Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-eche Banyere Unu

Jehova Na-eche Banyere Unu

Jehova Na-eche Banyere Unu

“Unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe [Chineke] nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”—1 PITA 5:7.

1. N’akụkụ dị aṅaa dị mkpa ka Jehova na Setan dị nnọọ iche?

JEHOVA na Setan dị nnọọ iche. Onye ọ bụla a dọtara n’ebe Jehova nọ ga-abụrịrị onye Ekwensu jụrụ. E kwupụtara ọdịiche a n’otu akwụkwọ ntụaka. Banyere ọrụ Setan dị ka e depụtara n’akwụkwọ Bible bụ́ Job, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica (1970) na-ekwu, sị: ‘Ọrụ Setan bụ ịwagharị n’ụwa na-achọ omume ma ọ bụ onye ọ ga-ebo ebubo ọjọọ; n’ụzọ dị otú a, ọrụ ya dị iche na nke “anya Onyenwe anyị,” bụ́ nke na-awagharị n’ụwa na-ewusi ihe nile dị mma ike (II Chron. xvi, 9). Setan ekwetaghị na ụmụ mmadụ ji achọghị ọdịmma onwe ha nanị na-egosi ịdị mma, e nyekwara ya ikike ịnwale ha n’okpuru nchịkwa nke Chineke ruo ókè Chineke kwere ka o meruo ya.’ Ee, lee ka ha si dị iche!—Job 1:6-12; 2:1-7.

2, 3. (a) Olee otú ihe okwu ahụ bụ́ “Ekwensu” pụtara si pụta ìhè nke ọma n’ihe mere Job? (b) Olee otú Bible si egosi na Setan nọgidere na-ebo ndị ohu Jehova nọ n’elu ala ebubo?

2 Okwu ahụ bụ́ “Ekwensu” sitere n’okwu Grik pụtara “onye ebubo ụgha,” “onye nkwutọ.” Akwụkwọ Job na-ekpughe na Setan boro ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job ebubo na ọ na-ejere Jehova ozi n’ihi ọdịmma onwe ya, na-asị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” (Job 1:9) Ihe ndekọ dị n’akwụkwọ Job na-egosi na n’agbanyeghị ule na ọnwụnwa ndị o nwetara, Job bịarukwuru Jehova nso. (Job 10:9, 12; 12:9, 10; 19:25; 27:5; 28:28) Mgbe ahụmahụ ọjọọ ya gasịrị, ọ gwara Chineke, sị: “Site n’ọnụnụ ntị ka m nụrụ Gị; ma ugbu a anya m ahụwo Gị.”—Job 42:5.

3 Setan ọ̀ kwụsịla ibo ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ebubo kemgbe oge Job? Ee e. Akwụkwọ Mkpughe na-egosi na n’oge ọgwụgwụ a, Setan nọgidere na-ebo ụmụnna Kraịst e tere mmanụ nakwa n’ezie ndị enyi ha na-ekwesị ntụkwasị obi, ebubo. (2 Timoti 3:12; Mkpughe 12:10, 17) N’ihi ya, mkpa dị ukwuu nke anyị nile bụ́ ezi Ndị Kraịst nwere bụ ido onwe anyị n’okpuru Chineke anyị nke na-eche banyere anyị, bụ́ Jehova, na-ejere ya ozi n’ihi ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe ọ nọ ma si otú ahụ na-egosipụta na ebubo Setan bụ ụgha. Site n’ime otú ahụ, anyị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Jehova Na-achọ Inyere Anyị Aka

4, 5. (a) N’ụzọ dị iche n’ebe Setan nọ, gịnị ka Jehova na-achọ n’ụwa? (b) Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta ihu ọma Jehova?

4 Ekwensu na-ejegharị n’ụwa, na-achọ onye ọ ga-ebo ebubo na onye ọ ga-eripịa. (Job 1:7, 9; 1 Pita 5:8) N’ụzọ dị iche, Jehova na-achọ inyere ndị na-achọ ike ya aka. Hananaị onye amụma gwara Eze Esa, sị: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Lee ọdịiche dị n’etiti nnyocha Setan ji ịkpọasị enyocha anyị na nlekọta ịhụnanya nke Jehova!

