Samuel nke Abụọ 12:1-31

  • Netan gara baara Devid mba (1-15a)

  • Nwa Bat-shiba nwụrụ (15b-23)

  • Bat-shiba mụrụ Solomọn (24, 25)

  • Joab weghaara Raba bụ́ obodo ndị Amọn (26-31)

12  Jehova wee zie Netan+ ka ọ gakwuru Devid. Ya agakwuru ya,+ sị ya: “E nwere ụmụ nwoke abụọ nọ n’otu obodo. Otu bụ ọgaranya, nke ọzọ abụrụ ogbenye.  Ọgaranya ahụ nwere ọtụtụ atụrụ na ehi.+  Ma ogbenye ahụ nwere naanị otu obere nne atụrụ ọ zụtara azụta.+ Ọ na-azụ ya, ọ nọkwa n’ụlọ nwoke ahụ na ụmụ ya na-eto. Ọ na-esokwa ya eri ntakịrị nri o nwere, na-aṅụkwa mmiri dị n’iko ya. Ọ na-edinakwa n’aka ya ehi ụra. O wekwaara ya ka nwa ya nwaanyị.  Ka oge na-aga, ọgaranya ahụ nwere onye ọbịa. Ma o sighị n’atụrụ ya nakwa n’ehi ya were nke ọ ga-egburu onye ọbịa ya. Kama, ọ gara were obere atụrụ nke nwoke ahụ dara ogbenye gbuoro nwoke ahụ bịara n’ụlọ ya.”+  Ihe a nwoke ahụ mere were Devid ezigbo iwe, ya asị Netan: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ,+ aṅụ iyi na nwoke mere ihe a kwesịrị ịnwụ!  Ọ ga-akwụkwa ụgwọ obere atụrụ ahụ okpukpu anọ,+ n’ihi ihe a o mere nakwa n’ihi na obi fere ya azụ.”  Netan gwaziri Devid, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ. Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘Ọ bụ m tere gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel.+ M napụtakwara gị n’aka Sọl.+  Eji m obi m nye gị ụlọ onyenwe gị,+ nyefeekwa gị ndị nwunye onyenwe gị n’aka,+ meekwa gị eze ndị Juda na ndị Izrel ndị ọzọ.+ N’agbanyeghịkwa na mụ emeerela gị ihe a niile, m dị njikere imekwuru gị ihe ndị ọzọ.+  Gịnị mere i ji leda Jehova* anya, gaa mee ihe ọ sị emela? I gbuola Yuraya onye Het.+ I ji mma agha ndị Amọn gbuo ya,+ kpọrọkwa nwunye ya.+ 10  Ebe ọ bụ na i ledara m anya gaa kpọrọ nwunye Yuraya onye Het lụwa, mma agha agaghị apụ apụ mgbe ọ bụla n’ezinụlọ gị.’*+ 11  Jehova kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị gị. N’ụlọ gị ka ọ ga-esi dakwasị gị.+ M ga-anọkwa n’ihu gị kpọrọ ndị nwunye gị kpọnye nwoke ọzọ.+ Ọ ga-edinakwa ha n’ehihie ọcha.+ 12  Ọ bụ eziokwu na i mere nke gị na nzuzo,+ mụnwa ga-eme gị ihe a n’ihu ndị Izrel niile n’ehihie ọcha.’”* 13  Devid asị Netan: “Emehiela m Jehova.”+ Netan asị Devid: “Jehova agbagharakwala gị mmehie gị.+ Ị gaghị anwụ.+ 14  Ma, ebe ọ bụ na i ledara Jehova anya gaa mee ihe a, nwa nwoke ahụ a ka mụụrụ gị ga-anwụrịrị.” 15  Netan wee laa n’ụlọ ya. Jehova mere ka nwa ahụ nwunye Yuraya mụụrụ Devid daa ọrịa. 16  Devid rịọwakwara ezi Chineke ka nwa ahụ gbakee. Ọ malitere ibu ọnụ. Ọ na-abụkwa, ya lakpuo n’abalị, ya edinara n’ala nkịtị chi abọọ.