụ nwa ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.*+ 25  Onye ezi omume na-eri nri rijuo afọ,+Ma afọ ndị ajọ omume na-atọgbọ chakoo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ọ na-ekwu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “na-aṅụrị ọṅụ.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba izu.”
Na Hibru, “ihe ọ na-atụ anya ya bụ osisi nke ndụ ma o mezuo.”
Ma ọ bụ “Iwu onye ma ihe.”
Na Hibru, “na-eje ije.”
Ma ọ bụ “ka onye ahụ.”
Ma ọ bụ “na-anaghị adọ nwa ya aka ná ntị.”
O nwere ike ịbụ, “na-adọ ya aka ná ntị ozugbo.”