Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-eguzogidenụ Ekwensu”

“Na-eguzogidenụ Ekwensu”

 “Na-eguzogidenụ Ekwensu”

“Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—JEMS 4:7.

1. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ụwa nke oge a, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji dị ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha mkpa ịnọ na nche?

“CHINEKE apụwo n’anya, ma Ekwensu ka nọ.” Ihe ndị ahụ onye France na-ede akwụkwọ bụ́ André Malraux kwuru pụrụ ikwekọ nnọọ n’ọnọdụ e nwere n’ụwa anyị bi n’ime ya. N’ezie, ihe ndị mmadụ na-eme yiri ka ọ na-egosipụta aghụghọ Ekwensu karịa igosipụta uche Chineke. Setan ji “ọrụ ọ bụla dị ike na ihe ịrịba ama na ihe àmà dị ebube nke ụgha, jirikwa aghụghọ ajọ omume ọ bụla maka ndị na-ala n’iyi,” na-eduhie ndị mmadụ. (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10) Otú ọ dị, “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a, Setan na-etinye mgbalị ya nile n’ebe ndị ohu Chineke raara onwe ha nye nọ, na-ebuso Ndị Kraịst e tere mmanụ agha, “bụ́ ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (2 Timoti 3:1; Mkpughe 12:9, 17) Ọ dị Ndịàmà a na ndị enyi ha nwere olileanya elu ala mkpa ịnọ na nche.

2. Olee otú Setan si rafuo Iv, egwu dịkwa aṅaa ka Pọl onyeozi kwuru na ọ na-atụ ya?

2 Setan bụ onye nduhie n’ụzọ ọ bụla. N’iji agwọ mere ihe mkpuchi, ọ ghọgburu Iv iche na ọ pụrụ inwe obi ụtọ ka ukwuu site n’ime ihe n’adabereghị na Chineke. (Jenesis 3:1-6) Ihe dị ka puku afọ anọ ka e mesịrị, Pọl onyeozi kwupụtara egwu na-atụ ya na Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Kọrint pụrụ ịbụ ndị Setan ghọgburu. Pọl dere, sị: “Egwu ji m na n’ụzọ ụfọdụ, dị ka agwọ ahụ ji aghụghọ ya rafuo Iv, e nwere ike merụọ obi unu pụọ n’izi ezi na ịdị ọcha kwesịrị Kraịst ahụ.” (2 Ndị Kọrint 11:3) Setan na-emerụ uche ndị mmadụ ma na-eme ka ha na-eche echiche n’ụzọ gbagọrọ agbagọ. Dị nnọọ ka ọ rafuru Iv, ọ pụrụ ime ka Ndị Kraịst na-eche n’ụzọ na-ezighị ezi na obi ụtọ ha dabeere n’ihe Jehova na Ọkpara ya kpọrọ asị.

3. Nchebe dị aṅaa ka Jehova na-enye pụọ n’aka Ekwensu?

3 A pụrụ iji Setan tụnyere osi ọnyà, bụ́ onye na-esi ọnyà iji jide anụ na-amaghị na e siri ọnyà. Iji zere ọnyà Setan, ọ dị anyị mkpa ‘ibi n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu,’ bụ́ ebe nchebe ihe atụ nke Jehova na-enye ndị na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ya n’ihe ndị ha na-eme. (Abụ Ọma 91:1-3) Nchebe nile Chineke na-enye site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya dị anyị mkpa ka anyị wee “nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị  Efesọs 6:11) A pụrụ ịsụgharị okwu Grik maka “nzupụta ọjọọ dị iche iche” ịbụ “nzupụta aghụghọ nile,” ma ọ bụ “aghụghọ.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ekwensu na-eji ọtụtụ aghụghọ na nzupụta aghụghọ eme ihe ná mgbalị ya ịmata ndị ohu Jehova n’ọnyà.

Ọnyà Ndị Setan Siiri Ndị Kraịst Oge Mbụ

4. Ụwa dị aṅaa ka Ndị Kraịst oge mbụ biri na ya?

