Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi

AKWỤKWỌ Baịbụl bụ́ Ọrụ Ndịozi kọrọ nnọọ otú ọgbakọ Ndị Kraịst si malite na otú o si mụbaa. Ọ bụ Luk onye bụ́ dọkịta dere ya, ọ kọrọ akụkọ na-akpali mmasị banyere ihe Ndị Kraịst mere n’ime ihe dị ka afọ iri abụọ na asatọ, nke bụ́ malite n’afọ 33 O.A. ruo n’afọ 61 O.A.

Ihe bụ́ isi a kọrọ ná mmalite nke akwụkwọ Ọrụ Ndịozi a bụ ihe ndị Pita onyeozi mere, ebe akụkụ ya ikpeazụ kọrọ banyere ozi Pọl onyeozi. Ojiji Luk jiri nnọchiaha bụ́ “anyị” mee ihe gosiri na ọ nọ ya mgbe ihe ụfọdụ ndị ọ kọrọ mere. Inyocha ihe e dere n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nke ọma ga-enyere anyị aka inwe ekele maka ike Okwu Chineke na-akpa nakwa maka mmụọ nsọ Chineke. (Hib. 4:12) Ọ ga-akpalikwa anyị igosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, na-emekwa ka obi sikwuo anyị ike na Alaeze ahụ ga-abịa.

PITA EJIRI “MKPỊSỊ UGODI NKE ALAEZE” RỤỌ ỌRỤ

(Ọrụ 1:1–11:18)

Mgbe ndịozi ahụ natachara mmụọ nsọ, ha jiri obi ike gbaa àmà. Pita jiri “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe” nke mbụ megheere ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu “nabatara okwu ya” ụzọ na ohere nke ịmụta eziokwu nke Chineke nakwa ịbanye n’Alaeze ahụ. (Mat. 16:19; Ọrụ 2:5, 41) A malitere ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs nke mekwara ka ha gbasaa ebe dị iche iche, ma nke a mere ka ọrụ nkwusa ahụ gbasaruo ebe dị anya.

Mgbe ndịozi ahụ nọ na Jeruselem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn. Pita ji mkpịsị ugodi nke abụọ rụọ ọrụ site n’imeghere ndị Sameria ohere nke ịbanye n’Alaeze Chineke. (Ọrụ 8:14-17) Ikekwe, ọ bụ ihe dị ka otu afọ ka a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ ka Sọl onye Tasọs gbanwere n’ụzọ dị ịtụnanya. N’afọ 36 O.A., Pita ji mkpịsị ugodi nke atọ rụọ ọrụ, mgbe ahụkwa ka a wụkwasịrị ndị mba ọzọ a na-ebighị úgwù onyinye nke mmụọ nso n’efu.—Ọrụ 10:45.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:44-47; 4:34, 35—Gịnị mere ndị kwere ekwe ji ree ihe onwunwe ha ma kesaa ihe ha retara? Ọtụtụ n’ime ndị ghọrọ ndị kwere ekwe si obodo ndị dị anya bịa Jeruselem, ha ejighịkwa ihe ndị dị ha mkpa ga-ezuru ha iji nọtụkwuo na Jeruselem. Ma ha chọrọ ịnọtụkwu iji mụtakwuo ihe banyere okwukwe ọhụrụ a ha nabatara nakwa iji nwee ike ịgbara ndị ọzọ àmà. Iji nyere ndị a si esi bịa aka, ụfọdụ Ndị Kraịst rere ihe onwunwe ha ma keere ndị nwere mkpa ihe ndị ha retara.

4:13—Pita na Jọn, hà bụ iti bọrịbọ ma ọ bụ ndị na-agụghị akwụkwọ? Mba, ha abụghị. A kpọrọ ha “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị” n’ihi na ha agaghị ụlọ akwụkwọ ndị rabaị iji mụọ ihe banyere okpukpe.

5:34-39—Olee otú Luk si mara ihe Gameliel kwuru ná nzukọ ndị Sanhedrin nwere na nzuzo? E nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ ụzọ atọ o si mata: (1) O nwere ike ịbụ Pọl, onye bụ́bu nwa akwụkwọ Gameliel, kọọrọ ya Luk; (2) O nwekwara ike ịbụ na Luk jụtara ya otu onye so na Sanhedrin, dị ka Nikọdimọs, bụ́ onye na-akpọghị Ndị Kraịst asị; (3) Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na Luk matara ya site n’ike mmụọ nsọ Chineke.

