Ọnụ Ọgụgụ 6:1-27

  • Mmadụ ikwe nkwa na ọ ga-abụ onye Naziraịt (1-21)

  • Otú ndị nchụàjà ga-esi na-agọzi ndị Izrel (22-27)

6  Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị:  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ekwe nkwa pụrụ iche na ọ ga-abụ onye Naziraịt*+ nke Jehova,  ọ gaghị na-aṅụ mmanya na ihe ọ bụla na-aba n’anya. Ọ gaghị aṅụ mmanya gbara ụka ma ọ bụ ihe na-aba n’anya gbara ụka.+ Ọ gaghị aṅụ ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ e ji mkpụrụ vaịn mee. Ọ gaghịkwa ata mkpụrụ vaịn, ma nke ndụ ma nke a mịkpọrọ amịkpọ.  N’oge niile ọ bụ onye Naziraịt, ọ gaghị eri ihe ọ bụla e ji mkpụrụ vaịn mee, ma mkpụrụ vaịn na-achaghị acha ma mkpo ya.  “‘N’oge niile o kwere nkwa na ya ga-abụ onye Naziraịt, agụba agaghị emetụ ya n’isi.+ Ọ ga-adị nsọ. Otú ọ ga-esi dị nsọ bụ na ọ ga-ahapụ ntutu isi ya ka ọ na-eto ruo mgbe oge o nyefere Jehova onwe ya zuru.  Ọ gaghị abịa onye nwụrụ anwụ* nso n’oge niile o nyefere Jehova onwe ya.  Ọ bụrụgodị na nna ya ma ọ bụ nne ya ma ọ bụ nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwanne ya nwaanyị anwụọ, ọ gaghị emerụ onwe ya,+ n’ihi na ihe na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt nke Chineke ya dị n’isi ya.  “‘Ọ bụụrụ Jehova onye dị nsọ n’oge niile ọ bụ onye Naziraịt.  Ma ọ bụrụ na mmadụ nọ n’akụkụ ya nwụọ na mberede, ahụ́ ya emetụ ya,+ o wee merụọ ntutu isi ya nke na-egosi na ọ bụ onye e wepụtara iche maka Chineke,* ọ ga-akpụ isi ya+ n’ụbọchị a ga-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-akpụ ya n’ụbọchị nke asaa. 10  N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 11  Onye nchụàjà ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ ka e jiri kpuchiere ya mmehie o mere+ n’ihi onye nwụrụ anwụ.* Ọ ga-eme ka isi ya dị nsọ* n’ụbọchị ahụ. 12  Ọ ga-ewepụta onwe ya ọzọ ka ọ bụrụ onye Naziraịt nke Jehova n’oge niile ọ ga-abụ ya. Ọ ga-akpụta ebule na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà ikpe ọmụma. Ma, a gaghị agụnye oge ndị gara aga n’ihi na o merụrụ onwe ya n’oge ọ bụ onye Naziraịt. 13  “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị onye Naziraịt: Mgbe ọ nọzuru oge o ji bụrụ onye Naziraịt,+ a ga-akpọta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 14  N’ebe ahụ ka ọ ga-enye Jehova onyinye ya, ya bụ, ebule ahụ́ dị mma nke na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ,+ obere nne atụrụ ahụ́ dị mma na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà mmehie,+ otu ebule ahụ́ dị mma ka e jiri ya chụọ àjà udo,+ 15  otu nkata achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, nke a gwara mmanụ, achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ, nakwa àjà ọka+ na àjà mmanya+ ha na ha na-agakọ. 16  Onye nchụàjà ga-eche ihe ndị a n’ihu Jehova ma chụọ àjà mmehie na àjà a na-esu ọkụ maka onye ahụ. 17  Ọ ga-eji ebule ahụ chụọrọ Jehova àjà udo, ya na achịcha ndị ahụ na-ekoghị eko dị na nkata. Onye nchụàjà ga-achụkwa àjà ọka+ na àjà mmanya ha na ha na-agakọ. 18  “‘Onye Naziraịt ahụ ga-akpụ ntutu isi ya*+ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ọ ga-ekporo ntutu isi ya nke toro n’oge ọ bụ onye Naziraịt wụnye n’ọkụ na-ere anụ ahụ e ji chụọ àjà udo. 19  Onye nchụàjà ga-ewere otu ubu ebule ahụ e siri esi,+ si n’ime nkata ahụ were otu achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri na otu achịcha na-ekoghị eko dị fere fere. Ọ ga-achịkwasị ha n’ọbụ aka abụọ onye Naziraịt ahụ mgbe ọ kpụcharala isi na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt. 20  Onye nchụàjà ga-efegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ihe dị nsọ a ga-enye onye nchụàjà, ya na okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà e fegharịrị efegharị na ụkwụ anụ ahụ e nyere n’onyinye.+ E mechaa, onye Naziraịt ahụ nwere ike ịṅụ mmanya. 21  “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị onye Naziraịt+ nke kwere nkwa: Ọ bụrụ na o kwere nkwa na e nwere ihe ọzọ ọ ga-enye Jehova ma e wepụ ihe ndị onye Naziraịt kwesịrị iweta, ya abụrụkwa na ọ ga-ewetali ya, ọ ga-emezu nkwa ya n’ihi na o ji iwu na-achị ndị Naziraịt kpọrọ ihe.’” 22  Jehova gwaziri Mosis, sị: 23  “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị, ‘Otú a ka unu ga-esi na-agọzi+ ndị Izrel. Na-asịnụ ha: 24  “Ka Jehova gọzie unu+ ma chebe unu. 25  Ka Jehova nwee mmasị n’ebe unu nọ,*+ ka o meekwara unu amara. 26  Ka Jehova meere unu ihe ọma, meekwa ka udo dịrị unu.”’+ 27  Ha ga-eji aha m gọzie ndị Izrel,+ ka m wee gọzie ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Hibru na·zir′. Ọ pụtara “Onye E Wepụtara Iche; Onye E Nyefere Chineke.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “merụọ isi o ji bụrụ onye Naziraịt.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ na otú ọ ga-esi eme ya bụ ịhapụ ntutu isi ya ka o bidokwa towe.
Ma ọ bụ “isi o ji bụrụ onye Naziraịt.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”
Na Hibru, “Ka Jehova mee ka ihu ya nwuoro unu ìhè.”