4 Ndị Kraịst biri ndụ na narị afọ mbụ na nke abụọ O.A. biri n’oge ikike nke Alaeze Ukwu Rom nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu. Pax Romana (Udo nke Rom) mere ka azụmahịa gaa nke ọma. Ọganihu a mere ka ndị na-achị achị nwee oge ntụrụndụ dị ukwuu, ha hụkwara na ọha na eze nwere ihe ntụrụndụ dị ukwuu ka ha wee ghara inupụ isi. N’oge ụfọdụ, oge ezumike na-eburu ibu ka oge ọrụ. Ndị ndú ji ego ọha na eze enye ndị mmadụ achịcha ma na-emere ha ihe ngosi, na-eme ka ha na-eriju afọ ma na-enwe ihe ndị ga na-adọrọ uche ha.

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị Ndị Kraịst ịdị na-aga n’ebe ndị a na-eme ihe nkiri na egwuregwu na Rom? (b) Aghụghọ dị aṅaa ka Setan ji mee ihe, oleekwa otú Ndị Kraịst pụrụ isi zere ya?

5 Ọnọdụ a ọ̀ bụụrụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ ihe ize ndụ? Ọ bụrụ na e jiri okwu ịdọ aka ná ntị nke ndị dere akwụkwọ mgbe oge ndị ozi gasịrị, dị ka Tertullian, dere wee tụlee ya, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe omume ntụrụndụ ndị a na-enwe mgbe ahụ dị nnọọ ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ omume nye ezi Ndị Kraịst. Otu ihe kpatara ya bụ na a na-eme ihe ka ukwuu n’ememe ọha na eze ndị ahụ iji sọpụrụ chi ndị ọgọ mmụọ dị iche iche. (2 Ndị Kọrint 6:14-18) N’ebe ndị ahụ a na-eme ihe nkiri, ọbụna ọtụtụ egwuregwu ọdịnala ndị a na-eme na-ejupụta n’omume rụrụ arụ, ma ọ bụ jupụta n’ime ihe ike a na-akwafu ọbara na ha. Ka oge na-aga, mmasị ndị mmadụ nwere n’egwuregwu ọdịnala jụrụ oyi, e jikwa ihe nkiri ndị rụrụ arụ a na-emegharị ahụ́ na ha n’ekwupụtaghị okwu dochie anya ha. N’akwụkwọ ya bụ́ Daily Life in Ancient Rome, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jérôme Carcopino na-ekwu, sị: “N’egwuregwu ndị a, a na-ekwe ka ndị inyom na-eme egwuregwu gbara ọtọ kpam kpam . . . A na-awụfu ọbara nke ukwuu. . . . [Ihe nkiri ndị a na-emegharị ahụ́ na ha n’ekwughị okwu] gosipụtara omume rụrụ arụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị ukwuu bụ́ nke riworo ọha mmadụ bi n’isi obodo ahụ ahụ́. Ihe ngosi ndị dị otú ahụ adịghị awụ ha akpata oyi n’ahụ́ n’ihi na ọ dịwo anya ihe ike a na-eme na ọbara a na-akwafu n’ebe a na-eme egwuregwu ndị ahụ maara ha ahụ́ ma mebie amamihe ha bu pụta ụwa.”—Matiu 5:27, 28.

6 N’ebe ndị ahụ a na-eme egwuregwu, ndị na-alụ ọgụ ọnwụ n’ámá egwuregwu na-alụgide ọgụ ruo n’ọnwụ, ma ọ bụ lụsoo anụ ọhịa ọgụ, na-egbu ha ma ọ bụ na-abụ ndị ha gburu. A tụbaara ndị omempụ a mara ikpe ọnwụ, na n’ikpeazụ ọtụtụ Ndị Kraịst, anụ ọhịa ndị na-adọgbu adọgbu. Ọbụna n’oge ndị mbụ ahụ, aghụghọ Setan bụ ime ka ndị mmadụ ghara ịdị na-asọ omume rụrụ arụ na ime ihe ike oyi ruo mgbe ha ghọrọ ihe a na-eme n’ebe nile na ihe ọha mmadụ  na-achọsi ike. Nanị otu ụzọ isi zere ọnyà ahụ bụ ịghara ịga n’ebe ndị ahụ a na-eme ihe nkiri na egwuregwu.—1 Ndị Kọrint 15:32, 33.

7, 8. (a) N’ihi gịnị ka ọ gaara ejiwo bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya Onye Kraịst ịga kirie ọsọ ụgbọ ịnyịnya? (b) Olee otú Setan pụrụ isiwo jiri ebe ịsa ahụ́ nke Rom mata Ndị Kraịst n’ọnyà?

