Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwee Ọganihu n’Ozi Jehova Site n’Iṅomi Pọl

Nwee Ọganihu n’Ozi Jehova Site n’Iṅomi Pọl

Nwee Ọganihu n’Ozi Jehova Site n’Iṅomi Pọl

“Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.”—2 TIM. 4:7.

1, 2. Olee mgbanwe ndị Sọl onye Tasọs mere ná ndụ ya, oleekwa ọrụ dị mkpa ọ malitere ịrụ?

E NWERE otu nwoke maara ihe nke na-adịghịkwa atụ egwu. Ma, o ‘mere omume dị ka ọchịchọ anụ ahụ́ ya si dị.’ (Efe. 2:3) Nwoke a mechara kwuo na ya bụ “onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” (1 Tim. 1:13) Ọ bụ Sọl onye Tasọs ka a na-ekwu okwu ya ihe a.

2 Ka oge na-aga, Sọl mere nnọọ mgbanwe ná ndụ ya. Ọ hapụrụ otú o si ebibu ndụ ma rụsie ọrụ ike ‘ịghara ịchọ uru nke onwe ya, kama uru nke ọtụtụ ndị.’ (1 Kọr. 10:33) Ọ bịara dịrị nwayọọ n’obi, hụkwa ndị ahụ ọ na-akpagbubu n’anya. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.) O dere, sị: “M ghọrọ onye ozi . . . . Ọ bụ m, bụ́ onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ niile, ka e nyere obiọma a na-erughịrị mmadụ, ka m wee zisaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere akụ̀ Kraịst nke a na-apụghị ịghọta aghọta.”—Efe. 3:7, 8.

3. Olee otú ịgụ akwụkwọ ozi ndị Pọl dere na otú o si jee ozi ya ga-esi nyere anyị aka?

3 Sọl, bụ́kwa onye a maara dị ka Pọl nwere nnọọ ọganihu pụtara ìhè n’ozi Jehova. (Ọrụ 13:9) Otu ihe ga-enyere anyị aka inwe ọganihu n’ozi Jehova bụ ịgụ akwụkwọ ozi ndị Pọl dere na otú o si jee ozi ya, ma ṅomie okwukwe ya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 11:1; Ndị Hibru 13:7.) Ka anyị lee otú nke a ga-esi nyere anyị aka ịdị na-amụchi ọmụmụ ihe onwe onye anya, hụ nnọọ ndị mmadụ n’anya, ma na-ele onwe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Otú Pọl Si Mụọ Ihe

4, 5. Olee otú ọmụmụ ihe onwe onye si baara Pọl uru?

4 Pọl matụ Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ọ bụ onye Farisii nke gụrụ ‘akwụkwọ n’ụkwụ Gameliel, onye a kụziiri otú e si agbasosi Iwu nna nna ha ike.’ (Ọrụ 22:1-3; Fil. 3:4-6) Ozugbo e mechara ya baptizim, ọ ‘gawara Arebia’—ma ọ́ bụghị n’Ọzara nke Siria ya abụrụ n’ebe dị jụụ dị n’akụkụ osimiri dị n’Arebia, bụ́ ebe dị mma ịnọ tụgharịa uche. (Gal. 1:17) Ọ ga-abụ na Pọl chọrọ ịtụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị gosiri na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na Pọl chọrọ ịkwadebe maka ọrụ ọ na-aga ịrụ. (Gụọ Ọrụ 9:15, 16, 20, 22.) Pọl wepụtara oge tụgharịa uche n’ihe ndị metụtara Chineke.

5 Ihe ndị Pọl mụtara n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye nyeere ya aka ịkụzi eziokwu ahụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ nzukọ dị n’Antiọk dị na Pisidia, Pọl ji ma ọ dịghị ihe ọzọ ebe ise n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gosi na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Pọl zokwara aka ọtụtụ mgbe n’ihe odide ndị dị nsọ. Otú o si kọwaa Baịbụl mere ka ndị na-ege ya ntị kweta ihe ọ na-ekwu nke na “ọtụtụ n’ime ndị Juu na ndị a tọghatara atọghata, bụ́ ndị na-efe Chineke, sooro Pọl na Banabas” iji mụtakwuo ihe. (Ọrụ 13:14-44) Mgbe afọ ụfọdụ gachara, ìgwè ndị Juu nọ na Rom bịara n’ebe Pọl na-anọ ehi ụra, ọ kọwaara ha ihe ọ na-ekwu “site n’ịgba àmà nke ọma banyere alaeze Chineke, sitekwa n’iwu Mozis nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma, ọ gwara ha okwu na-eru n’obi banyere Jizọs.”—Ọrụ 28:17, 22, 23.

