Ozi Ọma Matiu Dere 9:1-38

  • Jizọs gwọrọ onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ (1-8)

  • Mgbe Jizọs kpọrọ Matiu (9-13)

  • Ajụjụ gbasara ibu ọnụ (14-17)

  • Ada Jaịrọs na otu nwaanyị nke bitụrụ uwe elu Jizọs aka (18-26)

  • Jizọs gwọrọ ndị ìsì na onye ogbi (27-34)

  • Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole (35-38)

9  O wee banye n’ụgbọ mmiri gafee n’ofe nke ọzọ ma banye n’obodo ya.+  Ma, ndị mmadụ buteere ya otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke dina n’àkwà.* Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe, ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Obi sie gị ike, nwa m. A gbagharala gị mmehie gị.”+  Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ wee na-eche n’obi ha, sị: “Onye a na-ekwulu Chineke.”  Ma ebe Jizọs ma ihe ha na-eche, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ọjọọ n’obi unu?+  Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’?+  Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie⁠—” ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, buru àkwà gị lawa n’ụlọ gị.”+  O wee bilie laa n’ụlọ ya.  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ihe a, egwu jidere ha, ha wee too Chineke, onye nyere ụmụ mmadụ ụdị ikike ahụ.  Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Matiu ka ọ nọ ọdụ n’ebe a na-anakọta ụtụ. O wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” O wee bilie, soro ya.+ 10  E mechaa, mgbe Jizọs nọ na-eri ihe n’ime ụlọ, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri ihe.+ 11  Ma mgbe ndị Farisii hụrụ ihe a, ha sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?”+ 12  Mgbe ọ nụrụ ihe ha kwuru, ọ sịrị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.+ 13  N’ihi ya, gaanụ mata ihe ihe a pụtara: ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’+ N’ihi na ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” 14  Ndị na-eso ụzọ Jọn wee bịakwute ya, jụọ ya, sị: “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị na-eso ụzọ gị anaghị ebu ọnụ?”+ 15  Jizọs wee sị ha: “Ndị enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ enweghị ihe mere ha ga-eji ruo uju mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ nọ. Ma oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ.+ Ha ga-ebuzi ọnụ mgbe ahụ. 16  E nweghị onye na-eji ibé ákwà ọhụrụ adụchi uwe ochie dọkara adọka, n’ihi na ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-eme ka nke ochie ahụ dọkaa. Ọ na-adọka karịa otú ọ dọkaburu.+ 17  Ndị mmadụ anaghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ochie. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, karama akpụkpọ ahụ ga-agbawa, mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama akpụkpọ ahụ emebiekwa. Kama, ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ọhụrụ, o nweghịkwa ihe ga-eme ha abụọ.” 18  Mgbe ọ na-agwa ha ihe ndị a, otu onye na-achị achị bịakwutere ya, kpọọrọ ya isiala, sị: “Ọ ga-abụ na nwa m nwaanyị anwụọla ugbu a, ma bịa bikwasị ya aka, ọ ga-adịkwa ndụ.”+ 19  Jizọs wee bilie soro ya, ndị na-eso ụzọ ya esorokwa ya. 20  Ma, otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ+ bịara ya n’azụ wee bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka,+ 21  n’ihi na ọ nọ na-agwa onwe ya, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.” 22  Jizọs tụgharịrị, hụ ya wee sị: “Obi sie gị ike, nwa m nwaanyị. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ Malite n’oge ahụ, nwaanyị ahụ gbakere.+ 23  Mgbe Jizọs batara n’ụlọ onye ahụ na-achị achị ma hụ ndị na-egbu ọjà nakwa ìgwè mmadụ na-atụ ụzụ,+ 24  ọ sịrị: “Sinụ ebe a pụọ, n’ihi na nwata nwaanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo. 25  Ozugbo a chụpụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’èzí, ọ banyere sere nwata nwaanyị ahụ n’aka,+ o wee bilie.+ 26  N’eziokwu, ihe a Jizọs mere gbasara n’ógbè ahụ niile. 27  Mgbe Jizọs si ebe ahụ na-apụ, ndị ìsì abụọ+ sooro ya, na-eti mkpu, sị: “Nwa Devid, meere anyị ebere.” 28  Mgbe Jizọs banyere n’ime ụlọ, ndị ìsì ahụ bịakwutere ya, o wee jụọ ha, sị: “Ùnu nwere okwukwe na m ga-emeli ihe a?”+ Ha asị ya: “Ee, Onyenwe anyị.” 29  O wee bitụ ha aka n’anya,+ sị: “Ka e meere unu ihe unu rịọrọ n’ihi na unu nwere okwukwe.” 30  Anya ha wee meghee. Jizọs gwasikwara ha ike, sị: “Ya enwekwala onye unu ga-akọrọ ya.”+ 31  Ma mgbe ha pụrụ n’èzí, ha kọsara ya n’ógbè ahụ niile. 32  Mgbe ha na-apụ, ndị mmadụ kpọtaara ya otu onye ogbi mmụọ ọjọọ ji.+ 33  Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ malitere ikwu okwu.+ O wee ju ìgwè mmadụ ahụ anya, ha asị: “A hụtụbeghị ụdị ihe a n’Izrel.”+ 34  Ma ndị Farisii nọ na-asị: “Ọ bụ onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ nyere ya ike o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 35  Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.+ 36  Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o meteere ha ebere,+ n’ihi na a gbara ha akpụkpọ,* na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ 37  Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “N’eziokwu, ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.+ 38  N’ihi ya, na-arịọnụ onye nwe ubi ahụ ka o zite ndị ọrụ n’ubi ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “a na-emegbu ha.”