7 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọsọ ụgbọ ịnyịnya ndị a na-enwe ná nnukwu ọgbọ egwuregwu ndị toro ogologo na-akpali mmasị, ma ha ekwesịghị Ndị Kraịst n’ihi na ndị na-ekiri ha na-amalitekarị ime ihe ike. Otu onye na-ede akwụkwọ na narị afọ nke atọ kọrọ na ụfọdụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ alụrịtawo ọgụ, Carcopino kwukwara na “ndị na-agụ kpakpando na ndị akwụna nwere ọdụ ahịa ha” n’okpuru ihe owuwu ọgbọ egwuregwu ahụ. N’ụzọ doro anya, ọgbọ egwuregwu nke Rom abụghị maka Ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

8 Gịnị banyere ebe ịsa ahụ́ ndị a ma ama nke Rom? N’ezie, ọ dịghị ihe dị njọ n’ịsa ahụ́ iji dị ọcha. Ma ọtụtụ n’ime ebe ịsa ahụ́ nke Rom bụ ihe owuwu buru ibu nke gụnyere ebe a na-ahịa aka n’ahụ́, ụlọ mmega ahụ́, ebe ndị a na-anọ agba chaa chaa, na ụlọ oriri na nkwari. Ọ bụ ezie na dị ka e kwuru, e setịpụrụ oge mgbe ndị ikom ga na-asa ahụ́ na mgbe ndị inyom ga na-asa nke ha, a na-ekwekarị ka a na-asakọta ahụ́. Clement nke Aleksandria dere, sị: “Ebe ịsa ahụ́ ndị ahụ gheere oghe mgbe ọ bụla nye ma ndị ikom ma ndị inyom; n’ebe ahụkwa, ha na-agba ọtọ iji mee omume rụrụ arụ.” N’ihi ya, Setan pụrụ ijiwo ihe owuwu ndị e mere maka ọha na eze mee ihe n’ụzọ dị mfe dị ka ọnyà iji mata Ndị Kraịst. Ndị maara ihe zeere ya.

9. Ọnyà ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst oge mbụ na-aghaghị izere?

9 Ịgba chaa chaa bụ ihe na-amasị ndị mmadụ iji egburu oge mgbe ikike Alaeze Ukwu Rom nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu. Ndị Kraịst oge mbụ pụrụ izere iti ebe ndị a na-eme mgbe a na-agba ọsọ ụgbọ ịnyịnya nanị site n’ịghara ịga ebe ndị ahụ. A na-agba ntakịrị chaa chaa n’ụzọ iwu na-akwadoghị n’ọnụ ụlọ ndị dị n’ime ụlọ ndị njem na ụlọ mmanya dị iche iche. Ndị na-agba chaa chaa na-eji mkpụrụ okwe onye nke ọzọ chị n’aka eti ebe. Ịgba chaa chaa na-eme ka ndụ na-adị ndị mmadụ ụtọ, n’ihi na ọ na-eme ka ha nwee olileanya nke inweta ego n’ụzọ dị mfe. (Ndị Efesọs 5:5) Ọzọkwa, ụmụ agbọghọ na-enye mmanya n’ụlọ mmanya ndị ahụ na-abụkarị ndị akwụna, na-akpata ihe ize ndụ nke ịdaba ná mmekọahụ rụrụ  arụ. Ihe ndị a bụ ụfọdụ ọnyà Setan siiri Ndị Kraịst bi n’obodo dị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom. Ihe ọ̀ dị nnọọ iche taa?