5 Jehova adịghị enyocha anyị iji hụchata emezighị emezi ma ọ bụ adịghị ike anyị nile. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Azịza ya bụ: ọ dịghị onye ọ bụ. (Eklisiastis 7:20) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi zuru okè bịaruo Jehova nso, ọ ga-elekwasị anyị anya, ọ bụghị iji maa anyị ikpe, kama iji hụ mgbalị anyị ma zaa ekpere anyị maka enyemaka na mgbaghara. Pita onyeozi dere, sị: “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike; ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 3:12.

6. Olee otú ihe metụtara Devid si bụrụ ma ihe nkasi obi ma ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị?

6 Devid ezughị okè, o mekwara mmehie dị oké njọ. (2 Samuel 12:7-9) Ma ọ wụsaara Jehova obi ya ma bịaruo ya nso n’ekpere siri ike. (Abụ Ọma 51:1-12, ihe e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 51) Jehova nụrụ ekpere ya ma gbaghara ya, ọ bụ ezie na Devid tara ahụhụ n’ihi ihe ndị na-adịghị mma mmehie ya rụpụtara. (2 Samuel 12:10-14) Nke a kwesịrị ịbụrụ anyị ma ihe nkasi obi ma ihe ịdọ aka ná ntị. Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị nwere nchegharị n’ezie, ma, ọ bụ ihe na-akpali iche echiche ịmara na mmehie na-arụpụtakarị ihe ndị dị mwute. (Ndị Galeshia 6:7-9) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbịaru Jehova nso, anyị kwesịrị izere ruo ókè o kwere mee, ihe ọ bụla ga-ewute ya.—Abụ Ọma 97:10.

Jehova Na-adọta Ndị Ya n’Ebe Ọ Nọ

7. Olee ụdị mmadụ Jehova na-achọ, oleekwa otú o si adọta ha n’ebe Ọ nọ?

7 Devid dere n’otu n’ime abụ ya, sị: “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.” (Abụ Ọma 138:6) N’ụzọ yiri nke ahụ, abụ ọzọ na-asị: “Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị? nke na-eme Onwe ya ka Ọ dị elu ịnọdụ ka eze, nke na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie.” (Abụ Ọma 113:5-7) Ee, Onye Okike pụrụ ime ihe nile nke eluigwe na ala na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị ụwa anya, anya ya na-ahụkwa “onye dị umeala n’obi,” “onye na-enweghị ike,” bụ́ mmadụ ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme.” (Ezikiel 9:4) Ọ na-adọta ndị dị otú ahụ n’ebe ọ nọ site n’aka Ọkpara ya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru, sị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya . . . Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m ò kwere ya.”—Jọn 6:44, 65.

8, 9. (a) Gịnị mere o ji dị anyị nile mkpa ịbịakwute Jizọs? (b) Gịnị dị nnọọ ịrịba ama banyere ndokwa nke ihe mgbapụta ahụ?

8 Ụmụ mmadụ nile kwesịrị ịbịakwute Jizọs ma nwee okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ n’ihi na a mụrụ ha dị ka ndị mmehie, ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. (Jọn 3:36) Ọ dị ha mkpa ime ka ha na Chineke dịghachi ná mma. (2 Ndị Kọrint 5:20) Chineke echereghị ka ndị mmehie rịọ ya ka o mee ndokwa ụfọdụ ha na ya pụrụ isi na ha dịrị n’udo. Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya nke ya n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ maka anyị. N’ihi na ọ bụrụ na, mgbe anyị bụ ndị iro, e mere ka anyị na Chineke dịghachi ná mma site n’ọnwụ nke Ọkpara ya, a ga-azọpụta anyị site ná ndụ ya n’ụzọ dị ukwuu karị.”—Ndị Rom 5:8, 10.

