Ozi Ọma Matiu Dere 9:1-38

  • Jizọs gwọrọ onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ (1-8)

  • Mgbe Jizọs kpọrọ Matiu (9-13)

  • Ajụjụ gbasara ibu ọnụ (14-17)

  • Ada Jaịrọs na otu nwaanyị nke bitụrụ uwe elu Jizọs aka (18-26)

  • Jizọs gwọrọ ndị ìsì na onye ogbi (27-34)

  • Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole (35-38)

9  O wee banye n’ụgbọ mmiri gafee n’ofe nke ọzọ ma banye n’obodo ya.+ 2  Ma, ndị mmadụ buteere ya otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke dina n’àkwà.* Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe, ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Obi sie gị ike, nwa m. A gbagharala gị mmehie gị.”+ 3  Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ wee na-eche n’obi ha, sị: “Onye a na-ekwulu Chineke.” 4  Ma ebe Jizọs ma ihe ha na-eche, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ọjọọ n’obi unu?+ 5  Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’?+ 6  Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie⁠—” ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, buru àkwà gị lawa n’ụlọ gị.”+ 7  O wee bilie laa n’ụlọ ya. 8  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ihe a, egwu jidere ha, ha wee too Chineke, onye nyere ụmụ mmadụ ụdị ikike ahụ. 9  Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Matiu ka ọ nọ ọdụ n’ebe a na-anakọta ụtụ. O wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” O wee bilie, soro ya.+ 10  E mechaa, mgbe Jizọs nọ na-eri ihe n’ime ụlọ, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri ihe.+ 11  Ma mgbe ndị Farisii hụrụ ihe a, ha sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?”+ 12  Mgbe ọ nụrụ ihe ha kwuru, ọ sịrị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.+ 13  N’ihi ya, gaanụ mata ihe ihe a pụtara: ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’+ N’ihi na ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” 14  Ndị na-eso ụzọ Jọn wee bịakwute ya, jụọ ya, sị: “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị na-eso ụzọ gị anaghị ebu ọnụ?”+ 15  Jizọs wee sị ha: “Ndị enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ enweghị ihe mere ha ga-eji ruo uju mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ nọ. Ma oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ.+ Ha ga-ebuzi ọnụ mgbe ahụ. 16  E nweghị onye na-eji ibé ákwà ọhụrụ adụchi uwe ochie dọkara adọka, n’ihi na ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-eme ka nke ochie ahụ dọkaa. Ọ na-adọka karịa otú ọ dọkaburu.+ 17  Ndị mmadụ anaghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ochie. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, karama akpụkpọ ahụ ga-agbawa, mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama akpụkpọ ahụ emebiekwa. Kama, ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ọhụrụ, o nweghịkwa ihe ga-eme ha abụọ.” 18  Mgbe ọ na-agwa ha ihe ndị a, otu onye na-achị achị bịakwutere ya, kpọọrọ ya isiala, sị: “Ọ ga-abụ na nwa m nwaanyị anwụọla ugbu a, ma bịa bikwasị ya aka, ọ ga-adịkwa ndụ.”+ 19  Jizọs wee bilie soro ya, ndị na-eso ụzọ ya esorokwa ya. 20  Ma, otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ+ bịara ya n’azụ wee bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka,+ 21  n’ihi na ọ nọ na-agwa onwe ya, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.” 22  Jizọs tụgharịrị, hụ ya wee sị: “Obi sie gị ike, nwa m nwaanyị. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ Malite n’oge ahụ, nwaanyị ahụ gbakere.+ 23  Mgbe Jizọs batara n’ụlọ onye ahụ na-achị achị ma hụ ndị na-egbu ọjà nakwa ìgwè mmadụ na-atụ ụzụ,+ 24  ọ sịrị: “Sinụ ebe a pụọ, n’ihi na nwata nwaanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo. 25  Ozugbo a chụpụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’èzí, ọ banyere sere nwata nwaanyị ahụ n’aka,+ o wee bilie.+ 26  N’eziokwu, ihe a Jizọs mere gbasara n’ógbè ahụ niile. 27  Mgbe Jizọs si ebe ahụ na-apụ, ndị ìsì abụọ+ sooro ya, na-eti mkpu, sị: “Nwa Devid, meere anyị ebere.” 28  Mgbe Jizọs banyere n’ime ụlọ, ndị ìsì ahụ bịakwutere ya, o wee jụọ ha, sị: “Ùnu nwere okwukwe na m ga-emeli ihe a?”+ Ha asị ya: “Ee, Onyenwe anyị.” 29  O wee bitụ ha aka n’anya,+ sị: “Ka e meere unu ihe unu rịọrọ n’ihi na unu nwere okwukwe.” 30  Anya ha wee meghee. Jizọs gwasikwara ha ike, sị: “Ya enwekwala onye unu ga-akọrọ ya.”+ 31  Ma mgbe ha pụrụ n’èzí, ha kọsara ya n’ógbè ahụ niile. 32  Mgbe ha na-apụ, ndị mmadụ kpọtaara ya otu onye ogbi mmụọ ọjọọ ji.+ 33  Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ malitere ikwu okwu.+ O wee ju ìgwè mmadụ ahụ anya, ha asị: “A hụtụbeghị ụdị ihe a n’Izrel.”+ 34  Ma ndị Farisii nọ na-asị: “Ọ bụ onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ nyere ya ike o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 35  Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.+ 36  Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o meteere ha ebere,+ n’ihi na a gbara ha akpụkpọ,* na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ 37  Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “N’eziokwu, ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.+ 38  N’ihi ya, na-arịọnụ onye nwe ubi ahụ ka o zite ndị ọrụ n’ubi ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “a na-emegbu ha.”