Ọnyà Setan Taa

10. Olee otú ọnọdụ ndị dị taa si yie ndị nke jupụtara n’Alaeze Ukwu Rom?

10 N’ozuzu, aghụghọ Setan agbanwebeghị kemgbe ọtụtụ narị afọ ndị ahụ. Ka “Setan wee ghara ịghọgbu” Ndị Kraịst bi n’obodo Kọrint rụrụ arụ, Pọl onyeozi nyere ha ndụmọdụ siri ike. Ọ sịrị: “Anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ [Setan].” (2 Ndị Kọrint 2:11) N’ọtụtụ mba ndị mepere emepe, ọnọdụ ndị e nwere taa yiri ndị ahụ juru ebe nile mgbe ikike Alaeze Ukwu Rom nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu. Ọtụtụ ndị na-enwe oge ntụrụndụ ugbu a karịa ka ha nwetụworo mgbe ọ bụla ọzọ. Lọtrị gọọmenti na-eme ka ndị dara ogbenye na-enwetụ olileanya. E nwere ọtụtụ ihe ntụrụndụ ndị dị ọnụ ala bụ́ ndị na-adọrọ uche ndị mmadụ. Ámá egwuregwu na-eju eju, ndị mmadụ na-agba chaa chaa, ìgwè mmadụ na-amalite ime ihe ike mgbe ụfọdụ, ndị na-eme egwuregwu na-emekarịkwa otú ahụ. A na-anụ egwú ndị rụrụ arụ n’ebe nile, a na-eme ihe nkiri ndị rụrụ arụ n’ebe ndị a na-eme ihe nkiri nakwa na sinima na TV. Ná mba ụfọdụ, ịsakọta ahụ́ n’ebe ịsa ahụ́ na n’isi iyi ndị na-asọpụta mmiri ọkụ bụ ihe a na-emekarị, tinyere ịgba ọtọ asa ahụ́ n’ụsọ mmiri dị iche iche. Dị nnọọ ka Setan mere na narị afọ ndị mbụ nke Iso Ụzọ Kraịst, ọ na-agbalị iji ihe ntụrụndụ nke ụwa ara ndị ohu Chineke ụra.

11. Ọnyà ndị dị aṅaa dị n’ọchịchọ nke ịtụsaratụ ahụ́ na ịtụrụ ndụ?

11 N’ụwa ebe nrụgide jupụtara, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịchọ ịtụsaratụ ahụ́ ma ọ bụ ịtụrụ ndụ. Otú ọ dị, dị nnọọ ka ebe ịsa ahụ́ ndị Rom nwere ihe ndị dị ize ndụ nye Ndị Kraịst oge mbụ, ụfọdụ ebe ezumike na ebe ntụrụndụ aghọwo ọnyà Setan jiworo mee ihe iji duba Ndị Kraịst nke oge a n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ n’ịṅụbiga mmanya ókè. Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru. Meenụ ka uche unu zuo okè n’ụzọ ezi omume, unu anọgidekwala na-eme mmehie, n’ihi na ụfọdụ enweghị ihe ọmụma banyere Chineke.”—1 Ndị Kọrint 15:33, 34.

12. Olee ụfọdụ aghụghọ ndị Setan ji amata ndị ohu Jehova n’ọnyà taa?

12 N’ihe banyere Iv, anyị ahụwo otú Setan si jiri aghụghọ merụọ echiche ya. (2 Ndị Kọrint 11:3) Taa, otu n’ime ọnyà ndị Ekwensu ji eme ihe bụ iduba Ndị Kraịst n’iche na ọ bụrụ na ha emee ihe ruo n’ókè ọ bụla kwere omume n’ịgbalị igosi na Ndịàmà Jehova dị nnọọ ka ndị ọzọ, na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịdọta ụfọdụ ndị n’eziokwu Ndị Kraịst. Mgbe ụfọdụ ha na-agabiga ókè, ihe megidekwara ihe ha bu n’obi na-eme. (Hagaị 2:12-14) Aghụghọ ndị ọzọ nke Setan bụ ịkpali Ndị Kraịst raara onwe ha nye, ma ndị na-eto eto ma ndị toworo eto, ibi ụdị ndụ abụọ ma ‘na-eme ka mmụọ nsọ Chineke na-enwe mwute.’ (Ndị Efesọs 4:30) Ụfọdụ ndị adabawo n’ọnyà a site n’iji Intanet eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

13. Olee ọnyà zoro ezo nke bụ otu n’ime nzupụta aghụghọ nke Ekwensu, ndụmọdụ dịkwa aṅaa dị n’Ilu kwesịrị ekwesị n’ebe a?

13 Ọnyà ọzọ nke Setan bụ anwansi na-apụtachaghị ìhè. Ọ dịghị ezi Onye Kraịst ga-ama ụma tinye aka n’ife Setan ma ọ bụ ná mgbaasị. Ma, ụfọdụ adịghị elezi anya mgbe a bịara n’ihe nkiri vidio, ihe nkiri TV, egwuregwu vidio, na ọbụna akwụkwọ ụmụaka na akwụkwọ ndị na-akpa ọchị, bụ́ ndị na-egosipụta ime ihe ike na omume mgbaasị. Ọ dị mkpa izere ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na anwansi. Ilu amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Ogwu na igbudu dị n’ụzọ onye gbagọrọ agbagọ n’obi: onye na-edebe mkpụrụ obi ya ga-anọ ha n’ebe dị anya.” (Ilu 22:5) Ebe ọ bụ na Setan bụ “chi nke usoro ihe a,” ihe ọ bụla na-ewu ewu pụrụ izochi otu n’ime ọnyà ya.—2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 2:15, 16.

