Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Nọ n’Ọrụ?

Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Nọ n’Ọrụ?

Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Nọ n’Ọrụ?

“Ụwa nọ n’oké mgbagwoju anya, dị ka a ga-asị na ike anwansi ji nnọọ nlezianya na-anwa imechi ụzọ nile e si agbapụ n’ọnọdụ mberede.”—Jean-Claude Souléry, odeakụkọ.

‘Mmetụta nke enweghị enyemaka ndị mmadụ n’otu n’otu na-enwe yiri ka ọ̀ na-eme ka ha na-eche na mmụọ ọjọọ nke karịrị ha ike nọ n’ọrụ.’—Josef Barton, ọkọ akụkọ ihe mere eme.

OKÉ egwu nke mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere na September 11, 2001, kpaliri, mere ka ọtụtụ mmadụ tụgharịa uche. Ka ọ na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Financial Times nke England, Michael Prowse kwuru, sị: “Ọ dịghị anụmanụ ga-eme ma ọ bụ pụrụ ime omume n’ụzọ obi ọjọọ dị otú ahụ.” Otu uche akwụkwọ akụkọ nke New York Times kwuru na e wezụga nhazi nke mwakpo ahụ chọrọ, “ọ dị nnọọ mkpa ịtụle otú ịkpọasị nke kpaliri ya ruru. Ọ bụ ịkpọasị nke karịrị nke e ji alụ agha, nke na-amaghị ókè, nke na-adịghị agbaso nkwekọrịta ọ bụla.”

Ndị nọ n’okpukpe dịgasị iche iche tụgharịrị uche ma ọ̀ ga-abụ na ụfọdụ ike ọjọọ nọ n’ọrụ. Otu ọchụnta ego si Sarajevo bụ́ onye hụrụ arụ nke ịkpọasị agbụrụ kpatara na Bosnia kwupụtara, sị: “Mgbe a lụsịrị agha Bosnia ruo otu afọ, ekweere m na ọ bụ Setan kpatara ya. Nke a bụ nnọọ ịwị ara.”

Mgbe a jụrụ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jean Delumeau ma ò kweere na Ekwensu dị, ọ zara, sị: “M̀ pụrụ isi aṅaa rụọ ụka na e nweghị ike na-akpata ihe ọjọọ ka m na-ahụ ihe ndị na-eme na ihe ndị meworo kemgbe a mụrụ m: Agha ụwa nke abụọ, bụ́ nke tara isi ihe karịrị nde mmadụ 40; ogige Auschwitz na ogige ọnwụ dị iche iche; mgbuchapụ agbụrụ e mere na Cambodia; ọchịchị aka ike nke Ceauşescu bụ́ nke a kwafuru nnọọ ọbara na ya; ọchịchị nke ọtụtụ ebe gburugburu ụwa iji mmekpọ ọnụ mere usoro ha na-agbaso. Arụ ndị a kpaworo enweghị ngụta. . . . Ya mere, ekweere m na anyị ziri ezi ịkpọ ihe ndị dị otú ahụ ‘aka ọrụ Ekwensu,’ ọ bụghị na ọ bụ Ekwensu nke nwere mpi na ụkwụ wara mkpị kpatara ha kama ọ bụ Ekwensu nke bụ́ ihe nnọchianya nke mmụọ na ike nke ihe ọjọọ bụ́ nke na-akpa ike n’ụwa.”

Dị ka Jean Delumeau, ọtụtụ mmadụ na-asị na arụ a na-akpa taa n’etiti ọha mmadụ, site ná ndị a na-akpa n’ime ezinụlọ ruo ná ndị a na-akpa gburugburu ụwa, bụ “aka ọrụ Ekwensu.” Ma gịnị ka nke a pụtara? À ga-asị na ọ bụ ike na-abụghị onye nke na-akpata ihe ọjọọ ka ihe ndị dị otú ahụ na-eyi egwu si n’aka, ka è nwere ndị nwere ikike ọjọọ bụ́ ndị nọ n’ọrụ, ndị na-akpali ndị mmadụ ịkpa arụ ndị karịrị ụdị ihe ọjọọ e ji mara ụmụ mmadụ? Ọ̀ bụ onyeisi ihe ọjọọ—Setan bụ́ Ekwensu—na-achịkwa ikike ndị dị otú ahụ?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Ụmụaka: Foto U.S. Coast Guard