9 Jọn onyeozi kwadoro eziokwu ahụ dị mkpa bụ́ na Chineke na-eme ka ya na ụmụ mmadụ dịghachi ná mma, na-ede, sị: “Site na nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ọnọdụ anyị, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ime ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site na ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na anyị ahụwo Chineke n’anya, kama na ọ hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya dị ka àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 4:9, 10) Ọ bụ Chineke bu ụzọ mee ihe, ọ bụghị ụmụ mmadụ. Ị́ dịghị enwe mmetụta nke ịbụ onye a dọtara n’ebe Chineke nke na-egosi ịhụnanya dị ukwuu n’ahụ́ “ndị mmehie,” “ndị iro” ma e kwuwerịị, nọ?—Jọn 3:16.

Mkpa Ọ Dị Ịchọ Jehova

10, 11. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji na-achọ Jehova? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele usoro ihe Setan anya?

10 N’ezie, Jehova adịghị amanye anyị ịbịakwute ya. Anyị aghaghị ịchọ ya, ‘sọọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na, n’eziokwu, ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ 17:27) Anyị aghaghị ịmata oruru o ruuru Jehova ịchọ ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ya. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso. Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ.” (Jems 4:7, 8) Anyị ekwesịghị ịla azụ iguzogidesi Ekwensu ike na iguzosi ike nye Jehova.

11 Nke a pụtara ịnọpụ nnọọ iche n’ebe ajọ usoro ihe Setan dị. Jems dekwara, sị: “Ùnu amaghị na ịbụ ndị enyi nke ụwa bụ ịbụ ndị iro nke Chineke? Ya mere, onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi nke ụwa na-edebe onwe ya n’ọnọdụ ịbụ onye iro nke Chineke.” (Jems 4:4) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị enyi Jehova, anyị aghaghị ịtụ anya ka ụwa Setan kpọọ anyị asị.—Jọn 15:19; 1 Jọn 3:13.

12. (a) Okwu ndị dị aṅaa na-akasi obi ka Devid dere? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jehova nyere site n’aka Azaraịa onye amụma?

12 Mgbe ụwa Setan na-emegide anyị n’ụzọ ụfọdụ kpọmkwem, ọ dị anyị mkpa karịsịa ijekwuru Jehova n’ekpere, na-arịọ maka enyemaka ya. Devid, bụ́ onye Jehova napụtara ọtụtụ ugboro, dere iji kasie anyi obi, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu. Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha. Jehova na-edebe ndị nile na-ahụ Ya n’anya; ma ndị nile na-emebi iwu ka Ọ ga-ekpochapụ.” (Abụ Ọma 145:18-20) Abụ ọma a na-egosi na Jehova pụrụ ịzọpụta anyị mgbe a na-ele anyị ule n’otu n’otu nakwa na ọ ga-azọpụta ndị ya n’ozuzu ha n’oge ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Mkpughe 7:14) Jehova ga-anọ anyị nso ma ọ bụrụ na anyị anọrọ ya nso. N’ịbụ onye “mmụọ nke Chineke” duziri, Azaraịa onye amụma kwuru ihe anyị pụrụ iwere dị ka eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, sị: “Jehova nọnyeere unu, mgbe unu nọnyeere Ya; ọ bụrụkwa na unu achọọ Ya, Ọ ga-eme ka unu chọta Ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, Ọ ga-ahapụ unu.”—2 Ihe E Mere 15:1, 2.

Jehova Aghaghị Ịdị Adị Nye Anyị

13. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na Jehova dị adị nye anyị?