Jizọs Guzogidere Ekwensu

14. Olee otú Jizọs si guzogide ọnwụnwa mbụ nke Ekwensu?

14 Jizọs setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke iguzogide Ekwensu na ime ka ọ gbalaga. Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim na mgbe o busịrị ọnụ ruo ụbọchị 40, Setan nwara ya. (Matiu 4:1-11) Ọnwụnwa nke mbụ nwara iji agụụ kwesịrị ịgụ Jizọs mgbe o busịrị ọnụ, mee ihe. Setan gwara Jizọs ka ọ rụọ ọrụ  ebube mbụ ya iji gboo mkpa anụ ahụ́. N’ihota Deuterọnọmi 8:3, Jizọs jụrụ iji ike ya mee ihe maka ọdịmma onwe ya ma jiri nri ime mmụọ kpọrọ ihe karịa nri nkịtị.

15. (a) Olee ọchịchọ e bu pụta ụwa nke Setan gbakwasịrị ụkwụ wee nwaa Jizọs? (b) Gịnị bụ otu n’ime nzupụta aghụghọ ndị bụ́ isi Ekwensu ji arata ndị ohu Chineke taa, ma olee otú anyị pụrụ isi guzogide ya?

15 Echiche na-akpali mmasị banyere ọnwụnwa a bụ na Ekwensu agbalịghị ime ka Jizọs mee mmehie nke inwe mmekọahụ. Agụụ nke na-akpalite, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọchịchọ iri nri yiri ka ọ bụ ọchịchọ anụ ahụ́ kasị ike iji mee ihe n’ịnwa Jizọs n’oge a. Ọnwụnwa ndị dị aṅaa ka Ekwensu ji ara ndị Chineke ụra taa? Ha dị ọtụtụ ma dịgasịa iche, ma ọ na-eji ọnwụnwa mmekọahụ eme ihe dị ka otu n’ime nzupụta aghụghọ ndị bụ́ isi o ji eme ihe ná mgbalị ya imebi iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Jehova. Site n’iṅomi Jizọs, anyị pụrụ iguzogide Ekwensu na ọnwụnwa. Dị nnọọ ka Jizọs mebiri mgbalị Setan site n’icheta akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị, mgbe a nwara anyị ọnwụnwa, anyị pụrụ icheta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Jenesis 39:9 na 1 Ndị Kọrint 6:18.

16. (a) Olee otú Setan si nwaa Jizọs nke ugboro abụọ? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan pụrụ isi nwaa anyị itinye Jehova n’ule?

16 Mgbe e mesịrị, Ekwensu nwara Jizọs ka o si ná mgbidi ụlọ nsọ wụtuo ma nwalee ikike Chineke nwere iji ndị mmụọ ozi Ya chebe ya. N’ihota Deuterọnọmi 6:16, Jizọs jụrụ itinye Nna ya n’ule. Setan nwere ike ghara ịnwa anyị ọnwụnwa isi n’elu ụlọ nsọ wụtuo, ma ọ pụrụ ịnwa anyị itinye Jehova n’ule. À na-anwa anyị ịma ókè anyị pụrụ iṅomiru uwe na ejiji ndị na-ewu ewu n’ụwa ma ghara ịbụ ndị e nyere ndụmọdụ? À na-anwa anyị ikere òkè ná ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo? Mgbe ahụ, anyị ga na-etinye Jehova n’ule. Ọ bụrụ na anyị nwere ọchịchọ ndị dị otú ahụ, kama isi n’ebe anyị nọ gbalaga, Setan pụrụ igbutụ oge, nọgide na-agbalị ịraba anyị n’ịdụnyere ya úkwù.

17. (a) Olee otú Ekwensu si nwaa Jizọs nke ugboro atọ ya? (b) Olee otú Jems 4:7 pụrụ isi mezuoro anyị?