6. Gịnị nyeere Pọl aka ịnọgidesi ike n’ozi ya mgbe o nwere ihe isi ike?

6 Mgbe Pọl nwere ihe isi ike ụfọdụ, ọ nọgidere na-atụle Akwụkwọ Nsọ ma nweta ume site n’ihe ndị sitere n’ike mmụọ nsọ e dere n’ime ya. (Hib. 4:12) Mgbe Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom tupu e gbuo ya, ọ gwara Timoti ka o wetere ya “akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ” na “akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe.” (2 Tim. 4:13) Ọ ga-abụ na akwụkwọ ndị a Pọl sị ka e wetere ya so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị o ji mụọ nnọọ ihe. Inweta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ site n’ịmụchi Baịbụl anya dị Pọl mkpa ka o wee nwee ike ịtachi obi.

7. Kwuo uru ndị ị ga-erite ma ị na-amụchi Baịbụl anya.

7 Ịmụchi Baịbụl anya, ya na ịtụgharị uche n’ihe anyị mụrụ, ga-enyere anyị aka inwe ọganihu n’ozi Jehova. (Hib. 5:12-14) Iji gosi otú Okwu Chineke si baa uru, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Iwu si n’ọnụ gị dị m mma, karịa ọtụtụ puku ọlaedo na ọlaọcha. Ihe i nyere n’iwu na-eme ka m mara ihe karịa ndị iro m, n’ihi na ọ bụ nke m ruo mgbe ebighị ebi. Egbochiwo m ụkwụ m ịga n’ụzọ ọjọọ ọ bụla, ka m wee debe okwu gị.” (Ọma 119:72, 98, 101) Ị̀ na-amụchi Baịbụl anya? Ị̀ na-akwado maka ọrụ ndị ị ga-arụkwu n’ozi Chineke n’ọdịnihu site n’ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na ịtụgharị uche n’ihe ndị ị na-agụ?

Sọl Mụtara Ịhụ Ndị Mmadụ n’Anya

8. Olee otú Sọl si mesoo ndị na-adịghị ekpe okpukpe ndị Juu?

8 Tupu Sọl aghọọ Onye Kraịst, ọ na-anụrụ okpukpe ya ọkụ n’obi, ma o nwechaghị mmasị n’onye ọ bụla na-adịghị ekpe okpukpe ndị Juu. (Ọrụ 26:4, 5) Ọ kwadoro ndị Juu ji nkume tụgbuo Stivin. Ọ ga-abụ na nke a mere ka o chee na ihe ọ na-eme ziri ezi, ikekwe na-eche na Stivin kwesịrị ọnwụ. (Ọrụ 6:8-14; 7:54–8:1) Akụkọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ sịrị: “Sọl malitere imeso ọgbakọ ahụ n’ụzọ jọgburu onwe ya. Ọ na-awakwasị ụlọ niile n’otu n’otu, na-adọkpụpụta ma ndị ikom ma ndị inyom, ọ na-enyefekwa ha ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ.” (Ọrụ 8:3) O ‘ruru n’ókè nke ịkpagbu ha ọbụna n’obodo ndị ọzọ.’—Ọrụ 26:11.