+ 17  Otu ụbọchị, ndị okenye na-ejere Devid ozi gara guzoro n’akụkụ ya ka ha kulite ya, ma o kweghị. O soghịkwa ha rie nri. 18  N’ụbọchị nke asaa, nwa ahụ nwụrụ. Ma ụjọ nọ na-atụ ndị na-ejere Devid ozi ịgwa ya na nwa ahụ anwụọla. Ha nọ na-eche, sị: “Mgbe nwa ahụ nọ ndụ, ọ naghị ege anyị ntị ma anyị gwa ya okwu. Oleezi otú anyị ga-esi agwa ya na nwa ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ́.” 19  Mgbe Devid hụrụ ka ndị na-ejere ya ozi nọ na-atakwunyere ibe ha okwu, ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ya ajụọ ha, sị: “Nwa ahụ ọ̀ nwụọla?” Ha asị ya: “Ọ nwụọla.” 20  Devid wee si n’ala bilie, saa ahụ́, tee mmanụ,+ gbanweekwa ákwà ya, gaa n’ụlọ+ Jehova kpọọ isiala. Mgbe ọ kpọchara, ya alọta n’ụlọ* ya, kwuo ka e butere ya nri, e bute ya, ya erie. 21  Ndị na-ejere ya ozi ajụọ ya, sị: “Gịnị mere i ji mee ihe a i mere? Mgbe nwa ahụ nọ ndụ, ị nọ na-ebu ọnụ, na-ebekwa ákwá. Ma ozugbo ọ nwụrụ, gị ebilie, rie nri.” 22  Ya asị: “Mgbe nwa ahụ ka nọ ndụ, m nọ na-ebu ọnụ,+ na-ebekwa ákwá, n’ihi na m sịrị n’obi m, ‘Jehova nwere ike imere m amara, nwa ahụ adị ndụ.’+ 23  Ugbu a ọ nwụrụ, gịnịzi mere m ga-eji na-ebu ọnụ? M̀ nwere ike ịkpọghachite ya?+ M ga-emecha nwụọ otú ọ nwụrụ,+ ma yanwa agaghị alọghachikwute m.”+ 24  Devid kasikwara Bat-shiba+ nwunye ya obi. Ọ gakwara ya na ya edinaa. Ka oge na-aga, ọ mụrụ nwa nwoke, a gụọ ya Solomọn.*+ Jehova hụkwara ya n’anya.+ 25  Jehova zikwara Netan+ onye amụma ka ọ gaa gụọ ya Jedidaya,* maka na ọ hụrụ ya n’anya. 26  Joab nọkwa na-alụso Raba,+ bụ́ isi obodo ndị Amọn,+ agha, wegharakwa ya.+ 27  Joab wee zie ndị mmadụ ka ha gaa zie Devid, sị: “Agara m lụso Raba agha,+ wegharakwa ebe ha si enweta mmiri.* 28  Ugbu a, kpọkọta ndị agha fọrọ ka unu maa ụlọikwuu, lụsokwa obodo ahụ agha ma weghara ya. Ma ọ́ bụghị ya, m ga-eweghara ya. A ga na-etokwa m maka ya.”* 29  Devid wee kpọkọta ndị agha niile, ha agaa Raba, lụso ya agha ma weghara ya. 30  O kpupụkwara okpueze dị n’isi Malkam.* E ji ọlaedo na nkume ndị dị oké ọnụ* kpụọ okpueze ahụ. Ọlaedo e ji kpụọ ya dị otu talent* n’arọ. E kpunyekwara Devid okpueze ahụ n’isi. Ihe ndị ọ kwatara n’obodo ahụ karịkwara akarị.+ 31  Ọ kpụkwaara ndị bi n’obodo ahụ, gwa ha ka ha na-awa nkume, na-akpụ brik, nakwa ka ha jiri ngwá ọrụ ndị na-aghọ nkọ e ji ígwè rụọ nakwa anyụike na-arụ ọrụ. Otú a ka o mekwara obodo ndị Amọn niile. N’ikpeazụ, Devid na ndị agha ya niile laghachiri Jeruselem.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “okwu Jehova.”
Ma ọ bụ “a ga na-eji mma agha egbu mmadụ n’ezinụlọ gị mgbe niile.”
Na Hibru, “n’ihu anyanwụ.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Aha a bụ́ Solomọn si n’okwu Hibru pụtara “Udo.”
Jedidaya pụtara “Onye Jaa hụrụ n’anya.”
Na Hibru, “obodo mmiri.”
Na Hibru, “a ga-akpọkwasịkwa aha m n’obodo ahụ.”
Malkam nwere ike ịbụ arụsị ndị Amọn. E nwere ebe a kpọrọ ya Molek ma ọ bụ Milkọm.
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.