17 Mgbe Setan kwere Jizọs nkwa inye ya alaeze nile nke ụwa ma ọ bụrụ na ọ ga-akpọ isiala nye ya, Jizọs guzogidere ya ọzọ site n’ihota ihe site n’Akwụkwọ Nsọ, na-eguzosi ike n’ife Nna ya ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Deuterọnọmi 5:9; 6:13; 10:20) Setan nwere ike ọ gaghị ekwe nkwa inye anyị alaeze nke ụwa, ma ọ na-eji ihe ndọrọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, na ọbụna atụmanya nke inwe obere alaeze nke onwe anyị, anwa anyị ọnwụnwa mgbe nile. Ànyị na-emeghachi omume dị ka Jizọs mere, na-efe Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-adịrị anyị otú ọ dịịrị Jizọs. Ihe ndekọ Matiu na-asị: “Mgbe ahụ Ekwensu hapụrụ ya.” (Matiu 4:11) Setan ga-ahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị eguzogidesie ya ike site n’icheta ụkpụrụ Bible ndị kwesịrị ekwesị na itinye ha n’ọrụ. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jems 4:7) Otu Onye Kraịst degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na France akwụkwọ, sị: “Setan dị aghụghọ n’ezie. N’agbanyeghị ezigbo ebumnobi m, ọ na-esiri m ike ịchịkwa mmetụta na ọchịchọ m. Otú o sina dị, site n’inwe obi ike, ndidi, na karịsịa, site n’enyemaka Jehova, enwewo m ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma jidesie eziokwu ahụ aka ike.”

Ndị A Kwadebere nke Ọma Iguzogide Ekwensu

18. Ihe agha ime mmụọ ndị dị aṅaa na-akwadebe anyị iguzogide Ekwensu?

18 Jehova enyewo anyị ihe agha ime mmụọ zuru ezu iji nyere anyị aka “iguzosi ike megide  nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11-18) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe eziokwu ahụ dị ga-eke anyị ekike n’úkwù, ma ọ bụ kwadebe anyị, maka ọrụ Ndị Kraịst. Mkpebi siri ike anyị mere ịgbasosi ụkpụrụ ezi omume nke Jehova ike ga-adị ka ihe mgbochi obi, na-echebe obi anyị. Ọ bụrụ na anyị yikwasịrị ozi ọma n’ụkwụ anyị, ọ ga-eme ka anyị na-ekerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa, nke a ga-ewusikwa anyị ike ma chebe anyị n’ụzọ ime mmụọ. Okwukwe anyị siri ike ga-adị ka ọta ukwu, na-echebe anyị pụọ ‘n’akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ,’ bụ́ mwakpo ndị o ji aghụghọ eme na ọnwụnwa ya dị iche iche. Olileanya anyị e ji n’aka na nkwa Jehova ga-emezu ga-adị ka okpu agha nke na-echebe ikike iche echiche anyị ma na-enye anyị udo nke uche. (Ndị Filipaị 4:7) Ọ bụrụ na anyị enwee nkà n’iji Okwu Chineke eme ihe, ọ ga-adị ka mma agha anyị pụrụ iji nye aka ịtọhapụ ndị mmadụ site n’agbụ ime mmụọ nke Setan. Anyị pụkwara iji ya chebe onwe anyị, ọbụna dị ka Jizọs mere mgbe a nwara ya.

19. Tụkwasị ‘n’iguzogide Ekwensu,’ gịnị dị mkpa?

19 Site n’iyikwasị ‘ekike agha a zuru ezu nke sitere na Chineke’ na ịnọgide na-ekpe ekpere, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-echebe anyị mgbe Setan wakporo anyị. (Jọn 17:15; 1 Ndị Kọrint 10:13) Ma Jems gosiri na o zughị ezu nanị ‘iguzogide Ekwensu.’ Karịsịa, anyị aghaghịkwa ‘ido onwe anyị n’okpuru Chineke,’ bụ́ onye na-eche banyere anyị. (Jems 4:7, 8) A ga-atụle otú anyị pụrụ isi mee nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ọnyà ndị dị aṅaa nke Setan ka Ndị Kraịst oge mbụ na-aghaghị izere?

• Nzupụta aghụghọ ndị dị aṅaa ka Setan ji eme ihe taa iji gbalịa ịmata ndị ohu Jehova n’ọnyà?

• Olee otú Jizọs si guzogide ọnwụnwa dị iche iche nke Ekwensu?

• Ekike agha ime mmụọ dị aṅaa na-enyere anyị aka iguzogide Ekwensu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Jizọs guzogidesiri Ekwensu ike

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst narị afọ mbụ jụrụ ihe ntụrụndụ ime ihe ike na nke rụrụ arụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck