Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 9:1-27
9 Ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime ihe m chọrọ ime? Ọ̀ bụ na mụ abụghị onyeozi? Ọ̀ bụ na mụ ahụghị Jizọs Onyenwe anyị?+ Ọ̀ bụ na unu abụghị ihe m rụpụtara n’ọrụ Onyenwe anyị?
2 Ọ bụrụgodị na abụghị m onyeozi maka ndị ọzọ, n’eziokwu, abụ m onyeozi maka unu. N’ihi na unu bụ ihe akaebe na-egosi na abụ m onyeozi nke Onyenwe anyị.
3 Ihe m na-agwa ndị na-akatọ m bụ:
4 Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike isi n’aka ndị ọzọ na-enweta ihe anyị ga na-eri na ihe anyị ga na-aṅụ?
5 Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike ịlụ nwanna nwaanyị,+ ya esoro anyị na-agagharị, otú ahụ ndịozi ndị ọzọ na ụmụnne Onyenwe anyị+ na Sifas*+ mere?
6 Ka ọ̀ bụ naanị mụ na Banabas+ bụ ndị na-enweghị ike ịkwụsị ịrụ ọrụ anyị ji akpa afọ anyị?
7 È nwere onye agha na-esi n’akpa ya egbo mkpa ya niile mgbe ọ bụ onye agha? È nwere onye na-akọ ubi vaịn nke na-anaghị eri mkpụrụ ya?+ Ka è nwere onye na-akpa anụ nke na-anaghị aṅụ mmiri ara nke si n’anụ ahụ?
8 Ihe ndị a m na-ekwu abụghị naanị uche mmadụ. Iwu Mosis kwukwara ha.
9 N’ihi na e dere n’Iwu Mosis, sị: “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.”+ Chineke ò kwuru ihe a maka na ọ na-eche gbasara ehi?
10 Ọ́ bụghị maka anyị ka o ji kwuo ya? N’eziokwu, ọ bụ maka anyị ka e ji dee ya, n’ihi na onye na-akọ ubi kwesịrị ịkọ ubi ma nwee olileanya na ọ ga-akọpụta ihe. Onye na-azọcha ọka kwesịkwara inwe olileanya na ọ ga-enweta ọka.
11 Ọ bụrụ na anyị akụọla ihe ndị si n’aka Chineke n’ime unu, ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma anyị si n’aka unu nweta ihe ụfọdụ anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị?+
12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ nwere ikike isi n’aka unu nweta ihe, ọ̀ bụ na anyị akaghị ha nwee ikike a? N’agbanyeghị na anyị nwere ikike a, o nweghị ihe ọ bụla anyị si n’aka unu nweta.+ Kama anyị na-edi ihe niile, ka anyị wee ghara isi ụzọ ọ bụla mee ka ozi ọma gbasara Kraịst ghara ịna-aga aga.+
13 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-arụ ọrụ dị nsọ na-eri ihe ndị dị n’ụlọ nsọ, nakwa na ndị na-arụ ọrụ mgbe niile n’ebe a na-achụ àjà na-eketa ihe ụfọdụ e ji chụọ àjà?+
14 Ọ bụkwa otú ahụ ka Onyenwe anyị si kwuo ka e si n’ozi ọma ndị na-ezi ozi ọma na-ezisa nyejuo ha afọ.+
15 Ma, agwabeghị m unu ka unu nye m ihe ọ bụla.+ N’eziokwu, ihe mere m ji ede ihe ndị a abụghị ka unu nye m ihe. Ọ kaara m mma ịnwụ kama ikwe ka mmadụ ọ bụla mee ka m kwụsị ịnya isi na o nweghị onye na-akwụ m ụgwọ maka ozi ọma m na-ezisa.+
16 Ọ bụrụkwa na m na-ezisa ozi ọma, ọ bụghị ihe mere m ga-eji na-anya isi, n’ihi na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. N’eziokwu, m ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na anaghị m ezisa ozi ọma.+
17 Ọ bụrụ na m ji obi m niile na-ezisa ya, a ga-akwụ m ụgwọ. Ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe m chọrọ ime, m ga-emerịrị ya n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke họpụtara m ka m na-arụ.+
18 Gịnịzi bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ịna-ezisa ozi ọma n’anaraghị ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na m si otú ahụ na-ezisa ya, agaghị m asị ka e nye m ihe e kwesịrị inye m maka ozi ọma m na-ezisa.
19 Ọ bụ eziokwu na o nweghị mmadụ ọ bụla m bụ ohu ya, emeela m onwe m ohu mmadụ niile, ka m wee nyere ọtụtụ ndị aka ka ha sowe ụzọ Jizọs.
20 N’ihi ya, m gakwuru ndị Juu, mụ emewe ka onye Juu iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs.+ M gakwuru ndị na-edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na iwu ejighị m idebe Iwu Mosis.+
21 M gakwuru ndị na-anaghị edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-anaghị edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na m na-edebe Iwu Chineke na nke Kraịst.+
22 M gakwuru ndị na-esighị ike, mụ emewe ka onye na-esighị ike iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs.+ Emeela m ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka, ka m wee si otú ọ bụla m nwere ike zọpụta ụfọdụ n’ime ha.
23 Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee na-ezisara ya ndị ọzọ.+
24 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ ịsọ mpi na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-enye onye meriri? Na-agbanụ ọsọ otú ga-eme ka unu merie.+
25 Ndị niile so n’asọmpi na-ejide onwe ha n’ihe niile. Ha na-eme ya iji nweta ihe nrite* nwere ike imebi emebi,+ ma anyịnwa na-eme ya iji nweta ihe nrite na-enweghị ike imebi emebi.+
26 N’ihi ya, m na-agba ọsọ maka na ama m ebe m gba na-aga,+ m na-etikwa ọkpọ otú ọ na-agaghị abụ ikuku ka m na-eti ya.
27 Ma, m na-ejidesi onwe m ike,* na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m,+ ka ọ ghara ịbụ m kwusachaara ndị ọzọ ozi ọma, Chineke ajụ m.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Aha ya ọzọ bụ Pita.
^ Na Grik, “okpueze.”
^ Ma ọ bụ “na-ata onwe m ahụhụ.”