7:59—Stivin ò kpegaara Jizọs ekpere? Mba, o kpegaaraghị Jizọs ekpere. Ọ bụ naanị Jehova Chineke ka anyị ga-efe ofufe—n’ihi ya kwa, ọ bụ naanị ya ka anyị ga-ekpegara ekpere. (Luk 4:8; 6:12) Dị ka o kwesịrị ịdị, Stivin kwesịrị ikpegara Jehova ekpere n’aha Jizọs. (Jọn 15:16) Ma n’oge a, n’ọhụụ, Stivin hụrụ “Nwa nke mmadụ ka o guzo n’aka nri Chineke.” (Ọrụ 7:56) Ebe ọ bụ na Stivin maara nke ọma na e nyela Jizọs ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ihe o mere bụ ịgwa Jizọs okwu, na-arịọ ya ka o chebe mmụọ ya.—Jọn 5:27-29.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:8. Ndị na-efe Jehova agaghị arụzu ọrụ ịgba àmà ha na-arụ n’ụwa niile ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ Chineke enyereghị ha aka.

4:36–5:11. Ọ bụ Josef onye Saịprọs ka a kpọkwara Banabas, nke pụtara “Nwa Nkasi Obi.” O nwere ike ịbụ na ndịozi gụrụ ya Banabas n’ihi na o nwere ọmịiko, dị obiọma ma na-enyere ndị ọzọ aka. Anyị kwesịrị ịdị ka ya, ọ bụghị dị ka Ananayas na Safaịra, bụ́ ndị mere ka hà bụ ihe ha na-abụghị nakwa ndị aghụghọ.

9:23-25. Ịgbanahụ ndị iro anyị ka anyị wee nwee ike nọgide na-ekwusa ozi ọma adịghị egosi na anyị bụ ndị ụjọ.

9:28-30. Ọ bụrụ na ebe anyị na-ekwusa ozi ọma bụ ebe a na-eme ihe ike, omume rụrụ arụ, ma ọ bụkwanụ ihe pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Jehova, anyị kwesịrị iji akọ mara ebe na mgbe anyị ga na-ekwusa ozi ọma. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma anyị zute ndị na-akpa ụdị àgwà ndị a.

9:31. N’oge ihe dị mma, anyị kwesịrị ịgbalị ime ka okwukwe anyị sie ike site n’ịmụ ihe na ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-amụ. Nke a ga-enyere anyị aka ịnọgide na-atụ egwu Jehova site n’ịdị na-eme ihe ndị anyị na-amụta nakwa site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

OZI PỌL JI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI JEE

(Ọrụ 11:19–28:31)

N’afọ 44 O.A., Agabọs gara Antiọk, bụ́ ebe Banabas na Sọl nọ na-ezi ihe ruo “otu afọ zuru ezu.” Agabọs buru amụma na a ga-enwe “oké ụnwụ,” bụ́ nke mere mgbe afọ abụọ gachara. (Ọrụ 11:26-28) Banabas na Sọl laghachiri Antiọk “mgbe ha zigachara ihe enyemaka ahụ dum na Jeruselem.” (Ọrụ 12:25) N’afọ 47 O.A.—nke bụ́ ihe dị ka afọ iri na abụọ ka a tọghatachara Sọl—mmụọ nsọ zigara Banabas na Sọl ije ozi n’ala ọzọ. (Ọrụ 13:1-4) N’afọ 48 O.A., ha laghachiri Antiọk, “bụ́ ebe e nyefere ha n’aka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.”—Ọrụ 14:26.

Mgbe ihe dị ka ọnwa itoolu gachara, Pọl (onye a makwaara dị ka Sọl) họọrọ Saịlas ka ya na ya soro mee njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ. (Ọrụ 15:40) Timoti na Luk sonyeere Pọl n’ụzọ. Luk nọọrọ na Filipaị ebe Pọl gawara Atens nakwa Kọrịnt, bụ́ ebe o zutere Akwịla na Prisila ma nọọ otu afọ na ọnwa isii. (Ọrụ 18:11) Pọl hapụrụ Timoti na Saịlas na Kọrịnt ma kpọrọ Akwịla na Prisila gawa Siria ná mbido afọ 52 O.A. (Ọrụ 18:18) Akwịla na Prisila so ya ruo Efesọs ma nọwazie n’ebe ahụ.

Mgbe Pọl nọtụchara n’Antiọk nke Siria, ọ malitere njem ozi ala ọzọ ya nke atọ n’afọ 52 O.A. (Ọrụ 18:23) N’Efesọs, ‘okwu Jehova wee na-agbasa ma na-enwe mmeri nke ukwuu.’ (Ọrụ 19:20) Pọl nọrọ ihe dị ka afọ atọ n’ebe ahụ. (Ọrụ 20:31) Pọl nọ na Jeruselem na Pentikọst nke afọ 56 O.A. Mgbe e jidere ya, ọ gbaara ndị ọchịchị àmà n’atụghị egwu. Na Rom, a tụrụ Pọl mkpọrọ n’ụlọ ya ruo afọ abụọ (nke bụ́ malite n’afọ 59 ruo afọ 61 O.A.), ọ nọkwa n’ebe ahụ chọta ụzọ o si na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze ahụ, na-ezikwa “ihe banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—Ọrụ 28:30, 31.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

14:8-13—Gịnị mere ndị nọ na Listra ji kpọọ “Banabas Zus, kpọọ Pọl Hemis”? N’akụkọ ifo ndị Grik, ọ bụ Zus na-achị chi ndị ọzọ, a makwaara nwa ya bụ́ Hemis dị ka ọkà okwu. Ebe ọ bụ Pọl ka kwuo okwu, ndị Listra kpọrọ ya Hemis ma kpọọ Banabas Zus.

16:6, 7—Gịnị mere mmụọ nsọ ji machibido Pọl na ndị ha na ya so iwu ka ha ghara ikwusa ozi ọma n’ógbè Eshia na Bitinia? Ndị ọrụ e nwere mgbe ahụ dị ole na ole. N’ihi ya, mmụọ nsọ dugara ha n’ebe ozi ọma ha ga-aka rụpụta ihe.

18:12-17—Gịnị mere na Galio bụ́ onye na-achị achị atụpụghị ọnụ mgbe ndị mmadụ na-eti Sọstenis ihe? Ikekwe Galio weere ya na ihe ahụ a na-eti nwoke ahụ, bụ́ onye o yiri ka ọ bụ ya bụ́ onyeisi ná ndị ahụ na-alụso Pọl ọgụ kwesịịrị ya. Ma o yiri ka ihe a e mere Sọstenis ò mechara rụpụta ihe dị mma n’ụdị na nwoke ahụ mechara ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst. Pọl mechara kpọọ Sọstenis “nwanna anyị.”—1 Kọr. 1:1.

18:18—Olee nkwa Pọl kwere? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ọ ga-abụ na Pọl kwere nkwa ịghọ onye Naziraịt. (Ọnụ Ọgụ. 6:1-21) Ma, Baịbụl agwaghị anyị ihe nkwa ahụ Pọl kwere bụ. Ihe ọzọkwa bụ na Akwụkwọ Nsọ ekwughị ma Pọl ò kwere nkwa ahụ tupu ya aghọọ Onye Kraịst ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ka na-amalite imezu nkwa ahụ amalite ka ọ̀ na-abịa ná njedebe. Nke ọ bụla ọ sọrọ ya ya bụrụ, ikwe ụdị nkwa ahụ abụghị mmehie.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

12:5-11. Anyị nwere ike ikpe ekpere maka ụmụnna anyị, anyị kwesịkwara ime otú ahụ.

12:21-23; 14:14-18. Herọd ji ọsọ nara otuto e kwesịrị inye naanị Chineke. Pọl na Banabas mere nnọọ ihe dị iche site n’ịjụwapụ nnọọ isi ozugbo ịnara otuto na ùgwù na-erughịrị ha! Anyị ekwesịghị ịchọwa ka e too anyị n’ihi ihe ndị anyị rụrụ n’ozi Jehova.

14:5-7. Ịdị akọ pụrụ inyere anyị aka ịnọgidesi ike n’ozi anyị.—Mat. 10:23.

14:22. Ndị Kraịst na-atụ anya inweta mkpagbu. Ha anaghị anwa isi ụzọ megidere okwukwe ha gbanahụ mkpagbu.—2 Tim. 3:12.

16:1, 2. Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto kwesịrị ịgbasi mbọ ike n’ozi Chineke ma rịọ Jehova ka o nyere ha aka inwe aha ọma.

16:3. Anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ma ọ bụrụhaala na Akwụkwọ Nsọ kwadoro ya, iji hụ na anyị kwusaara ndị mmadụ ozi ọma.—1 Kọr. 9:19-23.

20:20, 21. Ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ so n’otu ụzọ dị mkpa anyị si agbasa ozi ọma anyị.

20:24; 21:13. Ịnọgide na-erubere Chineke isi ka mkpa karịa ichebe ndụ anyị.

21:21-26. Anyị kwesịrị ịdị njikere ịnabata ndụmọdụ dị mma.

25:8-12. Ndị Kraịst nke oge a pụrụ ma kwesịkwa ‘ịkwado ozi ọma ma jiri iwu ndị e nwere mee ka o guzosie ike.’—Fil. 1:7.

26:24, 25. Anyị kwesịrị ịdị na-ekwusa ‘eziokwu, na-ekwukwa okwu ka ndị uche ha zuru okè’ n’agbanyeghị na ha bụ ihe nzuzu n’anya “onye anụ ahụ́ na-achị.”—1 Kọr. 2:14.

[Foto dị na peeji nke 30]

Olee mgbe Pita ji “mkpịsị ugodi nke Alaeze” rụọ ọrụ?

[Foto dị na peeji nke 31]

E wezụga enyemaka nke mmụọ nsọ, a gaaraghị enwe ike ikwusa ozi ọma n’ụwa niile