13 Pọl onyeozi dere banyere Mozis na “ọ nọgidere na-eguzosi ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Hibru 11:27) N’ezie, ọ dịghị mgbe Mozis hụrụ Jehova anya n’ụzọ nkịtị. (Ọpụpụ 33:20) Ma Jehova dị nnọọ adị nye ya nke na ọ dị ka ọ na-ahụ Ya anya. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe ọnwụnwa Job gasịrị, anya okwukwe nke Job hụrụ Jehova nke ọma karị dị ka Chineke nke na-ekwe ka a nwaa ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ọnwụnwa ma bụrụ onye na-adịghị agbahapụ ha ma ọlị. (Job 42:5) E kwuru banyere Ịnọk na Noa na ha ‘na Chineke yikọrọ jegharịa.’ Ha mere nke a site n’ịchọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ na irubere ya isi. (Jenesis 5:22-24; 6:9, 22; Ndị Hibru 11:5, 7) Ọ bụrụ na Jehova dị adị nye anyị dị ka ọ dị nye Ịnọk, Noa, Job, na Mozis, anyị ‘ga-amara ya’ n’ụzọ anyị nile, ọ ‘ga-emekwa ka ụzọ anyị nile zie ezie.’—Ilu 3:5, 6.

14. Gịnị ka ‘ịrapara’ Jehova n’ahụ́ pụtara?

14 Kpọmkwem tupu ndị Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis dụrụ ha ọdụ, sị: “Jehova, bụ́ Chineke unu, ka unu ga na-ejeso n’azụ, Ya ka unu ga-atụ egwu, ihe nile O nyere n’iwu ka unu ga-edebe, olu Ya ka unu ga-ege ntị, Ya ka unu ga-efe ofufe, Ya ka unu ga-arapara n’ahụ́.” (Deuterọnọmi 13:4) Ha gaje iso Jehova, ịtụ egwu ya, irubere ya isi, na ịrapara n’ahụ́ ya. Banyere okwu a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘ịrapara n’ahụ́,’ otu ọkà mmụta Bible na-ekwu na “okwu e ji mee ihe maka ya na-egosi mmekọrịta chiri nnọọ anya.” Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ha na ya na-enwe mkpakọrịta chiri anya.” (Abụ Ọma 25:14, NW) Anyị na Jehova ga-enwe mmekọrịta a chiri anya ma dị oké ọnụ ahịa ma ọ bụrụ na ọ dị adị nye anyị nakwa ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu nke na anyị na-atụ egwu imejọ ya n’ụzọ ọ bụla.—Abụ Ọma 19:9-14.

Ị̀ Maara na Jehova Na-eche Banyere Gị?

15, 16. (a) Olee otú Abụ Ọma nke 34 si egosi na Jehova na-eche banyere anyị? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike icheta ihe ọma ndị Jehova mewooro anyị?

15 Otu n’ime nzupụta aghụghọ Setan bụ ịgbalị ime ka anyị chefuo eziokwu ahụ bụ́ na Chineke anyị, bụ́ Jehova, na-anọgide na-elekọta ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Eze Devid nke Izrel maara nke ọma banyere ogwe aka Jehova nke na-enye nchebe ọbụna mgbe o chere oge kasị dị ize ndụ ihu. Mgbe a manyere ya ime ka onye ara n’ihu Eze Ekish nke Gat, ọ rọrọ abụ, abụ mara nnọọ mma, bụ́ nke gụnyere okwu ndị a na-egosipụta okwukwe: “Sonụ m mee ka Jehova dị ukwuu, ka anyị buliekwa aha Ya elu n’otu. Achọrọ m Jehova, Ọ zakwara m, wee napụta m n’ụjọ m nile. Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, O wee dọpụta ha. Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma: onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke na-agbaba n’ime Ya. Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha. Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.”—Abụ Ọma 34:3, 4, 7, 8, 18, 19; 1 Samuel 21:10-15.

16 Ì kweere na Jehova nwere ike nzọpụta? Ị̀ maara banyere nchebe o ji ndị mmụọ ozi ya enye? Ì detụwo ire n’onwe gị ma hụ na Jehova dị mma? Olee mgbe ikpeazụ ị chọpụtara kpọmkwem na Jehova emeworo gị ihe ọma? Gbalịa cheta. Ọ̀ bụ n’ụlọ ikpeazụ ahụ i letara n’ozi, kpọmkwem mgbe ọ dị gị ka ike ọ gwụla gị? Ikekwe, gị na onye nwe ụlọ nwere mkparịta ụka dị nnọọ mma mgbe ahụ. Ì chetara kelee Jehova maka inyekwu gị ike dị gị mkpa nakwa maka ịgọzi gị? (2 Ndị Kọrint 4:7) N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ isiri gị ike icheta kpọmkwem ihe ọma ụfọdụ Jehova meere gị. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i cheghachi echiche azụ ruo otu izu, otu ọnwa, otu afọ gara aga ma ọ bụ karịa. Ya bụrụ otú a ka ọ dị, gịnị ma i mee nnọọ mgbalị siri ike ịbịarukwu Jehova nso ma gbalịa ịhụ otú o si na-eduzi gị? Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke . . . ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.” (1 Pita 5:6, 7) N’ezie, otú ọ na-echeru banyere gị ga-atụ gị n’anya!—Abụ Ọma 73:28.

