Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 9:1-27

  • Pọl onyeozi bụ onye e kwesịrị iṅomi (1-27)

    • “Ekechila ọnụ ehi” (9)

    • “M ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na anaghị m ezisa ozi ọma” (16)

    • Emeela m ihe niile iji nyere mmadụ niile aka (19-23)

    • Mmadụ ijide onwe ya ka ọ na-agba ọsọ ndụ (24-27)

9  Ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime ihe m chọrọ ime? Ọ̀ bụ na mụ abụghị onyeozi? Ọ̀ bụ na mụ ahụghị Jizọs Onyenwe anyị?+ Ọ̀ bụ na unu abụghị ihe m rụpụtara n’ọrụ Onyenwe anyị?  Ọ bụrụgodị na abụghị m onyeozi maka ndị ọzọ, n’eziokwu, abụ m onyeozi maka unu. N’ihi na unu bụ ihe akaebe na-egosi na abụ m onyeozi nke Onyenwe anyị.  Ihe m na-agwa ndị na-akatọ m bụ:  Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike isi n’aka ndị ọzọ na-enweta ihe anyị ga na-eri na ihe anyị ga na-aṅụ?  Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike ịlụ nwanna nwaanyị,+ ya esoro anyị na-agagharị, otú ahụ ndịozi ndị ọzọ na ụmụnne Onyenwe anyị+ na Sifas*+ mere?  Ka ọ̀ bụ naanị mụ na Banabas+ bụ ndị na-enweghị ike ịkwụsị ịrụ ọrụ anyị ji akpa afọ anyị?  È nwere onye agha na-esi n’akpa ya egbo mkpa ya niile mgbe ọ bụ onye agha? È nwere onye na-akọ ubi vaịn nke na-anaghị eri mkpụrụ ya?+ Ka è nwere onye na-akpa anụ nke na-anaghị aṅụ mmiri ara nke si n’anụ ahụ?  Ihe ndị a m na-ekwu abụghị naanị uche mmadụ. Iwu Mosis kwukwara ha.  N’ihi na e dere n’Iwu Mosis, sị: “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.”+ Chineke ò kwuru ihe a maka na ọ na-eche gbasara ehi? 10  Ọ́ bụghị maka anyị ka o ji kwuo ya? N’eziokwu, ọ bụ maka anyị ka e ji dee ya, n’ihi na onye na-akọ ubi kwesịrị ịkọ ubi ma nwee olileanya na ọ ga-akọpụta ihe. Onye na-azọcha ọka kwesịkwara inwe olileanya na ọ ga-enweta ọka. 11  Ọ bụrụ na anyị akụọla ihe ndị si n’aka Chineke n’ime unu, ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma anyị si n’aka unu nweta ihe ụfọdụ anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị?+ 12  Ọ bụrụ na ndị ọzọ nwere ikike isi n’aka unu nweta ihe, ọ̀ bụ na anyị akaghị ha nwee ikike a? N’agbanyeghị na anyị nwere ikike a, o nweghị ihe ọ bụla anyị si n’aka unu nweta.+ Kama anyị na-edi ihe niile, ka anyị wee ghara isi ụzọ ọ bụla mee ka ozi ọma gbasara Kraịst ghara ịna-aga aga.+ 13  Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-arụ ọrụ dị nsọ na-eri ihe ndị dị n’ụlọ nsọ, nakwa na ndị na-arụ ọrụ mgbe niile n’ebe a na-achụ àjà na-eketa ihe ụfọdụ e ji chụọ àjà?+ 14  Ọ bụkwa otú ahụ ka Onyenwe anyị si kwuo ka e si n’ozi ọma ndị na-ezi ozi ọma na-ezisa nyejuo ha afọ.+ 15  Ma, agwabeghị m unu ka unu nye m ihe ọ bụla.+ N’eziokwu, ihe mere m ji ede ihe ndị a abụghị ka unu nye m ihe. Ọ kaara m mma ịnwụ kama ikwe ka mmadụ ọ bụla mee ka m kwụsị ịnya isi na o nweghị onye na-akwụ m ụgwọ maka ozi ọma m na-ezisa.+ 16  Ọ bụrụkwa na m na-ezisa ozi ọma, ọ bụghị ihe mere m ga-eji na-anya isi, n’ihi na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. N’eziokwu, m ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na anaghị m ezisa ozi ọma.+ 17  Ọ bụrụ na m ji obi m niile na-ezisa ya, a ga-akwụ m ụgwọ. Ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe m chọrọ ime, m ga-emerịrị ya n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke họpụtara m ka m na-arụ.+ 18  Gịnịzi bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ịna-ezisa ozi ọma n’anaraghị ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na m si otú ahụ na-ezisa ya, agaghị m asị ka e nye m ihe e kwesịrị inye m maka ozi ọma m na-ezisa. 19  Ọ bụ eziokwu na o nweghị mmadụ ọ bụla m bụ ohu ya, emeela m onwe m ohu mmadụ niile, ka m wee nyere ọtụtụ ndị aka ka ha sowe ụzọ Jizọs. 20  N’ihi ya, m gakwuru ndị Juu, mụ emewe ka onye Juu iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs.+ M gakwuru ndị na-edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na iwu ejighị m idebe Iwu Mosis.+ 21  M gakwuru ndị na-anaghị edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-anaghị edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na m na-edebe Iwu Chineke na nke Kraịst.+ 22  M gakwuru ndị na-esighị ike, mụ emewe ka onye na-esighị ike iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs.+ Emeela m ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka, ka m wee si otú ọ bụla m nwere ike zọpụta ụfọdụ n’ime ha. 23  Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee na-ezisara ya ndị ọzọ.+ 24  Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ ịsọ mpi na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-enye onye meriri? Na-agbanụ ọsọ otú ga-eme ka unu merie.+ 25  Ndị niile so n’asọmpi na-ejide onwe ha n’ihe niile. Ha na-eme ya iji nweta ihe nrite* nwere ike imebi emebi,+ ma anyịnwa na-eme ya iji nweta ihe nrite na-enweghị ike imebi emebi.+ 26  N’ihi ya, m na-agba ọsọ maka na ama m ebe m gba na-aga,+ m na-etikwa ọkpọ otú ọ na-agaghị abụ ikuku ka m na-eti ya. 27  Ma, m na-ejidesi onwe m ike,* na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m,+ ka ọ ghara ịbụ m kwusachaara ndị ọzọ ozi ọma, Chineke ajụ m.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aha ya ọzọ bụ Pita.
Na Grik, “okpueze.”
Ma ọ bụ “na-ata onwe m ahụhụ.”