9. Olee ihe mere Sọl nke mere ka o chebara otú o si emeso ndị mmadụ echiche?

9 Mgbe Onyenwe anyị Jizọs pụtara ìhè n’ihu Sọl, ọ nọ na-aga Damaskọs ịga kpagbuo ndị na-eso ụzọ Kraịst nọ n’ebe ahụ. Ìhè sitere n’ebe Ọkpara Chineke nọ mere ka ìsì kpuo Sọl, nke mere ka ọ chọọ ndị ga-edugharị ya. Tupu Jehova ejiri Ananayas meghee anya Sọl, Sọl agbanweela nnọọ otú o si emeso ndị mmadụ ihe. (Ọrụ 9:1-30) Mgbe ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ rụsiri ọrụ ike iji ṅomie ụzọ Jizọs si mesoo mmadụ niile ihe. Nke a pụtara na ọ ga-akwụsị ime ihe ike, ma ghọọ onye ya na ‘mmadụ niile na-adị n’udo.’—Gụọ Ndị Rom 12:17-21.

10, 11. Olee otú Pọl si gosi na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya n’ezie?

10 Pọl akwụsịghị naanị n’iso ndị ọzọ dịrị n’udo. Ọ chọrọ igosi ha na ya hụrụ ha n’anya n’ezie, ikwusa ozi ọma nyekwaara ya aka ime nke a. Na njem ozi ala ọzọ mbụ ya, o kwusara ozi ọma n’Eshia Maịnọ. N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ Pọl na ndị ha na ya so nwetara n’ebe ahụ, ha lekwasịrị anya n’inyere ndị dị umeala n’obi aka ịghọ Ndị Kraịst. Ha gaghachiri Listra na Aịkoniọm, n’agbanyeghị na e nweela mgbe ndị mmegide nọ n’obodo ndị a chọrọ igbu Pọl.—Ọrụ 13:1-3; 14:1-7, 19-23.

11 Pọl na ndị ha na ya so mechara chọọ ndị nwere ezi obi n’obodo Masedonịa nke dị na Filipaị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka onye na-eso ụzọ ndị Juu aha ya bụ Lidia gere ntị n’ozi ọma ahụ ma ghọọ Onye Kraịst. Ndị ọrụ gọọmentị ji ígwè kụọ Pọl na Saịlas ihe n’ebe ahụ ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ma, Pọl kwusaara onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ ozi ọma, bụ́ nke mere ka e mee ya na ndị ezinụlọ ya baptizim iji gosi na ha na-efezi Jehova.—Ọrụ 16:11-34.

12. Gịnị kpaliri Sọl na-akparị mmadụ ịghọ onyeozi Jizọs Kraịst nwere ịhụnanya?

12 Gịnị mere Sọl bụ́ onye na-akpagbubu ndị mmadụ ji sonyere ndị ọ na-akpagbubu? Gịnị kpaliri nwoke ahụ na-akparị mmadụ ịghọ onyeozi nwere obiọma na ịhụnanya, bụ́ onye dị njikere ịnwụ iji hụ na ndị ọzọ mụtara eziokwu banyere Chineke na Kraịst? Pọl n’onwe ya kwuru, sị: ‘Chineke, onye kpọrọ m site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ, chere na ọ dị mma ikpughe ọkpara ya site n’aka m.’ (Gal. 1:15, 16) Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Ihe mere e ji meere m ebere bụ ka Kraịst Jizọs wee site n’aka mụ onwe m, bụ́ onye kasị bụrụ onye mmehie, gosi ogologo ntachi obi ya niile ka m wee ghọọrọ ndị ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ ihe atụ, ka ha wee nweta ndụ ebighị ebi.” (1 Tim. 1:16) Jehova gbaghaara Pọl, amara na obiọma a na-erughịrị mmadụ e meere ya mere ka o kwusaara ndị ọzọ ozi ọma iji gosi na ya hụrụ ha n’anya.

13. Gịnị kwesịrị ịkpali anyị igosi ndị ọzọ ịhụnanya, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee nke a?

13 N’otu aka ahụ, Jehova na-agbagharakwa mmehie anyị na ihe ndị anyị na-emezichaghị. (Ọma 103:8-14) Ọbụ abụ ahụ jụrụ, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa Jehova, ònye pụrụ iguzo?” (Ọma 130:3) E wezụga ebere Jehova, ọ dịghị onye n’ime anyị ga-enwe ọṅụ ije ozi dị nsọ na-enye, ọ dịghịkwa onye ga-enwe olileanya inweta ndụ ebighị ebi. Obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ dị nnọọ ukwuu. N’ihi ya, dị ka Pọl mere, anyị kwesịrị ịhụ ndị ọzọ n’anya site n’ikwusara ha ozi ọma na ịkụziri ha eziokwu ahụ nakwa site n’ịgba ụmụnna anyị ume.—Gụọ Ọrụ 14:21-23.

