Ozi Ọma Matiu Dere 16:1-28

  • Ụfọdụ gwara Jizọs ka o gosi ha ihe àmà (1-4)

  • Ihe iko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii (5-12)

  • Mkpịsị ugodi Alaeze eluigwe (13-20)

    • A rụrụ ọgbakọ n’elu oké nkume (18)

  • Jizọs kwuru na a ga-egbu ya (21-23)

  • Ihe e ji ama ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs (24-28)

16  Ndị Farisii na ndị Sadusii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha gwara ya ka o gosi ha ihe àmà si n’eluigwe.+  O wee sị ha: “N’uhuruchi, unu na-asị, ‘Ihu ígwé ga-adị mma, n’ihi na ọ na-acha ọbara ọbara.’  N’ụtụtụ, unu na-asịkwa, ‘Mmiri ga-ezo taa, oyi ga-atụkwa, n’ihi na eluigwe na-acha ọbara ọbara ma gbaa ọchịchịrị.’ Unu ma otú e si akọwa ihu ígwé, ma unu enweghị ike ịkọwa ihe àmà nke oge a.  Ọgbọ ọjọọ nke hapụrụ Chineke* na-achọ ihe àmà, ma a gaghị egosi ya ihe àmà ọ bụla+ ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona.”+ O wee hapụ ha pụọ.  Ma ndị na-eso ụzọ ya gafere n’ofe nke ọzọ ma chefuo iwere achịcha.+  Jizọs sịrị ha: “Lezienụ anya, kpacharakwanụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”+  N’ihi ya, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “Anyị chefuru iweta achịcha.”  Ebe Jizọs ma ihe ha na-ekwu, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-agwa ibe unu na unu ejighị achịcha, unu ndị okwukwe nta?  Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu, ka ọ̀ bụ na unu echetaghị ogbe achịcha ise ahụ e nyere puku mmadụ ise (5,000) nakwa nkata ole unu tụtụjuru nke ha tafọrọ?+ 10  Ka ọ̀ bụ na unu echetaghị ogbe achịcha asaa ahụ e nyere puku mmadụ anọ (4,000) nakwa nkata ole unu tụtụjuru nke ha tafọrọ?+ 11  Gịnị mere na unu aghọtaghị na ọ bụghị achịcha ka m na-ekwu gbasara ya? Ihe m na-ekwu bụ ka unu lezie anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”+ 12  Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-ekwu bụ ka ha lezie anya maka ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii, ọ bụghị maka ihe iko achịcha nkịtị. 13  Mgbe Jizọs banyere n’ógbè Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke mmadụ bụ?”+ 14  Ha wee sị: “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim,+ ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja,+ ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ Jeremaya ma ọ bụ otu n’ime ndị amụma.” 15  O wee sị ha: “Ònye ka ununwa chere na m bụ?” 16  Saịmọn Pita zara, sị: “Ị bụ Kraịst,+ Ọkpara Chineke dị ndụ.”+ 17  Jizọs wee sị ya: “Saịmọn nwa Jona, ka obi na-atọ gị ụtọ n’ihi na ọ bụghị anụ ahụ́ na ọbara* mere ka ị mata ihe a, kama ọ bụ Nna m nke nọ n’eluigwe.+ 18  Ana m asịkwa gị: Ị bụ Pita,+ ọ bụkwa n’elu oké nkume a+ ka m ga-arụ ọgbakọ m, ọnụ ụzọ ámá nke ili* agaghịkwa aka ya ike. 19  M ga-enye gị mkpịsị ugodi Alaeze eluigwe, ihe ọ bụla ị ga-eke agbụ n’ụwa bụ ihe e kere agbụ n’eluigwe, ihe ọ bụla ị ga-atọpụ n’ụwa bụkwa ihe a tọpụrụ n’eluigwe.” 20  Ọ gwasiziri ndị na-eso ụzọ ya ike ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ya bụ Kraịst.+ 21  Malite n’oge ahụ gawa, Jizọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem nakwa na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ata ya ezigbo ahụhụ ebe ahụ. A ga-egbukwa ya, ma, n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.+ 22  Pita wee kpọpụ ya n’akụkụ bido ịbara ya mba, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị. Ihe a agaghị eme gị.”+ 23  Ma ọ gbanyeere Pita azụ, sị ya: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị na-achọ imegharị m anya, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.”+ 24  Jizọs gwaziri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ* ya na-eso m mgbe niile.+ 25  N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-adị ndụ ọzọ.+ 26  N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ* ya?+ Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ* ya?+ 27  N’ihi na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ihe o mere.+ 28  N’eziokwu, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe a na-agaghị anwụ ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’Alaeze ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “nke na-akwa iko.”
Ma ọ bụ “n’ihi na ọ bụghị mmadụ.”
Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”