Nọgide Na-achọ Jehova

17. Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-achọ Jehova?

17 Ịnọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta aghaghị ịbụ ihe na-aga n’ihu. Jizọs kwuru n’ekpere o kpegaara Nna ya, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Inweta ihe ọmụma banyere Jehova na Ọkpara ya chọrọ anyị ịnọgide na-eme mgbalị. Enyemaka nke ekpere na mmụọ nsọ na-enye dị anyị mkpa iji ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10; Luk 11:13) Nduzi nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” dịkwa anyị mkpa iji jiri nri ime mmụọ a na-enye “n’oge kwesịrị ekwesị” na-azụ uche anyị. (Matiu 24:45) Site n’aka ya, Jehova enyewo anyị ndụmọdụ ịgụ Okwu ya kwa ụbọchị, ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya, na ikere òkè buru ibu n’ikwusa ‘oziọma nke alaeze ahụ.’ (Matiu 24:14) Site n’ime otú ahụ, anyị ga-anọgide na-achọ Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova.

18, 19. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (b) Ọ bụrụ na anyị eguzogidesie Ekwensu ike ma nọgide na-achọ Jehova, olee otú a ga-esi gọzie anyị?

18 Setan na-eme ihe nile o nwere ike ime iji na-ewetara ndị Jehova mkpagbu, mmegide, na nrụgide site n’akụkụ ọ bụla. Ọ na-agbalị ịkpaghasị udo anyị na imebi aha ọma anyị nwere n’ebe Chineke anyị nọ. Ọ chọghị ka anyị nọgide n’ọrụ anyị nke ịchọta ndị nwere obi eziokwu na inyere ha aka ịbịa n’akụkụ nke Jehova n’ihe iseokwu ahụ metụtara ọbụbụeze eluigwe na ala. Ma anyị aghaghị ikpebisi ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova, na-atụkwasị ya obi ịnapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ. Site n’ikwe ka Okwu Chineke na-eduzi anyị nakwa site n’iso nzukọ ya a na-ahụ anya na-arụsi ọrụ ike, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-anọ ya mgbe nile ịkwado anyị.—Aịsaịa 41:8-13.

19 N’ihi ya, ka anyị nile guzogidesie Ekwensu na nzupụta aghụghọ ya dị iche iche ike, nọgide na-achọ Chineke anyị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Jehova, bụ́ onye na-aghaghị ‘ime ka anyị guzosie ike, mee ka anyị sie ike.’ (1 Pita 5:8-11) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ‘ga-edebe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke, ka anyị na-echere ebere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ile anya ndụ ebighị ebi.’—Jud 21.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Ekwensu” pụtara, oleekwa otú Ekwensu si ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’aha ahụ?

• Olee otú Jehova si dị iche n’ebe Ekwensu nọ n’ụzọ O si ekiri ndị bi n’ụwa?

• N’ihi gịnị ka mmadụ na-aghaghị iji nakwere àjà mgbapụta ahụ n’ịbịakwute Jehova?

• Gịnị ka ‘ịrapara’ Jehova n’ahụ́ pụtara, oleekwa otú anyị pụrụ isi nọgide na-achọ Ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

N’agbanyeghị ọnwụnwa ya, Job bịara ghọta na Jehova na-eche banyere ya

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ na-echetara anyị na Jehova na-eche banyere anyị