14. Olee otú anyị nwere ike isi mụbaa ozi anyị?

14 Pọl chọrọ inwe ihe ịga nke ọma n’ozi ya, otú Jizọs si jee ozi ya metụkwara ya n’obi. Ikwusa ozi ọma bụ otu ụzọ Ọkpara Chineke si gosi na ya hụrụ nnọọ ndị mmadụ n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:35-38) Pọl mere ihe kwekọrọ n’arịrịọ ọ bụla ọ rịọrọ ka e zitekwuo ndị ọrụ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ. Gị onwe gị kwanụ? Ị̀ nwere ike ime ka otú i si ezi ozi ọma kakwuo mma? Ma ọ bụkwanụ ị̀ ga-enwe ike iwepụtakwu oge iji na-aga ozi ọma, ikekwe hazie ihe ndị ị na-eme iji ghọọ onye ọsụ ụzọ? Ka anyị gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya n’ezie site n’inyere ha aka ‘ijidesi okwu nke ndụ ike.’—Fil. 2:16.

Otú Pọl Si Were Onwe Ya

15. Olee otú Pọl si were onwe ya nakwa Ndị Kraịst ndị ọzọ?

15 Ebe Pọl bụ Onye Kraịst na-ekwusa ozi ọma, e nwere ihe nlereanya ọzọ magburu onwe ya o setịpụụrụ anyị. N’agbanyeghị na Pọl nwere ọtụtụ ihe ùgwù n’ọgbakọ, ọ maara nke ọma na ọ bụghị ihe ndị ọ rụpụtara mere o ji nwee ihe ùgwù ndị a, marakwa na ya enwetaghị ha n’ihi na ya ruru eru inweta ha. Ọ ghọtara na ihe ùgwù ndị a o nwere bụ ụzọ Jehova si gosi ya obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Pọl ghọtara na e nwekwara Ndị Kraịst ndị ọzọ na-eme nke ọma n’ozi ha. N’agbanyeghị ihe úgwù ndị o nwere n’ọgbakọ, ọ nọgidere na-adị umeala n’obi.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:9-11.

16. Olee otú Pọl si gosi na ya dị umeala n’obi n’okwu ahụ metụtara ibi úgwù?

16 Lee otú Pọl si dozie nsogbu bilitere na Siria nke dị n’Antiọk. Okwu banyere ibi úgwù kpatara nsogbu n’ọgbakọ nọ n’ebe ahụ. (Ọrụ 14:26–15:2) Ebe ọ bụ na a họpụtara Pọl ka o bute ụzọ n’ikwusara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma, ọ gaara eche na ya bụ ọkachamara n’iso ndị na-abụghị ndị Juu emekọrịta ihe nakwa na ọ bụ ya ruru nnọọ eru idozi nsogbu ahụ. (Gụọ Ndị Galeshia 2:8, 9.) Ma, mgbe o yiri ka o nwelighị ike ịkwụsị nsogbu ahụ, o ji obi umeala kwere ịgakwuru òtù na-achị isi nọ na Jeruselem iji dozie okwu ahụ. O mere nnọọ ihe òtù na-achị isi kwuru mgbe ha gechara okwu ahụ, kwuo ihe a ga-eme ma gwa ya ka o soro ná ndị ga-aga gwa ụmụnna ihe e kpebiri. (Ọrụ 15:22-31) Pọl si otú a ‘bute ụzọ n’inye ụmụnna ya nsọpụrụ.’—Rom 12:10b.

17, 18. (a) Olee otú Pọl si mesoo ndị nọ n’ọgbakọ ihe? (b) Gịnị ka ihe ahụ ndị okenye ọgbakọ dị n’Efesọs mere mgbe Pọl na-ala na-agwa anyị banyere Pọl?

