Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs 3:1-21
3 Ihe mere e ji tụọ mụnwa, bụ́ Pọl, mkpọrọ+ bụ n’ihi na m na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-enyekwara ununwa bụ́ ndị mba ọzọ aka.
2 N’eziokwu, ama m na unu anụla na e nyere m ọrụ inyere unu aka+ ka amara Chineke baara unu uru.
3 Chineke mere ka m mata ihe nzuzo dị nsọ. Edere m gbasara ya ná nkenke n’akwụkwọ ozi m detaara unu n’oge gara aga.
4 N’ihi ya, unu gụchaa ihe a m na-ede, ọ ga-edo unu anya na aghọtala m ihe nzuzo ahụ dị nsọ+ gbasara Kraịst.
5 N’ọgbọ ndị gara aga, Chineke emeghị ka ụmụ mmadụ mara ihe nzuzo a otú o si mee ka ndịozi ya dị nsọ na ndị amụma ya mara ya ugbu a.+
6 Ihe nzuzo ahụ bụ na ndị mba ọzọ, ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, ga-eketa ihe o ketara, sorokwa n’ahụ́ ya.+ Ha ga-enwetakwa otu ihe ahụ Chineke ji maka ozi ọma anyị na-ezisa kwe anyị ná nkwa.
7 M ghọrọ onye na-ezisa gbasara ihe nzuzo a dị nsọ n’ihi amara Chineke. O nyere m onyinye a n’efu mgbe o nyere m ike ya.+
8 Chineke meere mụnwa, bụ́ onye kacha ndị nsọ niile nta,+ amara,+ ka m zisaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ihe ọma ndị na-enweghị atụ si n’aka Kraịst
9 ma mee ka ụmụ mmadụ hụ otú Chineke, onye kere ihe niile, si mezuo ihe nzuzo ya dị nsọ,+ nke o zoro kemgbe ogologo oge gara aga.
10 Nke a bụ ka e wee mee ugbu a ka ọchịchị na ikike ndị dị n’eluigwe si n’aka ọgbakọ+ mata na Chineke si n’ụzọ dị iche iche egosi amamihe ya.+
11 Ihe a ka Chineke zubere, ma n’oge gara aga ma n’ọdịnihu, na ọ ga-esi n’aka Kraịst+ Jizọs Onyenwe anyị mezuo.
12 N’ihi okwukwe anyị nwere na Jizọs, ọnụ na-aka anyị ikwu okwu, obi ana-esikwa anyị ike ịna-abịa Chineke nso.+
13 N’ihi ya, m na-arịọ unu ka unu ghara ịda mbà maka ahụhụ m na-ata n’ihi unu, n’ihi na ahụhụ m na-ata ga-eme ka e too unu.+
14 Ọ bụ ya mere m ji na-egburu Nna anyị ikpere n’ala,
15 onye mere ka ezinụlọ niile n’eluigwe na n’ụwa dịrị.*
16 Ekpere m bụ ka Chineke, onye dị ebube, jiri mmụọ nsọ ya gbaa unu ume, meekwa ka obi sie unu ike.+
17 M na-arịọkwa ya ka okwukwe unu nwere mee ka Kraịst dịrị unu n’obi, ka unu hụkwa ndị ọzọ n’anya,+ ka unu kwụsie ike, gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike+ na ntọala okwukwe unu.+
18 Ọ ga-eme ka unu na ndị nsọ nwee ike ịghọta nke ọma otú eziokwu si dị obosara, dị ogologo, dị elu, dịkwa omimi.
19 Ọ ga-emekwa ka unu mara na otú Kraịst si hụ unu n’anya+ dị mkpa karịa mmadụ ịma ihe, ka unu wee na-akpa àgwà niile Chineke na-enyere mmadụ aka ịna-akpa.
20 Chineke, onye na-enye anyị ike,+ ga-emeliri anyị ihe mmaji kwuru mmaji karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ ihe niile anyị na-eche n’echiche.+
21 Ka a na-eto ya n’ọgbọ niile ruo mgbe niile ebighị ebi n’ihi ihe o sirila n’aka ọgbakọ nakwa n’aka Kraịst Jizọs rụọ. Amen.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “onye ezinụlọ niile n’eluigwe na n’ụwa si n’aka ya nweta aha ha.”