Ozi Ọma Matiu Dere 24:1-51

  • IHE ÀMÀ NKE NỤNỌ KRAỊST (1-51)

    • Agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji (7)

    • A ga-ekwusa ozi ọma (14)

    • Oké mkpagbu (21, 22)

    • Ihe àmà Nwa nke mmadụ (30)

    • Osisi fig (32-34)

    • Otú ihe dị n’oge Noa ka ọ ga-adị (37-39)

    • Na-echenụ nche (42-44)

    • Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na ajọ ohu (45-51)

24  Ka Jizọs si n’ụlọ nsọ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ka ha gosi ya ihe niile a rụrụ n’ụlọ nsọ ahụ.  O wee sị ha: “Ùnu na-ahụ ihe ndị a niile? N’eziokwu, ana m asị unu na a ga-akwatucha nkume ndị a. E nweghị otu a ga-ahapụ n’elu ibe ya.”+  Mgbe ọ nọ ọdụ n’Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya naanị ha, sị ya: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Gịnị ga-abụkwa ihe àmà nke ọnụnọ*+ gị na nke ọgwụgwụ oge a?”*+  Jizọs zara ha, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu.+  N’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Abụ m Kraịst.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị.+  Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. Unu atụla ụjọ, n’ihi na ihe ndị a ga-emerịrị. Ma ọgwụgwụ erubeghị.+  “N’ihi na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.+ A ga-enwekwa ụkọ nri+ na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.+  Ihe ndị a niile bụ mmalite ihe mgbu.*  “Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-enyefe unu n’aka ndị ga-akpagbu unu,+ ha ga-egbukwa unu.+ Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ 10  Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ga-akwụsị ife Chineke, rara ibe ha nye, kpọọkwa ibe ha asị. 11  A ga-enwe ọtụtụ ndị amụma ụgha, ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị.+ 12  Ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụkwa oyi n’ihi otú mmebi iwu si ju ebe niile. 13  Ma, ọ bụ onye tachiri obi* ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.+ 14  A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà,+ mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa. 15  “N’ihi ya, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata mbibi, nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ,+ (onye na-agụ ya, ya gbalịa ghọta ya nke ọma), 16  ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.+ 17  Ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata ka o buru ngwongwo n’ụlọ ya. 18  Onye nọ n’ubi, ya alaghachikwala n’ụlọ ka ọ chịrị uwe elu ya. 19  Ụmụ nwaanyị dị ime na ndị ji nwa n’aka n’oge ahụ ga-ata ahụhụ. 20  Na-ekpenụ ekpere ka oge unu ga-agbapụ ghara ịbụ n’oge oyi ma ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike. 21  N’ihi na mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu+ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.+ 22  N’eziokwu, ọ bụrụ na e meghị ka oge ahụ dị mkpirikpi, e nweghị onye a ga-azọpụta. Ma n’ihi ndị a họọrọ, a ga-eme ka oge ahụ dị mkpirikpi.+ 23  “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ n’ebe a,’+ ma ọ bụ, ‘Ọ nọ n’ebe ahụ,’ unu ekwela.+ 24  N’ihi na a ga-enwe Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha.+ Ha ga na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube ma na-eme ihe ịtụnanya dị iche iche iji duhie ndị Chineke họọrọ,+ ma o kwe ha omume. 25  Chetanụ na mụ ebula ụzọ dọọ unu aka ná ntị. 26  N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị mmadụ asị unu, ‘Ọ nọ n’ala ịkpa,’ unu agala ebe ahụ. Ha sịkwa, ‘Ọ nọ n’ọnụ ụlọ dị n’ime,’ unu ekwela.+ 27  N’ihi na dị ka àmụ̀mà na-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ apụta ma gbuo ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka ọnụnọ* Nwa nke mmadụ ga-adị.+ 28  Ebe ọ bụla ozu dị, ebe ahụ ka ugo ga-ezukọta.+ 29  “Ozugbo mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gachara, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,+ ọnwa ga-akwụsịkwa ịgba. Kpakpando ga-esi n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ihe* ndị dị n’eluigwe maa jijiji.+ 30  Mgbe ahụ, ihe àmà Nwa nke mmadụ ga-apụta n’eluigwe, ebo niile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ruo uju.+ Ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.+ 31  Ọ ga-ejikwa ụda opi na-adasi ike zipụ ndị mmụọ ozi ya. Ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa* chịkọta ndị ọ họọrọ, si n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+ 32  “Sinụ n’osisi fig mụta ihe: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro ma pupụtawa akwụkwọ, unu na-ama na oge osisi ji amị mkpụrụ eruwela.+ 33  Ma ununwa, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a niile na-eme, maranụ na Nwa nke mmadụ nọ nso n’ọnụ ụzọ.+ 34  N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị ihe ga-eme ka ọgbọ a nwụchaa ruo mgbe ihe ndị a niile mere. 35  Eluigwe na ụwa ga-ala n’iyi.* Ma, e nweghị ihe ga-eme ka okwu m laa n’iyi.*+ 36  “E nweghị onye ma ụbọchị na awa ọ ga-abụ.+ Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m ma.+ 37  N’ihi na otú ihe dị n’oge Noa+ ka ọ ga-adị n’ọnụnọ* Nwa nke mmadụ.+ 38  N’ihi na dị ka ha nọ n’oge ahụ tupu Iju Mmiri, na-eri, na-aṅụ, ndị nwoke ana-alụ nwaanyị, a na-ekekwa ụmụ nwaanyị di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ,+ 39  ha amaghịkwa ruo mgbe Iju Mmiri ahụ bịara kpochapụ ha niile,+ otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. 40  Mgbe ahụ, ụmụ nwoke abụọ ga-anọ n’ubi. A ga-akpọrọ otu onye, hapụ onye nke ọzọ. 41  Ụmụ nwaanyị abụọ ga na-egwe nri na nkume e ji egwe nri. A ga-akpọrọ otu onye, hapụ onye nke ọzọ.+ 42  N’ihi ya, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.+ 43  “Ma maranụ otu ihe a: A sị na onyeisi ezinụlọ ma oge nche onye ohi ga-eji abịa,*+ ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka ọ bata n’ụlọ ya.+ 44  N’ihi ya, dịrịnụ njikere,+ n’ihi na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’oge unu na-echeghị na ọ ga-abụ. 45  “Ònye n’eziokwu bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,* onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 46  Ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ.+ 47  N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere. 48  “Ma ọ bụrụ na ajọ ohu ekwuo n’obi ya, sị, ‘Nna m ukwu na-egbu oge,’+ 49  wee malite iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị aṅụrụma a ma ama na-eri, na-aṅụkwa, 50  nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge ọ na-amaghị.+ 51  Ọ ga-atakwa ya ezigbo ahụhụ ma tụba ya n’ebe ndị ihu abụọ nọ. N’ebe ahụ ka ọ ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ụdị ihe mgbu nwaanyị na-enwe ma ọ mụwa nwa.
Ma ọ bụ “onye na-atachi obi.”
Na Grik, “ike.”
Na Grik, “n’ifufe anọ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-achị achị na ndị ha na-achị n’ụwa ọjọọ a ka a na-ekwu maka ha.
Ma ọ bụ “ghara imezu.”
Ma ọ bụ “oge onye ohi ga-eji abịa n’abalị.”
Ma ọ bụ “ma ihe.”