17 Pọl, bụ́ onye dị umeala n’obi adịghị asọ ụmụnna asọ. Kama ịsọ ha asọ, ha na ya na-emekọ nnọọ ihe. Mgbe ọ na-emechi akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, ọ kpọrọ aha ihe karịrị iri mmadụ abụọ ọ sịrị ka e kelee. Ọ dịghị ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ a kpọrọ aha ihe ka ọtụtụ n’ime ha, ọ bụkwa naanị ole na ole n’ime ha nwere ibu ọrụ ndị pụrụ iche. Ma ha bụcha ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, Pọl hụkwara ha nnọọ n’anya.—Rom 16:1-16.

18 Ịdị umeala n’obi Pọl na omume enyi o nwere wusikwuru ọgbakọ ndị o letara ike. Na nke ikpeazụ ya na ndị okenye si Efesọs zukọrọ, “ha dakwasịkwara Pọl n’olu ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ, n’ihi na okwu ahụ o kwuru wutere ha karịsịa, ya bụ, na ha agaghị ịhụ ihu ya ọzọ.” Ha agaraghị eme otú a mgbe ọ na-ala ma a sị na ọ bụ onye nganga, onye na-asọ ndị ọzọ asọ.—Ọrụ 20:37, 38.

19. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ‘dị nwayọọ n’obi’ mgbe anyị na-emeso Ndị Kraịst ibe anyị ihe?

19 Ndị niile chọrọ inwe ọganihu n’ozi Jehova kwesịrị ịdị umeala n’obi ka Pọl. Ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ghara “ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka [ha].” (Fil. 2:3) Olee otú anyị ga-esi mee ihe a Pọl kwuru? Otu ụzọ bụ ịdị na-ekwenyere ndị okenye ọgbakọ anyị, na-eso ntụziaka ndị ha na-enye ma ghara ịdị na-agbagha ikpe ọ bụla ha kpere n’ọgbakọ. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Ụzọ ọzọ bụ iwere ụmụnna anyị niile dị ka ndị dị oké mkpa. Ihe mejupụtara ọgbakọ ndị Jehova bụ ndị si ná mba, obodo na agbụrụ dị iche iche. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka anyị ghara ịdị na-emelara otu ndị karịa ibe ha ma hụ mmadụ niile n’anya dị ka Pọl mere? (Ọrụ 17:26; Rom 12:10a) A gbara anyị ume ka anyị ‘na-anabata ibe anyị, dị nnọọ ka Kraịst nabatara anyị, ka e wee nye Chineke otuto.’—Rom 15:7.

‘Jiri Ntachi Obi’ Na-agba Ọsọ Ndụ

20, 21. Gịnị ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi?

20 E nwere ike iji ndụ Onye Kraịst tụnyere ndị ọsọ na-agba aga n’ebe dị anya. Pọl dere, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ. Malite ugbu a gaa n’ihu, e debeere m okpueze ezi omume, nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume, ga-enye m dị ka ụgwọ ọrụ n’ụbọchị ahụ, ma ọ bụghị naanị m, kamakwa ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.”—2 Tim. 4:7, 8.

21 Iṅomi Pọl ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ ndụ ebighị ebi ahụ n’isi. (Hib. 12:1) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-eme nke ọma n’ozi Jehova site n’ịdị na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya, na-ahụ nnọọ ndị ọzọ n’anya, ma nọgide na-adị umeala n’obi.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú inwechi ọmụmụ Baịbụl onwe onye anya si baara Pọl uru?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka ezi Ndị Kraịst na-ahụ nnọọ ndị ọzọ n’anya?

• Olee àgwà ndị ga-enyere gị aka ịghara ịdị na-emelara otu ndị ihe?

• Olee otú ihe nlereanya Pọl ga-esi nyere gị aka ịdị na-ekwenyere ndị okenye ọgbakọ gị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ka Akwụkwọ Nsọ gbaa gị ume dị ka ọ gbara Pọl

[Foto dị na peeji nke 24]

Gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya site n’ikwusara ha ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 25]

Ị̀ maara ihe mere ụmụnna ji hụ Pọl n’anya?