Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Chineke Dị?

Olee Otú Chineke Dị?

Echiche Baịbụl

Olee Otú Chineke Dị?

BAỊBỤL kwuru, sị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya ofufe ga-efe ya ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” Okwu a mere ka anyị ghọta nnọọ otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ banyere otú Chineke dị—ọ bụ mmụọ! (Jọn 4:19-24) N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl kọwara ya dị ka onye. Aha ya bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.

Ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl na-ekwu na ha aghọtaghị otú Chineke dị. Ebe ọ bụ na Chineke abụghị onye a na-ahụ anya, kama, ọ bụ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, gịnị mere ọtụtụ amaokwu Baịbụl ji ekwu banyere Chineke dị ka à ga-asị na o nwere anya, ntị, imi, obi, ogwe aka, aka, mkpịsị aka, na ụkwụ? * Ụfọdụ nwere ike ikwere na Chineke dị ka mmadụ n’ihi na Baịbụl kwuru na e kere mmadụ n’onyinyo ya. Ịtụlekwu ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka mgbagwoju anya ahụ kwụsị.—Jenesis 1:26.

Gịnị Mere E Ji Ekwu na O Nwere Ihe Ndị E Ji Mara Mmadụ?

Iji nyere ụmụ mmadụ aka ịghọta otú Chineke dị, Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ndị dere Baịbụl jiri ihe ndị e ji mara mmadụ kọwaa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Okwu ndị ahụ na-egosi na asụsụ ụmụ mmadụ ezughị ezu ịkọwa ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Ihe ha bu n’uche jiri okwu ndị ahụ mee ihe bụ iji okwu ndị ụmụ mmadụ ga-aghọta kọwaa ihe ndị dị n’eluigwe. Nke a apụtaghị na anyị kwesịrị ịghọta okwu ndị ahụ n’ụzọ nkịtị dịkwa ka anyị na-agaghị aghọta ebe ndị Baịbụl kpọrọ Chineke “Oké Nkume,” “anyanwụ,” ma ọ bụ “ọta” n’ụzọ nkịtị.—Diuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 84:11.

N’otu aka ahụ, iji kọwaa na àgwà ndị Jehova nwere n’ụzọ zuru ezu dịtụkwa n’ime ụmụ mmadụ, Baịbụl kwuru na e kere mmadụ n’onyinyo Chineke. O doro anya na nke a apụtaghị na ụmụ mmadụ bụ mmụọ ma ọ bụ na Chineke dị ka mmadụ.

Chineke Ọ̀ Bụ Nwoke Ka Ọ̀ Bụ Nwaanyị?

Dị nnọọ ka anyị na-ekwesịghị ịghọta ebe ndị e kwuru na Chineke nwere akụkụ ahụ́ mmadụ n’ụzọ nkịtị, anyị ekwesịghịkwa ịghọta ebe ndị a kọwara Chineke dị ka nwoke n’ụzọ nkịtị. Ọ bụ naanị ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya na-enwe oké na nne, ọ na-egosikwa na asụsụ ụmụ mmadụ agaghị akọwachali otú Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ Jehova, dị.

Baịbụl ịkpọ Chineke “Nna” na-enyere anyị aka ịghọta na e nwere ike iji Onye Okike anyị tụnyere nna nke hụrụ ezinụlọ ya n’anya, na-echebe ha ma na-egboro ha mkpa ha. (Matiu 6:9) Nke a apụtaghị na anyị kwesịrị ilewe Chineke, ma ọ bụ ọbụna ndị mmụọ ọzọ e kere eke bi n’eluigwe, anya dị ka ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị. Ha abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’ụzọ nkịtị. Ọ dabara nnọọ adaba na Baịbụl kwuru na ndị a kpọrọ iso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe ya anaghị atụ anya ịnọgide na-abụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ ịghọ ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ. Pọl onyeozi chetaara ha na ‘a gaghị enwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị’ n’etiti ha mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ dị ka ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ. A na-akpọkwa ha ‘nwaanyị Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst na-alụ ọhụrụ’ n’ụzọ ihe atụ. Ihe a niile na-egosi na e kwesịghị ịghọta ebe ndị e ji ihe ndị e ji mara ụmụ mmadụ kọwaa Chineke—na Ọkpara ya ọ mụrụ naanị ya, bụ́ Jizọs, na ndị mmụọ ọzọ e kere eke—n’ụzọ nkịtị.—Ndị Galeshia 3:26, 28; Mkpughe 21:9, 1 Jọn 3:1, 2.

Ebe ndị dere Baịbụl ghọtara ihe bụ́ ọrụ ụmụ nwoke, ha kwuru banyere Chineke ka à ga-asị na ọ bụ nwoke. Ha chọpụtara na nwoke na-arụ ọrụ ya nke ọma na-eme ka Jehova, bụ́ onye ji ịhụnanya na-elekọta ụmụ ya ndị nọ n’ụwa dị ka nna.—Malakaị 3:17; Matiu 5:45; Luk 11:11-13.

Àgwà Chineke nke Kasị Pụta Ìhè

Ọ bụ ezie na Eze kasị elu bụ mmụọ, ọ nọtụghị anyị n’ebe dị anya, zoo ụdị onye ọ bụ ezoo, ma ọ bụ gbachi anyị nkịtị. Na ọ bụ mmụọ apụtaghị na ndị obi ha ziri ezi enweghị ike iru ya nso, bụ́ ndị chọrọ ịmụta banyere ịhụnanya ya, ike ya, amamihe ya, na ikpe ya ziri ezi, bụ́ àgwà ndị na-egosikwa ụdị onye ọ bụ na ndị a na-ahụ n’ihe ndị o kere eke.—Ndị Rom 1:19-21.

Ma, e nwere ike iji àgwà Chineke nke kasị pụta ìhè, bụ́ ịhụnanya, kọwaa Ya. Ịhụnanya ya pụtara nnọọ ìhè nke na a na-asị na Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Àgwà a jikọtara àgwà ndị ọzọ e ji mara ya, dị ka ebere, mgbaghara, na ogologo ntachi obi. (Ọpụpụ 34:6; Abụ Ọma 103:8-14; Aịzaya 55:7; Ndị Rom 5:8) N’ezie, Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya, bụ́ onye na-akpọ anyị bụ́ ụmụ mmadụ òkù ka anyị bịaruo ya nso.—Jọn 4:23.

[Ihe odide ala ala peeji]

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Gịnị bụ aha Chineke?—Abụ Ọma 83:18.

▪ Olee ebe anyị nwere ike ịhụ ihe ndị na-egosi àgwà Chineke?—Ndị Rom 1:19-21.

▪ Olee àgwà Chineke nke kasị pụta ìhè?—1 Jọn 4:8.